Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Patmọs—Àgwàetiti nke Apọkalips

Patmọs—Àgwàetiti nke Apọkalips

Patmọs—Àgwàetiti nke Apọkalips

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA GRIS

MGBE ụfọdụ, ndị Patmọs na-ele anya n’ofe Osimiri Aegean ma hụ otu ọkụ na-amụke na ndagwurugwu nke otu ugwu dị n’àgwàetiti Samọs bụ́ nke dị ebe ahụ nso. Ụfọdụ na-ekwu na ọkụ ahụ dị ịtụnanya bụ ọkụ eletrik nọ otu ebe, ma ndị okpukpe bi na Patmọs na-esi ọnwụ na ọ bụghị ya. Ha na-agbara aga agwa ndị agbata obi ha na ha enwetawo ihe ịrịba ama ọzọ sitere n’aka otu onye a kasị mara amara biburu n’àgwàetiti ahụ, bụ́ onye a chụtara ná ntakịrị àgwàetiti Gris a dịdewere ụsọ oké osimiri Asia Minor, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 1,900 gara aga.

O yiri ka ọ bụ Eze Ukwu Rom bụ́ Domitian mara onye ahụ a ma ama ikpe ibi na Patmọs “n’ihi okwu Chineke na àmà Jisọs.” N’ebe ahụ ka ọ nọ nụ olu Chineke “dị ka nke opi,” bụ́ nke sịrị: “Mụ onwe m bụ Alfa na Omega ahụ . . . Ihe ị na-ele anya, dee ya n’akwụkwọ.”—Mkpughe 1:8-11.

Akwụkwọ ahụ bụ akụkụ ikpeazụ nke akwụkwọ a kasị ere mgbe ọ bụla. Ụfọdụ akọwawo ya dị ka otu n’ime ihe odide ndị kasị sie ike nghọta e detụworo—akwụkwọ Bible a na-akpọ Mkpughe ma ọ bụ Apọkalips, bụ́ akwụkwọ ikpeazụ nke Bible. Onye dere ya bụ onyeozi Jisọs, bụ́ Jọn. Ọhụụ ndị ahụ Jọn hụrụ banyere mbibi ikpeazụ nke ajọ ụwa a amasịwo ndị na-agụ ya eri ọtụtụ narị afọ. *

Patmọs Taa

Ọtụtụ ndị nleta na-ekweta na Patmọs—nke dị n’ime ime n’ebe ugwu Àgwàetiti Dodecanese—bụ ebe kwesịrị ekwesị ịnọ dee akwụkwọ a. Mkpumkpu ntụ nke mgbawa ugwu kpatara na olulu gbara ọchịchịrị na-ekewa ugwu ahịhịa ndụ jupụtara na ya nakwa ala ahịhịa ndị nwere okooko osisi bụ́ ndị oké anwụ Aegean na-achanwụsị.

Iji hụ otú Patmọs dị taa, abanyere m ụgbọ mmiri n’ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ isi nke Gris bụ́ Piraievs. Mgbe ọ gaferela etiti abalị, ka ụgbọ mmiri ahụ na-abata n’ọdụ ụgbọ mmiri dị warawara na Skála—ọdụ ụgbọ mmiri na obodo ukwu kasị ibu na Patmọs—ihu igwe gbachapụrụ ma mee ka a hụ àgwàetiti ahụ n’ìhè nke ọnwa gbazuru agbazu.

N’ụtụtụ echi ya, ka m na-aṅụ kọfị Gris na-elu ilu, akwadebere m ịmalite ịgagharị n’àgwàetiti ahụ. N’isi ụtụtụ ahụ, ahụrụ m ndị nne ochie yi uwe ojii gbadaruru ala, bụ́ ndị na-achọ ịchụkwudo obere ụmụaka na-agba ọsọ. Otu onye ọkụ azụ̀ gbara afụ ọnụ nọdewere ebe ahụ nke nọ na-akụ ihe ọ ga-eji mere nri ehihie—otu azụ̀ octopus nke o ji ube gbute ná mmiri ahụ—n’elu ebe e tere simenti bụ́ ebe ụgbọ mmiri na-akwụsị iji mee ka ọ dị mfe mbọkasị.

