Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eziokwu E Zochiri Ruo Afọ 50—n’Ihi Gịnị?

Eziokwu E Zochiri Ruo Afọ 50—n’Ihi Gịnị?

Eziokwu E Zochiri Ruo Afọ 50—n’Ihi Gịnị?

Rum bụ ntakịrị àgwàetiti nke Hebrides Dị n’Ime bụ́ nke dịpụrụ adịpụ site n’ụsọ oké osimiri ọdịda anyanwụ Scotland. N’ihe dị ka afọ 70 gara aga, onye nwe ya nyere ọkà mmụta ihe ọkụkụ bụ́ John Heslop Harrison, bụ́

prọfesọ na mahadum nakwa onye so na Royal Society nke Britain bụ́ nke a na-akwanyere ùgwù ikike inyocha ndụ ihe ọkụkụ ndị dị na ya.

N’afọ ndị sochirinụ, Harrison kọrọ na ya chọpụtara ọtụtụ ụdị ihe ọkụkụ ndị pụrụ iche n’ebe ahụ, bụ́ ndị a hụrụ na-eto nanị n’ebe ndịda dị ọtụtụ narị kilomita. E toro Harrison nke ukwuu, nchọpụta ya mekwuru nnọọ ka a na-enye ya nsọpụrụ. Ma ka ọ na-achọpụtakwu ihe ọkụkụ, otú ahụ ka ndị ọkà mmụta ihe ọkụkụ na-enwekwu obi abụọ.

Na 1948, John Raven, bụ́ ọkà mmụta ihe ọkụkụ na-anụ ọkụ n’obi, nke na-akụzi ihe odide ndị Gris na ndị Rom oge ochie na Cambridge, nakweere ihe ịma aka nke ime nnyocha. Ma e bipụtaghị ihe ndị ọ chọpụtara. Kama nke ahụ, e zochiri ya, ọ bụ nanị na 1999 ka e kpughere ihe ndị ọ chọpụtara. N’ihi gịnị? N’ihi na Raven chọpụtara na Harrison bụ onye wayo. Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kọọ, a kụrụ ihe ọkụkụ ndị ahụ n’ebe ọzọ ma wefeta ha na Rum na nzuzo.

Raven nwere ihe ọmụma ebumpụta ụwa banyere ihe ọkụkụ ndị dị n’ebe ha pụrụ ito, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ hụrụ n’ime ọtụtụ mkpọrọgwụ nke ihe ọkụkụ ndị Harrison “chọpụtara,” ahịhịa ndị juru n’England bụ́ ndị na-adịkebeghị na Rum. Ihe ọkụkụ ndị ọzọ bụ ndị ụmụ ahụhụ ndị a kọrọ na a hụrụ n’ebe abụọ nanị na Britain riri—otu n’ime ebe ndị ahụ bụ n’ubi ihe ọkụkụ Harrison dị n’England. E nwetara ihe àmà ọzọ na mkpọrọgwụ nke otu ihe ọkụkụ, bụ́ nke nwere ụmụ iberibe nkume quartz—nke na-abụtụghịdị quartz na-adị na Rum.

A ka nwekwara ihe ndị ọzọ. A chọpụtara na ihe ndị Harrison kwuru banyere urukurubụba na ébé bụ ụgha. Akwụkwọ bụ́ The Sunday Telegraph Magazine kwuru na otu onye bi na Rum kwuru, sị: “Prọfesọ ahụ zochiri ihe ụfọdụ n’onwe ya—urukurubụba ma ọ bụ ihe ọkụkụ—iji chọpụta ha n’afọ ọ bụla.” N’ihi ya, gịnị mere na e kpugheghị ihe Harrison mere?

Onye nchọpụta bụ́ Karl Sabbagh kwubiri na mkpebi e mere ịghara ime ihe, bụ obiọma e mere iji chebe ezinụlọ Harrison, ọ ga-abụkwa n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na Harrison bụ nwoke siri ike, nke dị ize ndụ ịma ya aka. Sabbagh kwukwara na ikpughe ihe o mere “gaara ewetara nkà mmụta ihe ọkụkụ dum aha ọjọọ.”