Okpete—Ahịhịa Kasịnụ n’Ahịhịa Nile
Okpete—Ahịhịa Kasịnụ n’Ahịhịa Nile
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’AUSTRALIA
GỊNỊ ka anyị ga-eme ma shuga adịghị? Ọ ga-abụ ikwubiga okwu ókè ikwu na ụwa ga-abịa ná njedebe ya—ma ọ ga-adị mkpa ka a gbanwee nnọọ ọtụtụ nri ma ọ bụrụ na shuga agakwaghị adị. Ee, taa n’akụkụ ka ukwuu n’ụwa, a na-eri shuga kwa ụbọchị, nke na-eme ka mmepụta a na-emepụta shuga bụrụ ọrụ zuru ụwa nile ọnụ.
Ọtụtụ nde mmadụ, site na Cuba ruo India, sitekwa na Brazil ruo Africa, na-akụ ma na-egbute okpete n’ubi. N’ezie, n’otu oge, ọrụ imepụta shuga nọ n’ọkwá nke mbụ dị ka ọrụ mmepụta kasị ukwuu nakwa nke kasị enye ego n’ụwa. A pụrụ ikwu na okpete emetụtawo ụwa n’ụzọ ọ bụ nanị ihe ọkụkụ ole na ole metụtaworo ya.
Ọ̀ ga-amasị gị ịmụtakwu ihe banyere ihe ọkụkụ a dị ịrịba ama? Ya bụrụ otú ahụ, sonyere anyị ná nleta anyị na-aga n’ógbè dị na Queensland, Australia, ebe a na-akụ okpete. Ọ bụ ezie na ebe a bụ nanị ebe na-emepụta okpete n’ókè na-adịchaghị ukwuu, ịrụ ọrụ ubi na usoro dị irè nke imepụta shuga emewo ka ọ bụrụ otu n’ime ndị kasị erepụ shuga n’ụwa.
Ileta Ógbè Okpete
Ikuku dị ebe a na-ekpo ọkụ, dịkwa udè. Anwụ nke ebe okpomọkụ a na-acha obosara ala jupụtara n’okpete kaworo aka. Nnukwu ígwè ọrụ nke yiri ụgbọala e ji ewe ọka wheat n’ubi ji nwayọọ nwayọọ na-agba n’etiti osisi okpete tochara ogologo, na-egbujisị ókpòrò ya n’usoro iwe ya n’ubi ma na-awụnye okpete ndị ahụ e gbujiri egbuji n’azụ obu ngwongwo nke ọ dọkpụ. N’oge na-adịghị anya, mmiri shuga esi n’okpete ahụ e gwepịaworo na-apụta, ísìsì ọma ana-esijukwa n’ikuku. Mmiri ụtọ ọma a nke sitere n’ahịhịa a dị ịrịba ama amalitewo njem ya site n’ubi gaa ná mkpọ shuga ahụ dị na tebụl gị.
N’oge na-adịbeghị anya, e ji aka dọlịrị gbutusịa okpete ndị a n’ebe a n’Australia dị ka a ka na-eme ya n’ọtuṭụ mba ebe a na-egbute okpete. Leedị ihe a na-eme ebe a. Ndị ọrụ ji aka na-egbutusị okpete. Ahịrị nke ndị na-egbutusị okpete, bụ́ ndị ọsụsọ na-agba, na-eji nwayọọ nwayọọ abanye n’ubi okpete ahụ. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ izi ezi yiri nke ndị agha, ndị ọrụ ahụ na-ejikọta ùkwù ókpòrò okpere ndị kwụ ọtọ n’otu aka wee dọlaa ha n’otu akụkụ iji mee ka úkwù ha pụta ìhè. Pịam, e gbujiela otu! Pịam, e gbujiela otu! Site n’iji aka dị ike nke na-eme gara gara, ndị ọrụ bu mma na-egbujisị ókpòrò ndị ahụ n’úkwù ha. Ka ha na-atụga ha n’akụkụ n’ahịrị kpakọrọ ọnụ, ha na-agafe n’úkwù okpete ọzọ. N’ụwa nile, ọnọdụ a ji nwayọọ nwayọọ na-agbanwe, ka ọtụtụ mba karị maliteworo usoro nke iji ígwè ọrụ eme ihe ugbu a.