Kama ịbanye n’ụgbọ mmiri, ekpebiri m ịrịgo n’akụkụ ugwu dị n’azụ Skála iji kirie àgwàetiti ahụ dum. Ihe m hụrụ kwesịrị ịrịba ama. Àgwàetiti ahụ gbasara dị ka nnukwu map na-egosi ugwu na ndagwurugwu bụ́ ndị osimiri na-ebugharị. Patmọs dị ka ntakịrị àgwàetiti atọ dịkọtara ọnụ—mkputamkpu ala ndị ibe ala ndị dị warawara jikọtara. Otu n’ime ibe ala ndị a dị warawara dị na Skála. Nke ọzọ dị n’ebe a kpọrọ aha kwesịrị ekwesị bụ́ Diakofti, nke pụtara “E Kewara Abụọ,” dịdewere ebe ndịda tọgbọrọ n’efu nke àgwàetiti ahụ. Patmọs dị ihe dị ka kilomita 13 n’ogologo, dịkwa nso site n’otu akụkụ ruo n’akụkụ ọzọ.

Ịgabiga Oge Nsogbu

E werewo Patmọs dị ka ebe dị nsọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kemgbe ndị mbụ si Asia Minor bịara biri n’ebe ahụ n’ihe dị ka afọ 4,000 gara aga. Ndị mbụ ahụ bi n’ebe ahụ họọrọ ebe nke abụọ kasị elu n’àgwàetiti ahụ dị ka ebe ha ga-arụ ụlọ nsọ Artemis ha, bụ́ chi nwanyị nke ịchụ nta.

N’ihe dị ka na 96 O.A., bụ́ mgbe e chere na a chụgara Jọn onyeozi na Patmọs, ọ nọ n’okpuru ọchịchị alaeze ukwu Rom. Na narị afọ nke anọ, àgwàetiti ahụ ghọrọ akụkụ nke Alaeze Ukwu Byzantium “e mere ndị na-eso ụzọ Kraịst.” Mgbe ahụ, n’agbata narị afọ nke asaa na nke iri, ọ ghọrọ ebe ndị Alakụba bijupụtara.

Ka oge na-aga, a gbahapụrụ Patmọs, ọ dịghịkwa ndị bi na ya. Mgbe ahụ, ná ngwụsị nke narị afọ nke 11, otu onye mọnk chọọchị Ọtọdọks nke Gris malitere iwu ebe obibi siri ike nke ndị mọnk nke “Senti” Jọn n’ebe ahụ e wuru ụlọ nsọ Artemis nke ndị na-ekpere arụsị. Ndị ọbịa jiri nwayọọ nwayọọ lọghachi ma rụọ ọtụtụ ụlọ ndị nwere akụkụ anọ bụ́ ndị e tere agba ọcha na Hora, bụ́ obodo nke ka gbara mgbidi nke ebe obibi ndị mọnk ahụ gburugburu.

Àgwàetiti ahụ nwere ebube nwa oge ná ngwụsị afọ ndị 1800, bụ́ mgbe ụfọdụ ụmụ amaala ya nwere otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri ndị kasị buo ibu na Mediterranean. Ọdụ ụgbọ mmiri ndị ahụ so kpata nnubata ọhụrụ nke ndị mmadụ. N’afọ ndị 1970, ọtụtụ n’ime ndị bara ọgaranya n’ụwa chọpụtara ala na ụlọ ndị dị ọnụ ala n’àgwàetiti a gbahapụrụ agbahapụ n’ụzọ bụ́ isi. Ha rụgharịrị ọtụtụ nnukwu ụlọ ochie nke ndị na-azụ ahịa n’osimiri ahụ, nke a, tinyere ọdụ ụgbọ mmiri ndị ọzọ, nyere aka mee ka Patmọs ghọọ ebe na-adọrọ mmasị ndị na-eme njem nleta.

