Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị a kpọtụrụ uche, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 26. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)

1. Ma ọ̀ bụ na mmadụ, anụmanụ, ma ọ bụ n’ihe e wetara n’ubi, gịnị ka Jehova chọrọ ka e nye ya? (Ilu 3:9)

2.N’Iwu ahụ, olee ihe e ji arụ ọrụ ubi Jehova kwuru na a pụrụ iji ya n’ụzọ na-ezighị ezi mere ngwá ọgụ? (Ọpụpụ 21:18, NW)

3. Iji kwadebe maka iwu ụlọukwu ahụ, ọrụ dị aṅaa ka Eze Devid kenyere ndị ọbịa ịrụ? (1 Ihe E Mere 22:2)

4. Mgbe ha na-aga Emeus, ònye kwuru na ọ ga-abụ na Jisọs bụ ọbịa n’ihi na o yiri ka ọ maghị ihe mere na Jerusalem? (Luk 24:18)

5. Ònye ka a na-edenyekarị dị ka nwa nke abụọ Noa, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụworị nke ikpeazụ? (Jenesis 5:32)

6. Olee onye nchụàjà si n’usoro ọmụmụ Erọn bụ́ onye a maara dị ka dịọka n’ịbụ odeakwụkwọ na onye nkụzi nke Iwu ahụ? (Nehemaịa 8:13)

7. Dị ka Deuterọnọmi 21:20, 21 si kwuo, omume ndị dị aṅaa ka a ga-eji maka ha tụgbuo nwa nwoke na-ekweghị nzụta na nkume?

8. Ihe ndị dị aṅaa dị iche n’ibe ha ndị metụtara ofufe ụmụ Israel ka e ji mara Bul, ọnwa nke asatọ na kalenda dị nsọ nke ndị Juu? (1 Ndị Eze 6:38; 12:26-33)

9. Ihe nkịtị dị aṅaa ghọrọ ihe àmà nke nkwụsi ike na ịdịgide adịgide? (Ọnụ Ọgụgụ 18:19)

10. Gịnị mere ka nwanne nwa mmefu nke okenye mara eziokwu bụ́ na ihe pụrụ iche na-eme n’ụlọ ha? (Luk 15:25)

11. Olee ebe mmụọ ozi nke asaa wụsara ọkwa ya nke iwe Chineke? (Mkpughe 16:17)

12. Ebee bụ ókèala ebe ọwụwa anyanwụ nke alaeze ukwu nke Eze Ahasuerọs nke Peasia? (Esta 1:1)

13. N’ọhụụ, ole ndị ka Jọn hụrụ na-anọdụ n’ocheeze ndị gbara ocheeze Jehova gburugburu? (Mkpughe 4:4)

14. Gịnị ka Jisọs kpọrọ ndị Farisii hụrụ ọdịnala n’anya? (Matiu 15:14)

15. Gịnị ka ndị mgbe ochie na-akpọ Mediterranean malite n’oge Mosis gawa n’ihu? (Ọnụ Ọgụgụ 34:6)

16. Gịnị ka ọnaozi Etiopia na-eme mgbe Filip bịarutere ụgbọala ya nso? (Ọrụ 8:28)

17. Gịnị ka a na-eme iji gosi na onye Hibru bụ́ ohu achọghị inwere onwe ya pụọ n’aka onye nwe ya? (Ọpụpụ 21:6)

18. Olee ebe ezi onye Sameria ahụ kpọgara onye Israel ahụ nọ n’ọnụ ọnwụ bụ́ onye ọ hụrụ n’okporo ụzọ? (Luk 10:34)

19. Ònye bụ eze ezi omume mbụ chịrị alaeze Juda? (1 Ndị Eze 15:11)

20. Ònye bụ onyeisi ndị ọrụ nkà wuru ụlọikwuu ahụ, ònye bụkwa onyeisi ndị osote ya? (Ọpụpụ 31:2-6)

21. Gịnị ka e kwuru jikọrọ Jisọs na ọgbakọ ndị Kraịst, bụ́ nke na-eme ka ịbụisi na nlekọta ịhụnanya ya pụta ìhè? (Ndị Efesọs 5:22, 23; Mkpughe 21:2)

22. Olee nwanyị a ma ama nụrụ arụmụka Pọl n’Areọpagọs dị n’Atens wee ghọọ onye kwere ekwe? (Ọrụ 17:33, 34)

23. Gịnị ka Gọvanọ Festọs tiri ná mkpu na “oké mmụta akwụkwọ” na-eme Pọl? (Ọrụ 26:24)

24. Olee anụmanụ Jisọs nọkwasịrị n’elu ya dị ka onye na-emeri emeri banye Jerusalem? (Jọn 12:14, 15)

[Igbe dị na peeji nke 26]

Azịza Nye Ajụjụ

1. Mkpụrụ mbụ

2. Ọ́gụ̀

3. Ịwa nkume

4. Kleopas

5. Ham

6. Ezra

7. Imefu ihe na ịṅụbiga mmanya ókè

8. Solomon wusịrị ụlọukwu ahụ dị na Jerusalem; Jeroboam ji aka ya mee ka ọ bụrụ ọnwa ememe n’alaeze ebe ugwu iji dọrọ uche ndị ya pụọ na Jerusalem nakwa pụọ n’ememe ndị a na-eme ebe ahụ

9. Nnu

10. ‘Ọ nụrụ olu abụ na ite egwú’

11. “N’elu mbara eluigwe”

12. India

13. Ndị okenye iri abụọ na anọ

14. “Ndị ndú kpuru ìsì”

15. Osimiri Ukwu ahụ

16. Ọ na-agụ amụma Aịsaịa

17. A na-eji ahà hapuo ntị ya

18. N’ụlọ ndị ọbịa

19. Esa

20. Bezalel, Ọhọlịab

21. Di

22. Damaris

23. Ọ na-eme ka ọ ghọọ onye anya na-adịghị mma

24. Nwa ịnyịnya ibu