Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịzụlite Ụmụaka Ịkpa Ezi Àgwà—n’Ụzọ Dị Aṅaa?

Ịzụlite Ụmụaka Ịkpa Ezi Àgwà—n’Ụzọ Dị Aṅaa?

Ịzụlite Ụmụaka Ịkpa Ezi Àgwà—n’Ụzọ Dị Aṅaa?

“Ụmụaka na-amụta inwe ùgwù onwe onye na njide onwe onye site n’inweta ma ịhụnanya ma ọzụzụ sitere n’aka ndị mụrụ ha,” ka The Gazette bụ́ akwụkwọ akụkọ Montreal, Canada, na-akọ. Gịnị ka nke a gụnyere? Dị ka onye Montreal bụ́ ọkà akparamàgwà mmadụ bụ́ Constance Lalinec si kwuo, ọ dị mkpa ka a kpaa ókè doro anya n’otú nwatakịrị ga-esi na-akpa àgwà.

Lalinec, bụ́ onye na-enyocha ụmụaka na ezinụlọ, kwukwara na “mgbe anyị gbochiri ụmụaka iburu ihe ndị si n’ihe ha mere pụta, anyị na-egbochikwa ihe dị ukwuu n’ihe ndị ha gaara amụta.” Ịhapụ nwatakịrị ka ọ na-eme ihe masịrị ya pụrụ imetụta uto ya n’ụzọ na-adịghị mma.

Ndụmọdụ amamihe dị na Bible banyere ịzụ ụmụ bụ́ nke nọworo na-adị irè eri oge kasị daba adaba. Ọ na-ekwu, sị: “Ka okwu unu bụrụ, Ee, ee; Ee e, ee e.” (Matiu 5:37) Ozugbo e nyere ụkpụrụ nduzi ndị ezi uche dị na ha, ụmụ gị aghọtakwa ha, nọgide na-ahụ na ha na-erube isi na ha. Na-eme ihe i kwuru. Nke a na-eme ka ụmụaka mara kpọmkwem banyere ụkpụrụ nduzi na atụmanya nke ndị mụrụ ha—na ndị mmadụ ‘ga-aghọrọ mkpụrụ ha ghara.’ (Ndị Galetia 6:7; Ndị Rom 2:6) Nzube nke ọzụzụ dị irè e nyere n’ịhụnanya bụ ka ụmụaka mụta irube isi n’ụkpụrụ nduzi na ka ha nagide nkụda mmụọ na ihe ụtọ a na-enwetaghị mgbe ha chọrọ ya ka ha wee nwee ike ịzụlite àgwà ndị dị ha mkpa iji too ma bụrụ ndị okenye na-akpa ezi àgwà, bụ́ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi.

A ga-achọtakwu ndụmọdụ banyere ihe Chineke na-agwa ndị mụrụ ụmụ banyere iji ịhụnanya na-enye ụmụ ha ọzụzụ n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a nwere peeji 192, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị.

□ Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.