Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbasa Echiche Pụrụ Ịdị Oké Njọ

Mgbasa Echiche Pụrụ Ịdị Oké Njọ

Mgbasa Echiche Pụrụ Ịdị Oké Njọ

“Okwu ụgha na-agbasa ngwa ngwa ebe eziokwu na-agbasa nwayọọ nwayọọ.”—Okwu MARK TWAIN.

“ONYE Juu agụụ dị ka gị!” ka otu onye nkụzi kwuru mgbe ọ mara nwa akwụkwọ ya dị afọ asaa ụra. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gwara klas ya ka ha kwụọ n’ahịrị ma bụọ ya asọ n’ihu.

Ma onye nkụzi ahụ ma nwa akwụkwọ ya—nwa nwa nwanne mama ya—maara nke ọma na nwatakịrị nwoke ahụ na ndị mụrụ ya abụghị ndị Juu. Ha adịghịkwa ekpe okpukpe ndị Juu. Kama, ha bụ Ndịàmà Jehova. N’iji ajọ mbunobi ọtụtụ ndị nwere megide ndị Juu, mee ihe, onye nkụzi ahụ na-akwalite asị a kpọrọ nwa akwụkwọ ya. Ụkọchukwu ha anọwo na-agwa ma onye nkụzi ahụ ma klas ya eri ọtụtụ afọ na Ndịàmà Jehova abaghị n’ihe. A nọwo na-akpọ ndị mụrụ nwatakịrị nwoke ahụ ndị Ọchịchị Kọmunist na ndị ọrụ òtù CIA (Ụlọ Ọrụ Nledo Etiti). N’ihi ya ndị ha na nwatakịrị nwoke ahụ nọ na klas kwụụrụ n’ahịrị, dị njikere ịbụ “onye Juu agụụ” ahụ asọ n’ihu.

Nwatakịrị nwoke ahụ lanarịrị wee kọọ ihe merenụ. Ọ dịghị otú ahụ n’ihe banyere nde ndị Juu isii bi na Germany na mba ndị dị ya nso n’ihe dị ka afọ 60 gara aga. E ji ajọ mgbasa echiche mee ihe n’ikpochapụ ndị Juu ahụ n’ụlọ ebe e ji gas egbu mmadụ na n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi. Ajọ mmegide ọtụtụ ndị ji oké obi ilu na-emegide ụmụ Shem n’ajụghị ase mere ka ọtụtụ ndị were ndị Juu dị ka ndị iro bụ́ ndị mkpochapụ ha na-abụghị nanị ihe dị mkpa kama ihe ziri ezi. N’ihi ya, mgbasa echiche ghọrọ ihe e ji kpochapụ ndị mmadụ n’ìgwè.

Ee, mgbasa echiche pụrụ ịpụta ìhè mgbe e ji ihe ndị na-egosi mkpọrọmasị dị ka swastika mee ihe ma ọ bụ mgbe e ji aghụghọ maa njakịrị na-adịghị mma. Ndị ọchịchị aka ike, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ụkọchukwu, ndị na-akpọsa ngwá ahịa, ndị na-ere ahịa, ndị odeakụkọ, ndị na-arụ n’ụlọ ọrụ redio na TV, ndị nnọchiteanya ụlọ ọrụ mgbasa ozi, na ndị ọzọ nwere mmasị n’ịgbanwe echiche na àgwà na-eji usoro ya ndị na-eme ka e kwenye eme ihe mgbe nile.

Otú ọ dị, a pụrụ iji ozi ndị na-eme ka a gbanwee echiche mee ihe ga-abara ndị mmadụ uru, dị ka ime ka ịnya ụgbọala mgbe mmanya na-egbu mmadụ belata. Ma a pụkwara iji mgbasa echiche mee ka asị a kpọrọ agbụrụ ma ọ bụ okpukpe ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ sie ike ma ọ bụ ranye ndị mmadụ n’ịzụ siga. “Kwa ụbọchị anyị na-anụ ọtụtụ ozi ndị na-eme ka a gbanwee echiche,” ka ndị nnyocha bụ́ Anthony Pratkanis na Elliot Aronson na-ekwu. “Ihe mere ozi ndị a ji eme ka a gbanwee echiche abụghị n’ihi ezi nrụrịta ụka, kama ọ bụ n’ihi iji ike mkpali na mmetụta anyị ndị bụ́ isi eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’agbanyeghị ihe ọ na-arụpụta, anyị na-ebi n’oge e ji mgbasa echiche eme ihe.”

Olee otú e siworo jiri mgbasa echiche metụta echiche na omume ndị mmadụ na narị afọ nile? Olee ihe ị pụrụ ime iji chebe onwe gị pụọ ná mgbasa echiche dị oké njọ? Ọ̀ dị ebe a pụrụ inweta ihe ọmụma a pụrụ ịtụkwasị obi? A ga-atụle ndị a na ajụjụ ndị ọzọ n’isiokwu ndị na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 3]

E ji mgbasa echiche mee ka ndị Juu taa ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi n’oge Oké Mgbukpọ ahụ