Mgbalị Loida Mere Ikwu Okwu
Mgbalị Loida Mere Ikwu Okwu
Dị ka mama Loida si kọọ
DỊ KA ọ na-adị nwanyị ọ bụla dị ime, enwere m nchegbu na nwa m pụrụ inwe nkwarụ ma m mụọ ya. Ma, atụghị m anya ákwá na-agbawa obi nke Loida, bụ́ nwa m nke atọ, kwara mgbe ọ pụtara ụwa. N’amaghị ụma, dọkịta ji mkpà o ji ejide ihe gbajie ọkpụkpụ olu Loida. Izu ole na ole mgbe a wasịrị ya ahụ iji gbaa ọkpụkpụ ahụ, a kpọlara Loida. Otú ọ dị, ọṅụ anyị adịteghị aka.
N’ime ọnwa ole na ole sochirinụ, ọ bịara doo anya na nnukwu nsogbu dị. Ọgwụ Loida na-aṅụ na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ ya—gụnyere ahụ ọkụ, otoro, na ihe ọdịdọ—ọgwụ a na-enyekwa ya maka mgbaàmà ndị a, yiri ka ọ na-eme ka ahụ ya ka njọ. N’oge na-adịghị anya Loida apụghị ịchịkwa mmegharị ahụ ya. N’ikpeazụ ndị dọkịta gwara anyị na Loida na-arịa ọrịa ụbụrụ. Ha kwuru na ọ gaghị aga ije ma ọ bụ kwuo okwu—ma ọ bụ ọbụna mata anyị.
Mgbalị Ndị Mbụ M Mere Iso Ya Kwurịta Okwu
N’agbanyeghị enweghị nchekwube, ọ ka dị m ka Loida ọ̀ pụrụ ịghọta ọtụtụ ihe. N’ihi ya ana m agụrụ ya akwụkwọ ndị dị mfe ma na-agbalị ịkụziri ya mkpụrụ okwu. Ma Loida apụghị ikwu okwu, ọ pụghịkwa ime ihe na-egosi na ọ na-aghọta ihe m na-ekwu. Ọ dịghị ụzọ isi mata ihe ọ pụrụ ịghọta—ma ọ bụrụ na ọ dị.
Ka ọtụtụ afọ na-aga, mgbalị ndị m na-eme ịkụziri Loida ihe yiri ka ọ dịghị arụpụta ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, ana m etinye ọtụtụ awa n’ịgụrụ ya ihe. Anyị na-eme ọbụna ka o sonyere anyị n’ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị na Noemí, bụ́ nwa anyị nwanyị nke obere, na-eji akwụkwọ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti na Akwukwọm nke Akukọ Bible, enwe. * Ana m agụrụ Loida ọtụtụ n’ime isiakwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ ndị a ugboro ugboro.
Enweghị ike iso onye ị hụrụ n’anya kwurịta okwu na-akụda obi n’ezie. Ọ bụrụ na m kpọrọ Loida gaa n’ogige ntụrụndụ, ọ na-akwasi ákwá ike. N’ihi gịnị? Ọ dị m ka ọ na-enwe mwute n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ọ pụghị ịgba ọsọ ma na-egwuri egwu dị ka ụmụaka ndị ọzọ. N’otu oge, anya mmiri malitere ịgba Loida mgbe nwanne ya nwanyị gụọrọ m ihe n’akwụkwọ a na-agụ n’ụlọ akwụkwọ. O doro anya na ọ dị ihe na-enye ya nsogbu, ma amaghị m ihe ọ bụ. Ihe Loida na-emedebe bụ ikwu ihe ole na ole mmadụ na-apụghị ịghọta, bụ́ ndị o ji ekwu ihe ndị bụ́ isi na-akpa ya bụ́ ihe oriri, mmiri, àkwà, ma ọ bụ mposi.
Mgbe ọ dị afọ itoolu, Loida malitere ịga ụlọ akwụkwọ maka ụmụaka nwere mkpa ndị pụrụ iche. Otú ọ dị, n’afọ atọ sochirinụ ọnọdụ ya bịara ka njọ. Ọ na-atụ ụjọ ọbụna ịzọpụ ụkwụ
ugboro ole na ole n’enweghị onye na-enyere ya aka, ọ fọkwara obere ka ọ kwụsị ikwu okwu. Mụ na di m kpebiri na ọ ga-aka mma ịkụziri Loida ihe n’ụlọ.N’afọ isii sochirinụ, akụziiri m Loida ihe ruo n’ókè m nwere ike. Edere m mkpụrụ akwụkwọ na bọọdụ ide ihe, na-eche na Loida ga-edepụtaghachi ya. Mgbalị ndị m mere kụrụ afọ n’ala. Ọ̀ bụ enweghị ike ịghọta ihe kpatara ya, kà ọ bụ na Loida apụghị ide ihe n’ihi na aka ya na-ama jijiji?
