Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abụla Onye E Duhiere Site ná Mgbasa Echiche!

Abụla Onye E Duhiere Site ná Mgbasa Echiche!

Abụla Onye E Duhiere Site ná Mgbasa Echiche!

“Onye nzuzu ga-ekwere ihe nile.”—ILU 14:15, TODAY’S ENGLISH VERSION.

E NWERE ọdịiche—nnukwu ọdịiche—dị n’etiti nkụzi na mgbasa echiche. Nkụzi na-egosi gị otú ị ga-esi na-eche echiche. Mgbasa echiche na-agwa gị ihe ị ga na-eche n’echiche. Ezi ndị ọkà nkụzi na-ewepụta ihe nile dị n’okwu ma chọọ ka a tụlee ya. Ndị na-agbasa echiche ga-amanyesi gị ike ịnụ ihe ha nwere ikwu ma ha agaghị achọ ka a tụlee ya. Ọtụtụ mgbe a dịghị aghọtacha ihe bụ nzube ha kpọmkwem. Ha na-atụle eziokwu, were ndị ga-abara ha uru mee ihe ma kpuchie ndị nke ọzọ. Ha na-agwagbukwa eziokwu ma mee ka ọ gbagọọ, bụrụ ndị ọkà n’ikwu okwu ụgha na okwu ndị na-abụchaghị eziokwu. Ihe ha na-achọ ịkpali abụghị ikike echiche gị nke ezi uche dị na ya kama mmetụta uche gị.

Onye na-agbasa echiche na-ahụ na akụkọ ya ga-eyi nke ziri ezi na nke na-akwado omume ọma nakwa nke ga-eme ka i nwee mmetụta nke ịbụ onye dị mkpa na onye so biri ma ị nabata ya. Ị bụ otu n’ime ndị maara ihe, ọ bụghị nanị gị kwụ, i nwere obi ike, ọ dịghịkwa ihe ga-eme gị—nke a bụ ihe ndị ha chọrọ ka i chee.

Olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị pụọ n’aka ụdị ndị ahụ Bible kpọrọ “ndị na-ekwu okwu efu” na ‘ndị na-aghọgbu obi mmadụ’? (Taịtọs 1:10) Ị marahaala ụfọdụ n’ime aghụghọ ha, ị mara na ị ga-enwe ike ịtụle akụkọ ọ bụla e chere gị n’ihu. Ndị a bụ ụzọ ụfọdụ nke isi mee nke a.

Na-eme Nhọrọ: A pụrụ iji obi na-anabata ihe nile tụnyere paịpụ ihe ọ bụla pụrụ isi n’ime ya gafee—tinyere mmiri nsị. Ọ dịghị onye chọrọ inwe obi e ji ihe na-adịghị mma merụọ. Solomọn, bụ́ eze na onye ọkà nkụzi n’oge ochie, dọrọ aka ná ntị: sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15) N’ihi ya ọ dị anyị mkpa ime nhọrọ. Ọ dị anyị mkpa ịtụle ihe ọ bụla e chere anyị n’ihu, na-ekpebi ihe a ga-anakwere na ihe a ga-ajụ ịnakwere.

Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ịbụ ndị na-adịghị anabata ihe, nke na anyị ga-ajụ ịtụle eziokwu ndị pụrụ ime ka iche echiche anyị ka mma. Olee otú anyị pụrụ isi nwee echiche ziri ezi? Site n’ịgbaso ụkpụrụ e ji atụle akụkọ ọhụrụ. Na nke a onye Kraịst nwere isi iyi nke amamihe dị ukwuu. O nwere Bible dị ka ihe nduzi ọ pụrụ ịtụkwasị obi maka iche echiche ya. N’otu akụkụ, obi ya bụ nke ghere oghe, ya bụ, ọ na-anabata ihe ọhụrụ. Ọ na-eji ụkpụrụ Bible atụle ihe ọhụrụ dị otú ahụ nke ọma, na-agbakwụnyekwa eziokwu dị na ya n’ụzọ o si eche echiche. N’akụkụ nke ọzọ, obi ya na-ahụ ihe ize ndụ nke akụkọ na-ekwekọtụghị n’ụkpụrụ ya ndị dabeere na Bible.

Na-enwe nghọta: Nghọta bụ “ịdị nkọ n’ime mkpebi.” Ọ bụ “ike ma ọ bụ ikike nke uche nke o ji amata ọdịiche otu ihe n’ebe ibe ya dị.” Onye nwere nghọta na-ahụ aghụghọ dị n’echiche ma ọ bụ ihe dị iche iche, na-emekwa mkpebi ziri ezi.

N’inwe nghọta, anyị ga-enwe ike ịmata ndị na-ekwu nanị ‘okwu ụtọ na okwu ọma’ iji ‘ghọgbuo obi ndị na-amaghị ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 16:18) Nghọta na-eme ka ị ghara ịnabata akụkọ ndị na-abaghị uru ma ọ bụ na-eduhie eduhie ma chọpụta ihe dị n’okwu. Ma olee otú ị pụrụ isi mata mgbe e nwere ihe na-eduhie eduhie?

