Asụsụ—Ihe Njikọ na Ihe Mgbochi nke Nkwurịta Okwu
Asụsụ—Ihe Njikọ na Ihe Mgbochi nke Nkwurịta Okwu
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA MEXICO
“Ọ dịghị akụkọ ihe mere eme pụrụ ime ka anyị mata kpọmkwem mgbanwe ndị metụtara otu ndị, ọdịnala na nkwenkwe nakwa mmetụta ha, dị ka inyocha asụsụ ha.”—MARTÍN ALONSO.
N’AKỤKỌ ihe mere eme nile, asụsụ—ebe ọ malitere, ndịrịta iche ya, na ọdịdị ya nke na-agbanwe agbanwe—adọrọwo mmasị ndị ọkà mmụta. N’ezie, mmasị ha nwere n’ebe ọ dị adịgidewo—dị nnọọ ka ọ dị n’ebe ihe ka ọtụtụ n’ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme dị—site n’enyemaka asụsụ n’onwe ya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na asụsụ bụ ihe bụ́ isi mmadụ na-eji enwe nkwurịta okwu.
Ndị ọkà mmụta asụsụ ụfọdụ na-ekwu na a na-asụ ihe dị ka asụsụ 6,000 ma ọ bụ karịa n’ụwa ugbu a, n’agụnyeghị ire okwu dị iche iche. Asụsụ ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ndị mmadụ na-asụ bụ Mandarin Chinese, nke nde mmadụ 800 na-asụ. Asụsụ anọ ndị ọzọ bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ kasị ukwuu nke ndị mmadụ na-asụ, bụ́ ndị na-adịchaghị n’usoro a, bụ Bekee, Spanish, Hindi, na Bengali.
Otú ọ dị, gịnị na-eme mgbe ndị nwere ọdịbendị dịrịtara iche, nweekwa asụsụ dịrịtara iche, zutere ibe ha na mberede? N’aka nke ọzọ, olee otú nnọpụiche nke ìgwè dị iche iche na-esi emetụta asụsụ ha? Ka anyị lee otú ihe njikọ—nakwa ihe mgbochi—nke nkwurịta okwu na-esi amalite.
Asụsụ A Gwara Ọgwa, Asụsụ Mba, Asụsụ Bụ́ Isi
Ịchị mba ọzọ, mba na mba ịzụkọrịta ahịa, na ọbụna ịnọ n’ogige ịta ahụhụ emewo ka ndị mmadụ hụ mkpa ọ dị ịkwụsị enweghị nkwurịta okwu nke enweghị otu asụsụ na-akpata. N’ihi ya ha malitere ịsụ otu ụdị asụsụ a gwagburu agwagbu,
ma ọ bụ nke e mere ka ọ dị mfe. Ha wepụrụ mkpụrụ okwu ndị siri ike, jiri ọnụ ọgụgụ ka nta nke mkpụrụ okwu na-eme ihe nanị n’ihe ndị ha nwekọrọ mmasị na ha. E si otú a malite ịsụ asụsụ a gwara ọgwa. Asụsụ a gwara ọgwa, n’agbanyeghị na a gwagburu ya agwagbu, bụ asụsụ nwere ọdịdị nke ya. Ma ọ bụrụ na e nwekwaghị mkpa mere e ji malite ịsụ ya, ọ pụrụ ịnwụ.Mgbe asụsụ a gwara ọgwa ghọrọ asụsụ otu ndị na-asụkarị, a na-etinye ya mkpụrụ okwu ndị ọzọ ma hazigharịa otú e si asụ ya. Ọ na-esi otú a ghọọ asụsụ mba. N’adịghị ka asụsụ a gwara ọgwa, asụsụ mba na-egosipụta ọdịbendị nke otu ndị. Taa, n’ụwa, a na-asụ ọtụtụ asụsụ a gwara ọgwa nakwa asụsụ mba—ndị dabeere n’asụsụ Bekee, French, Portuguese, Swahili, na n’asụsụ ndị ọzọ. Ụfọdụ aghọwo ọbụna asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ n’otu mba, dị ka asụsụ Tok Pisin a na-asụ na Papua New Guinea na asụsụ Bislama a na-asụ na Vanuatu.
Ihe njikọ ndị ọzọ na-akwalite nkwurịta okwu bụ asụsụ ndị bụ́ isi. Asụsụ bụ́ isi bụ otu asụsụ nke ìgwè dị iche iche bụ́ ndị nwegasịrị asụsụ nke ha, na-asụ. Dị ka ihe atụ, na Central African Republic, ndị na-asụ asụsụ dịgasị iche ná mba ahụ pụrụ ikwurịta okwu n’asụsụ Sango. Asụsụ Bekee na French bụ asụsụ ndị nnọchianya mba dị iche iche na-asụ dị ka asụsụ bụ́ isi. Asụsụ a gwara ọgwa bụ asụsụ bụ́ isi, asụsụ mba pụkwara ịbụ.
