Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbalị Ndị M Mere Iji Mee Nhọrọ Ndị Amamihe Dị na Ha

Mgbalị Ndị M Mere Iji Mee Nhọrọ Ndị Amamihe Dị na Ha

Mgbalị Ndị M Mere Iji Mee Nhọrọ Ndị Amamihe Dị na Ha

Dị KA GUSTAVO SISSON SI KỌỌ

Mgbe m dị afọ 12, ọ bụ ezie na m na-etinye oge dị ukwuu n’igwu mmiri, ekpebiri m ịghọ dọkịta. Ma n’ihe dị ka n’otu oge ahụ, amalitere m ịmụ Bible, n’ihi ya kwa chọọ ịbụ onye ozi. Gịnị si n’ọchịchọ m dị iche iche pụta? Hà kwekọrọ?

NA 1961, Olive Springate, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova na Brazil, malitere ịmụrụ mụ na mama m Bible. N’ihi mmegide sitere n’aka papa m, bụ́ dọkịta a na-asọpụrụ na Pôrto Alegre, anyị kwụsịrị ịmụ ihe. Ma, anyị na Olive nọgidere na-emekọrịta ihe, ka oge na-agakwa ahụrụ m eziokwu dị n’ihe m mụtara. Ma ka ọ na-erule mgbe ahụ, igwu mmiri m adọpụwo uche m n’ihe ime mmụọ.

Mgbe m dị afọ 19, ezutere m otu nwa agbọghọ mara mma aha ya bụ Vera Lúcia n’ụlọ ọrụ ebe m na-egwu mmiri, anyị malitekwara iyi oge. Mama m gwara ya banyere nkwenkwe anyị, o nwekwara mmasị. N’ihi ya eziri m Olive ozi, ọ malitekwara ịmụrụ anyị Bible, n’agbanyeghị mmegide sitere n’aka papa Vera Lúcia.

Vera Lúcia nọgidere na-amụ ihe, o nwetakwukwara ihe ọmụma Bible. Ọ malitere ọbụna iduziri ndị na-arụ ọrụ n’ebe m na-egwu mmiri ọmụmụ Bible. N’otu oge ahụ, etinyere m uche m n’ịnata ọzụzụ maka asọmpi igwu mmiri ndị a gaje inwe ná mba ahụ.

Ka anyị nọ na-amụ ihe ma na-aga nzukọ ndị Kraịst ruo ihe karịrị otu afọ, papa Vera Lúcia malitere iche na ọ dị ihe na-aganụ. Otu ụbọchị mgbe anyị si nzukọ lọta, ọ nọ na-eche anyị, ọ sịkwara na anyị ga-agwarịrị ya ebe anyị gara. Agwara m ya na anyị gara nzukọ ndị Kraịst nakwa na ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na o jighị okpukpe kpọrọ ihe, ọ bụụrụ anyị okwu metụtara ọnwụ na ndụ. Ọ mara ọsụ ma kwuo, sị: “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ọ bụ okwu metụtara ọnwụ na ndụ, aghaghị m iwere ya otú ahụ.” Site ụbọchị ahụ gawa, àgwà ya gbanwere, ọ bụkwa ezie na ọ dịghị mgbe ọ ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ ghọrọ ezigbo enyi n’oge mkpa.

Ime Nhọrọ

Ekpebiri m ịkwụsị igwu mmiri nke asọmpi ma e mesịa asọmpi nke mba ahụ, ma mmeri abụọ m nwere na ịbụ onye nwere mmeri na Brazil site n’iji ụdị igwu mmiri ọ bụla gwuruo mita 400 na 1,500 mere ka a kpọọ m òkù ikere òkè n’Asọmpi Kọntinent America Dum e nwere na Cali, Colombia, na 1970. Ọ bụ ezie na Vera Lúcia akwadoghị ka m gaa, amalitere m ịnata ọzụzụ maka asọmpi ndị ahụ.

