Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Guzogide Iyi Egwu Mmekọahụ?

Olee Otú M Pụrụ Isi Guzogide Iyi Egwu Mmekọahụ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Guzogide Iyi Egwu Mmekọahụ?

“Ụmụ okorobịa na-afụrụ ụmụ agbọghọ mkpọrọhịhị na-egosi mmasị ha iso ha nwee mmekọahụ, na-emekwa ha akaje.”—Carla, Ireland.

“Ụmụ agbọghọ na-akpọ òkù na telifon ugboro ugboro. Ha na-agbalị ime ka i kwenyere ha.”—Jason, United States.

“Ọ nọgidere na-emetụ m aka n’ogwe aka ma na-anwa ijide m aka.”—Yukiko, Japan.

“Ụmụ agbọghọ na-agwa m ihe ndị na-akpali omume rụrụ arụ.”—Alexander, Ireland.

“Otu nwa okorobịa si na bọs ụlọ akwụkwọ na-etiku m. Ọ bụghịdị na ọ chọrọ ka mụ na ya mee mkpapụ. Ọ nọ nnọọ na-esogbu m.”—Rosilyn, United States.

ILE anya, “ịja mma” na-akpali agụụ mmekọahụ, njakịrị rere ure, ịmetụ aka n’ụzọ na-akpali agụụ mmekọahụ—ihe ndị dị otú ahụ, mgbe a na-anabataghị ha ma bụrụ nke a na-eme ugboro ugboro, na-abụkarị ihe a pụrụ ịkpọ iyi egwu mmekọahụ. Ọ bụ ezie na o siri ike inweta ọnụ ọgụgụ ndị o metụtara n’ụwa dum, nnyocha ndị e mere na-egosi na o metụtawo ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa ka na-aga akwụkwọ na United States.

Gịnịdị bụ iyi egwu mmekọahụ? Akwụkwọ bụ́ Coping With Sexual Harassment and Gender Bias, nke Dr. Victoria Shaw dere, na-akọwa ya dị ka “inye mmadụ nsogbu iji kpalie agụụ mmekọahụ . . . Ọ pụrụ ịbụ n’ụzọ a na-ahụ anya (dị ka imetụ mmadụ aka n’ụzọ na-akpali agụụ mmekọahụ), okwu ọnụ (dị ka ikwu okwu banyere ọdịdị mmadụ bụ́ nke onye ahụ na-anabataghị), ma ọ bụ nke a na-ekwughị ekwu.” Mgbe ụfọdụ iyi egwu ahụ na-agụnye ịrịọ ka e nwee mmekọahụ n’ezoghị ọnụ.

Ihe ka ukwuu n’iyi egwu ị na-enweta n’ụlọ akwụkwọ pụrụ isite n’aka ndị ọgbọ gị. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ụfọdụ, ndị na-eme omume ahụ na-adịghị mma na-abụ ndị toworo eto, dị ka ndị nkụzi. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ Redbook na-ewere ya na ọnụ ọgụgụ na-ebughị ibu nke ndị nkụzi a na-ama ikpe n’ezie maka ịda iwu ndị metutara mmekọahụ “nwere ike bụrụ nanị akụkụ dị nta nke ndị na-ada iwu ahụ.”

E mesoro ndị inyom—mgbe ụfọdụkwa ndị ikom—mmeso ọjọọ dị otú ahụ ọbụna laa azụ n’oge Bible. (Jenesis 39:7; Rut 2:8, 9, 15) Bible bukwara amụma a dị mwute: “A ga-enwe oge ndị siri ike na mgbe ikpeazụ. Ndị mmadụ ga-abụ ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, ndị anyaukwu, ndị na-etu ọnụ, na ndị mpako; ha ga na-akparị mmadụ . . . ; ha ga-abụ ndị na-enweghị obiọma, ndị na-enweghị obi ebere, ndị nkatọ, ndị na-eme ihe ike, na ndị nwere obi ọjọọ.” (2 Timoti 3:1-3, Today’s English Version) Ya mere ọ pụrụ ikwe omume, ọbụna yie ihe ga-eme eme, na a ga-eyi gị onwe gị egwu n’ụzọ mmekọahụ.

Echiche Chineke

N’eziokwu, ọ bụghị ndị ntorobịa nile ka iyi egwu mmekọahụ na-enye nsogbu. Ndị ụfọdụ pụrụ ile ya anya dị ka ihe egwuregwu—ma ọ bụ ọbụna dị ka okwu ire ụtọ. Otu nnyocha na-eyi egwu e mere na United States gosiri na n’ime ndị e yiri egwu n’ụzọ mmekọahụ, pasent 75 kwetara na o nwere mgbe ha onwe ha yiri ndị ọzọ egwu. Ndị ụfọdụ toworo eto pụrụ ime ka nsogbu ahụ ka njọ site n’ile àgwà iyi egwu mmekọahụ anya dị ka ihe na-adịghị ihe ọ bụ, na-eleghara ya anya dị ka nanị ihe ụmụaka. Ma olee otú Chineke si ele ya anya?

