Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oge Ò Ruwo Ịzụta Àkwà Ọhụrụ?

Oge Ò Ruwo Ịzụta Àkwà Ọhụrụ?

Oge Ò Ruwo Ịzụta Àkwà Ọhụrụ?

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Britain

Ị̀ bụ onye na-adịghị arahụkarị ụra n’abalị, na-atụgharị iji nweta ebe ga-eme ka ị tụsara ahụ, na-etetakwa n’ụtụtụ bụrụ onye ike gwụchara nke ahụ na-egbu mgbu? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ àkwà gị na-akpata nsobgu ndị ahụ.

NGWÁ ụlọ a pụrụ ịbụ enyi gị ma ọ bụ onye iro gị. Ọ bụrụ na i bi n’ala ebe e ji àkwà ehi ụra, ma eleghị anya ị ga-eji otu ụzọ n’ụzọ atọ nke afọ ndụ gị zuo ike n’elu àkwà gị, ma àkwà gị agaghị adịru mgbe ebighị ebi. Àkwà ị na-edina na ya ugbu a ọ̀ dị gị mma n’ahụ?

Àkwà Ọhụrụ Ọ̀ Dị Gị Mkpa?

Otu àkwà na-adị mma ruo ihe dị ka afọ iri. Onye buru ibu karị pụrụ idinaka àkwà ngwa ngwa karị. Burukwa n’uche na ihe ndị dị gị mkpa na ihe ndị ị na-ahọrọ na-agbanwe ka ị na-emekwu okenye. Iji kpebie ma àkwà ọhụrụ ọ̀ dị gị mkpa, jụọ onwe gị ajụjụ ndị a. ‘M̀ na-edinaji olu ma ọ bụ na-enwe azụ mgbu mgbe m tetara n’ụra? Àkwà m ọ̀ dịkarị ntakịrị? Spring ma ọ bụ ebe njikọ ya ọ̀ na-emetụ m n’ahụ? M̀ na-anụ ụda ma m tụgharịa? Mụ na onye mụ na ya dina ànyị na-adakwuru onwe anyị n’amaghị ama? Elu àkwà ahụ ọ̀ dị larịị ka o nwere ebe ka ibe ya elu? Ụkwụ ya na ihe mkpọre ya hà emebiela?’ Ihe ndị ị zara n’ajụjụ ndị a pụrụ inyere gị aka ikpebi ma oge ò ruwo ịzụ àkwà ọhụrụ.

Gịnị Ka E Ji Amata Àkwà Dị Mma?

Àkwà dị mma na-eme ka i nwee ntụsara ahụ ma i dinara ala, na-egbo mkpa gị kpọmkwem ma na-eme ka i nweta ihe ndị ị chọrọ. Ọtụtụ àkwà na-enwe matarasị na ihe a na-adọnye ya, ma matarasị bụ isi ihe na-eme ka ị tụsara ahụ. O nwere ihe dị iche iche mejupụtara ya. Nke mbụ bụ ákwà e ji kwachie ya, bụ́ nke na-ejikọta ihe nile. Ihe ọzọ na-esochizi ya bụ obere fom na-eme ka i dinara n’elu ihe dị nro nakwa nke na-amịkọrọ mmiri si n’ahụ. Nkebi nke atọ, bụ́ nke na-ejigide ma na-eme ka ọ kwụsie ike, na-enwekarị ígwè a hịkọrọ ahịkọ ma ọ bụ spring. E nwere ihe dị iche iche na-adị n’ala ya, ma dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụrụ na spring dị ọtụtụ n’ala ya, waya ndị e ji mee ha adịkwa okpotokpo, ọ ga-adị mma ibu mmadụ. Nke a na-akasị ahọrọ n’oge a bụ matarasị ndị e ji fom mee, ọ dịghị arọ ka nke spring dị n’ime ya.

Otú ọ dị, matarasị na-adị mma nanị ma ọ bụrụ na ya na elu àkwà kwekọrọ, karịsịa ma ọ bụrụ nke a rụrụ maka ya. A na-erekọtakarị ihe nile mejupụtara àkwà divan ọnụ, ma elu ya ma matarasị ya. Elu ya bụ́ nke sara mbara na-eme ka matarasị ya ghara ịdị na-adakpu n’ime, na-eme ka matarasị ahụ sie ike wee si otú a na-eme nnọọ ka ọ ghara imebi ngwa ngwa. Ọzọ bụ àkwà a kpara akpa. A na-ejikarị osisi akpa elu ya, ọ na-enwekwa oghere n’okpuru, na-eme ka ikuku na-ekusa matarasị ya na ya kwekọrọ. Mkpịsị osisi ndị siri ike na-eme ka elu àkwà ahụ sie ike, ebe mkpịsị osisi ndị na-esichaghị ike na-eme ka ọ ghara isicha ike.

Ịhọrọ Àkwà Kwesịrị Ekwesị

Gịnị ka i kwesịrị iburu n’uche mgbe ị na-azụ àkwà? Àkwà ndị ọzọ jiworo mee ihe ga-amịkọrọworị ọsụsọ ma nwee ụmụ irighiri ihe ndị si n’akpụkpọ ahụ, ọ pụkwara ijupụta n’igwu ndị pụrụ ime ka ahụ na-agbakasị mmadụ, kpata ụkwara ume ọkụ, ma ọ bụ ụ́gwọ̀. O nwekwara ike ghara iru ụkpụrụ ndị e setịpụrụ maka ahụ ike nakwa ndị na-egosi na ọ dịghị ize ndụ.

Tupu ị gawa ịzụ àkwà ọhụrụ, a na-atụ aro ka i buru ụzọ tụlee ihe ndị dị ka ọnụ ego ya, ihe banyere ahụ ike, ma ọ bụ otú àkwà ahụ ga-aha. Gbalịa iwepụta oge buru ibu ịga n’ụlọ ahịa ndị nwere aha ọma ma jụta ọtụtụ ihe ruo n’ókè i nwere ike banyere àkwà ma ọ bụ matarasị nke ọ bụla. Ebe ọ bụ na àkwà na-adakarị ọnụ, ekwela ka e mee ka i mee mkpebi n’echeghị echiche nke ọma.

Ọ pụrụ isiri gị ike karị ịhọrọ nke kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ike gwụchara gị. Yiri ákwà ndị ga-eme ka ahụ ruo gị ala. Emela ihere ịnwale àkwà. Yipụ kootu na akpụkpọ ụkwụ gị ma dinatụ n’àkwà nke ọ bụla ruo ọtụtụ minit. Nwalee ụzọ dị iche iche e si ehi ụra n’àkwà, na-elekwasị anya karịsịa n’otú ọ dị gị n’ubu, úkwù, na n’azụ.—Lee igbe dị n’okpuru.

Ilekọta Àkwà Gị

Ilekọta àkwà gị nke ọma ga-eme ka ọ dịtee aka. Gwa ndị na-ere ya ka ha tụọrọ gị aro ma wepụta oge iji gụọ ntụziaka ndị rụrụ ya nyere maka ilekọta ya. Mgbe i bulatara àkwà ọhụrụ gị n’ụlọ, wepụ ihe ndị e ji fụchie ya ngwa ngwa o kwere mee. Nke a ga-enye aka mee ka ọ ghara ịgba udè, bụ́ nke pụrụ ime ka o dee mmiri, maa ebu ma mebie. Ihe ndị na-esonụ bụ aro ole na ole ọzọ a tụrụ.

● Na-atụgharị matarasị ọhụrụ e ji spring mee kwa izu ma ọ bụ kwa izu abụọ n’ime ọnwa ole na ole mbụ mgbe a zụtasịrị ya nakwa kwa ọnwa atọ mgbe nke ahụ gasịrị. Nke a ga-eme ka ihe ndị dị ya n’ime ghara ịwụgharị awụgharị ma mee ka ọ ghara inwe ebe ga-ebu ụzọ mebie. Ọ bụrụ na ị na-enwe azụ mgbu, i kwesịrị ịtụle inwe matarasị e ji fom mee, ebe ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị adị mkpa ịtụgharị ya mgbe mgbe.

● Ya adịla mgbe ị ga-apịaji ma ọ bụ fụkọta matarasị. Iji mee ka ákwà e ji kwachie ya ghara ịdọka, jiri ebe ndị a na-ejide ya aka na-eme ihe nanị maka idozi ya edozi, ọ bụghị maka iji ha buru ya eburu.

● Kwa ụtụtụ, na-ekpughepụ ákwà ị na-eji ekpuchi àkwà gị ruo minit 20 ma ọ dịkarịa ala ka ikuku kusa àkwà gị ma mee ka ọ gbakọọ.

● Na-edebe matarasị gị ọcha site n’itinye ya n’ime ákwà mkpuchi a pụrụ ịsa mmiri. Na-eticha ma matarasị ma elu àkwà iji mee ka uzuzu ghara ịdị na ha, jirikwa ncha na mmiri na-asachapụ ozugbo ihe ọ bụla gburu ya ma ọ bụ nke a wụrụ na ya.

● Gbalịa ịghara ịdị na-anọdụ ala n’otu ebe n’ọnụ ọnụ matarasị ahụ mgbe nile. Ekwela ka ụmụaka ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ na-amakwasị n’elu àkwà ahụ.

Àkwà gị karịrị nnọọ ihe e ji ego zụọ. Ọ bụ ihe i ji ego zụọ maka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke afọ ndụ gị—bụ́ nke pụrụ imetụta ụzọ abụọ nke ọzọ n’ụzọ dị ukwuu. Ọ bụrụ na i jiri amamihe họrọ ma lekọta enyi ga-enyere gị aka, ọ ga-elekọta gị nke ọma.

[Igbe dị na peeji nke 20]

Olee Àkwà nke Dị Gị Mma n’Ahụ?

Ntụsara Ahụ na Nkwagide. Matarasị ekwesịghị isi ike ka osisi iji dị gị mma n’ahụ. N’ezie, a na-eche na àkwà siri oké ike pụrụ ime ka azụ mgbu ka njọ. Kwee ka ahụ gị họta ihe kasị ya mma. Dinara ma chewa ihu n’elu. Ọ bụrụ na ị pụrụ itinye aka gị nke ọma n’okokoro azụ gị, ọ bụrụkwa na ọ pụrụ ịdịrị gị mfe ịtụgharị, matarasị ahụ siri ike otú ga-adị gị mma n’ahụ. Matarasị ga-ebuli gị kwesịrị ikwe ka ọkpụkpụ azụ gị gbatịa agbatịa mgbe i jiri akụkụ gị dinara ala. Àkwà siri ike karị ga-adị onye buru ibu karị mkpa.

Otú Ọ Ga-aha. Họrọ àkwà ga-eme ka ị na-atụgharị otú ị chọrọ. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ga na-edina n’àkwà ahụ, buru n’uche na nke ọ bụla n’ime mmadụ abụọ toworo eto ga-edina n’àkwà a rụrụ maka mmadụ abụọ ga-enwe otu ohere ahụ nwa ọhụrụ nke dina n’àkwà ya na-enwe.

Matarasị na Àkwà Kwekọrọ na Ya. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, zụọ matarasị ya na àkwà ahụ kwekọrọ bụ́ ndị e mere iji mee ka ị tụsara ahụ na iji kwagide azụ gị. Àkwà ochie pụrụ imebi matarasị ọhụrụ ma mee ka ọ ghara ịnọru oge e mere ya ka ọ nọruo.

Ọnụ Ahịa Ya. Ị na-enwetakarị ihe ị kwụrụ ụgwọ ya, ya mere zụọ àkwà kasị mma ị pụrụ ịzụta.

