Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ndị Britain na Ntụrụndụ

Na nke mbụ ya, na 1999, ihe ka ọtụtụ ná ndị Britain mefuru ego n’ihe omume ntụrụndụ karịa ‘n’ihe oriri, ụlọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ dị n’atụmatụ mmefu ego nke ezinụlọ kwa izu,’ ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Times nke London na-akọ. Na 1968, nanị pasent 9 nke ngụkọta ego ezinụlọ mefuru gara ná ntụrụndụ, n’adịghị ka pasent 17 na-aga na ya taa. Onye ndụmọdụ n’ihe banyere ndị ahịa bụ́ Martin Hayward, na-ekwu, sị: “Ebe ọ bụ na anyị nile bara nnọọ ọgaranya ugbu a karịa ihe dị ka afọ 30 gara aga, ọtụtụ ihe ntụrụndụ a na-azụ bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na a na-elebu anya dị ka ihe okomoko bụzi ndị ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ele anya dị ka ihe ndị dị oké mkpa. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-elezi ịga ezumike anya dị ka ihe ‘dị mkpa’ ọ bụghị ihe ‘a chọrọ.’ Ụfọdụ ndị na-ele ọbụna ịga ezumike ugboro atọ n’afọ anya dị ka ihe dị oké mkpa.” Ugbu a ezinụlọ dị iche iche na-emefu ego ji okpukpu anọ karịa nke ha mefuru na 1968 n’ihe nkiri vidio na ná ngwá a na-ege ege, TV, na kọmputa. N’eziokwu, 1 ezinụlọ n’ime ezinụlọ 10 ọ bụla nwere Internet, 1 n’ime 3 ọ bụla nwekwara kọmputa.

Obere Ụra nke Na-enye Ume Ọhụrụ

Àgwà nke ịdabere na caffeine iji gbochie iro ụra n’ehihie nwere ike ghara ịrụpụta ihe dị mma, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kwuru. “Ịṅụ caffeine na-akpata iro ụra,” ka ọkachamara n’ihe banyere ụra na Mahadum Cornell bụ́ Dr. James Maas na-ekwu. “Ihe ndị na-achụ ụra adịghị eme ka ụra ghara ịtụ gị ma ọ bụrụ na ị rahụghị ụra nke ọma.” Kama izutụ ike na iritụ ihe, Maas na-atụ aro ihitụ ụra, bụ́ nke o kwuru na ọ “na-ewulite ikike ichebara ihe ndị dị mkpa echiche na ime mkpebi ndị ziri ezi.” Obere ụra ehihie, nke na-erughị minit 30, pụrụ ime ka mmadụ nwetaghachi ume n’emeghị ka o siere ya ike ịmụrụ anya nakwa n’egbochighị ihi ezigbo ụra n’abalị, ka Times na-ekwu. “E kwesịghị ịkagbu ihitụ ụra,” ka Maas na-ekwu. “E kwesịrị iwere ya dị ka ihe a na-eme kwa ụbọchị.”

Owu Ọ̀ Na-adị n’Ahụ Atụrụ?

Dị ka otu nnyocha nke Kansụl Europe nke Ndị Malitere Ọrụ Ugbo Ọhụrụ nyere ikike ka e mee si gosi, “pasent 50 nke ụmụaka EU [Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe] amaghị ebe e si enweta shuga, ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ . . . amaghị ebe e si enweta owu, ebe ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ anọ kwenyere na ọ na-adị n’ahụ atụrụ.” Ọzọkwa, pasent 25 nke ndị dị afọ itoolu na afọ iri na Britain na Netherlands kwenyere na oroma na olive na-eme ná mba ha. Ebe bụ́ isi ụmụaka ahụ na-ahụ ihe ndị e nwetara n’ugbo abụghị n’ugbo kama ná nnukwu ụlọ ahịa, ebe bụ́ isi ha na-amụtakwa banyere ọrụ ugbo bụ n’ụlọ akwụkwọ. Ndị a pụrụ iso n’ihe ndị mere iji ọrụ ugbo mere aka ọrụ na-ejighị amasị ọtụtụ ụmụaka Europe taa. “Ná nkezi,” ka kansụl ahụ na-ekwu, “ọ bụ nanị pasent 10 nke ụmụaka EU ‘ga-achọ n’ezie’ ịbụ ndị ọrụ ugbo n’ọdịnihu.”

