Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmeso Ọjọọ nke Mmadụ—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-akwụsị?

Mmeso Ọjọọ nke Mmadụ—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-akwụsị?

Mmeso Ọjọọ nke Mmadụ—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-akwụsị?

E nyere minista Itali na-ahụ maka Ịdị n’Otu Ọha Mmadụ, bụ́ Livia Turco, Teta! nke March 8, 2000, nke na-ekwu banyere oké nsogbu nke ịgba ohu, bụ́ nke na-aga n’ihu n’ụzọ dị mwute n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. N’akwụkwọ ozi o degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Itali, o kwuru, sị:

“Ụdị dị iche iche nke ịgba ohu nke oge a, bụ́ ndị na-emetụta ndị inyom na ụmụaka karịsịa, na-akpata ọnọdụ jọgburu onwe ya nke chọrọ inye aka ngwa ngwa bụ́ ọnọdụ ọtụtụ nde mmadụ ka nọ na ya.” O kwubiri, sị: “Ihe ọ bụla e ji iwe kwuo megide ihe a jọgburu onwe ya bụ enyemaka na-enweghị atụ, mgbe ọ bakwara ihe ha ka ndị na-agụ [Teta!] ná ntị, ọ na-adịkwu ìrè.”

N’ihi nkesa a na-ekesa ihe karịrị nde 20 nke mbipụta ọ bụla nke Teta! n’asụsụ 82, ọ bụghị nanị na ọtụtụ nde ndị na-agụ ya na-amata ihe banyere nsogbu ndị a na-enwe taa kamakwa ha na-amata ihe ngwọta ndị dabeere na Bible maka nsogbu ndị ahụ.

Ma, ajụjụ a ka na-ajụ bụ, Ọ bụrụ na Chineke dị adị n’ezie, n’ihi gịnị ka o ji kwere ka ndị aka ha dị ọcha nọrọ n’oké nhụjuanya? Ọtụtụ ndị na-ajụ sị, ‘Olee otú m pụrụ isi hụ Onye Okike n’anya bụ́ onye amamihe ya pụtara ìhè n’ihe ndị e kere eke dị ịtụnanya ma bụrụ onye yiri ka ọ dịghị egosi mmadụ ọmịiko taa?’ A zara ajụjụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ na-eju afọ na broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? Ị pụru ịrịọ inweta otu site n’ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m n’ebe obibi m iji duziere m ọmụmụ Bible n’efu.