Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Enyemaka Iji Kwụsị Ime Isi Ike

Ihe Enyemaka Iji Kwụsị Ime Isi Ike

Ihe Enyemaka Iji Kwụsị Ime Isi Ike

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA FRANCE

IHE ndị mere na nso nso a emewo ka oké ịda iwu e nwere n’ọtụtụ n’ime ógbè ndị mepere emepe na France bụ́ ndị na-enwechaghị ihe ndị e ji enyere ndụ aka, pụta ihè. Dị ka magazin a na-ebipụta na France bụ́ L’Express si kwuo, “ihe ike a na-eme n’ebe ndị mepere emepe afọwo nke nta ka ọ mụbaa okpukpu ise n’ime afọ isii.” Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-etinye aka na mpụ ime ihe ike amụbawo nke ukwuu.

Tụkwasị n’imebisi ihe, ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ, ịpụnara mmadụ ihe, ịgba ihe onwunwe ọkụ, na ohi, ndị isi ike anọwo na-awakpo ndị nnọchiteanya nke Ọchịchị kpọmkwem. A na-awakpo ndị uwe ojii, ndị ọrụ mmenyụ ọkụ, na ndị ọrụ ụgbọ njem ọha na eze, tinyere ndị ọzọ.

N’ihi gịnị ka e ji nwee ime ihe ike n’ụzọ dị ukwuu? “N’ihi ndakpọ ezinụlọ, ọ bụ nnupụisi megide ịbụisi nile,” ka mmadụ abụọ bụ́ ndị ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze na-akọwa. Ha na-ezokwa aka “ná mmetụta [ndị ntorobịa] na-enwe nke ịbụ ndị ndị ọchịchị leghaara anya,” nakwa nke enweghị “atụmanya nke ọdịnihu nwere nzube.”

Ndịàmà Jehova na-ezi ozi ọma mgbe nile banyere olileanya dị na Bible n’ebe ndị a na-enwekarị ime isi ike. N’otu ihe omume e mere na nso nso a n’ụlọ ọrụ telivishọn dị na France, otu odeakụkọ kwuru, sị: “Ndịàmà Jehova na-ejegharị n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ na n’ebe ndị na-enwechaghị ihe ndị e ji enyere ndụ aka—ebe ndị yiri ka a ga-asị na ndị ọrụ ebere, ndị uwe ojii, na gọọmenti hà elegharawo ha anya. N’ụlọ na n’okporo ámá ndị a, ha na-agwa ndị mmadụ okwu ma na-ege ha ntị.” Ọrụ ha na-enwe mmetụta dị mma, dị ka akwụkwọ ozi a na-esonụ sitere n’aka otu nwa okorobịa na-agụ Teta! na-egosi.

“Ọ ga-amasị m iji obi m nile kelee unu maka mbipụta unu dị iche iche. Ọ bụghị nanị na unu enyeworo mụ onwe m aka kama mmekọrịta mụ na ndị mụrụ m adịwo mma karị. Adị m nanị afọ 16 ma bụrụ onye Alakụba.

“Ihe m chọrọ ikwu bụ na unu enwewo ihe ịga nke ọma n’ime ka m ghara ịbụkwa onye isi ike. N’ihi ya, m na-eme nnọọ ihe ndị kwekọrọ n’okpukpe m, ma ana m agụkwa Bible. N’ihi unu, ana m agakwa n’ihu n’agụmakwụkwọ m. Ọzọkwa, unu enyeworo ọtụtụ ndị agbata obi m aka ịkwụsị ime isi ike site na magazin unu—bụ́ ndị m na-enyetụ ha kwa ọnwa. M na-ekele unu nke ukwuu, ejikwa m unu ụgwọ ekele.”