N’ógbè dị iche iche dị n’ime otu mba, a pụrụ inwe ụdị dị iche nke asụsụ a na-asụ, bụ́ ndị a na-akpọ ire okwu. Ka otu ógbè na-anọpụ iche karị, otú ahụ ka ihe ndị mere ka ha pụọ iche pụrụ ịpụta ìhè karị. Ka oge na-aga, ire okwu ụfọdụ na-abịa dị nnọọ iche n’asụsụ ógbè ahụ nke na ha na-aghọ asụsụ ọzọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ dịghị
adịrị ndị ọkà mmụta asụsụ mfe ịmata ọdịiche dị n’etiti asụsụ na ire okwu. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na asụsụ na-agbanwe mgbe nile, mgbe ụfọdụ ire okwu na-akwụsị ịdị, ụfọdụ ọdịbendị ha esorokwa ha kwụsị ịdị.Asụsụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. (Ọpụpụ 4:11) Ụzọ na-akpali akpali nke asụsụ na-esi agbanwe na-egosi otú onyinye a si bụrụ nke a pụrụ ịgwagbu agwagbu. Anyị pụkwara ịmụta site n’asụsụ na ọ dịghị otu ìgwè mmadụ ka ibe ya mma, n’ihi na e nweghị ihe dị ka asụsụ na-adịghị mma. Dị nnọọ ka ọ dị n’ihe banyere onyinye ndị ọzọ Chineke nyere, asụsụ rutere mmadụ nile aka, n’agbanyeghị ihe bụ ọdịbendị ha ma ọ bụ ebe ha bi. Eri oge gboo, asụsụ ndị mmadụ nile na-asụ zuru nnọọ ezu nke na ha pụrụ imezu nzube e ji malite ịsụ ha. Nke ọ bụla n’ime ha kwesịrị ka a kwanyere ya ùgwù, n’agbanyeghị mmadụ ole na-asụ ya.
Ihe Omume na Mmekọrịta Ndị Kwalitere Asụsụ
Àgwà ihe a kpọrọ mmadụ nke iso ndị ọzọ na-akpakọrịta na-apụta ìhè n’asụsụ. N’ihi ya, mgbe ndị nwere ọdịbendị dịrịtara iche zutere—nke na-eme ọtụtụ mgbe—asụsụ nke ndị ahụ na-eme ka ihe àmà e nwere na ha zutere dịgide ruo ọtụtụ ọgbọ.
Dị ka ihe atụ, ọtụtụ mkpụrụ okwu Arabic dị n’asụsụ Spanish, bụ́ nke e weere na ọ bụ Latin e mezigharịrị emezigharị, nọgidere na-enye ihe àmà nke mmeri ndị Alakụba merịrị ókèala Spain na narị afọ nke asatọ. A pụkwara ịhụ mmetụta asụsụ Grik, French, Bekee, na asụsụ ndị ọzọ nweworo n’asụsụ Spanish. Ọzọkwa, mmetụta nke ndị bi n’America n’oge ochie ka na-apụta ìhè n’asụsụ Spanish a na-asụ na kọntinent ahụ. Dị ka ihe atụ, asụsụ Spanish a na-asụ n’ebe ahụ nwere ọtụtụ mkpụrụ okwu ndị e nwetara na Nahuatl bụ́ asụsụ ndị Aztec nke Ebe Etiti Kọntinent America.
Dị nnọọ ka asụsụ ala nna mmadụ na-eme ka a mata mba na ọbụna ógbè onye ahụ si, asụsụ a na-asụ pụrụ ime ka a mata òtù mmadụ so na ya, dị ka ọrụ, aka ọrụ, òtù obodo na nke egwuregwu, ma ọ bụ ọbụna òtù ndị omempụ. Ha dị ọtụtụ. Ndị ọkà mmụta asụsụ na-akpọ ụdị asụsụ ndị a dị iche okwu ndị ụfọdụ ji eme ihe ma ọ bụ asụsụ òtù ma ọ bụ ọbụna mgbe ụfọdụ, ire okwu.
Otú ọ dị, mgbe e nwere ibu iro n’etiti mba dị iche iche nakwa agbụrụ ma ọ bụ obodo dị iche iche, asụsụ adịghịzi abụ ihe njikọ. Ọ pụrụ ịghọ ihe mgbochi na-ekewakwu ndị mmadụ.
