Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe Kasị Ihe Nile Bi n’Oké Ọhịa Maa Mma”

“Ihe Kasị Ihe Nile Bi n’Oké Ọhịa Maa Mma”

“Ihe Kasị Ihe Nile Bi n’Oké Ọhịa Maa Mma”

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SWEDEN

AHỤRỤ m ya nke mbụ n’otu ụbọchị na June—“ihe kasị ihe nile bi n’oké ọhịa maa mma,” dị ka ụfọdụ ndị na-akpọ ya ebe a. Nke a bụ nnukwu ikwiikwii na-acha ntụ ntụ, ma ọ bụ ikwiikwii Lapland, dị ka a na-akpọ ya mgbe ụfọdụ.

Nnukwu ikwiikwii a mara mma na-ebi n’akụkụ nile nke Finland na n’ebe ugwu Sweden nakwa n’ime ime ebe ọwụwa anyanwụ Siberia, Alaska, na Canada. Ọ na-ebi n’ebe zoro ezo, ọ na-esikwa ike nchọta ma ọ bụrụ na ị maghị ebe akwụ́ ya dị. Ozugbo ị chọtara akwụ́ ya, ị ga-ahụkwa na ikwiikwii ahụ adịghị nnọọ atụ ụjọ.

Ileru Ọchụ Ntá Anya

Eleruru m oké ikwiikwii Lapland ahụ tụrụ àgwà mara mma anya ka ọ na-achọ nri. Na mberede, o si n’alaka osisi fepụ iji jide òké. Ò jidere ya? Ee! Ahụrụ m ka o ji ụkwụ kpagide ntakịrị òké ka o ji nwayọọ felie n’ụzọ dị ebube, na-agbasa nku ya ruru sentimita 140.

Ikwiikwii Lapland a adịghị abụkebe ụmụ n’afọ nile dị ka ọtụtụ ikwiikwii ndị ọzọ na-eme. Nnukwu ikwiikwii a na-eri nanị ụmụ ntakịrị òké, ya mere n’afọ ụfọdụ, mgbe òké ndị a dị ụkọ, ha na-akwụsị ịbụ ụmụ kpam kpam. N’ime afọ ndị ọzọ, mgbe nri hiri nne, a pụrụ inwe ụmụ anọ ma ọ bụ karịa n’otu akwụ́.

Ịhọrọ Oké

Oge opupu ihe ubi bụ oge oké ikwiikwii ji agbà nke nne, nke nne na-ejikwa nlezianya ahọrọ nke oké, ma otú nke oké maruru ná mma abụghị isi ihe dị ya mkpa—dị ka ọ pụrụ ịdị ọtụtụ ndị inyom bụ́ mmadụ. Dị ka nchọpụta nke ndị na-amụ banyere nnụnụ na-egosi, nke oké aghaghị igosipụta na ya nwere nkà n’ịchụ ntá. Tupu ha emee atụmatụ ọ bụla maka ezinụlọ, ọ ghaghị inye nke nne nri.

Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ òké, nke oké enweekwa nkà dị ka “onye na-akpa afọ,” nri ọ na-enye nke nne ga-eme ka o buo ibu. Ibu a o bukwuru na-abụrụ ahụ ya ihe mgbaàmà, na-egosi àkwá ole ọ ga-eyi.

Ọ bụzi ọrụ dịịrị nanị nke oké ịchụ ntá, bụ́ nke chọrọ ume ọrụ dị ukwuu. Ubé nke nne ahụ na-akpali ya, ebe ọ bụ na ume ọrụ ya dum bụ maka iyi àkwá na ilekọta akụ̀ ndị a bara uru.

Ịchọta Ebe Akwụ́ Ha Dị

Eji m enyo e ji ahụ ihe dị anya na-ekiri ka nke oké ahụ mara mma na-ebu nri na-efefe ugboro ugboro. Emesịrị m chọta ebe akwụ́ ahụ dị. Ikwiikwii Lapland adịghị akpa akwụ́ nke ha kama ha na-ewegharakarị akwụ́ ndị nnụnụ ndị ọzọ ha na-eri bụ́ ndị bi n’oké ọhịa ji osisi kpaa. Ọ bụrụ na akwụ́ adịghị, ikwiikwii pụrụ ibi na mkpọrọgwụ osisi e gbuturu egbutu.

N’akwụ́ ha, ahụrụ m ụmụ abụọ ha ka na-epupụta ábụ́bà bụ́ ndị kporopụrụ anya na-ele ihe ọ bụla nọ ha nso. Ka ha na-ebe ubé n’otu olu, ha lewere anya n’ebe nne ha nọ, bụ́ nke nọ nso na-ekiri ihe na-emenụ. Ịga ụmụ ha oké nso n’oge a pụrụ ịdị ize ndụ. Ọ bụrụ na nke nne echee na ihe ga-eme ụmụ ya, ọ ga-efere bịa n’emeghị mkpọtụ ma jiri ụkwụ ya nwere mbọ dị ka agịga lụso onye ahụ gara ha nso ọgụ. Ya mere ọ dị mkpa ịkpachara anya ma nọpụ anọpụ otú kwesịrị ekwesị iji leruo ikwiikwii anya.

Inye Ha Nri na Ịzụ Ha

Mgbe o rutere n’akwụ́ ahụ, nke oké ahụ ji ọnụ ya tụrụ nri ahụ n’ụkwụ ya ma nye otu n’ime ụmụ ha òké ahụ. Inye otu nwa ha nri na-eme ka nke nri ga-erute mgbe ọzọ tie mkpu na-ada oké ụda.

Mgbe nwa ha risịrị nrị ahụ ọ chọrọ iri, ọ na-agbanwe omume ya n’ụzọ na-afọ nke nta ka ọ na-atọ ọchị. Ihu ya, bụ́ nke gbasara agbasa ma dị mma tupu mgbe ahụ, na-agbanwe na mberede, nwa nnụnụ ahụ na-amalitekwa ime ka a ga-asị na mmanya na-egbu ya! Ume nile o nwere na-abụ maka ime ka nri ahụ gbarie, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-adịzi ntakịrị nke na ihe ga-afọdụ bụ ikpo ábụ́bà ndị na-esighị ike. Ma nwanne ya nke bu ya ụzọ rie nri ejiriwo nwayọọ nwayọọ na-emeghe anya ya, ọ na-amalitekwa inwere onwe ya pụọ n’ogbugbu nri ahụ na-egbu ya ka mmanya.

Ọ ga-adịgide otú a ruo etiti June. Ka ọ na-erule mgbe ahụ ụmụ ha ga-adị ọnwa anọ, ha pụkwara ifepụtụ n’akwụ́ ha ka nne ha na-eji ubé ya na-agba ha ume. Ná mbụ, ha na-eji nkà dị ukwuu agagharị n’osisi ahụ. N’ebe ahụ anụmanụ ndị na-eri ha na-adịkebeghị dị ka ha dị n’ala.

Ka oge na-aga, ụmụ nnụnụ ahụ na-efegharị n’alaka osisi dị iche iche, wee si otú a na-amụ ufe. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ha na-amụta nkà ife efe na ịchụ ntá n’enwetaghị enyemaka. Ọdịdị ha na-agbanwekwa, ka e wee nwee ike ilekwa ha onwe ha anya dị ka ‘ihe ndị mara mma bi n’oké ọhịa.’

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 28]

© Joe McDonald

© Michael S. Quinton

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 29]

© Michael S. Quinton

© Michael S. Quinton