Ọbụbụenyi Nọ ná Nsogbu

Ọrụ ụbọchị dị ogologo karị, imekwu njem achụmnta ego, na ngwá ntụrụndụ electronic “bụ́ ndị na-eme ka anyị na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla ma e wezụga ndị mmadụ ọzọ na-enwe mkpakọrịta” na-akpa ọbụbụenyi anyị aka ọjọọ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal na-akọ. “A dịghị ele iwepụta oge soro ndị enyi nọkọọ anya dị ka ihe dị mkpa kama dị ka nke na-ezuru ihe n’oge jupụtara n’ọtụtụ ihe omume n’ohi,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Ma ndị na-eleghara ọbụbụenyi anya pụrụ ịchọpụta na mgbe ọdachi dakwasịrị ezinụlọ ha, “ọ dịghị onye ga-abịa inyere ha aka,” ka ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Jan Yager, na-ekwu. N’aka nke ọzọ, nnyocha yiri ka ọ na-egosi na ndị nwere ezi ndị enyi adịghị enwekebe nchekasị nakwa na ha adịghị arịakebe ọrịa, ha pụkwara ịdị ọbụna ogologo ndụ karị. “Ihe dị mkpa,” ka Journal ahụ na-ekwu, “bụ ịghọta na ọ chọrọ mgbalị dị ukwuu iji jigide ọbụbụenyi, dị nnọọ ka ọ dị n’ime ka ọrụ na ezinụlọ kwekọọ.”

Ụmụaka Bubigara Ibu Ókè

“Oké ibu bụ otu n’ime nsogbu ahụ ike kasị sie ike na-eche ndị ntorobịa Esia ihu,” ka Dr. Chwang Leh-chii, bụ́ onyeisi òtù ndị ọkachamara n’ihe banyere ihe oriri nke Taipei, Taiwan, na-adọ aka ná ntị. E nwere ọnụ ọgụgụ dị elu nke ụmụaka bubigara ibu ókè n’ọtụtụ ebe n’Esia, karịsịa n’etiti ụmụaka nwoke nakwa n’obodo ukwu dị iche iche, ka magazin bụ́ Asiaweek na-akọ. Otu nnyocha e mere na nso nso a na Beijing gosiri na ihe karịrị pasent 20 nke ụmụ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị n’ebe ahụ bubigara ibu ókè. O yiri ka ndị na-eto eto bụ́ ndị Esia hà na-etinye oge dị ukwuu n’ikiri TV na igwu egwuregwu vidio, ka akụkọ ahụ na-ekwu. Gịnị ka a ga-eme? Dị ka Asiaweek si kwuo, ngwọta ya adaberechaghị n’ikpebi ókè ụmụaka ga-eriru ihe kama ọ dabeere n’ijikọta mmega ahụ ha na-eme mgbe nile na ihe oriri na-akwalite ahụ ike—nke ihe mejupụtakarịsịrị ya bụ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri kama ịbụ mgbadume ndị jupụtara n’abụba. Dr. Chwang gara n’ihu ikwu na ime ka mmega ahụ bụrụ ihe omume dị ụtọ bụ isi ihe ga-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma. Ma, ọ bụrụ na ha agbanweghị àgwà ha, ka akụkọ ahụ na-ekwu, ụmụaka bubigara ibu ókè pụrụ iche ọbara mgbali elu, ọrịa imeju, ọrịa shuga, na nsogbu uche, ihu.

Iji Ihe Nkiri Sịnịma Dochie Anya Chọọchị

“Nye ndị nọ n’afọ iri na ụma, ihe nkiri ndị dị ka Terminator 2, Titanic na Star Wars na-adọrọ uche n’ụzọ dị ukwuu gaa n’ihe ndị metụtara okpukpe karịa chọọchị ndị dịbu adị,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent na-akọ. Dr. Lynn Clark, nke ngalaba na-ahụ maka nnyocha usoro mgbasa ozi na Mahadum Colorado, jụrụ ndị na-eto eto 200 ihe nkiri nke kasị dị ka nkwenkwe okpukpe ha. Ọtụtụ zoro aka na Terminator 2, bụ́ nke na-egosi ọgụ ihe ọma na ihe ọjọọ lụrụ mgbe onye bụ́ isi ná ndị na-eme ihe nkiri ahụ laghachiri n’ikpeazụ iji gbapụta otu nwa yiri Mesaịa. Mgbe ọ na-ekwu okwu ná nnọkọ nkwurịta okwu n’Edinburgh, Scotland, Dr. Clark kwubiri, sị: “Ndị na-eto eto na-adaberezi n’ebe Darth Vader nọ na n’ihe nkiri X Files dị ka ihe ndị ga-enyere ha aka inweta azịza nye ajụjụ ndị metụtara nzube nke ndụ. Ihe nkiri X Files na-adọrọ mmasị n’ihi na ọ na-eleba anya n’ihe nile metụtara ike a na-amaghị ama na-achịkwa eluigwe na ala. Ọ na-ewelite okwu bụ́ na e nwere ihe ndị sayensị na-akọwaghị. Nke ahụ bụ okwu metụtara okpukpe, ma bụrụ nke okpukpe na-adịghị eleba anya nke ọma.”