Ka ọ dịgodị, Patmọs alanarịwo nnubata nke ndị njem, bụ́ nke fọworo nke nta ka o bibie àgwàetiti ndị ọzọ nke Gris. Isi ihe ndị kpatara ya bụ n’ihi na o nweghị ọdụ ụgbọelu nakwa n’ihi na ndị mọnk siri ọnwụ na ọ ga-anọgide bụrụ ógbè dị nsọ n’ụzọ bụ́ isi.

Ịgwakọta Akụkọ Ihe Mere Eme na Ọdịnala

N’inyere m aka ime atụmatụ maka ngagharị m n’àgwàetiti ahụ, onye na-eke nri n’ụlọ nri tụọrọ m aka n’okporo ụzọ e ji nkume rụọ, nọworo afọ 400, dị n’azụ obodo Skála, bụ́ nke gabigara ọhịa akwụoro na-esi ísì ọma ruo n’ebe e chere na ọ bụ ọgba Jọn ruokwa n’ebe obibi ndị mọnk nke “Senti” Jọn. Ná mpụga obodo ahụ, agafere m ihe odide na-atụ egwu bụ́ nke e ji ágbá na-acha ọbara ọbara dee n’ahụ mgbidi ahụ e ji nkume wuo: “Ohi sto 666” (Lezie anya maka 666), bụ́ otu n’ime ihe nnọchianya ndị dị ná Mkpughe, bụ́ ndị a ghọtahiere aghọtahie.

E wuru Ebe Obibi Ndị Mọnk nke Apọkalips ahụ, bụ́ nke nwere ntakịrị ụlọ ekpere “Senti” Anne na 1090, iji mechie ụzọ mbata nke ọgba ahụ bụ́ ebe akụkọ ọdịnala na-ekwu na ọ bụ ebe Jọn nọ hụ ọhụụ ya. Anọ m na-ele otu nwanyị ka o sekpuuru ala ma tinye otu tama (onyinye) n’ihe oyiyi nke “Senti” Jọn. Ndị Ọtọdọks ji okpukpe ha akpọrọ ihe, bụ́ ndị kweere na ihe oyiyi ahụ pụrụ ịrụ ọrụ ebube na-etinyere ya tamata—ntakịrị ọla ndị a kpụrụ dị ka mmadụ, akụkụ ahụ mmadụ, ụlọ na ọbụna ụgbọala na ụgbọ mmiri. Echetara m na ahụwo m ihe onyinye ndị yiri ha bụ́ ndị e ji ụrọ kpụọ na nso Kọrint, n’ụlọ nsọ nke chi dibịa Gris oge ochie bụ́ Asclepius. Ọ̀ bụ nanị ihe ndabakọ?

Ihe Ncheta Ọdịbendị na Ihe Odide Dị Iche Iche

Ka m banyere n’ogige ebe obibi ndị mọnk nke “Senti” Jọn ahụ, otu onye nwere ihu ọchị pụtara site n’ebe ahụ gbara ọchịchịrị nke nwere ọtụtụ paseji. “Papa Nikos” (Nna Nick) nwere obi ụtọ igosi mụ na ọtụtụ ndị ọzọ na-eme njem nleta akụ̀ ndị dị n’ebe obibi ndị mọnk ahụ. Ebe obibi ndị mọnk ahụ, bụ́ nke nwe akụkụ ka ukwuu nke Patmọs bụ otu n’ime ebe a kasị nwee akụ̀ na ebe a kasị mara amara na Gris.

