Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ala Ọma Jijiji!

Ala Ọma Jijiji!

Ala Ọma Jijiji!

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA TAIWAN

“Edina m ala na-agụ akwụkwọ n’okpukpu nke itoolu nke ụlọ elu m bi na ya na Taipei mgbe ọkụ bidoro ịnyụ. Mgbe ahụ ọnụ ụlọ ahụ bidoro ịma jijiji nke ukwuu. Ọ dị ka a ga-asị na anụ ọjọọ jidere ụlọ ahụ ma na-akwagharị ya. Agbabara m n’okpuru tebụl ka ụda ihe ndị si n’elu na-ada mere ka m tụọ ụjọ na uko ụlọ ahụ ga-ada. O yiri ka ọ nọgidere na-eme otú ahụ.”—Otu odeakụkọ bi na Taiwan.

ALA ỌMA JIJIJI. Nanị ịkpọ okwu ahụ aha na-atụ egwu, na nso nso a kwa ọ pụrụ ịbụ na ị nụwo ya nnọọ ọtụtụ ugboro. Dị ka Ụlọ Ọrụ United States Na-enyocha Ọdịdị Ime Ala si kwuo, ala ọma jijiji ndị mere na 1999 karịrị ọnụ ọgụgụ a na-adị atụ anya ya, ọnụ ọgụgụ ndị nwụkwara na ha ji okpukpu abụọ karịa nkezi ọnụ ọgụgụ ndị ọ na-egbu kwa afọ.

E nwere ala ọma jijiji kasị ukwuu na 1999 na Taiwan, bụ́ ebe nnukwu kọntinent abụọ nke ụwa jikọrọ ọnụ. Ná ngụkọta, e nwere ebe 51 a maara na okpuru ala gbawara agbawa na Taiwan dum. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na a na-enwe ihe dị ka ala ọma jijiji 15,000 kwa afọ n’ebe a. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ime ha pere nnọọ mpe nke na a pụghị ịma na ha mere.

Ọ dịghị otú ahụ na September 21, 1999. Mgbe o ji nkeji 47 gafee elekere anya 1 nke ụtụtụ, ala ọma jijiji kpara Taiwan aka ọjọọ nke na President Lee Teng-hui kọwara ya dị ka “nke kasị njọ meworo n’àgwàetiti ahụ eri otu narị afọ.” O meruru nanị sekọnd 30 ma ruo 7.6 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Richter. * Ebe ala ọma jijiji ahụ meruru bụ nanị ihe karịrị otu kilomita n’ime ala, emebaghị ime ya mere ka ọ kpaa ike dị ukwuu. “Mkpatụ merenụ kpọtere m n’ụra,” ka Liu Xiu-Xia, bụ́ onye bi nso n’etiti ebe ala ọma jijiji ahụ mere, na-ekwu. “Ngwongwo ndị dị n’ụlọ dara, ọbụnakwa bọlb ọkụ ndị dị n’uko dara ma kụwaa. Enweghị m ike ịpụta n’ihi na ihe ndị dara ada na enyo kụwara akụwa dachiri ọnụ ụzọ m.” Huang Shu-Hong, bụ́ onye ala ọma jijiji ahụ si n’àkwà ya tụpụ, nwere nsogbu dị iche. “Ọkụ eletrik nyụrụ ozugbo, ya mere oké ọchịchịrị gbara,” ka ọ na-ekwu. “Asọọrọ m ìsì pụta n’èzí ma soro ndị agbata obi m nọchaa oge fọdụrụ n’abalị ahụ n’akụkụ okporo ụzọ. Ala eyighị ka ọ kwụsịrị ịma jijiji.”

Ọrụ Nnapụta

Mgbe chi bọrọ a hụrụ ihe ala ọma jijiji ahụ mere. Ihe ruru ụlọ 12,000 dara, site n’ụlọ elu ndị dị otu okpukpu ruo ná ndị dị ọtụtụ okpukpu. Ka akụkọ banyere ọdachi ahụ na-agbasa, ndị ọkachamara n’ọrụ nnapụta si mba 23 bịara Taiwan inyere ndị ọrụ afọ ofufo nọ n’ebe ahụ aka. Ọ ka nwere ọtụtụ ndị ihe dagidere.

Awa 72 mbụ mgbe e nwesịrị ọdachi na-abụ oge e ji achọta ndị ka dị ndụ, ma na nke a ndị ọrụ nnapụta zutere ihe ịtụnanya ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, a napụtara otu nwatakịrị nwoke dị afọ isii ka awa 87 gasịrị. Na Taipei kwa, ka ndị ọrụ ji nnukwu ngwá ọrụ na-ekpochasị otu ụlọ obibi dị okpukpu 12 dara ada, otu nwa okorobịa bilitere na mberede. Ya na nwanne ya nwoke tọrọ atọ ruo ihe karịrị ụbọchị ise, ha abụọ lanarịkwara ọdachi ahụ!

Otú ọ dị, ọ dị mwute na e nweghị ike ịnapụta mmadụ nile, ndị ọrụ nnapụta chekwara ọnọdụ ụfọdụ na-agbawa obi ihu. Dị ka ihe atụ, otu onye ndú nke otu ìgwè kwara arịrị, sị: “Anyị nụrụ ka otu nwatakịrị na-ebe ákwá ruo awa asatọ gara aga. Mgbe nke ahụ gasịrị ọ kwụsịrị.” N’ikpeazụ, ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ na Taiwan ruru ihe karịrị 2,300, ihe karịrị mmadụ 8,500 merụkwara ahụ.