Ihe mejupụtara ógbè a na-akọ okpete n’Australia bụ n’ụzọ bụ́ isi mbara ala dị n’ikperé mmiri dị ihe dị ka kilomita 2,100 n’ogologo bụ́ nke akụkụ ya buru ibu gbatịpụrụ nnọọ
n’akụkụ Great Barrier Reef ahụ a ma ama. (Lee isiokwu bụ́ “Ileta Great Barrier Reef,” nke dị na Teta! June 8, 1991, Bekee) Ihu igwe dị udè, nke na-ekpo ọkụ n’oge nile n’afọ n’ebe a na-eme ka okpete na-eto nke ọma, ihe dịkwa ka mmadụ 6,500 bụ́ ndị na-akụ okpete na-enwetakarị ihe ha ji ebi ndụ site ná ntakịrị ugbo ezinụlọ ha, bụ́ ndị gbasapụrụ n’akụkụ ikperé mmiri dị ka ụyọkọ mkpụrụ vine dị n’elu osisi vine.Mgbe anyị gbasịrị ogologo ụzọ, anyị hụrụ n’ebe dị anya obodo shuga bụ́ Bundaberg, n’ikperé mmiri dị n’etiti Queensland. Ka anyị na-agbada n’otu obere ugwu, anyị hụrụ ihe magburu onwe ya—ruo ebe anya anyị pụrụ iru, ala nke okpete jupụtara na ya! Lee ọtụtụ àgwà ha tụrụ! Ubi okpete ndị ahụ nwechara oge dị iche iche ha ga-aka, nke mere ka ha ghọọ mbara ubi tụrụ àgwà akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ na ọlaedo ọlaedo, na-enwekwa ntakịrị àgwà nchara nchara n’ala ndị a na-akọghị ihe ọ bụla n’afọ a ma ọ bụ nke a sụchara n’oge na-adịbeghị anya.
July bụ ọnwa na-ajụkarịsị n’oyi n’afọ, oge igbute ya na igwerisị ya ka malitere amalite. Nke a ga-aga n’ihu ruo December ka ihe ọkụkụ ndị ahụ na-aka n’oge dị iche iche. Ugbu a anyị nwere mmasị ịga n’ụlọ ọrụ a na-emepụta shuga na ya iji hụ ihe e ji okpete ndị e gbuterela egbute eme. Ma a tụrụ aro na tupu anyị emee nke ahụ ka anyị mụta ihe ụfọdụ banyere okpete n’onwe ya. Ya mere anyị kpebiri ibu ụzọ gaa n’ebe a na-eme nchọpụta banyere shuga bụ́ nke e guzobere n’ógbè a. N’ebe a, ndị ọkà mmụta sayensị na-emepụta ụdị okpete ọhụrụ dị iche ma na-emekwa nchọpụta iji mee ka ọkụkọ na mmepụta nke okpete dịwanye mma.
Mmalite Ya na Otú E Si Akụ Ya
N’ebe ahụ a na-eme nchọpụta banyere shuga, otu onye ọkà n’ihe banyere ọrụ ugbo bụ́ onye nwere mmasị inyere anyị aka, nwere obi ụtọ ịkụziri anyị ihe ụfọdụ banyere okpete n’onwe ya ma kọwaa otú e si akụ ya. N’ịbụ nke e bu ụzọ hụ n’ọhịa mmiri na-ezokarị na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia na New Guinea, okpete bụ ahịhịa kasịnụ n’ahịhịa nile, bụ́ nke gụnyere ndị dị n’ụdị dị iche iche dị ka ahịhịa ata, ahịhịa ndị na-amị ụdị ọka dị iche iche, na osisi achara. Ahịhịa ndị a nile na-emepụta shuga n’akwụkwọ ha site n’usoro osisi na-eji esite n’anyanwụ enweta nri ya. Ma, okpete dị iche n’ihi na ọ na-eme otú ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu, mgbe e mesịrị ọ na-echebe shuga dị ka mmiri na-atọ ụtọ n’ime ókpòrò ya.
A maara ịkụ okpete nke ọma n’India oge ochie. N’ebe ahụ, na 327 T.O.A., ndị odeakwụkwọ nọ n’òtù ndị agha na-eme mwakpo nke Alexander Onye Ukwu, dere na ndị bi n’ala ahụ “na-ata ókpòrò magburu onwe ya, bụ́ nke na-ewepụta ihe dị ka mmanụ aṅụ n’enwetaghị enyemaka ọ bụla nke aṅụ.” Ka nchọpụta a na-eme n’ụwa na mmepeanya na-arị elu na narị afọ nke 15, mmepụta a na-emepụta okpete gbasara ka ọkụ ụgụrụ. Taa, ụdị dị iche iche nke okpete eruwo ọtụtụ puku, ihe karịkwara mba 80 so arụpụta ihe dị ka otu nde tọn okpete a na-enwe kwa afọ.