Mgbe ọ na-erule afọ 18, Loida bịara sie ike nlekọta nke na m kpegaara Jehova ekpere n’ụzọ siri ike, na-arịọ ya ka o nyere m aka isoro nwa m kwurịta okwu. A zara ekpere m n’ụzọ m na-atụghị anya ya.
Ikwu Okwu
Ihe gbanwere mgbe ụmụ m ndị nwanyị na-agbanwe ihe ndị e ji chọọ ime ụlọ ihi ụra anyị mma. Tupu ha adọkapụ akwụkwọ a mapawaburu n’ahụ ụlọ ahụ, Noemí dere aha ụfọdụ n’ahụ ụlọ ahụ—aha ndị dị na Bible na aha ndị enyi na ndị ezinụlọ anyị. N’ịchọ ịmata ihe ọ ga-eme, nwa m nwanyị bụ́ Rut jụrụ Loida ma ọ maara ebe e dere “Jehova.” N’ụzọ juru ya anya, Loida gara n’ahụ ụlọ ahụ ma debe isi ya n’akụkụ ebe e dere aha Chineke. Rut chọrọ ịma ma Loida ọ ga-akọta aha ndị nke ọzọ, n’ihi ya o lere ya ule. N’ịbụrụ Rut ihe ijuanya, Loida kọtara nke ọ bụla n’ime ha—ọbụna aha ndị ọ na-ahụtụbeghị ka e depụtara ha! Rut kpọrọ ezinụlọ anyị nile ka anyị jiri anya anyị hụrụ. Loida ma agụ ihe!
Ka oge na-aga, anyị chepụtara ụzọ ga-enyere Loida aka ịgwa anyị “okwu.” Anyị mapawara mkpụrụ akwụkwọ n’ahụ paseji anyị dị ogologo. Ịmapawa mkpụrụ akwụkwọ ndị dị nta na bọọdụ a ga na-ejide n’aka agaghị adị mma, n’ihi na Loida adịghị eweliteli aka ya iji tụọ mkpụrụ akwụkwọ nke ọ bụla aka. N’ihi ya ọ bụrụ na Loida achọọ ịgwa anyị ihe, ọ ga-egosi ihe ọ chọrọ ịgwa anyị site n’ịgaru n’akụkụ mkpụrụ akwụkwọ nke ọ bụla ọ chọrọ n’ahụ ụlọ. Dị ka ị pụrụ iche, nke a ga na-agwụ nnọọ ike. N’eziokwu, Loida aghaghị ịga ọtụtụ kilomita iji gosi ihe ọ chọrọ ikwu, ọ pụkwara iwe ya ọtụtụ awa iji gosichaa ya!
Otú ọ dị, Loida nwere obi ụtọ inwe ike ịgwa anyị “okwu.” N’eziokwu, nke a bụ ihe mbụ ọ gwara anyị: “Obi dị m nnọọ ụtọ na apụrụ m ịgwa mmadụ okwu ugbu a site n’enyemaka Jehova.” N’ịbụ ndị nwere ihe ijuanya, anyị jụrụ Loida, sị: “Gịnị ka ị na-eme oge nile ahụ ị na-anọdụ ogologo ụbọchị dum?” Loida gwara anyị na ya na-eche ihe ya chọrọ ịgwa anyị n’obi ya. N’ezie, Loida kwuru na ọ gụsiwo ya agụụ ike ịgwa anyị okwu eri afọ 18. “Mgbe Rut malitere ịga akwụkwọ,” ka o kwuru, “ana m agụrụ onwe m akwụkwọ ọgụgụ. Ana m emegharị ọnụ m, na-ekwu ihe ụfọdụ, ma unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu. Ọ bụ ya mere m na-eji amalite ịkwa ákwá mgbe nile.”
Eji m anya mmiri rịọ ya mgbaghara maka aghọtachaghị ihe ọ na-ekwu. Loida zaghachiri, sị: “Ị bụ ezigbo nne, ị daghịkwa mbà. Anọwo m na-enwe obi ụtọ n’ihi gị. Ahụrụ m gị n’anya nke ukwuu. N’ihi ya akwazila ákwá. Ị̀ nụla?”
Ọganihu Ime Mmụọ
Loida enweworị ihe ọmụma nke Bible, o buruwokwa amaokwu ụfọdụ nke Bible n’isi. Ma n’oge na-adịghị anya ọ gwara anyị na ya chọrọ ịza ajụjụ n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọgbakọ anyị, bụ́ ntụle ajụjụ na azịza dabeere na Bible nke a na-eme kwa izu. Olee otú ọ ga-esi mee nke a? Otu n’ime anyị ga-agụrụ ya isiokwu ahụ nile. Mgbe ahụ Loida ga-ahọrọ ajụjụ nke ọ chọrọ ịza. Anyị ga-edetu azịza ya ka ọ na-egosi anyị ya. Mgbe ahụ, ná nzukọ, otu n’ime anyị ga-agụpụta azịza Loida. “Ọ bụụrụ m ihe
obi ụtọ inwe ike ikere òkè,” ka Loida gwara anyị otu oge, “n’ihi na ọ na-eme ka m nwee mmetụta nke ịbụ akụkụ nke ọgbakọ.”Mgbe ọ dị afọ 20, Loida kwupụtara ọchịchị ya ịbụ onye e mere baptism. Mgbe a jụrụ ya ma ọ maara ihe mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova pụtara, Loida zaghachiri na ya emewo ya afọ asaa gara aga—mgbe ọ dị nanị afọ 13. “Ekpegaara m Jehova ekpere,” ka o kwuru, “agwakwara m ya na m chọrọ ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi.” N’August 2, 1997, Loida gosipụtara nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site na baptism ime mmiri. “Ekele dịrị Jehova,” ka Loida gwara anyị, “emewo m ihe na-agụsi m agụụ ike ime!”