N’ụzọ doro anya, Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-akatọ ụdị nile nke iyi egwu mmekọahụ. A gwara anyị ka anyị ghara “irigbu” ndị ọzọ site n’ime ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ụzọ mmekọahụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-8) N’ezie, e nyere ụmụ okorobịa iwu kpọmkwem imeso “ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne nwanyị, n’ịdị ọcha nile.” (1 Timoti 5:1, 2) Ọzọkwa, Bible katọrọ “okwu na-abaghị n’ihe.” (Ndị Efesọs 5:3, 4) Ya mere, o ziri ezi ma i wee iwe, nwee mgbagwoju anya, ọbụnakwa hụ onwe gị dị ka onye e lelịrị mgbe e yiri gị egwu!

Gịnị Ka M Ga-ekwu?

Oleezi otú ị ga-esi meghachi omume ma mmadụ nye gị nsogbu n’ụzọ dị otú a? Mgbe ụfọdụ emeghachighị omume n’ụzọ siri ike ma ọ bụ n’ụzọ doro anya na-eme ka onye na-eyi gị egwu mekwuo mgbalị. Bible na-agwa anyị na mgbe nwunye onye were Josef n’ọrụ gwara ya ka ha nwee mmekọahụ, o leghaghịrị ya nanị anya. Kama nke ahụ, o ji nkwụsi ike jụ ịnabata mgbalị ọ na-eme ịdọrọ mmasị ya n’ụzọ rụrụ arụ. (Jenesis 39:8, 9, 12) Taa, ịkwụsi ike na ịkpọ okwu aha ka bụ ụzọ kasị mma isi guzogide iyi egwu mmekọahụ.

N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na onye ahụ nke na-enye gị nsogbu ebughị n’obi ime ihe ga-ewute gị. Ihe yiri iyi egwu mmekọahụ pụrụ ịbụ kpọmkwem mgbalị ọ na-eme n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị iji dọta uche gị. Ya mere echela na ị ghaghị ime ihe na-adịghị mma iji kwụsị omume ahụ ị na-achọghị. Nanị ikwu ihe dị ka, ‘achọghị m ụdị okwu ahụ,’ ma ọ bụ, ‘biko, emetụzila m aka’ pụrụ ime ka a ghọta gị. N’agbanyeghị otú i si kwuo ya, emela ka okwu gị yie ihe egwuregwu. Ka ee e gị bụrụ ee e! Andrea na-eto eto si otú a kwuo ya: “Ọ bụrụ na ha aghọtaghị ihe ndị i kwuru n’ụzọ dị mma, ị ghaghị ịgwa ha hoo haa. Mgbe mgbe ị ghaghị ikwu ya otú ahụ.” Ikwu hoo haa sị ‘Kwụsị ya!’ pụrụ imezu ihe ị chọrọ.

Ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ aka njọ, anwala ime ihe dị na ya nanị gị. Gbalịa isoro ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị ọzọ meworo okenye bụ́ ndị tozuru okè kwurịta ya. Ha pụrụ inwe aro ndị ga-adị irè iji mee ihe banyere ọnọdụ ahụ. Dị ka ihe ikpeazụ a ga-eme, ha pụrụ ọbụna iche na ọ ga-adị mkpa ịgwa ndị isi ụlọ akwụkwọ banyere ya. N’agbanyeghị mmechu ihu nke ime otú ahụ pụrụ ịkpatara gị, ọ pụrụ ime ka a ghara iyi gị egwu ọzọ n’ụzọ mmekọahụ.

Igbochi Iyi Egwu Mmekọahụ

N’ezie, ọ kasịdị mma izere ịbụ onye e yiri egwu n’ụzọ mmekọahu. Gịnị pụrụ inye aka na nke a? Andrea na-enye ndụmọdụ, sị: “Ya adịla mgbe ị ga-eme ka e chee na ọ pụrụ ịbụ na i nwetụrụ mmasị. Ndị ọzọ ga-anụ banyere ya, nsogbu ahụ ga-adịgidekwa.” Otú i si eji ejiji pụrụ ikere òkè dị ukwuu. Mara, bụ́ onye na-eto eto na-ekwu, sị: “Adịghị m eji ejiji ka agadi nwanyị, ma ana m ezere ákwà ndị na-eme ka ahụ m na-adọrọ mmasị.” Ịjụ ịnabata mgbalị ndị a na-eme iji mee ka i nwee agụụ mmekọahụ ma na-eyi ákwà ndị na-adọta mmasị n’otu oge ahụ pụrụ inye echiche na-edoghị anya. Bible na-enye ndụmọdụ ka a na-eji ejiji n’ụzọ na-egosi “nsọpụrụ na uche zuru okè.”—1 Timoti 2:9.