Iche Ihe Si na Ya Pụta Ihu

E mere mgbalị dị ukwuu ichebe ọtụtụ narị puku ndị ala ọma jijiji ahụ mere ka ha ghara inwekwa ebe obibi. Na mbụ, ndị ụfọdụ ọdachi ahụ metụtara ekwechaghị abanyeghachi n’ụlọ. Nke a pụrụ ikwe nghọta, n’ihi na ụbọchị iri mgbe ala ọma jijiji mbụ ahụ mesịrị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obere ala ọma jijiji 10,000 mere! Otu n’ime ndị a ruru 6.8 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Richter, na-eme ka ọtụtụ ụlọ bụ́ ndị na-esikwaghị ike daa.

Ka o sina dị, ọrụ nnapụta gara n’ihu. Ọtụtụ òtù na-abụghị nke gọọmenti—gụnyere ìgwè ndị ọrụ nnapụta bụ́ ndị si mba ọzọ, ìgwè ndị Buddha bụ́ Tzu Chi, na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ—tinyere oge na nkà ha n’ọrụ ahụ. Ndị ọzọ so rụọ ọrụ enyemaka ahụ bụ Ndịàmà Jehova. N’ikwekọ na ndụmọdụ Bible nyere ná Ndị Galetia 6:10, ha nwere ihe mgbaru ọsọ abụọ. Ha chọrọ (1) inye ndị ezinụlọ nke okwukwe ha ihe nakwa (2) imere mmadụ nile ihe ọma, gụnyere ndị ha na ha na-anọghị n’otu okpukpe.

Ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ nke ụbọchị mbụ, Ndịàmà Jehova ji ụgbọala na-ebute nri, mmiri, ụlọikwuu, na ihe ndị e ji esi nri n’èzí. Ebe ọ bụ na ihe nile e ji ezirịta ozi adịkwaghị arụ ọrụ, ndị okenye si ọgbakọ isii dị n’ebe ọdachi ahụ mere mekọrọ mgbalị ọnụ ịchọta Ndịàmà ibe ha na ndị ikwu ha tinyere ndị ha na-amụrụ Bible na ndị nwere mmasị. A gbara Ndịàmà a chọpụtara na ha enwekwaghị ebe obibi ume ibikọta ọnụ ka e wee nwee ike ilekọta mmadụ nile nke ọma ma kpọtụrụ ha ngwa ngwa. Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị so na Kọmitii Alaka nke Taiwan letara ìgwè na ọgbakọ nke ọ bụla iji gbaa ha ume.

Nzọụkwụ ọzọ bụ ịrụzi ụlọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị mebiri emebi. Ọgbakọ nke ọ bụla depụtara ndị enyemaka dị mkpa. Mgbe ahụ n’okpuru ntụziaka nke Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè, e zigara ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo ịga rụzie ihe ndị dị mkpa. N’ime otu ọnwa mgbe ala ọma jijiji ahụ mesịrị, a rụchara ọrụ ahụ.

Ndịàmà Jehova nyekwaara ndị agbata obi ha na-abụghị Ndịàmà aka. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà ahụ letara ndị nọ n’ụlọ ọgwụ na ndị bi n’ụlọikwuu dị iche iche iji nye ha nkasi obi. Ha kesakwara isiokwu e mepụtaghachiri emepụghachi bụ́ “Ọdachị Ndị Na-emere Onwe Ha—Inyere Nwa Gị Aka Ịnagide Ha,” bụ́ nke e bipụtara na Teta! (Bekee) nke June 22, 1996. Ọtụtụ ndị nwere ekele inweta ihe ọmụma a, ha malitekwara ịgụ ya ozugbo. Ka e meghere ụzọ, Ndịàmà Jehova zigara gwongworo ndị a kwajuru ihe na ha n’ebe ndị dịpụrụ iche n’akụkụ ugwu bụ́ ndị ala ọma jijiji ahụ kpara aka ọjọọ.

Ndị na-amụ Bible na-aghọta na e buru n’amụma eri ogologo oge gara aga na a ga-eji “ala ọma jijiji [nke ga-eme] n’ebe dị iche iche” mara mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a. (Matiu 24:7) Ma Bible na-eme ka e nwee obi ike na n’oge na-adịghị anya, n’okpuru ịchịisi udo nke Alaeze Chineke, ihe a kpọrọ mmadụ agaghịzi ebi n’egwu n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha. N’oge ahụ ụwa ga-abụ paradaịs n’ezie.—Aịsaịa 65:17, 21, 23; Luk 23:43.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 N’ụzọ dị iche, ala ọma jijiji ahụ kpatara ọdachi bụ́ nke mere na Turkey n’August 1999 ruru 7.4 n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, n’agbanyeghị nke ahụ ọnụ ọgụgụ mmadụ o gburu ji okpukpu asaa ma ọ dịkarịa ala karịa ndị nke ahụ mere na Taiwan gburu.

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ndịàmà Jehova na-enwe nzukọ ha ka ha bi n’ụlọikwuu

[Foto dị na peeji nke 25]

Ala ọma jijiji ahụ mebiri ọtụtụ ụzọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

San Hong R-C Picture Company

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

San Hong R-C Picture Company

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ala ọma jijiji dị na peeji nke 23-25: E nwetara ọnụ ọgụgụ site n’aka Ụlọ Ọrụ Nnyocha Ala Ọma Jijiji nke Berkeley