Ohere. Ọ bụrụ na ohere adịghị n’ime ụlọ, a pụrụ ịtụle ịzụ àkwà a na-agbabewe n’ahụ ájá. Ụdị ọzọ a pụrụ ịzụ bụ futon, nke bụ́ cushion e ji owu mee, bụ́ nke na-adịghị egbu oge ịgbasa n’ala n’abalị. A pụkwara ire futon dị ka oche e ji emere àkwà, bụ́ nke a kpara akpa, a pụkwara ịgbasa agbasa.

Nsogbu Ahụ Ike. Ọ bụrụ na ị dịghị atụsara ahụ n’ụdị àkwà a na-ejikarị eme ihe, àkwà a pụrụ imegharị ọdịdị ya na-eme ka e nwee ike idina otú ọ bụla a chọrọ. Àkwà e ji plastic a wụnyere mmiri mee matarasị ya na-eme ka a tụsara ahụ nke ọma, ọ pụkwara inyere ndị nwere ọrịa ọkpụkpụ aka.

Ndị Ahụ Ha Na-adịghị Anabata Ihe Ụfọdụ. Ọ bụrụ na uzuzu na ihe ndị e tinyere n’ime matarasị adịghị ekwe ka ị tụsara ahụ, fiber aka mere ma ọ bụ fom pụrụ ịdị mma. E kwesịrị ịrịba ama na ihe ndị ahụ mmadụ na-adịghị anabata adịghị ejupụta n’àkwà e ji osisi kpaa elu ya ma ọ bụ n’àkwà e ji plastic a wụnyere mmiri mee matarasị ya.

Ndị Okenye. Jide n’aka na ọbọ ụkwụ gị pụrụ imetụ n’ala ma ị nọdụ n’ọnụ àkwà gị. Àkwà akụkụ ya siri ike ga-eme ka ọ dịrị gị mfe karị ịnọdụ na ibili n’àkwà.

[Igbe dị na peeji nke 21]

Aro Banyere Nchebe

▪ Na-eyi ákwà ụra ndị ọkụ na-apụghị ịgba ngwa ngwa.

▪ Hụ na e doziri ákwà a na-atọ n’elu àkwà edozi n’ebe dịpụrụ adịpụ site n’ọkụ ma ọ bụ n’ígwè na-eme ka ụlọ na-ekpo ọkụ.

▪ Na-enyocha blanket eletrik mgbe mgbe ma è nwere ebe ákwà ya dọkara adọka, mpịaji nke buru ibu, ebe ọkụ rere nakwa waya eletrik dọbiri adọbi. Ya adịkwala mgbe ị ga-eji blanket ahụ eme ihe ma ọ dịrị mmiri mmiri, kama hapụ ya ka o jiri aka ya gbakọọ. Adọkwasịla ihe ndị dị arọ n’àkwà ahụ mgbe a kwụnyere waya ọkụ nke blanket ahụ n’eletrik.

▪ Agbajula mmiri gbọrọ agbọ na karama e ji agbanye mmiri ọkụ, ejikwala ya na blanket eletrik eme ihe n’otu mgbe. Wepụ ya tupu nwatakịrị arịgote n’àkwà.

[Ihe Osise dị na peeji nke 21]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ihe mkpuchi

Iji eri achọ ya mma n’ụzọ dị obodobo

Iji eri achọ ya mma obere obere

Ijikọ ya ọnụ

Ibé ihe ndị e jikọrọ ọnụ

Ihe ndị ji ya

Fom

Spring ndị a pịajiri apịaji

Spring ndị a hịgọrọ gburugburu

Spring ndị a gbatịrị agbatị

[Ebe E Si Nweta Foto]

E sepụtaghachiri ya site n’ike a natara Kansụl Ihi Ụra

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

E sepụtaghachiri ya site n’ike a natara Kansụl Ihi Ụra