Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị a kpọtụrụ uche, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 16. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)

1. Ònye ka Jọn onyeozi hụrụ “n’etiti ihe ịdọba oriọna asaa ahụ,” nọ na-ezi ya ozi ọ ga-ezi ọgbakọ asaa ahụ? (Mkpughe 1:13)

2. Kama ikwe ka “ihe ọjọọ merie” anyị, gịnị ka Pọl na-adụ anyị ọdụ ime? (Ndị Rom 12:21)

3. Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ejide gị ije otu mile, so ya jee mile abụọ”? (Matiu 5:41)

4. Kama ịkpa isi na iyi ihe ọlaedo, gịnị ka Pita dụrụ ndị Kraịst bụ́ nwunye ọdụ ka ha jiri na-achọ onwe ha mma? (1 Pita 3:3, 4)

5. Gịnị ka Aịsaịa kpọrọ Abraham, nke na-egosi na ọ bụ nna bụ́ mmadụ nke mba Israel? (Aịsaịa 51:1)

6. N’ihi gịnị ka Devid ji jụ ịṅụ mmiri ahụ ndị dike atọ ahụ gara Betlehem kutere ya mgbe ọ nọ n’ọgba Adulam? (2 Samuel 23:15-17)

7. Gịnị ka Bat-sheba na-eme oge mbụ Devid hụrụ ya? (2 Samuel 11:2)

8. Kama iji ink, gịnị ka Pọl kwuru na e ji dee ihe n’elu obi ndị Kraịst nọ na Kọrint? (2 Ndị Kọrint 3:3)

9. Gịnị ka Jehova ji wepụsịa igurube nke ihe otiti nke asatọ ahụ, nke mere na otu afọdụghị n’Ijipt? (Ọpụpụ 10:19)

10. N’ihi gịnị ka Jehova ji gbuo Sọl? (1 Ihe E Mere 10:13)

11. Olee obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri Pọl nọ na ya site n’otu ụgbọ gafere n’ọzọ dị ka onye mkpọrọ e du na-aga Rom? (Ọrụ 27:5)

12. Olee otú Jehova si gosi na ya na-eche banyere ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei? (Ọpụpụ 22:22-24; Deuterọnọmi 24:17-21)

13. Olee aha a kpọrọ ubi ahụ ndị nchụàjà jiri ego ahụ Judas tụbara n’ụlọ nsọ zụta? (Matiu 27:3-8; Ọrụ 1:19)

14. N’ihi gịnị ka Pita ji basiere Saịmọn mba ike maka iche ha ego n’ihu iji nweta ike ime ka mmadụ nweta mmụọ nsọ? (Ọrụ 8:20, 21)

15. Afọ ole ka Sera dị mgbe ọ mụrụ Aịsak? (Jenesis 17:17)

16. Olee mba Elimelek na nwunye ya, bụ́ Naomi, kwagara n’ihi oké ụnwụ, bụ́ ebe nwa ha nwoke bụ́ Mahlọn nọ lụọ Rut? (Rut 1:1-4)

[Igbe dị na peeji nke 16]

Azịza Nye Ajụjụ

1. Jisọs Kraịst, bụ́ onye Jọn kọwara dị ka “Onye yiri nwa nke mmadụ”

2. “Were ezi ihe merie ihe ọjọọ”

3. Ọ na-enye ihe atụ nke mkpa ọ dị iji nrubeisi na-eme ihe a chọrọ nke iwu kwadoro

4. ‘Uwe a na-apụghị imebi nke bụ́ mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo’

5. ‘Oké nkume nke e siri na ya wapụta unu’

6. N’ihi na ọ nọchiri anya ọbara ha, bụ́ nke ha tinyere n’ihe ize ndụ iji kute ya

7. Ọ na-asa ahụ

8. “Mmụọ nke Chineke dị ndụ”

9. Ifufe Ọdịda Anyanwụ dị ike nke ukwuu fegara ha n’Oké Osimiri Uhie

10. O mere omume ekwesịghị ntụkwasị obi megide Jehova site n’erubeghị isi n’iwu ya na site n’ịjụta ihe n’aka onye na-ajụ ndị mmụọ ase

11. Maịra dị na Lisia

12. O mere ndokwa maka ọdịmma na ihe oriri ha

13. Akeldama, ma ọ bụ “Iberibe ala ọbara”

14. O gosipụtara ebumnobi ọjọọ ịnwa ịzụrụ “onyinye Chineke” a, obi ya ‘ezighịkwa ezi n’ihu Chineke’

15. Ọ dị afọ 90

16. Moab