Mgbe m mere nke ọma na Cali, ndị na-enye ọzụzụ jụrụ m ma m nwere mmasị ịnata ọzụzụ maka asọmpi Olympic. Echere m banyere ihe ọmụmụ ọgwụ m ka na-amụ na eziokwu ndị dị ebube m mụtaworo banyere nzube Jehova ma kagbuo echiche nile nke ịchụso ọrụ igwu mmiri. Site mgbe ahụ gawa, enwere m ọganihu ime mmụọ n’ụzọ dị ngwa. Na 1972, bụ́ afọ e nwere asọmpi Olympic na Munich, Germany, mụ na Vera Lúcia gosipụtara nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova site na baptism ime mmiri. Nke a kwaliri mama m ịmaliteghachi ọmụmụ Bible ya, ka oge na-agakwa e mekwara ya baptism.

Mgbe e mesịrị mama m baptism, mmegide papa m na-emegide anyị dịwanyere njọ. N’ikpeazụ ezinụlọ anyị tisara, ebe ọ bụkwa na m ka nọ na mahadum, anyị na-enweta ihe e ji ebi ndụ site n’obere ụgwọ ezumike nká a na-akwụ mama m na ego anyị nwetara mgbe anyị rere ụlọ anyị. N’ihi ya, mụ na Vera yigharịrị agbamakwụkwọ anyị. N’ezie, ezigbo ihe ndị m mụtara n’aka papa m nyeere m aka ime mkpebi ndị m mere. Ọ na-ekwukarị, sị: “Egwu atụla gị ịdị iche” nakwa, “Ndị ka n’ọnụ ọgụgụ adịghị ezi ezi mgbe nile.” Otu n’ime okwu ndị kasị amasị ya bụ, “Ihe mmadụ na-enye ndị ọzọ na-egosi ihe onye ahụ bụ.”

Dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, enwewo m ike itinye ndụmọdụ magburu onwe ya nke papa m n’ọrụ. Anọ m n’akụkụ àkwà ya mgbe ọ nwụrụ na 1986. Anyị ghọrọ enyi ọzọ ma na-akwanyere ibe anyị ùgwù. Echere m na o nwere obi ụtọ n’ebe m nọ ebe ọ bụ na abụrụwo m dọkịta dị ka ya onwe ya bụ.

Ka ọ dịgodị, agụsịrị m akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ nkà ọgwụ na 1974. Ekpebiri m ịbụ dọkịta na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla, ma ka e mesịrị, mgbe m tụlekwuru okwu ahụ, ekpebiri m na m pụrụ inyere ụmụnna m bụ́ ndị Kraịst aka karị site n’ịghọ dọkịta na-awa ahụ. (Ọrụ 15:28, 29) N’ihi ya anabatara m ihe ịma aka ahụ ma jiri afọ atọ ọzọ nara ọzụzụ iji ghọọ dọkịta na-awa ahụ.

Ikpe Na-eweta Ihe Ịma Aka

Otu ihe merenụ n’ụzọ dị nnọọ mwute bụ́ nke metụtara m bụ ihe banyere otu nwa agbọghọ Onyeàmà dị afọ 15 bụ́ onye nwere ọbara ọgbụgba n’ime ahụ ya. Ihu ya adịghị mma, ọ̀tụ̀tụ̀ nrugharị ọbara ya dịkwa ala ma ọ maara ihe, ọ kwụsikwara nnọọ ike ná mkpebi o kpebiri na ya agaghị anara ọbara. Mgbe m mesịrị ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ya rịa elu, ejiri m ígwè endoscope lee ime ahụ ya ma jiri saline solution jụrụ oyi sachaa ebe ahụ ọbara na-agba ya ka ọ kwụsị. Ná mmalite ọ gbakewara, ma mgbe awa 36 gasịrị, ka a na-enye ya nlekọta siri ike, ọbara ọgbụgba ahụ maliteghachiri na mberede. N’agbanyeghị mgbalị dọkịta nọ ọrụ mgbe ahụ mere, ọ kwụsịlighị ọbara ọgbụgha ahụ ma mee ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ya ghara ịdalata, nwa agbọghọ ahụ nwụkwara.