Ise Siga Na-eme Ka A Nwụchuo Ọnwụ

“Siga ọ bụla mmadụ sere na-ewepụ minit 11 ná ndụ ya,” ka obere akwụkwọ akụkọ bụ́ University of California Berkeley Wellness Letter na-akọ. N’ihi ya, ise otu katọn siga ga-ewepụ otu ụbọchị na ọkara ná ndụ mmadụ, afọ ọ bụla o sekwara otu mkpọ siga kwa ụbọchị, ọ ga-ewepụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa abụọ ná ndụ ya, ka ndị nnyocha na Mahadum nke Bristol, England, na-ekwu. Ndị ọkà mmụta sayensị mere atụmatụ a site n’iji afọ ndụ ndị na-ese siga tụnyere nke ndị na-adịghị ese. Ndị nnyocha ahụ kwuru, sị: “Ọ na-egosi oké ihe ise siga na-efu n’ụzọ onye ọ bụla pụrụ ịghọta ya.”

Enyí “Ndị Na-ese Ihe”

N’Ottapalam, India, a na-akụziri ụmụ enyí ise ihe site n’iji imi ha ejide brọsh. Ndị nchekwa eguzobewo Ọrụ Nkà na Nchekwa Enyí nke Esia iji nweta ego a ga-eji na-echekwa enyí site n’ire ihe ndị enyí sere, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Indian Express na-akọ. Otu enyí dị afọ isii aha ya bụ Ganesan yiri nnọọ ka ọ na-enwe mmasị ná mgbalị ndị ọ na-eme “ise ihe.” Mgbe obi dị ya mma ise ihe, ọ na-emegharị ntị ya ma nara onye na-enye ya ọzụzụ brọsh. Mgbe Ganesan na-ese ihe, ọ dịghị achọ ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya, ọbụna nnụnụ ma ọ bụ ọsá. Mgbe o sesịrị ihe mara mma, Ganesan na-akwụsịtụ ma yie ka ọ na-ele ihe o sere. Otú ọ dị, ọ bụghị ụmụ enyí nile na-anabata mgbalị ndị a na-eme ka ha ghọọ anụ “na-ese ihe.” Ụfọdụ na-egosi enweghị mmasị ha site n’ịgbaji brọsh ha.

Ikpebi Oge Ịmụ Nwa

“A mụtawo ịmụ nwa mgbe ụlọ ọgwụ chọrọ,” ka akwụkwọ akụkọ Itali bụ́ Corriere della Sera na-ekwu. N’otu nnọkọ e nwere na nso nso a na Florence, Itali iji kwurịta banyere ịmụ nwa, Fred Paccaud, onye Switzerland bụ́ ọkachamara n’ọrịa ụmụ nwanyị kwuru, sị: “Kemgbe narị afọ nke 19, ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, ịmụ nwa n’ụbọchị Saturday na Sunday ejiriwo pasent 95 belata. Ma ọ kwụsịghị na nke ahụ: Anyị pụrụ ikwu na ihe ka ukwuu n’ịmụ nwa na-ewere ọnọdụ n’oge kwekọrọ n’oge òtù ndị ọrụ kpebiri, ya bụ, n’oge ọrụ bụ́ mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị dọkịta na ndị nọọsụ na-anọ ọrụ.” A na-eji ọgwụ akpali ịmụ nwa ma ọ bụ a waa ahụ iji bupụta nwa. “Anyị na-eche iji ọgwụ amụ nwa na ịwa ahụ iji bupụta nwa ihu,” ka Angelo Scuder, bụ́ ọkachamara n’ọrịa ụmụ nwanyị n’obodo Florence, na-ekwu. “Anyị na-ahụ mmụba dị ngwa nke ịwa ahụ iji bupụta nwa, bụ́ ụzọ e si ebupụta ihe karịrị pasent 20 nke [ụmụ a na-amụ] ugbu a.” Otú ọ dị, Prọfesọ Carlo Romanini, bụ́ onyeisi nke Òtù Ndị Ọkachamara n’Ọrịa Ụmụ Nwanyị na Ndị Ọkachamara n’Ihe Banyere Ịmụ Nwa, na-ekwu na “‘ime mkpebi oge ịmụ nwa’ abụghị nhọrọ nke oge masịrị mmadụ” kama ọ bụ ihe nchebe nye nne na nwa pụọ ná nsogbu pụrụ ịdapụta. “Ọ ka nnọọ mma [ịmụ nwa] mgbe ndị ọrụ ụlọ ọgwụ zuru ezu nakwa mgbe ha nwere ike inye nlekọta kasị mma ha pụrụ inye,” ka o kwuru.