Ụdị ndị enyi ị na-ahọrọ na-emetụkwa otú e si emeso gị omume. (Ilu 13:20) Rosilyn na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ n’ime ụmụ agbọghọ so n’otu ìgwè chọrọ ka ụmụ okorobịa hụ ha, ụmụ okorobịa ahụ pụrụ iche na ụmụ agbọghọ nile so n’ìgwè ahụ dị otú ahụ.” Carla kwukwara otu ihe ahụ, sị: “Ọ bụrụ na gị na ndị na-anabata okwu ndị ahụ ma ọ bụ ndị chọrọ ka a hụ ha na-akpakọrịta, mgbe ahụ, a ga-eyikwa gị egwu n’ụzọ mmekọahụ.”

Bible na-ekwu banyere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Daịna bụ́ onye sooro ụmụ agbọghọ si Kenean na-akpakọrịta—bụ́ ebe a ma ndị inyom ama maka omume na-adịghị ọcha. Nke a mere ka a kwaso ya iko. (Jenesis 34:1, 2) E nwere ezi ihe mere Bible ji na-ekwu, sị: “Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe.” (Ndị Efesọs 5:15) Ee, ‘ilezi anya’ otú i si eji ejiji, otú i si ekwu okwu, nakwa banyere ndị gị na ha na-akpakọrịta pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ichebe gị pụọ n’iyi egwu mmekọahụ.

Otú ọ dị, nye ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa, otu n’ime ụzọ kasị dị irè e si egbochi iyi egwu mmekọahụ bụ nanị ime ka ndị ọzọ mara banyere okpukpe gị. Nwa okorobịa bụ́ Timon, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-echeta, sị: “Ụmụ agbọghọ ahụ maara na abụ m Onyeàmà, ya mere ọ fọrọ nke nta ka nke ahụ kwụsịchaa iyi egwu mmekọahụ ha na-eyi m.” Andrea na-ekwu, sị: “Ịgwa ha na ị bụ Onyeàmà ga-eme ka o belata n’ụzọ dị ukwuu. Ha ga-aghọta na ị dị iche n’ebe ha nọ n’ọtụtụ ụzọ nakwa na i nwere ụkpụrụ omume ị na-agbasosi ike.”—Matiu 5:15, 16.

Ọ Bụrụ na E Yie Gị Egwu

Ọ bụ ezie na ị pụrụ ịgbalịsi ike, ị pụghị izerecha ndị ọjọọ na-akparị mmadụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ eyie gị egwu, ọ dịghị ihe mere ị ga-eji were obi amamikpe na-enye onwe gị nsogbu—ọ bụrụhaala na i mere ihe dị ka onye Kraịst. (1 Pita 3:16, 17) Ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ ewute gị, nweta enyemaka site n’iso ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị tozuru okè n’ọgbakọ ndị Kraịst nwee nkwurịta okwu. Rosilyn na-ekweta na o siri ike mmadụ inwe obi ụtọ mgbe a na-eyi ya egwu mmekọahụ. “Nanị inwe onye ibe,” ka ọ na-ekwu, “onye ị pụrụ iso kwurịta okwu, na-enye aka.” Chetakwa na “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya.”—Abụ Ọma 145:18, 19.

Iguzogide mmejọ adịghị mfe, ma ọ bara uru. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndekọ Bible banyere otu nwa agbọghọ si Shunem. Ọ bụ ezie na e yichaghị ya egwu n’ụzọ mmekọahụ dị ka e si aghọtakarị okwu ahụ taa, Solomon, bụ́ eze bara ọgaranya ma dị ike nke na-achị Juda, mesoro ya omume ndị ọ na-achọghị iji dọrọ mmasị ya. N’ihi na o nwere ịhụnanya n’ebe nwoke ọzọ nọ, o guzogidere omume ndị ahụ. Ya mere o kwusiri ike banyere onwe ya, sị, “Mụ onwe m bụ mgbidi.”—Abụ nke Abụ 8:4, 10.

Gosipụta otu ịdị ike n’omume na mkpebisi ike dị otú ahụ n’onwe gị. Bụrụ “mgbidi” mgbe omume ndị ị na-achọghị chere gị ihu. Mee ka mmadụ nile nọ gị nso mara banyere ọnọdụ gị dị ka onye Kraịst. Site n’ime otú ahụ, ị pụrụ ịnọgide na-abụ ‘onye a na-ataghị ụta onye na-aghọghịkwa aghụghọ,’ nweekwa obi ike na i mewo ihe na-atọ Chineke ụtọ.—Ndị Filipaị 2:15. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 27 E nyere ndụmọdụ ndị ọzọ banyere iyi egwu mmekọahụ ná mbipụta Teta! nke June 8, 1996; September 8, 1995; na May 22, 1991 (Bekee).

[Foto dị na peeji nke 10]

Ime ka mmadụ nile mara banyere ihe ndị i kwere na ha dị ka onye Kraịst pụrụ ịbụ ihe nchebe

[Foto dị na peeji nke 10]

Site n’esoghị ìgwè ndị na-eme ihe ọjọọ na-akpakọrịta, ị pụrụ igbochi iyi egwu mmekọahụ