Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ahụ Ụzọ Karịa Anya Gị?

Ị̀ Na-ahụ Ụzọ Karịa Anya Gị?

Ị̀ Na-ahụ Ụzọ Karịa Anya Gị?

NDỊ na-anya ụgbọala apụghị iji anya nkịtị hụ ihe na-abịa n’ihu n’ebe ụzọ gbara oké ngọ. Ma site n’enyemaka nke enyo nke e debere n’ebe ahụ ụzọ gbara ngọ ná mba ụfọdụ, a pụrụ ịhụ ụgbọ ọzọ na-abịanụ ma gbochie ihe mberede. N’otu aka ahụ, ụmụ mmadụ apụghị ịhụ n’ezie Onye Okike nke a na-apụghị ịhụ anya. Ọ̀ dị ụzọ a ga-esi mara na Onye dị otú ahụ dị adị?

Otu onye edemede na narị afọ mbụ kwuru banyere otú anyị pụrụ isi ghọta ihe anyị na-apụghị ịhụ anya. O dere, sị: “Ihe [Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya; ka ha ghara inwe ngọpụ.”—Ndị Rom 1:20.

Chee echiche banyere nke ahụ. Ị̀ na-ahụ ihe àmà nke ọgụgụ isi n’ihe ndị gbara anyị gburugburu bụ́ ndị ụmụ mmadụ na-apụghị ikepụta? Ihe ndị dị otú ahụ hà na-enyere gị aka iji “anya nke uche gị” hụ na ọ dị onye ka mmadụ ukwuu? Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.—Ndị Efesọs 1:18, King James Version.

Ịmụta Ihe Site n’Ihe Ndị E Kere Eke

Ì nwewo mmasị n’ịdị ebube nke igwe na-egbuke egbuke nke jupụtara na kpakpando n’abalị nke ọnwa na-adịghị agba, na-ahụ na ya ihe àmà nke ịdị adị nke Onye Ukwu Na-eme Ihe? “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi,” ka otu onye na-ekiri ya n’oge ochie kwuru. “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo,” ka nwoke a tụgharịrị n’uche ya, “gịnị ka mmadụ bụ, na Ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na Ị na-eleta ya?”—Abụ Ọma 8:3, 4; 19:1.

Ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ anyị inwe mmasị n’ihe ndị e kere eke dị ịtụnanya bụ́ ndị ụmụ mmadụ na-apụghị imepụta. Otu ahịrị abụ uri a ma ama na-ekwu, sị: “Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ike osisi.” Ma, ihe ka dị nnọọ ịtụnanya bụ okike nke nwa ọhụrụ, bụ́ nke na-ewere ọnọdụ n’enweghị ntụziaka okike ọ bụla na-esite n’aka ndị mụrụ ya. Mgbe ọbara ọcha si n’ahụ nna ya na àkwá si n’ahụ nne ya jikọrọ ọnụ, a na-atụ ụkpụrụ ngwa ngwa maka nwa na DNA mkpụrụ ndụ ahụ e mepụtara ọhụrụ. A na-ekwu na “ọ bụrụ na e depụta” ntụziaka ndị dị na DNA, ọ “ga-eju otu puku akwụkwọ ndị nwere peeji 600 n’otu n’otu.”

Nke ahụ bụ nanị mmalite. Mkpụrụ ndụ mbụ ahụ na-ekewa ịghọ abụọ, e mesịa ọ ghọọ anọ, ọzọ asatọ, na-ekewakwa aga n’ihu. Mgbe ihe dị ka ụbọchị 270 gasịrị, a na-amụ nwa ọhụrụ nwere ọtụtụ puku nde mkpụrụ ndụ dị ndụ na-adị ihe karịrị ụdị mkpụrụ ndụ 200. Leenụ, mkpụrụ ndụ mbụ ahụ nwere ihe ọmụma ọ ga-eji mepụta ụdị mkpụrụ ndụ nile nakwa iji mepụta ha n’oge kwesịrị nnọọ ekwesị! À na-akpali gị inye Onye Okike anyị otuto? Rịba otuto ọbụ abụ ahụ nyere ama bụ́ onye dere, sị: “Gị onwe gị enwetawo akụrụ m abụọ: Ị na-akpa m n’afọ nne m dị ka e si akpa ákwà. M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.”—Abụ Ọma 139:13-16.

