Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Akụkọ Kasị Ọhụrụ Banyere Agụụ Dị n’Ụwa

“Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) na-eme atụmatụ na ihe dị ka ọkara nke ndị bi ná mba nile—ndị bara ọgaranya na ndị dara ogbenye—na-ahụju anya n’ihi otu ụdị nke erighị ezigbo nri ma ọ bụ ọzọ,” ka State of the World 2000 na-akọ. A na-eme atụmatụ na ijeri mmadụ 1.2 n’ụwa nile adịghị eri ihe na-edozi ahụ. Ọzọkwa, a na-ekwu na ọtụtụ ijeri ndị ọzọ nọ ‘n’agụụ na-apụtaghị ìhè,’ bụ́ nke na-ezo aka ná ndị yiri ka ha na-eri nri nke ọma ma bụrụ ndị enweghị vitamin na mineral ndị dị oké mkpa mere ka ha ghara inwe ahụ ike. “Echiche na-ezighị ezi a ka nwere taa bụ na ọ bụ ụkọ nri na-akpata agụụ,” ka Ụlọ Ọrụ Worldwatch, bụ́ nke na-ewepụta akụkọ State of the World kwa afọ, na-ekwu. “Nke bụ eziokwu bụ na ihe na-akpata agụụ bụ mkpebi ndị mmadụ na-eme . . . Ma ndị mmadụ hà na-ebi ndụ dịtụ mma, na-enye ndị inyom ọnọdụ, nakwa ma gọọmenti ọ̀ na-elekọta ndị ha na-achị anya—ha bụcha ihe ndị na-ekpebi ma ndị mmadụ hà ga-enweta ihe oriri ma ọ bụ na ha agaghị enweta, ọ bụghị ụdị ihe oriri ndị mba nwere na-akpata ya.”

Igbu Onwe Onye na France

“Pasent 30 nke ndị toworo eto na France echetụwo echiche igbu onwe ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Monde na-akọ. N’ime ndị a gbara ajụjụ ọnụ ná nnyocha mbụ a e metụworo na France banyere mmadụ igbu onwe ya, pasent 13 kwuru na ha echesiwo echiche ike igbu onwe ha, pasent 17 ọzọ kwetakwara na ha echetụwo banyere ya. Otú ọ dị, dị ka Michel Debout, bụ́ prọfesọ nkà mmụta ọgwụ e ji eme nchọpụta n’ụlọ ọgwụ mahadum dị na Saint-Étienne, si kwuo, ezi ọnụ ọgụgụ ya karịrị nnọọ nke ahụ, n’ihi na ọtụtụ ndị na-ezochikarị echiche ndị dị otú ahụ n’ihi inwe obi amamikpe. Ihe ka ọtụtụ ná ndị ahụ a jụtara echiche ha na-ele igbu onwe onye anya dị ka “omume na-egosi enweghị nchekwube” bụ́ nke nsogbu mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-akpata, kama ịbụ ọnọdụ ezinụlọ. Kwa afọ, a na-enwe mmadụ 160,000 na-anwa igbu onwe ha na France nakwa ihe dị ka mmadụ 12,000 gburu onwe ha.

Ịhọrọ Nkwenkwe Okpukpe Masịrị Onye

Otu nchọpụta onye na-ajụta echiche ọha bụ́ George Gallup, Jr., mere na-egosi na ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ na United States na-ele okpukpe anya dị ka “egwú a gwara ọgwa.” Kama inwe “nkwenkwe ndị dịwara kemgbe ụwa, ndị [Ebe Ugwu] America ‘na-ahọrọ’ ihe ha chọrọ ikwere, mgbe mgbe na-agwakọta echiche dị iche iche si n’otu okpukpe ma ọ bụ agwakọta nkwenkwe okpukpe abụọ ma ọ bụ karịa, ịbụ nke ha kweere,” ka akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ National Post na-akọ. Nnyocha ahụ na-egosikwa na “enweghị ihe ọmụma banyere Bible, nkwenkwe ndị bụ́ isi na ọdịnala nke okpukpe mmadụ na-apụta nnọọ ìhè” nakwa na “mgbe mgbe okpukpe ha na-ekpe bụ nke elu ọnụ, na-amaghị ihe ndị ha kweere ma ọ bụ ihe mere ha ji kwere ha,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Reginald Bibby, bụ́ prọfesọ nkà mmụta mmekọrịta ọha na eze na Mahadum Lethbridge, Alberta, Canada, na-ekwu, sị: “Ihe ka n’ọtụtụ ndị mmadụ ka na-anabata omenala ndị kasị ewu ewu nke okpukpe Katọlik na Protestant, ma na-ahọrọ nkwenkwe, omume, na ememe ndị ha ga na-agbaso—dị ka baptism, agbamakwụkwọ, na olili ozu.”