Ọdịnihu nke Asụsụ
Nkwurịta okwu bụ ihe dị mgbagwoju anya. N’otu akụkụ, omume oge a na-elekwasị anya n’iwepụ ihe mgbochi bụ́ asụsụ, karịsịa n’ihi ụlọ ọrụ mgbasa ozi. Dị ka Encyclopædia Britannica si kwuo, ugbu a 1 onye n’ime mmadụ 7 na-asụ Bekee dị ka asụsụ mbụ ma ọ bụ dị ka nke abụọ. N’ihi ya, ọ bụ asụsụ bụ́ isi nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ na-asụ n’ụwa. Ọsụsụ ndị mmadụ na-asụ ya emewo ka ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu na-enwe nkwurịta okwu ma mee ka a na-enyerịta ihe ọmụma bara uru.
N’aka nke ọzọ, ihe mgbochi bụ́ asụsụ esowo kpalite nkewa, ịkpọasị, na agha. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ nile na-asụ otu asụsụ, . . . mba dị iche iche ga na-emekọ ihe ọnụ karị.” Otú ọ dị, imekọ ihe ọnụ dị otú ahụ ga-achọ oké mgbanwe karịrị nnọọ nanị ịsụ asụsụ bụ́ isi. Ọ bụ nanị Onye Okike nwere amamihe nke kere asụsụ pụrụ ime ka mmadụ nile na-asụ otu asụsụ.
Bible, bụ́ isi ihe Chineke na-esi na ya agwa ụmụ mmadụ okwu, na-egosi n’ụzọ doro anya na Chineke ga-ekpochapụ ajọ usoro ihe dị ugbu a n’oge na-adịghị anya ma jiri ọchịchị eluigwe dochie ya—Alaeze ya. (Daniel 2:44) Ọchịchị ahụ ga-eme ka ụmụ mmadụ dịrị n’otu n’ime usoro ihe ọhụrụ nke udo na ezi omume n’ụwa a.—Matiu 6:9, 10; 2 Pita 3:10-13.
Ọbụnadị ugbu a, asụsụ ime mmụọ dị ọcha—eziokwu banyere Jehova Chineke na nzube ya—na-eme ka ọtụtụ nde ndị mmadụ bụ́ ndị nwere asụsụ dị iche iche, ndị si mba dị iche iche, na ndị nọbu n’okpukpe dị iche iche dịrị n’otu. (Zefanaịa 3:9) N’ihi ya, o yiri ihe ezi uche dị na ya na n’ụwa ọhụrụ ya, Chineke ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ dịkwuo n’otu site n’inye mmadụ nile otu asụsụ, na-emegharị ihe o mere na Bebel.
[Igbe dị na peeji nke 10]
Ebe Asụsụ Dị Iche Iche Malitere
Onye Okike maara ihe nile, bụ́ Jehova Chineke, ejiriwo asụsụ mee ihe n’eluigwe, nke bụ́ ógbè ndị bụ́ mmụọ. (Job 1:6-12; 1 Ndị Kọrint 13:1) Mgbe o kere ụmụ mmadụ, ọ kụnyere n’ime ha ìgwè okwu na ikike ịmụba ya. Ọ dịghị ihe àmà na-egosi na e nwere asụsụ ndị mgbe ochie nke ihe mejupụtara ya bụ ibe ubé. N’ụzọ megidere nke ahụ, tụlee ihe Encyclopædia Britannica na-akọwa banyere asụsụ Sumerian, bụ́ asụsụ kasị ochie a ma ama bụ́ nke a na-ede ede: “Ngwaa nke asụsụ Sumerian, na . . . nganihu, ndịnetiti, na nsonazụ ya dị iche iche, na-egosi na ọ dị mgbagwoju anya.”
N’ihe dị ka narị afọ nke 20 T.O.A., n’ụzọ megidere iwu Chineke nke bụ́ ka a gbasaa ma “jupụta ụwa,” ụmụ mmadụ mere mgbalị ịchị mmadụ nile n’Ala Dị Larịị nke Shaịna, na Mesọpotemia ma malite iwu Ụlọ Elu okpukpe nke Bebel. Ndịrịta iche nke asụsụ malitere mgbe Chineke ghagburu otu asụsụ ha na-asụ, mebie ajọ atụmatụ ha dị ize ndụ.—Jenesis 1:28; 11:1-9.
Ihe ndekọ Bible ekwughị na asụsụ nile sitere na nke mbụ ahụ. Na Shaịna, Chineke mere ka e nwee ọtụtụ ìgwè okwu na ụzọ iche echiche ndị ọhụrụ, na-akpata ndịrịta iche nke asụsụ. N’ihi ya, mgbalị ndị a na-eme iji mata asụsụ e si nweta asụsụ ndị ọzọ nile enwebeghị isi.
[Foto dị na peeji nke 10]
Na Bebel, Chineke ghagburu asụsụ ụmụ mmadụ na-enupụ isi