Loida na-enwe obi ụtọ ịgwa ndị ikwu na ndị agbata obi anyị banyere Alaeze Chineke. Mgbe ụfọdụ ọ na-eso anyị ka anyị na-eme nkwusa nye ndị mmadụ n’okporo ámá. O dewokwa akwụkwọ ozi anyị na-edebe n’ọnụ ụzọ mgbe mmadụ na-anọghị n’ụlọ. Loida na-enwe mmasị pụrụ iche n’ebe ndị agadi na ndị ọrịa nọ. Dị ka ihe atụ, o nwere otu nwanna nwanyị nọ n’ọgbakọ anyị e bere ụkwụ. “Amaara m ihe ọ pụtara ịbụ onye na-enweghị ike ịga ije,” ka Loida gwara anyị, n’ihi ya kwa o degaara nwanna nwanyị a akwụkwọ ozi agbamume. E nwekwara Jairo, bụ́ nwa okoro nọ n’ọgbakọ ọzọ, bụ́ onye nwere ahụ mkpọnwụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ site n’isi ya gbadata. Mgbe Loida nụrụ banyere ọnọdụ ya, o degaara ya akwụkwọ ozi. Akụkụ ya ụfọdụ kwuru, sị: “N’oge na-adịghị anya Jehova ga-eme ka anyị gbakee. Nhụjuanya agaghị adị na Paradaịs. Mgbe ahụ m ga-ama gị aka n’ọsọ. Ana m achị ọchị n’ihi na ọ ga-abụ ihe obi ụtọ dị ukwuu. Iche na anyị ga-adị otú Jehova kere anyị, n’arịaghị ọrịa . . . Ọ̀ bụ na nke ahụ abụghị ihe magburu onwe ya?”
E Nyeere Ya Aka Ịtachi Obi
Aghọtala m ọtụtụ ihe ugbu a banyere àgwà Loida na-akpa n’oge gara aga bụ́ nke na-agbagwoju m anya. Dị ka ihe atụ, Loida kwuru na mmadụ ibi ya ọma adịghị amasị ya mgbe ya dị obere n’ihi na ya nwere nnọọ nkụda mmụọ. “O yiri nnọọ ihe na-ezighị ezi na ụmụnne m ndị nwanyị na-ekwu okwu ma na-amụta ihe ndị m na-apụghị ịmụta,” ka o kwuru. “Iwe na-ewe m nke ukwuu. O nwere oge mgbe ọ gaara akara m mma ma a sị na m nwụrụ anwụ.”
N’agbanyeghị na o nwere onyinye nke ịgwa mmadụ okwu, Loida na-eche ọtụtụ ihe ịma aka ihu. Dị ka ihe atụ, kwa ọnwa ma ọ bụ karịa ihe ọdịdọ na-adọ ya ọtụtụ ugboro bụ́ mgbe ọ na-adị ka ihe ọ gbagidere ya n’akpịrị, aka na ụkwụ ya ana-emegharị n’ụzọ na-enweghị nchịkwa. Ọzọkwa, ọrịa ọ bụla—ọbụna obere oyi—na-eme ka ike gwụ ya nke ukwuu. Site n’oge ruo n’oge Loida na-enwe ịda mbà n’obi n’ihi ọnọdụ ya. Gịnị na-enyere ya aka ịtachi obi? Ka o jiri ọnụ ya kọọrọ gị:
“Ekpere abụworo m nnukwu ihe enyemaka. Ọ na-enye m obi ụtọ ịgwa Jehova okwu, inwe mmetụta nke ịnọ ya nso. Enwere m ekele maka ịhụnanya na mmasị ndị ọzọ na-egosi m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Eweere m ya na ọ bụ ihe ndabara ọma na n’agbanyeghị nsogbu anụ ahụ m, abụwo m onye ezigbo nne na nna hụrụ m n’anya nke ukwuu zụlitere. Ọ dịghị mgbe m ga-echezọ ihe ụmụnne m ndị nwanyị mewooro m. Mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ dị n’ahụ ụlọ zọpụtara ndụ m. E wezụga ịhụnanya Jehova na ịhụnanya ezinụlọ m, ndụ m agaraghị enwe nzube.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 7 Ndị Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara. A dịghịzi ebipụta Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti.
[Foto dị na peeji nke 22]
Loida na ezinụlọ ya