“Ọ Gara Nzukọ”

N’ajụjụ ọnụ a gbara ndị odeakwụkwọ 148 bụ́ ndị na-arụrụ ndị isi ụlọ ọrụ ndị a ma ama ọrụ, pasent 47 kwuru na o nwewo mgbe nna ha ukwu gwara ha ka ha ghaara ndị ọzọ ụgha, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal na-akọ. Otu odeakwụkwọ, nke na-arụ ọrụ n’ụlọ ahịa na Texas, kwuru na iji jigide ọrụ ya ruo afọ 30, na ya abụrụwo onye na-aghaghị ịgwa ndị na-akpọ na fon na nna ya ukwu “gara nzukọ,” ọbụna mgbe ọ nọ nanị ya n’ọfịs ya. Ụgha ụfọdụ pụrụ ịkpata nsogbu karị, dị ka ịgwa nwanyị na ị maghị ebe di ya pụrụ apụ gara. A chụrụ otu odeakwụkwọ n’ọrụ mgbe ọ gwara onye kpọrọ na fon eziokwu na e zigabeghị akwụkwọ ndọrọ ego e kwesịrị iziga tupu mgbe ahụ.

È Kwesịrị Iji Snow Kpụọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike?

Nnukwu snow dara n’Israel n’oge oyi gara aga emewo ka a jụọ ndị Juu bụ́ ndị Ọtọdọks n’ebe ahụ ajụjụ ụfọdụ siri ike: Ò kwesịrị ekwesị ka ndị mmadụ na-atụrịta onwe ha snow a kpụrụ akpụ n’Ụbọchị Izu Ike? Gịnị banyere iji snow akpụ mmadụ? Dị ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ IsraelWire si kwuo, onye bụbu onyeisi ndị rabaị n’Israel, bụ́ Mordehai Eliyahu, echepụtawo ụkpụrụ ụfọdụ ga-eduzi ndị okpukpe na-amachaghị nke kwesịrị na nke na-ekwesịghị. Onye rabaị ahụ kọwara na iji snow akpụ mmadụ bụ “ọrụ,” ọbụna ma ọ bụrụ na ọ bụ maka nanị egwuregwu. N’ihi ya ihe a so n’ihe ndị a na-agaghị eme n’Ụbọchị Izu Ike. N’aka nke ọzọ, ndị mmadụ ịtụrịta onwe ha snow a kpụrụ akpụ abụghị ọrụ, n’ihi ya kwa o ziri ezi. Otú ọ dị, ọ dabeere n’otu ihe. Ndị nile so atụ ya aghaghị ikwekọrịta n’egwuregwu ahụ, bụ́ nke na-agụpụ ịtụ ndị na-agafe agafe snow a kpụrụ akpụ.

Ụbụrụ Ndị Meworo Okenye Hà Na-enweta Mkpụrụ Ndụ Akwara Ndị Ọhụrụ?

“Ruo ọtụtụ iri afọ, e chere na ndị mmadụ na-enwezu mkpụrụ ndụ ụbụrụ nile ha kwesịrị inwe ma a mụọ ha,” ka The New York Times na-ekwu. Ọ bụ ezie na laa azụ na 1965, nchọpụta e mere n’anụmanụ ụfọdụ gosiri na ụbụrụ ha na-enweta mkpụrụ ndụ akwara ndị ọhụrụ, ọtụtụ ndị ọkà ọrịa akwara ahụ kweere na nke a adịghị eme n’ahụ mmadụ. Otú ọ dị, n’afọ iri gara aga, e nwewo ihe àmà dị ukwuu na-egosi na ụbụrụ na-emepụta mkpụrụ ndụ akwara ndị ọhụrụ nakwa na ọ pụrụ ịdị na-eme onwe ya ka ọ dịghachi ọhụrụ mgbe nile. N’afọ gara aga ndị nchọpụta chọpụtara na ụbụrụ mmadụ na-enweta mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ n’akụkụ ya nke ihe ọmụma na-adịghị anọte aka na ya. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị kwenyere ugbu a na “ọ pụrụ ịbụ na ụbụrụ na-emezigharị onwe ya oge nile.”

