Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nleta E Mere ‘n’Obodo Kasị Ochie na Russia’

Nleta E Mere ‘n’Obodo Kasị Ochie na Russia’

Nleta E Mere ‘n’Obodo Kasị Ochie na Russia’

MỤ NA nwunye m, bụ́ Linda, rutere Moscow na July 1998 iji rụọ ọrụ e kenyere anyị. Anyị agatụbeghị Russia mbụ, anyị nwekwara oké mmasị ịmata ihe banyere mba ahụ, asụsụ ya, na ndị ya.

N’oge na-adịghị anya mgbe anyị rutesịrị, ahụrụ m ihe osise na-akpali mmasị n’azụ akwụkwọ ego ruble ise na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Ọ na-egosi ihe yiri ebe e wusiri ike bụ́ nke e ji brick wuo na narị afọ nke 14 ma ọ bụ nke 15 bụ́ nke chere ihu n’otu osimiri, e nwekwara otu àgwàetiti na ọdọ mmiri n’ihe osise ahụ. N’akụkụ ya, e dere aha ebe ahụ ịbụ: Novgorod.

Ajụrụ m ndị bi na Moscow banyere ya. Ha nile maara banyere Novgorod, ma, ọ bụ nanị otu n’ime ndị m jụrụ ajụjụ gatụworo ebe ahụ n’ezie. A gwara m na ọ dị n’ebe na-erughị kilomita 550 site na Moscow ma bụrụ ebe a na-eji ụgbọ okporo ígwè aga site n’otu ụzọ ahụ gawara St. Petersburg. Mụ na nwunye m kpebiri ịga ya.

Njem Anyị Mere Gaa Novgorod

Ebe ọ bụ na agbatara m tiketi anyị ga-eji gaa St. Petersburg n’oge gara aga, amaara m ebe m ga-aga gbata ya. E biri nọmba nkebi ụgbọ ahụ na ọnụ ụlọ dị na ya anyị ga-anọ n’elu tiketi anyị. Anyị rutere n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị mgbe ọ gafetụrụ elekere anya itoolu n’otu mgbede na September gara aga ma nọdụ n’ọnụ ụlọ e nyere nanị anyị bụ́ nke dị ná nkebi ụgbọ nke 5.

Mgbe ọ sụsisịrị ike ma maa kweke kweke, ụgbọ ahụ nupụrụ. Ọ ga-emegide nke a ruo ogologo abalị ahụ dum ebe ọ bụ na anyị banyere n’ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị n’ebe nile ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị. Anyị kwụsị, ọ gaa minit ole na ole, ụgbọ okporo ígwè ọzọ ekwofee. Minit ole na ole ọzọ ga-agafe ka anyị nọ n’echere n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị. Mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-ewepụ ya na brek, nye ya ọkụ, ụgbọ okporo ígwè ahụ emeekwa mkpọtụ, n’ikpeazụ, o nupụ. Mgbe ahụ ụra na-eburu m ọzọ.

Onye na-elekọta ime ụgbọ okporo ígwè ahụ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị nwa obere oge tupu anyị erute Novgorod. Ọrụ na-aga n’ihu n’ebe ahụ ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị, ọbụna n’elekere anya asaa nke ụtụtụ. N’ọdụ akwụkwọ akụkọ, anyị hụrụ map obodo ahụ ma jụọ onye na-ere akwụkwọ akụkọ ahụ ego ole tagzi ga-ana iji buruo anyị na họtel anyị ga-anọ. Ọkwọ ụgbọala nara anyị ruble 20 (ihe dị ka cent 70) ma buru anyị n’ụgbọala Lada ya a rụrụ na Russia gaa na họtel anyị ga-anọ, bụ́ nke dị n’ofe Osimiri Volkhov—osimiri ahụ e sere n’akwụkwọ ego ahụ.

Ọkwọ ụgbọala ahụ gwara anyị na ya abụghị onye Russia ma na nwunye ya bụ. Ọ bụ ya mere o ji biri na Russia. Onye na-anabata ndị mmadụ na họtel ahụ nabatara anyị ọbụnakwa kwere ka anyị debanye aha anyị n’akwụkwọ, ọ bụ ezie na ọ bụ elekere 7:30 nke ụtụtụ ka na-akụ. Ọ tụụrụ anyị aro ebe ndị anyị pụrụ ịga. Anyị ji ụkwụ gaa n’akụkụ osimiri ahụ ma mesịa rie nri ụtụtụ.

Anyị hụrụ otu ogige a sụchara ahịhịa ya nke ọma na osisi ndị e gbupụrụ alaka ha ụfọdụ. Okooko osisi ndị mara mma jupụtara n’ebe a na-eme mkpagharị dị n’akụkụ osimiri ahụ. Ọ bụ ezie na e nwere ndị na-eme njem nleta—bọs a rụrụ na Korea bụ́ nke na-abịa oge ụfọdụ butere ìgwè ndị na-eme njem nleta—Novgorod abụghị obodo na-adọta ndị na-eme njem nleta. Ihe ka ọtụtụ ná ndị anyị hụrụ bụ ndị Russia.

Ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ gwara anyị na Novgorod bụ obodo kasị ochie na Russia. E kwuru na ọ dịkarịwo 1,100 afọ. Ihe na-agba àmà ihe nketa okpukpe o nwere bụ ọtụtụ chọọchị dị n’obodo ahụ dum. Na map, Linda gụtara chọọchị 25 bụ́ ndị dị nanị n’akụkụ họtel ahụ.

Anyị hụrụ ụlọ elu e wunyere na kremlin—ọ bụghị Kremlin nke dị na Moscow; “kremlin” bụ okwu Russian nke pụtara “ebe e wusiri ike n’obodo.” A pụrụ iru n’elu ụlọ elu ahụ n’enweghị ihe mgbochi. Mgbe anyị kwụrụ ruble 5 (ihe na-erughị cent 20), e kwere ka anyị jiri steepụ ya dị okirikiri rịgoruo elu ya. Eji m ihe anyị hụrụ tụnyere foto dị n’akwụkwọ ego ruble ise ahụ. Osisi ndị dị na ya etoola, e jiriwokwa gbam gbam kụchie elu ụzọ dị n’akụkụ mgbidi kremlin ahụ. Ma Osimiri Volkhov ka dị ya—otu osimiri ahụ na otu àgwàetiti ahụ nakwa ọdọ mmiri ahụ dị n’akwụkwọ ego ahụ. Ọ bụ nanị ígwè e ji egwu ala osimiri ahụ bụ ihe na-adịghị n’ihe osise ahụ dị n’akwụkwọ ego ahụ.

Anyị hụrụ otu ihe dị ịrịba ama n’ụbọchị nke abụọ anyị nọrọ na Novgorod. Ọ bụ ezie na ndị Russia na-ewere obodo ahụ dị ka nke dị ntakịrị—n’agbanyeghị mmadụ 250,000 bi na ya—ndị bi na ya chetara anyị nakwa ihe banyere anyị! Nwanyị na-eke nri na họtel ahụ chetara na anyị bịara ụnyaahụ ya. O chetara na kọfị na-amasị anyị, ọ nọgidekwara na-ebutere anyị ya. O chetakwara na anyị achọghị ịṅụ mmiri mkpụrụ osisi, n’ihi ya kwa ọ jụghị anyị n’ụbọchị nke abụọ ma ànyị ga-aṅụ ya. Mgbe m jụrụ ya ego ole anyị ga-akwụ, Olga—echetara m aha ya—mụmụrụ ọnụ ọchị ka ọ na-elegide m anya ma kwuo sị, “Ọ bụ ọnụ ụlọ nke 356, ọ́ bụghị ya?”

Na Sunday ọtụtụ puku mmadụ jupụtara na kremlin, àkwà mmiri ndị ụkwụ e wuru n’Osimiri Volkhov, okporo ámá, na n’ebe ahụ a na-eme mkpagharị. Linda gara ịzụta ọka e ghere eghe n’aka onye na-ere ya n’akụkụ àkwà ndị ụkwụ ahụ, bụ́ onye—i kwutere ya!—chetara na ọ hụrụ ya ụnyaahụ ya.

Mgbe anyị gaghachiri ịrị ụlọ elu ahụ iji legharịa anya ọzọ, nwa agbọghọ na-anakọta ego mbanye na ya mụmụụrụ anyị ọnụ ọchị ma kwuo, sị: “Unu bịara ebe a ụnyaahụ, ọ́ bụghị ya? Unu akwụọla ụgwọ ụnyaahụ, ya mere unu agaghị akwụ ụgwọ ọzọ.”

Anyị zutere David, bụ́ enyi anyị maara eri ọtụtụ afọ na New York tupu mgbe ahụ. Ọ lụrụ nwa agbọghọ Russia, bụ́ Alyona, ha bikwa na Novgorod ugbu a, na-eje ozi n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Anyị zutere n’ihu Ụlọ Nri Detinets, bụ́ nke a rụnyere kpọmkwem ná mgbidi dị ná ngwụsị kremlin. E resịrị anyị nri ndị Russia kasị mma anyị rịtụrụla n’ebe ahụ. Ụzọ ihe oriri atọ (salad, ofe, ihe oriri bụ́ isi, kọfị, na ihe ndị e ji atụcha ọnụ ma e richaa ihe) yiri anyị ihe na-adịghị oké ọnụ.

Novgorod bụ obodo ndị nwere omume enyi bi na ya, bụ́ ndị chetara anyị, ndị nwere nri ndị magburu onwe ha, na akụkọ ihe mere eme zuru nnọọ ezu, na ihe dị iche iche e ji eme ka ọ na-adọrọ mmasị. Anyị ga-aga ebe ahụ ọzọ.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

Akwụkwọ ego Russia bụ́ ruble ise, na foto nke otu ebe ahụ na Novgorod

[Foto dị na peeji nke 7]

“Kremlin,” site n’ebe Osimiri Volkhov dị

[Foto dị na peeji nke 8]

Ịgafe àkwà mmiri dị n’Osimiri Volkhov

[Foto dị na peeji nke 8]

E ji okpukpe kpọrọ ihe na Novgorod ruo ọtụtụ narị afọ