Ọ na-eju ndị mụworo banyere “ọrụ ebube” ndị a anya. Dr. James H. Hutton, nke bụbu onyeisi oche nke òtù Nkà Ọgwụ na Chicago na Illinois State, kwuru na ya nwere oké ihe ijuanya ‘n’ike mkpụrụ ndụ nwere ime ka mkpụrụ ndụ ndị ga-anọchi ya nweta ihe ọmụma ndị ha ga-achọ imepụta. Ọ bụ ihe magburu onwe ya n’ezie na ndị ọkà mmụta sayensị anyị na-eme nnyocha enwewo ike ịma banyere ihe ndị dị otú ahụ. Ma, n’ezie ọ ghaghị ịbụ Onye Nwere Ọgụgụ Isi Karịa Mmadụ mere atụmatụ maka ihe ndị a dị ịtụnanya.’

Dr. Hutton gara n’ihu ikwu, sị: “N’ịdabere n’obere ihe ọmụma m nwere banyere nkà mmụta akụkụ ahụ na-emepụta mmiri ọgwụ ahụ, ịmụ ihe banyere ọrụ akụkụ ahụ na-emepụta mmiri ọgwụ ahụ na-arụ na ọrịa na-arịa akụkụ ahụ ndị a, na-ewepụtakwu ihe àmà na-eme ka e kwenye na aka Onye Bụ Chineke aghaghị ịdị n’ọrụ na ịdị mgbagwoju anya nke akụkụ ahụ ndị a dị mkpa.” O kwubiri, sị: “Ịtụgharị uche n’ihe ndị a dị ịtụnanya dị m ka ọ bụ ezi ihe mere a ga-eji kwere na ike pụrụ ime ihe nile nke mazukwaara ihe nile mere atụmatụ maka eluigwe na ala, mee ka ha na-arụ ọrụ, na-elekọtakwa ha.”

Mgbe ọ kwuchara ihe ndị a, Dr. Hutton jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ Chineke nke bụ́ onye, nke na-arịba ọdịda egwele nke ọ bụla ama?” Ọ zara, sị: “Ekwetachaghị m na nke ahụ. Ekwetaghịkwa m na ọ dị otú ọ bụla O si eleba anya n’ihe ndị m na-eme bụ́ ndị na-adịchaghị mkpa.”

N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji ekweta na e nwere ihe àmà nke ọgụgụ isi ‘n’ọrụ ebube’ nke ihe ndị e kere eke ma na-enwe obi abụọ banyere ịdị adị nke Chineke bụ́ onye nke na-eche banyere ihe a kpọrọ mmadụ?

Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụrụ na Chineke dị, ọ gaghị ekwe ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ nke ukwuu. Otu ajụjụ ụfọdụ na-ajụkarị bụ, “Ebee ka Chineke nọ mgbe mkpa ya na-akpa anyị?” Otu onye lanarịrị ogbugbu ndị Nazi gburu ọtụtụ nde mmadu n’Agha Ụwa nke Abụọ nwere mwute dị ukwuu n’ihi nhụjuanya ọ hụrụ nke na ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ị pụrụ ịratụ ire gị n’obi m, ọ ga-abụrụ gị nsí.”

Ya mere nye ọtụtụ ndị, ọ bụ ọnọdụ nke amaghị ihe a ga-eme. Dị ka onye ahụ kiriri ihe n’oge ochie bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite kwuru, ihe àmà nke na-egosi na Onye Okike dị adị na-apụta ìhè mgbe anyị tụlere otú e si mee ma doo ihe dị iche iche n’usoro n’ụzọ ọrụ ebube. Ma, ọ bụrụ na Ọ bụ Chineke na-eche banyere anyị, olee otú Ọ pụrụ isi kwere ka oké nhụjuanya dị otú ahụ dịrị? Ọ bụrụ na anyị ga-aghọta ma fee Chineke n’ụzọ kwesịrị ekwesị, anyị aghaghị inweta azịza na-eju afọ nye ajụjụ ahụ dị mkpa. Olee ebe anyị pụrụ inweta ya?

Anyị na-agba gị ume inweta otu broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? Na peeji nke 32 nke Teta! a, ị pụrụ ịmata otú ị ga-esi rịọ maka otu. Anyị nwere olileanya na iji nlezianya tụlee akụkụ bụ́ “Ihe Mere Chineke Jiworo Kwere Ka Ahụhụ Dịrị” na “Gịnị Bụ Ihe Siworo ná Nnupụisi Pụta?” ga-enye gị azịza ndị na-eju afọ.