E Jikọọ Mmetọ Ụmụaka na Oké Nchekasị

“Ndị inyom a na-etikarị ihe ma ọ bụ e metọrọ n’ụzọ mmekọahụ mgbe ha bụ ụmụaka pụrụ inwe nchekasị dị mgbagwoju anya ná ndụ ha nile,” ka The Dallas Morning News na-akọ. Ndị nnyocha nọ na Mahadum Emory dị n’Atlanta ji ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ọgwụ ahụ na-akpata nchekasị na otiti nke obi ndị inyom e metọrọ n’oge gara aga tụnyere nke ndị inyom a na-emetọghị, mgbe ndị inyom ahụ na-arụ ọrụ na-akpata nchekasị. Ndị e metọrọ mgbe ha bụ ụmụaka nwere nnọọ ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke mmiri ọgwụ ahụ na-akpata nchekasị nakwa otiti dị ngwa ngwa nke obi ha n’oge ha nwere nchekasị. Ndị nnyocha ahụ kwubiri na “ọ pụrụ ịbụ na mmiri ọgwụ na-emebi kpam kpam ụzọ ha si emeghachi omume ma ha nwee nchekasị nakwa ụzọ ha sị ebelata ya,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.

Akpa Ndị Dị Arọ A Na-anya n’Azụ

Nnyocha Òtù Ndị Dọkịta Na-agba Ọkpụkpụ n’America mere, egosiwo na e nwere njikọ chiri anya dị n’etiti azụ mgbu na ubu mgbu nke ụmụaka na-enwe na akpa ndị dị arọ ụmụaka ụfọdụ na-anya n’azụ. Mgbe ha ji akwụkwọ ha na-agụ n’ụlọ akwụkwọ, nri na ihe ọṅụṅụ, ngwá egwú na ákwà mgbanwe fojusịa akpa ha na-anya n’azụ, ụmụaka ụfọdụ na-eburu ibu na-eru kilogram 18 n’arọ. Ndị dọkịta na-agwọ ọrịa ụmụaka na-adọ aka ná ntị na ụmụaka na-aga ụlọ akwụkwọ elementrị pụrụ imesị nwewa oké azụ mgbu, tinyere ịgba ngọ nke ọkpụkpụ azụ, ma ọ bụrụ na ha na-ebu ibu ndị dị arọ otú ahụ na-aga akwụkwọ kwa ụbọchị. Ndị ọkachamara ụfọdụ na-atụrụ ndị isi ụlọ akwụkwọ na ndị nkụzi aro ka arọ akpa nwata akwụkwọ na-anya n’azụ ghara ịkarị pasent 20 nke arọ nwata ahụ ma ọ bụ ka akpa a na-anya n’azụ “nwee ihe mkpọre, nwee belt a ga-eji na-ekegide ya n’úkwù, nweekwa ọbụna fom n’akụkụ na-emetụ nwata n’azụ,” ka akwụkwọ akụkọ Mexico City bụ́ Excelsior na-akọ.

Mmanya—Gbara Narị Afọ Atọ

A hụrụ karama mmanya abụọ n’ikpo ụlọ e bibiri na 1682 na London, ka The Times nke London na-akọ. Ihe e ji kwụchie ọnụ otu emebiela, mmanya dị ya n’ime agbaakwala ụka; ma ihe e ji kwụchie nke ọzọ bụ́ nke e kedoro waya na wax, ka dị nnọọ otú ọ dị mgbe e kwụchiri ya. N’oge a na-eme nnwale mmanya pụrụ iche bụ́ nke Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie dị na London mere, ndị ọkachamara n’ihe banyere mmanya nwalere ụfọdụ n’ime mmanya ndị ahụ gbara ọtụtụ narị afọ bụ́ ndị ha ji ntụtụ mịpụta. Ha kwubiri na ọ pụrụ ịbụ mmanya ọkụ Madeira, ha kwukwara na ụtọ ya “agbanwebeghị, na ọ dị mma n’ọnụ, na-agụ agụụ ma bụrụ ịgba.”

Osimiri Ụwa Nọ n’Oké Nsogbu

“Ihe karịrị ọkara nke osimiri ndị kasị ibu n’ụwa na-ata ata ma ọ bụ bụrụ ndị e metọrọ emetọ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today na-akọ. E mewo ka ọtụtụ ọwara mmiri “talata nke ukwuu ma bụrụ ndị e metọrọ emetọ” n’ihi iji ha eme ihe n’ụzọ gabigara ókè nakwa n’ihi mmebi ala na mmiri, ka Òtù Na-ahụ Maka Mmiri n’Ụwa Maka Narị Afọ nke 21 na-ekwu. Mmebi a na-emebi ihe ndị a sitere n’okike “na-eyi ahụ ike ụmụ mmadụ na mmiri ha na-agba n’ubi, na-aṅụ aṅụ na nke ha ji eme ihe n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe, egwu,” ka òtù ahụ na-ekwu. Ọ dị mma ịmara na n’ime osimiri 500 kasị ibu n’ụwa nile, osimiri abụọ “kasị ọcha” bụ Amazon dị n’Ebe Ndịda America na Congo dị n’Africa. Gịnị kpatara ya? “E nwere ụlọ ọrụ mmepụta ihe ole na ole dị n’akụkụ ha abụọ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.