Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Ihe Furu Efu

Ịchọta Ihe Furu Efu

Ịchọta Ihe Furu Efu

N’afọ gara aga, na Maryland, U.S.A., otu nwoke ji ire ọma jụ ịnara magazin Ụlọ Nche na Teta! Otú ọ dị, obere nwa ya nwanyị jụrụ ya ma ọ bụ ya nata ha, nna ya kweere ka ọ nata ha. Ha abụọ na-ehicha ụgbọala ha ma na-etinye ihe mkpofu n’arịa ihe mkpofu dị nso. N’iche na ha pụrụ ịchịfu magazin ndị ahụ, Onyeàmà ahụ nyere ha magazin ndị ahụ kpebiri ịlaghachi iji lee ma hà dị n’arịa ahụ.

Kama ịhụ magazin ndị ahụ, ihe ọ hụrụ bụ akpa na pọọsụ. Ozugbo ọ gara na nke nwanyị adres ya dị na pọọsụ ahụ. Mgbe ha bịaruru nso ebe o bi, Ndịàmà abụọ ahụ gara na nke ya hụrụ otu nwanyị katatụrụ ahụ ka ọ kpụ oké ịnyịnya na-aga n’ebe a na-edebe ịnyịnya. Mgbe ha nyere ya ihe ndị ahụ, nwanyị ahụ tiri mkpụ, sị: “Ekele dịrị Chineke ihe nile bara uru dị n’ime ya—akwụkwọ ikike ngafe m, akwụkwọ ndọrọ ego, kaadị e ji azụ ihe n’aka, na akwụkwọ ịnyịnya.” O kwuru na e zuru ihe ndị ahụ n’abalị ụnyaahụ ya. Ebe ọ bụ na ọ fọrọ nke nta ka e kpofuo ihe dị n’arịa ahụ, ọ dị mma na e nyochara ya.

Nwanyị ahụ nyere ha ihe, ma kama ịnara ya, di na nwunye ahụ wetara akpa na pọọsụ ahụ nyere ya broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Iji gosipụta ekele ya, nwanyị ahụ dejupụtara otu akwụkwọ ndọrọ ego a ga-eji nye aka n’ikesa akwụkwọ ndị dị otú ahụ dabeere na Bible n’ụwa nile. Kemgbe ahụkwa, ọ nọwo na-egosi ezi mmasị n’ọmụmụ Bible.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a nwere peeji 32 bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.