Anyị si n’ime otu ụlọ ekpere jụrụ oyi nke anwụrụ ọkụ kandụl gbachuworo, bụ́ ebe ozu onye wuru ebe obibi ndị mọnk ahụ dị gafere ma banye n’Ụlọ Ekpere nke Nwa Agbọghọ ahụ Na-amaghị Nwoke, bụ́ nke e ji nkume si n’ụlọ nsọ Artemis wuo akụkụ ya ụfọdụ. N’ụlọ ndebe ihe ochie, anyị hụrụ ọtụtụ ọlaedo na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị ndị eze ukwu ji nye onyinye; akwụkwọ bu nkwekọrịta ndị mọnk na ndị bi n’àgwàetiti ahụ mere na narị afọ nke 11, bụ́ nke Eze Ukwu nke Byzantium bụ́ Alexius nke Mbụ Comnenus bịanyere aka na ya; na ibé akpụkpọ anụ mara mma, na-acha odo odo nke narị afọ nke 6 bụ́ nke e ji ọlaọcha kama ịbụ ink dee Oziọma Mak na ya. Tụkwasị n’ibé akpụkpọ anụ a, e nwere ọtụtụ Bible na ihe odide nkà mmụta okpukpe n’ebe obibi ndị mọnk ahụ.

Ebe Ndị Na-adọrọ Mmasị n’Àgwàetiti Ahụ

Àgwàetiti ahụ nwekwara ebe ndị mara mma site n’okike. Kilomita ole na ole site n’ebe ndịda Skála, e nwere ụsọ mmiri a na-emetọghị emetọ n’ọnụ mmiri a rụchiri arụchi. Ụsọ mmiri ahụ dị larịị, o nweghịkwa ihe dị na ya ma e wezụga Kalikatsou, nke pụtara “Nnụnụ Cormorant,” bụ́ nkume dị n’etiti ụsọ mmiri ahụ, bụ́ nke dị okpukpu ise ma ọ bụ isii n’ogo na nke ọgba dịgasị na ya.

Ụzọ kasị mma isi nụ ụtọ Patmọs bụ nanị site n’ịgagharị ebe nile. Ị pụrụ ịchọ ịnọdụ ala n’anwụ na-achasi ike n’acropolis oge ochie bụ́ mkpọmkpọ ebe na Kastelli ma gee ntị n’ubé atụrụ na mkpọrọhịhị na-ada ụda nke ndị ọzụzụ atụrụ. Ma ọ bụ n’ehihie ụfọdụ mgbe alụlụ nke Osimiri Aeagan na-akwụgo n’ihu igwe, ị pụrụ ịchọ ịnọdụ ala ma kirie ụsọ mmiri ndị ahụ bụ́ ebe ụgbọ mmiri ndị na-apụ apụ site n’ime alụlụ ahụ na-akwụgo elu na-adị ka ha na-arịgo n’igwe.

N’ụbọchị ikpeazụ m nọrọ n’ebe ahụ, ọmarịcha anwụ na-ada ada mere ka obodo ahụ dị n’okpuru ya bukwuo ibu. N’ọnụ mmiri ahụ, ndị ọkụ azụ̀ na-ebu oriọna na-akwadebe ntakịrị ụgbọ mmiri ndị a na-akpọ gri-gri, bụ́ ụmụ ọbọgwụ, n’ihi na ha na-eso nnukwu ụgbọ mmiri n’azụ.

Àgwàetiti ahụ nile yiri ka ọ na-egbukepụ egbukepụ. Ifufe na-atụ oyi na ebili mmiri na-ebugharị gri-gri ndị ahụ n’ụzọ dị egwu. Mgbe awa ole na ole gasịrị, anọ m n’ala ụgbọ mmiri hụ ntakịrị ụgbọ mmiri ndị ahụ ọzọ, ka ha na-alaghachi Piraievs mgbe o ji ọsọ na-agbafe ebe ha na-egbu azụ̀ bụ́ ebe dị kilomita ole na ole site n’ụsọ mmiri. Ndị ikom ahụ amụnyewo ọkụ ahụ na-enwusi ike bụ́ nke ha ji adọta azụ. N’abalị ahụ, ruo mgbe m na-adịzighị ahụ ha na àgwàetiti ahụ, anọgidere m na-eji anya nke uche m na-ahụ Jọn ahụ a chụpụrụ achụpụ ka ọ na-edetu ọhụụ ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Maka nkọwa zuru ezu, lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 29]

Ebe obibi ndị mọnk nke “Senti” Jọn

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]

© Miranda 2000