Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere I Ji Kwesị Izere Mgbaasị

Ihe Mere I Ji Kwesị Izere Mgbaasị

Ihe Mere I Ji Kwesị Izere Mgbaasị

ỌBỤRỤ na a kụziiri gị na ụdị ụfọdụ nke mgbaasị bụ ụzọ isi soro ezigbo ndị mmụọ kwurịta okwu, ọ pụrụ iju gị anya ma ị mata ihe Bible na-ekwu banyere mgbaasị. Dị ka ihe atụ, ọ na-ekwu, sị: “Unu echela ndị na-ajụ mmụọ ihe ihu, unu echekwala ndị dibịa afa ihu; unu achọpụtala ha, iwere ha merụọ onwe unu.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.)—Levitikọs 19:31; 20:6, 27.

N’ezie, Bible na-akọwa onye na-eme mgbaasị dị ka “ihe arụ [n’anya] Jehova.” (Deuterọnọmi 18:11, 12) N’ihi gịnị? Ilerukwu ihe Bible na-ekwu banyere otu akụkụ bụ́ isi nke mgbaasị anya—iso ndị nwụrụ anwụ ekwurịta okwu, nke a na-ekwu na ọ na-eme eme—ga-aza ajụjụ ahụ.

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Dị Ndụ?

N’adịghị ka ihe ọtụtụ mmadụ na-eche, Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-akụzi na ọ gaghị ekwe ụmụ mmadụ omume isoro ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ kwurịta okwu. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-eso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu, ndị nwụrụ anwụ aghaghị ịdị ndụ n’ezie. Ọ ghaghị ịdị akụkụ ha nke na-adị ndụ mgbe ha nwụsịrị. Ụfọdụ ndị na-ekwu na mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?

Ihe ndekọ Bible banyere otú e si kee mmadụ na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ̀ bụ na nke a adịghị egosi na onye ahụ n’onwe ya bụ mkpụrụ obi nakwa na o nweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-adịgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị? N’ezie, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị na [Sheol, NW],” ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Eklisiastis 9:5, 10.

Ya mere dị ka Bible si kwuo, mkpụrụ obi abụghị ihe na-adị ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị nakwa ihe ndị dị ndụ pụrụ imesị soro kwurịta okwu. Ihe na-esonụ bụ ihe atụ abụọ nke ndị ọkà mmụta Bible a na-akwanyere ùgwù, bụ́ ndị kwubiworo na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. Ọkà mmụta okpukpe si Canada bụ́ Clark H. Pinnock kwuru, sị: “Echiche a [bụ́ na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ] emetụtawo nkà mmụta okpukpe eri ogologo oge, ma ọ dịghị na Bible. Bible adịghị akụzi anwụghị anwụ e bu pụta ụwa nke mkpụrụ obi.” N’otu aka ahụ, ọkà mmụta si Britain bụ́ John R. W. Stott kwuru, sị: “Anwụghị anwụ—nke pụtakwara enweghị mbibi—nke mkpụrụ obi bụ echiche ndị Gris ọ bụghị nke Bible.”

Ka o sina dị, ndị mmadụ na-enweta ozi ma na-anụ olu ndị yiri nke ndị nwụrụ anwụ. Oleezi ndị na-ekwu okwu ndị ahụ?

Hà So Ole Ndị Ekwurịta Okwu?

Bible na-ekwu na otu onye bụ́ mmụọ a na-adịghị ahụ anya ji agwọ, dị nnọọ ka ọkà n’ịtụgharị ụda olu na-eji nwa bebi eme ihe, gwa nwanyị mbụ, bụ́ Iv, okwu ma mee ka o nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:1-5) Bible na-akpọ onye a bụ́ mmụọ, ma ọ bụ mmụọ ozi, “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Onye ahụ, bụ́ Setan, nwere ihe ịga nke ọma n’ịrafu ndị mmụọ ozi ndị ọzọ inupụ isi. (Jud 6) A na-akpọ ndị ajọ mmụọ ozi a ndị mmụọ ọjọọ, ha bụkwa ndị iro Chineke.

