Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ụwa Pụrụ Iche

Dị ka ndị na-enyocha mbara igwe si kwuo, a nọgidewo na-achọpụta mbara ụwa ndị ọhụrụ ka ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, obere ịma jijiji—nke ike ndọda nke mbara ụwa kpatara―nke kpakpando dị anya, nke mbara ụwa dị iche iche na-agba gburugburu. Na 1999, e kwuru na e nwere mbara ụwa 28 dị otú ahụ bụ́ ndị na-esoghị n’usoro mbara igwe anyị. Ndị ọhụrụ e kwuru na a chọpụtara ha ka Jupiter ma ọ bụ karịa ya. Jupiter ji ihe dị ka okpukpu 318 bukarịa Ụwa n’ibu. Dị ka Jupiter, a na-eche na ihe mejupụtara mbara ụwa ndị ahụ bụ helium na hydrogen. N’ihi ebe mbara ụwa ndị ahụ na-eru ma ha na-agba kpakpando gburugburu, a na-ekwu na o yighị ka mbara ụwa ọ bụla ha ka ụwa ọ̀ ga-enwe ike ịdị ebe ha dị. Ọzọkwa, n’adịghị ka Ụwa nke dị nde kilomita 150 site n’anyanwụ ọ na-agba okirikiri, ha na-agba kpakpando ha gburugburu. N’ezie, otu ụzọ ịgba gburugburu nke otu mbara ụwa dị malite na nde kilomita 58 ruo nde kilomita 344 site na kpakpando ọ na-agba gburugburu. “Ọ malitela ido anya na e nwekebeghị ụzọ ịga gburugburu ndị a haziri nke ọma, ndị gara okirikiri dị ka anyị na-ahụ n’usoro mbara igwe anyị,” ka otu onye na-enyocha mbara igwe kwuru.

Iji Opi Aka Ekwurịta Okwu

A na-achọ ka ụmụaka na-aga akwụkwọ n’àgwàetiti Gomera, bụ́ otu n’ime àgwàetiti ndị dị na Canary Islands, mụta iji opi aka ekwurịta okwu nke ndị na-azụ atụrụ n’ebe ahụ jiworo mee ihe ruo ọtụtụ narị afọ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-akọ. N’ịbụ nke a malitere ịfụ na mbụ dị ka ụzọ isi soro onye nọ na ndagwurugwu ọzọ na-ekwurịta okwu n’ógbè ahụ jupụtara n’ugwu, silbo, ma ọ bụ opi aka nke Gomera, na-eji ụda ndị yiri nkeji okwu nke okwu ọnụ eme ihe. Ndị na-afụ ya na-etinye mkpịsị aka ha n’ọnụ ha iji gbanwee ụda ya, ha na-akwụkwụchi aka ha nke nta ka ụda ya wee gatee aka―ihe ruru kilomita atọ. N’ịbụ nke fọrọ nke nta ka a kwụsị ịfụ ya n’afọ ndị 1960, silbo amalitewo iwu ewu ọzọ, àgwàetiti ahụ na-enwezi ụbọchị ịfụ opi aka kwa afọ. Otú ọ dị, a kpaara ya ókè. “Ị pụrụ iji ya kwurịta okwu ma ị pụghị iji ya kwuo ọtụtụ ihe,” ka Juan Evaristo, bụ́ onye nduzi agụmakwụkwọ n’ógbè ahụ, kwuru.

Ụmụaka na Ụra

“Ndị mụrụ ụmụ aghaghị ịkpa ókè, ọ bụghị nanị n’oge ụmụaka ndị toruworo ogo ịga akwụkwọ ga-amụru anya kamakwa n’ihe ha pụrụ ime tupu ha alakpuo ụra,” ka magazin bụ́ Parents na-ekwu. “Ikiri TV, igwu egwuregwu kọmputa na vidio na ịwagharị n’Internet bụ ihe omume ndị na-akpali akpali, bụ́ ndị na-eme ka uche ụmụaka nọgide na-arụ ọrụ gafee oge. Inwe ihe buru ibu ha ga-eme ma ha lọta akwụkwọ na-egbochi ha imecha ihe omume e nyere ha ime n’ụlọ n’oge.” Nnyocha na-egosi na ehighị ụra na-enwekarị mmetụta dị iche n’ahụ ụmụaka—ha na-aghọ ndị na-adịghị anọ jụụ na ndị na-akpa aghara, ebe ndị toworo eto na-ero ụra ma na-anọ jụụ. N’ihi ya, mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ, ụmụaka na-ehighị ụra nke ọma adịghị enwe ike itinye uche n’ihe, ịṅa ntị, na icheta ihe ha na-amụta, na ịrụta mgbakọ na mwepụ. Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ dị ndị mụrụ ụmụ mkpa iyi oge ụmụ ha ga-eji lakpuo ma were ya dị ka ihe mbụ—ọ bụghị ihe ha ga-eme mgbe ike gwụsịrị ha ma ọ bụ mgbe ha na-enwekwaghị ihe ha na-eme.

Ọrịa AIDS n’Ụwa Nile

Dị ka otu akụkọ ọhụrụ sitere n’aka òtù Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, n’ụwa nile “ihe karịrị nde mmadụ 50 ebutewo nje HIV-AIDS—nke ha ka ọnụ ọgụgụ ndị bi na United Kingdom—nde mmadụ 16 anwụwokwa,” ka The Globe and Mail nke Canada na-ekwu. “Nnyocha e mere ná mba Africa itoolu kpughere na ọnụ ọgụgụ ndị inyom ji pasent 20 karịa ndị ikom ebutewo ọrịa ahụ ugbu a” nakwa na “ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma ji ihe dị ka okpukpu ise yie ka ha ga-ebute HIV-AIDS karịa ụmụ okorobịa nọ n’afọ iri na ụma.” Peter Piot, bụ́ onye nduzi ukwu nke Ihe Omume E Jikọrọ Ọnụ nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka HIV/AIDS, na-akọwa ọnọdụ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe dị ka nke “na-amụba ngwa ngwa.” Akụkọ ahụ na-akọwa na “ọ̀tụ̀tụ̀ e ji ebute nje HIV n’ebe bụbu Soviet Union ejiriwo ihe karịrị okpukpu abụọ mụbaa n’afọ abụọ gara aga, nke bụ́ mmụba kasị ukwuu n’ụwa.” Ndị ọkachamara na-ekwu na ihe kpatara ya bụ mmụba n’isi n’akwara na-agbanye ọgwụ n’ahụ n’ógbè ahụ. N’ụwa nile ihe karịrị ọkara nke ndị butere HIV-AIDS “na-ebute ọrịa ahụ mgbe ha na-erule afọ 25, ha na-anwụkarịkwa tupu ha eruo afọ 35.”