Mgbe nke a mere, kọmitii na-ahụ maka ụkpụrụ ọrụ anyị napụrụ m ọnọdụ m ruo nwa oge dị ka onye na-awa ahụ ka aka wee sie ya ike ma wega okwu ahụ na kansụl na-ahụ maka ahụ ike ógbè ahụ. E boro m ebubo imebi ụzọ ihe atọ n’ime ụkpụrụ ndị na-achịkwa nkà ọgwụ, bụ́ nke tinyere akwụkwọ ikike m dị ka dọkịta nakwa ihe m ji ebi ndụ n’ihe ize ndụ.

Otu kọmitii nyere m ụbọchị 30 ka m zara ọnụ m site n’akwụkwọ e dere ede. Ndị ọkàiwu m kwadebere ihe ha ga-ekwu bụ́ ndị kwekọrọ n’iwu, akwadebekwara m ihe ndị kwekọrọ na nkà ọgwụ na sayensị m ga-eji zara ọnụ m site n’enyemaka nke Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ (HLC) dị n’ógbè ahụ, bụ́ òtù nke Ndịàmà Jehova bụ́ ndị ọrụ ha bụ ịkwalite mmekọrịta ụlọ ọgwụ na onye ọrịa. Mgbe a na-ekpe ikpe ahụ, kọmitii ahụ na-enye ntụziaka jụrụ ajụjụ karịsịa banyere ọnọdụ m dị ka dọkịta na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, ihe m ji zara ọnụ m dabekarịsịịrị n’ihe ndị kwekọrọ na nkà ọgwụ na sayensị nakwa n’akụkọ sitere n’aka ndị dọkịta na-awa ahụ bụ́ ndị a na-akwanyere ùgwù.

Ihe àmà e nyere kwadoro na onye ọrịa ahụ jụrụ ịnara mmịnye ọbara nakwa na ọ dịghị ihe ọ bụla m mere iji manye ya ime mkpebi ahụ. Ikpe ahụ mekwara ka ọ pụta ìhè na n’ime ndị dọkịta anọ a gakwuuru, ọ bụ nanị m malitere ụdị ọgwụgwọ onye ọrịa ahụ na ọrịa ya chọrọ.

Mgbe ahụ e wegara okwu m n’aka otu kọmitii ga-eme ntụli aka mgbe ndị nile mejupụtara ya ga-anọ ya. Eji m minit iri zara ọnụ m bụ́ mgbe, dị ka m mere n’akwụkwọ e dere ede m ji zara ọnụ m tupu nke a, m kwuru okwu karịsịa n’ihe metụtara nkà ọgwụ. Mgbe ha nụsịrị ihe m kwuru, mmadụ abụọ so na kọmitii ahụ kwuru na ọ bụ ezie na ejighị m ọbara mee ihe, ụdị ọgwụgwọ m tụrụ aro ya dabesiiri ike na nkà mmụta sayensị. Dọkịta ọzọ mesiri ya ike na ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara na-adị irè nakwa na ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ na ya na-adị ala karị. Onye kwuru okwu ikpeazụ so na kọmitii ahụ kwuru na ihe bụ́ okwu abụghị ma mmịnye ọbara ọ̀ bụ ụdị ọgwụgwọ dị mma ma ọ bụ na ọ bụghị. Ihe bụ́ okwu bụ ma dọkịta ò nwere ikike ịmanye onye ọ na-agwọ ịnara ụdị ọgwụgwọ nke onye ahụ ọ na-agwọ na-achọghị, onye ahụ so na kọmitii ahụ echeghịkwa na dọkịta nwere ikike ahụ. N’ihi ya, site ná ntụli aka nke ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke mmadụ 12 kwadoro ya na mmadụ 2 na-akwadoghị ya, ndị so na kọmitii ahụ kwadoro ka a kagbuo ebubo nile ahụ, si otú a kwuo na aka m dị ọcha.