Bible na-egosi na ndị mmụọ ọjọọ nwere ike nke iduhie ndị mmadụ. (Luk 8:26-34) Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na Iwu Chineke na-ekwu, sị: “A gaghị ahụta n’etiti gị onye . . . na-ajụ mmụọ ihe, ma ọ bụ dibịa afa, ma ọ bụ onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe. N’ihi na ihe arụ [n’anya] Jehova ka onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ.” (Deuterọnọmi 18:10-12) Olee ihe ize ndụ ndị dị n’ileghara iwu a anya?

Ahụmahụ mere eme Eze Sọl nke Israel oge ochie nwere na-aza ajụjụ ahụ. N’ihi ịtụ ndị iro ya egwu, Eze Sọl chọgara onye na-ajụ ndị mmụọ ase. Ọ gwara ya ka ọ kpọọ Samuel onye amụma nwụworo anwụ. Mgbe ọ nụrụ otú onye ahụ na-ajụ ndị mmụọ ase si kọwaa otu agadi nwoke, Sọl chere na onyinyo mmụọ a bụ Samuel. Gịnịkwa ka ọ gwara Sọl? A ga-enye Israel n’aka ndị iro ha, Sọl na ụmụ ya ndị ikom ga-anọnyere “Samuel,” nke na-egosi na ha ga-anwụ. (1 Samuel 28:4-19) Olee otú Chineke si meghachi omume ná mkpebi Sọl mere ijekwuru onye na-ajụ mmụọ ase? Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “Sọl wee nwụọ n’ihi mmekpu ya . . . ọzọkwa, n’ihi na ọ jụrụ ase n’aka onye nwere mmụọ ọ na-ajụ ihe, iji ya jụọ ase.” (1 Ihe E Mere 10:13) Lee nnukwu ihe o furu ya!

N’otu aka ahụ taa, ndị na-etinye aka ná mgbaasị na-etinye onwe ha n’oké ihe ize ndụ. Bible na-adọ aka ná ntị na “ndị na-eme mgbaasị” ga-anwụ “ọnwụ nke abụọ ahụ [ma ọ bụ nke ebighị ebi].” (Mkpughe 21:8; 22:15, NW) Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ihe amamihe dị na ya ime bụ́ nke na-azọpụta ndụ bụ izere mgbaasị n’ụdị ya nile.

Ụzọ Isi Guzogide Ndị Ajọ Mmụọ

Gịnị ma ọ bụrụ na i tinyeworị aka ná mgbaasị? Mgbe ahụ ị ga-eme nke ọma ime ihe ozugbo iji chebe onwe gị na ezinụlọ gị ka ndị ajọ mmụọ ghara imerụ unu ahụ. Ihe ndị dị aṅaa ka ị ga-eme? Iji maa atụ: Olee otú mmadụ na-esi echebe ụlọ ya na ezinụlọ ya pụọ n’aka ụmụ ahụhụ? Mgbe o gbusịrị ha, ọ ga-ewepụ ihe ndị na-adọta ụmụ ahụhụ ahụ n’ụlọ ya. Ọ ga-emechi mgbawa ndị dị n’ụlọ ya ma mezikwuo mgbidi ya iji mee ka ụmụ ahụhụ ndị ahụ ghara ịbatakwa n’ụlọ ya, ọ bụrụkwa na nsogbu ahụhụ ahụ na-enye ya adịgide, ọ pụrụ ịrịọ ndị ọzọ ka ha nyere ya aka igbu ha.

Ime ihe yiri nke ahụ pụrụ inyere gị aka iguzogide ndị ajọ mmụọ na inwere onwe gị pụọ n’aka ha. Tụlee ihe nlereanya nke ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ n’Efesọs bụ́ ndị na-eme mgbaasị tupu ha ghọọ ndị Kraịst. Mgbe ha kpebisịrị inwere onwe ha pụọ ná mgbaasị, ha mere ụzọ ihe atọ iji chebe onwe ha pụọ ná nsogbu yiri nke ụmụ ahụhụ bụ́ nke ndị ajọ mmụọ na-enye. Gịnị ka ha mere?

Nzọụkwụ Mbu

Bible na-akọwa, sị: “Ọtụtụ n’ime ndị na-eme mgbaasị kpokọtara akwụkwọ ha, rechapụ ha ọkụ n’ihu ọha mmadụ.” (Ọrụ 19:19, NW) Site n’ibibi akwụkwọ ha ji ajụ ndị mmụọ ase, ndị Kraịst ọhụrụ ahụ setịpụụrụ ndị nile chọrọ iguzogide ndị ajọ mmụọ taa ihe nlereanya. Bibie ihe nile metụtara mgbaasị. Nke a ga-agụnye akwụkwọ nile, magazin, akwụkwọ ndị na-atọ ọchị, vidio, akwụkwọ ịma ọkwa, ihe ọmụma si na kọmputa, na egwú bụ́ ndị na-enye echiche mgbaasị, nakwa ọgwụ nchebe ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a na-eyi maka “nchebe.”—Deuterọnọmi 7:25, 26; 1 Ndị Kọrint 10:21.

Otu nwoke nọ n’ebe Ndịda America bụ́ onye mikpuworo onwe ya ná mgbaasị eri ọtụtụ iri afọ ṅara ntị na ndụmọdụ a dị n’Akwụkwọ Nsọ. “Otu ụbọchị,” ka ọ na-echeta, “achịkọtara m ngwongwo m nile metụtara mgbaasị n’ihu ụlọ m ma were anyụike bibie ha.” Mgbe ahụ o suru ihe ahụ nile ọkụ ruo mgbe o nweghị nke fọrọnụ. Mgbe nke ahụ gasịrị o nwere ọganihu ime mmụọ dị mma, n’oge na-adịghịkwa anya ọ ghọrọ onye ozi na-anụ ọkụ n’obi n’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova.

Ma, nzọụkwụ mbụ ahụ ezughị. N’ihi gịnị? Ọbụna afọ ole na ole mgbe ndị Kraịst ahụ nọ n’Efesọs bibisịrị akwụkwọ ndị ha ji eme majik, Pọl onyeozi dere, sị: ‘ịgba mgba anyị bụ imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe.’ (Ndị Efesọs 6:12) Ike agwụbeghị ndị mmụọ ọjọọ. Ha ka nọ na-achọ ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma. Gịnị ọzọ dị ndị Kraịst ahụ mkpa ime?

Nzọụkwụ nke Abụọ

Pọl gbara Ndị Efesọs nke narị afọ mbụ ume, sị: “Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu wee pụ iguzogide nzupụta aghụghọ nile nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11, nkọwa ala ala peeji nke NW) Ndụmọdụ ahụ ka dị irè taa. Dị nnọọ ka onye na-agbalị igbuchapụ ụmụ ahụhụ dị n’ụlọ ya, onye Kraịst aghaghị iwusikwu ihe nchebe ya yiri mgbidi ike iji chebe onwe ya pụọ n’aka ndị ajọ mmụọ. Gịnị ka nzọụkwụ nke abụọ a na-agụnye?

“Tụkwasị ihe nile ndị a,” ka Pọl na-eme ka ọ pụta ìhè, “welienụ ọta nke bụ okwukwe, nke unu ga-apụ imenyụ akụ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ n’ime ya.” (Ndị Efesọs 6:16, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ọta dị oké mkpa. Ka okwukwe gị na-esi ike karị, otú ahụ ka nguzogide ị na-eguzogide ndị ajọ mmụọ ga-esi ike karị.—Matiu 17:20.

Oleezi otú ị pụrụ isi wusie ihe nchebe gị ike? Site n’ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible gị. N’ụzọ dị aṅaa ka ọmụmụ Bible si emetụta okwukwe? Dị nnọọ ka ịkwụsi ike nke mgbidi na-adabere n’otú ntọala ya siruru n’ike, otú ahụ ka ịkwụsi ike nke okwukwe mmadụ si adabere n’ụzọ dị ukwuu n’otú ntọala ya siruru n’ike. Gịnị bụ ntọala ahụ?

Ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Okwukwe si n’ọnụnụ pụta, ma ọnụnụ ahụ sitere n’okwu Kraịst.” (Ndị Rom 10:17) A na-akpọ gị òkù ka ị rịọ otu n’ime Ndịàmà Jehova ka o duziere gị ọmụmụ Bible n’efu, n’oge na n’ebe dị gị mma. Ọmụmụ ihe dị otú ahụ ga-ewusi okwukwe gị ike. (Ndị Rom 1:11, 12; Ndị Kọlọsi 2:6, 7) Gịnị ka ọ ga-arụpụta? N’oge na-adịghị anya okwukwe gị ga-aghọ ihe nchebe siri ike nke ga-arụ ọrụ dị ka ọta imegide ọrụ nke ndị ajọ mmụọ.—Abụ Ọma 91:4; 1 Jọn 5:5.

Gịnị bụ nzọụkwụ nke atọ ndị Kraịst ahụ nọ n’Efesọs weere?

Nzọụkwụ nke Atọ

Ndị ọhụrụ ahụ kwere ekwe nọ n’Efesọs oge ochie mere ihe iji guzogide ndị ajọ mmụọ, ma ndị Kraịst ahụ ka bi n’obodo nke jupụtara n’ofufe ndị mmụọ ọjọọ. Inwekwu nchebe dị ha mkpa. Ya mere mgbe Pọl onyeozi degaara ndị kwere ekwe ibe ya akwụkwọ, ọ gwara ha ihe ha ga-eme, sị: “Sitekwanụ n’ekpere na arịrịọ nile na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime Mmụọ Nsọ, werekwa ịnọgidesi ike na ịrịọ arịrịọ nile banyere ndị nsọ nile na-amụ anya ime nke a.”—Ndị Efesọs 6:18.

N’ezie, ikpesi ekpere ike mgbe nile maka nchebe Jehova bụ, ka bụrụkwa nzọụkwụ siri ike ma dị mkpa maka nchebe pụọ n’aka ndị ajọ mmụọ. Ọ na-enye nkasi obi ịmara na Jehova ga-aza arịrịọ gị sitere n’ala ala obi site n’inye gị nchebe ya, nke na-agụnye nkwado nke ndị mmụọ ozi ya. (Abụ Ọma 34:7; 91:2, 3, 11, 14; 145:19) Ya mere, ọ dị oké mkpa ịnọgide na-ekpegara Chineke ekpere, sị: “Dọpụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.”—Matiu 6:13; 1 Jọn 5:18, 19.

Antônio, onye bụbu onye na-ajụ ndị mmụọ ase na Brazil, bịara ghọta abamuru nke ekpere. Mgbe o kweresịrị ka e duziere ya ọmụmụ Bible ma mara aha Chineke, bụ́ Jehova, ọ malitere ikpegara Jehova Chineke ekpere n’ụzọ siri ike maka enyemaka iji nwere onwe ya pụọ ná mgbaasị. Ka ọ na-echetaghachi ihe ndị gara aga, ọ na-ekwu, sị: “Ikpegara Jehova ekpere abụrụwo ebe mgbaba nye mụ na ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị ndị ajọ mmụọ ji mere ohu n’oge gara aga.”—Ilu 18:10.

Ị Pụrụ Ime Ya

Ọ dị mkpa mgbe ị matasịrị Jehova, ka ị tụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu, rube isi n’ịbụisi ya nakwa n’iwu ya. Ọ bụrụ na i mee nke a, mgbe ị kpọkuru ya maka enyemaka, na-eji aha ya eme ihe, ọ ga-echebe gị. Antônio nwetara nchebe dị otú ahụ. Taa ọ bụ onye Kraịst bụ́ okenye n’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na São Paulo, o nwekwara ekele maka ịchọta eziokwu ahụ nke mere ka o nwere onwe ya.—Jọn 8:32.

Dị ka Antônio na ọtụtụ puku ndị ọzọ na-emebu mgbaasị bụ́ ndị na-ejere Jehova Chineke ozi ugbu a, ị pụrụ inwere onwe gị pụọ ná mgbaasị. Ya mere, bibie ihe ndị metụtara mgbaasị, wusie okwukwe gị ike site n’ọmụmụ Bible ma na-ekpe ekpere maka nchebe Jehova. Mee ihe ndị a—ndụ gị dabeere na ha!

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Dị ka Bible si kwuo, ndị dị ndụ apụghị iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu

[Foto dị na peeji nke 6]

1. Bibie ihe nile metụtara mgbaasị

[Foto dị na peeji nke 7]

2. Nọgide na-amụ Bible

[Foto dị na peeji nke 8]

3. Na-ekpesi ekpere ike mgbe nile