Na-anwale akụkọ: “Ndị m hụrụ n’anya,” ka Jọn, bụ́ onye Kraịst na-akụzi ihe na narị afọ nke mbụ, kwuru, “unu ekwela okwu mmụọ nile, kama nwapụtanụ ndị mmụọ ahụ.” (1 Jọn 4:1) Ụfọdụ ndị taa yiri fom; ha na-amịkọrọ ihe ọ bụla ha nụrụ. Ọ na-adị nnọọ mfe ịmịkọrọ ihe ọ bụla anyị nụrụ.

Ma ọ ka nnọọ mma ka onye ọ bụla jiri aka ya họrọ ihe ọ ga-etinye n’obi ya. Otu ilu na-ekwu na anyị bụ ihe anyị na-eri, nke a pụkwara ịbụ eziokwu n’ihe banyere ma nri anụ ahụ ma nke obi. N’agbanyeghị ihe ị na-agụ ma ọ bụ na-ekiri ma ọ bụ na-egere, na-atụle ma ihe ndị dị na ya hà na-enye echiche na-eduhie eduhie ka hà bụ eziokwu.

Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ziri ezi, anyị aghaghị ịdị njikere ịtụle echiche anyị mgbe nile ka anyị na-anụ ihe ọhụrụ. Anyị aghaghị ịghọta na ha bụ nanị echiche ndmmad. Ịtụkwasị ha obi dabeere n’izi ezi nke ihe ndị anyị chọpụtara, n’ọdịdị nke echiche anyị nakwa n’ụkpụrụ ndị anyị na-ahọrọ ịgbaso.

Na-ajụ ajụjụ: Dị ka anyị hụworo, e nwere ọtụtụ ndị taa ga-achọ ‘iwere ire ụtọ rafuo anyị.’ (Ndị Kọlọsi 2:4) N’ihi ya, mgbe a gwara anyị okwu ire ụtọ, anyị kwesịrị ịjụ ajụjụ.

Nke mbụ, tụlee ma o bu echiche ọjọọ. Gịnị bụ nzube nke akụkọ ahụ? Ọ bụrụ na akụkọ ahụ jupụtara n’ịkọ ọnụ na okwu ọjọọ, gịnị kpatara ya? Nke okwu ọjọọ dịwagodị, gịnị bụ abamuru nke akụkọ ahụ n’onwe ya? Ọzọkwa, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, gbalịa ịtụle ihe ndị ahụ na-ekwu okwu ahụ meworo n’oge gara aga. À ma ha ama n’ikwu eziokwu? Ọ bụrụ na ọ bụ ‘akwụkwọ ma ọ bụ ndị a ma ama,’ gịnị ma ọ bụ ole ndị ka ha bụ? N’ihi gịnị ka ị ga-eji were onye a—ma ọ bụ òtù ma ọ bụ akwụkwọ—dị ka nke nwere amamihe kasịnụ ma ọ bụ nke bu akụkọ a pụrụ ịtụkwasị obi n’ihe ahụ ọ na-ekwu? Ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ na-akpali mmetụta uche, jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na e lee ya anya n’ụzọ ziri ezi, gịnị bụ abamuru nke akụkọ ahụ?’

Esola ọtụtụ mmadụ: Ọ bụrụ na ị ghọta na echiche mmadnile ezichaghị ezi, ị pụrụ iche echiche n’ụzọ dị iche. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ndị ọzọ nile hà na-eche echiche n’otu ụzọ ahụ, ọ̀ pụtara na i kwesịrị ime otú ahụ? Ọtụtụ ndị inwe otu echiche abụghị ihe a pụrụ ịdabere na ya iji kpebie ihe bụ eziokwu. Eri ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ ndị anọwo na-anakwere ụdị echiche nile, e mesịa ha achọpụta na ha ezighị ezi. Ma, a ka nwere ọchịchọ nke isoro ọtụtụ mmadụ. Iwu e nyere n’Ọpụpụ 23:2 bụ ụkpụrụ dị mma: “Esola ọtụtụ mmadụ n’azụ baa n’ihe ọjọọ dị iche iche.”

Ezi Ihe Ọmụma Dị Iche ná Mgbasa Echiche

E kwuwo na Bible bụ ihe nduzi a pụrụ ịdabere na ya maka iche echiche nke ọma. Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike n’ihe Jisọs gwara Chineke: “Okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Nke a dị otú a n’ihi na Chineke, Onye Chepụtara ihe e dere na Bible, bụ “Chineke nke eziokwu.”—Abụ Ọma 31:5.

Ee, n’ọgbọ a na-agbasa echiche ndị jọgburu onwe ha, anyị pụrụ iji obi ike dabere n’Okwu Jehova dị ka isi iyi nke eziokwu. N’ikpeazụ nke a ga-echebe anyị pụọ n’aka ndị chọrọ ‘iji okwu nrafu dị iche iche were anyị zụọ ahịa.’—2 Pita 2:3.

[Foto dị na peeji nke 9]

Nghọta na-eme ka ị ghara ịnabata akụkọ ndị na-abaghị uru ma ọ bụ na-eduhie eduhie

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Na-atụle ma eziokwu ọ̀ dị n’ihe ọ bụla ị na-agụ ma ọ bụ na-ekiri

[Foto dị na peeji nke 11]

Echiche ọtụtụ ndị nwere adịghị ezi ezi mgbe nile

[Foto dị na peeji nke 11]

Anyị pụrụ iji obi ike dabere n’Okwu Chineke dị ka isi iyi nke eziokwu