N’akụkụ ka ukwuu nke ụwa, ịkụ ya bụ ọrụ siri
ike nke ukwuu. A na-egbujisị ókpòrò okpete ndị kaworo aka ka ha dị ihe dị ka sentimita 40 n’ogologo, a na-akụkwa ha n’ala a kọrọ akọ, na-eme ka ohere dị n’etiti ha na ibe ha bụrụ mita 1.5. Mkpirisi nke ọ bụla na-amịpụta ihe dị ka ókpòrò okpete 8 ruo 12, bụ́ ndị na-akanụ n’agbata ọnwa 12 na 16. Ịga ije n’etiti ubi nke okpete kara aka jupụtara n’ime ya pụrụ ịbụ ahụmahụ na-atụ ụjọ. Ókpòrò okpete na-etoru mita anọ n’ogologo. Ihe ahụ na-eme hịara hịara n’ebe ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ ifufe kpatara ihe ahụ, ka ọ̀ ga-abụ agwọ ka ọ̀ bụ òké? Maka adịghị ama ama, eleghị anya ọ bụ oge ịga zere isi n’ala a na-akụghị ihe ọ bụla!A na-eme nnyocha iji chọpụta ụzọ ndị a ga-esi na-egbochi ụmụ ahụhụ na ọrịa ndị na-emebi okpete. Ọtụtụ n’ime mgbalị ndị a agatụwo nke ọma, ọ bụ ezie na ọ bụghị ha nile. Dị ka ihe atụ, na 1935, ná mgbalị e mere iji kpochapụ ébé na-enye okpete nsogbu, gọọmenti webatara awọ okpete sitere Hawaii n’ebe ugwu nke Queensland. N’ụzọ dị mwute, awọ okpete ahụ họọrọ imirikiti imi nri ndị ọzọ karịa ébé na-eri okpete, wee mụbaa nke ukwuu ma bụrụ n’onwe ya ihe bụ́ isi na-ala okpete n’iyi n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nile nke Australia.
Ị̀ Na-esu Ha Ọkụ Tupu I Gbute Ha?
Ka chi jisịrị, anyị kiriri n’ịtụnanya ka otu onye ọrụ ugbo obodo ahụ sunyere okpete ya kaworo aka ọkụ. N’otu ntabi anya obere ubi ahụ ghọrọ ebe ọkụ dị ukwuu na-agba bụ́ nke ire ọkụ ya na-akwụgo n’elu n’ime abalị ahụ. Isu okpete ahụ ọkụ na-enye aka ịgbụchapụsị akwụkwọ ndị a na-achọghị na ihe ndị ọzọ pụrụ ime ka igbute ya na ọrụ ịkwọri ya sie oké ike. Otú ọ dị, site n’oge ndị na-adịbeghị anya, a nọwo na-enwe ịrị elu nke iwe okpete n’ubi n’ebughị ụzọ kpọọ ya ọkụ. A na-akpọ usoro a igbute okpete n’oyi. Ọ bụghị nanị na ọ na-eme ka e mepụtakwuo shuga kamakwa ọ na-eme ka e nwee ahịhịa nchebe nke na-ekpuchi ala, bụ́ nke, n’aka nke ya, na-enye aka igbochi nrichapụ nke elu ala na ahịhịa iruchi ya.
Ọ bụ ezie na n’ọtụtụ mba ebe a na-akọ okpete taa, a ka na-eji aka egbute ya, ọtụtụ mba karị na-eji nnukwu ígwè ọrụ ndị na-egbutu okpete eme ihe. Nnukwu ụgbọ ndị a na-agba n’etiti okpete ndị toro ogologo, na-egbupụsị ọnụ ọnụ ha ma na-agbụsịsị ahụ ókpòrò ya wee na-egbujisị ha mkpirisi mkpirisi n’onwe ha, na-akwadebe ha maka ịkwọrisi ha n’ebe a na-akwọrisi ha. Ebe otu onye na-egbu okpete pụrụ iwe ihe dị ka tọn okpete 5 kwa ụbọchị na-eji usoro na-agwụ ike nke iji aka egbutusị ha, ụgbọ ndị na-egbutu okpete pụrụ iwe ihe ruru tọn 300 n’ubi kwa ụbọchị n’ụzọ dị mfe.
A pụrụ igbu okpete dị n’ubi kwa afọ ruo ọtụtụ afọ tupu shuga ọ na-emepụta ebelata, o wee dị mkpa ka a kụọ ọzọ.Ozugbo e gbutere okpete, ime ihe banyere ya ngwa ngwa dị mkpa, n’ihi na shuga dị n’okpete e weworo n’ubi na-emebi ngwa ngwa. Iji mee ka ọ gaa ngwa ngwa n’ebe a na-akwọri ya, e nwere ụzọ ụgbọ okporo ígwè dị kilomita 4,100 nke na-agba n’ógbè ndị a na-akụ okpete na Queensland. Obere ụgbọ okporo ígwè ndị tụrụ àgwà na-agba n’okporo ígwè ndị a na-adọrọ anya ka ha na-agbafe obodo nta a, na-adọkpụrụ ọtụtụ ụgbọ ndị e ji ebu ngwongwo bụ́ ndị okpete jupụtara na ha.