Ichebe Ihe Ndị Ruuru Otu Onye Ọrịa

Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike enwetawo ikike n’ụlọ ikpe iji manye Ndịàmà na-arịa ọrịa ịnara mmịnye ọbara, site na mgbe ruo na mgbe, m na-enyekwa ihe àmà mgbe a na-ekpe ikpe bụ́ nke na-enye aka akagbu ikike ndị dị otú ahụ. Otu nke merenụ metụtara otu Onyeàmà nke akwara olu ya zara aza, nke bụ́ ọrịa na-akpata oké ọbara ọgbụgba n’ime afọ. Mgbe e bugara ya n’ụlọ ọgwụ, ọbara dị ya n’ahụ fọrọrịị obere—ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin ya dị gram 4.7 n’ime desilita ọ bụla. * Na mbụ, a manyeghị ya ịnara ọbara, e nyere ya nanị ọgwụgwụ na-adịchaghị irè.

Mgbe ahụ, ka ọ nọsịrị otu izu n’ụlọ ọgwụ, ọ tụrụ onye ọrịa ahụ n’anya mgbe onye ọrụ ụlọikpe ji akwụkwọ ikike mmịnye ọbara bịa leta ya. Ka ọ na-erule ugbu a ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin ya arịruwo gram 6.4 n’ime desilita ọ bụla, ahụ adịtụla ya mma. O yiri ka ọkàikpe ahụ ò mere mkpebi ya na-adabeere n’ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin nke mbụ ahụ kama ịbụ na nke abụọ, bụ́ nke ka elu.

Òtù HLC kwuru na ya ga-enye aka. Onye ọrịa ahụ rịọrọ m ka m lee ya ahụ. Emere m otú ahụ, emesịkwara m nwee ike ibuga ya n’ụlọ ọgwụ ebe a pụrụ ịgwọ ya n’ejighị ọbara. N’otu oge ahụ, ndị ọkàiwu ya kwuru na ụlọikpe ekwesịghị inye ikike ịmịnye onye ọrịa ahụ ọbara.

A kpọrọ m òkù ịbịa kwuo okwu n’ihu ọkàikpe ahụ, bụ́ onye jụrụ m banyere ọnọdụ onye ọrịa ahụ. Mgbe a na-ekpe ikpe ahụ, o nyere m ikike ịnọgide na-agwọ onye ọrịa ahụ ka arụmụka banyere izi ezi nke ikike ụlọikpe ahụ nyere na-aga n’ihu. Ka oge ikpe ọzọ na-erule, onye ọrịa ahụ agbakeela ma laa. Mgbe a kpọrọ m ọzọ ikwu okwu, ọkàiwu ụlọ ọgwụ ahụ gwara m ka m weta ihe àmà na-egosi na ọgwụgwọ ahụ m tụrụ aro ya dabeere na nkà mmụta sayensị. N’ịbụrụ ya ihe ihere, ewepụtara m otu isiokwu dị n’akwụkwọ ahụ ike nke ụlọ ọgwụ ahụ ọ na-ekpechitere ọnụ ya bipụtara, akwụkwọ ahụ tụkwara aro ọgwụgwọ dị otú ahụ!

Mgbe e kpebiri ikpe ahụ, anyị nwere obi ụtọ ịnụ na a kwadowo ihe anyị kwuru banyere iji ọgwụgwọ ọzọ na-abụghị mmịnye ọbara eme ihe. E nyere ụlọ ọgwụ ahụ iwu ịkwụ ihe nile e mefuru, gụnyere ego e mefuru n’ikpe ahụ. Ọ bụ ezie na ụlọ ọgwụ ahụ tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe, ikpe makwara ya.