Ịba n’Ụlọ Ọrụ Ahụ
Ileta ụlọ ọrụ na-emepụta shuga bụ ahụmahụ na-adọrọ mmasị. Ihe mbụ a na-ahụ bụ ahịrị nke ụgbọ ndị e bujuru okpete na-echere ka a bịa bupụsịa ihe dị n’ime ha. Nnukwu ígwè ndị na-akwọri ihe na ndị na-apịpụta mmiri ya, na-akwọri okpete ahụ, na-apịpụta mmiri shuga site n’avụvụ ya. A na-amịkpọ avụvụ nke fọrọ afọ wee jiri ya mee ihe na-enye ụlọ ọrụ ahụ nile ọkụ. A na-eresịkwa ụlọ ọrụ na-emepụta akwụkwọ na ihe ndị e ji arụ ụlọ ndị mafọrọnụ n’avụvụ ahụ ka ha jiri ha mepụta ngwá ahịa ha.
A na-ewepụzi urughuru ihe dị ná mmiri shuga ahụ, na-enwezi mmiri dị ọcha. A na-eji urughuru ihe ndị ahụ e wepụtasịrị, nke a na-akpọ apịtị, eme fatịlaịza. A na-eji ihe ọzọ a na-ewepụta na ya, bụ́ molasses, eme nri anụ ma ọ bụ ihe a na-eji esi mmanya na-aba n’anya na ụdị ya e ji emepụta ihe n’ụlọ ọrụ. Ọtụtụ ihe ndị a na-eji okpete eme na ịga were were nke usoro e ji egweri ya na-adọrọ mmasị n’ezie.
A na-emezi ka mmiri ahụ rọọ arọọ site n’isikpọ ya, a na-agwakọtakwa ya na aghịrịgha shuga. Aghịrịgha shuga ndị a na-ebuwanye ibu ruo mgbe ha ruru ókè a chọrọ ka ha hara. Mgbe ahụ a na-ewepụta ha n’ebe ahụ a gwakọrọ ha ma mịkpọọ ha. Ihe nke a na-emepụta bụ shuga na-acha nchara nchara. Nnụcha a ga-anụchakwu ya ga-agbanwe shuga ahụ na-acha nchara nchara ka ọ ghọọ shuga na-acha ọcha, bụrụ nke a nụchara anụcha nke ọtụtụ ndị maara nke ọma, bụ́ nke ha na-ahụ n’elu tebụl nri ha.
Eleghị anya tii ma ọ bụ kọfị gị ga-atọtụkwu ụtọ ka anyị letasịrị ógbè okpete a bụ́ nke na-adọrọ mmasị ma na-emepe anya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa mamịrị, mgbe ahụ ị ghaghị ịhapụ shuga, ikekwe jirikwa ihe ọzọ dochie anya ya.
N’ezie, ọ na-enye anyị obi ụtọ ịhụ ikike ime ọtụtụ ihe na inwe nkà nke Onye ahụ haziri ma mee ka e nwee uto bara ụba nke osisi a dị ịtụnanya, bụ́ okpete—nke bụ n’ezie ahịhịa kasịnụ n’ahịhịa nile!
[Igbe dị na peeji nke 16]
Ọ̀ Bụ Osisi Beet Ka Ọ̀ Bụ Okpete?
A na-emepụta shuga site n’ihe ọkụkụ abụọ bụ́ isi n’ụwa. A na-akụkarị okpete n’ebe okpomọkụ, ọ bụkwa na ya ka e si enweta ma ọ dịkarịa ala pasent 65 nke shuga a na-emepụta n’ụwa nile. Pasent 35 fọdụrụnụ bụ nke a na-apịpụta site n’osisi beet, bụ́ nke a na-akụ n’ebe ihu igwe na-ajụ oyi karị, dị ka n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na n’Ebe Ọdịda Anyanwu Europe na n’Ebe Ugwu America. Shuga ha abụọ na-emepụta yiri ibe ha.
[Foto dị na peeji nke 17]
Ígwè na-egbutu okpete. Ụgbọ traktọ a na-adọkpụrụ obu ngwongwo
[Foto dị na peeji nke 17]
Ịkpọ okpete ọkụ tupu e gbute ya
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 15]
Foto nile dị na peeji nke 15-18: Ụlọ Ọrụ Na-emepụta Shuga na Queensland