Ilekọta Ezinụlọ Anyị

Kemgbe m ghọrọ Onyeàmà, Vera Lúcia anọwo na-akwado m dị ka onye ibe kwesịrị ntụkwasị obi nakwa dị ka nwunye dị ike, nwanyị na nne na-egosi ụmụ ya ezi ihe nlereanya. Olee otú o siworo nwee ike iche ihe ịma aka ndị ahụ nile ihu, na-elekọta ụlọ anyị ma na-enye aka ilekọta ụmụ anyị, bụ́ ndị ntorobịa ndụ juru ahụ ugbu a? O meliri nke a n’ihi ịhụnanya dị omimi ọ hụrụ Jehova na ozi ndị Kraịst.

Dị ka ndị mụrụ ụmụ, anyị akụziworo ụmụ anyị ozizi na ụkpụrụ Bible site mgbe ha dị nnọọ ntakịrị. N’agbanyeghị ịbụ ndị na-adịghị enwe ohere, anyị na-agbalị ije ozi oge nile ruo ọnwa ole na ole kwa afọ. Anyị na-eme ike anyị iji gbasoo usoro ihe omume nke gụnyere ịgụ Bible mgbe nile, ịtụle otu akụkụ Bible kwa ụbọchị, na ịkọrọ ndị ọzọ nkwenkwe anyị n’ozi ndị Kraịst. N’oge ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ mgbe, ezinụlọ anyị na-eduziri ndị na-abụghị Ndịàmà ihe hà ka ọmụmụ Bible 12 kwa izu.

Mụ na Vera Lúcia na-agbalịkwa ime ka ụmụaka anyị na-esonye n’ihe ndị anyị na-eme ma, n’otu oge ahụ, na-ahapụ ha ịhọrọ ihe ndị na-amasị ha. Anyị kwenyere na e nwere ihe atọ ndị bụ́ isi dị mkpa iji mee ka ndị mụrụ ụmụ lekọtazie ezinụlọ ha anya. Nke mbụ, ozizi ziri ezi, nke dabeere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Nke abụọ, ezi ihe nlereanya, bụ́ nke na-enye ụmụaka ihe àmà doro anya na ndị mụrụ ha na-atụ Chineke egwu ziri ezi. Na nke atọ, ha na ndị Kraịst nọ n’afọ ndụ na ọnọdụ nile ná ndụ, bụ́ ndị ndị òtù ezinụlọ pụrụ isi n’aka ha mụta nkà dịgasị iche, inwe mkpakọrịta ziri ezi. Dị ka di na nwunye, anyị emewo ya ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ anyị inye ezinụlọ anyị ihe ndị a.

N’ileghachi anya azụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 30 anyị nke ijere Jehova ozi, mụ na nwunye m pụrụ ikwu, n’enweghị obi abụọ ọ bụla, na o nyewo anyị ihe kasị mma ná ndụ, nyekwa anyị ọtụtụ ihe ụtọ na ngọzi. Ọ bụ ezie na agaghị m asọmpi Olympic ahụ, m ka na-egwu mmiri ruo ọtụtụ kilomita n’otu izu. N’eziokwu, ọbụbụ m bụ dọkịta nakwa otu n’ime Ndịàmà Jehova emewo ka m bụrụ onye na-adịghị enwe nnọọ ohere, ma ahụwo m ya dị ka ihe bara nnọọ uru inyere ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst aka ịnọgide n’ozi ha na-ejere Chineke n’agbanyeghị ọnwụnwa.

Ọtụtụ mgbe a na-ajụ m ma m na-echegbu onwe m na m gakwaghị arụ ọrụ m mgbe usoro ihe ọhụrụ nke Chineke bịara, bụ́kwa mgbe ọrịa na-agakwaghị adị. Ihe m na-azaghachi bụ na m ga-abụ onye mbụ ga-awụli elu n’ọṅụ mgbe “onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ,” nakwa mgbe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24; 35:6.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 21 Nwoke toworo eto ahụ dị na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin dị ihe dị ka gram 15 n’ime desilita ọ bụla.

[Foto dị na peeji nke 15]

Ịwa onye ọrịa ahụ

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Mụ na Vera Lúcia, na ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị