Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nchegbu M Bụ́ Isi—Ịnọgide Na-eguzosi Ike n’Ihe

Nchegbu M Bụ́ Isi—Ịnọgide Na-eguzosi Ike n’Ihe

Nchegbu M Bụ́ Isi—Ịnọgide Na-eguzosi Ike n’Ihe

DỊ KA ALEXEI DAVIDJUK SI KỌỌ

Ọ bụ n’afọ 1947; ebe o mere bụ kilomita ole na ole site n’obodo nta anyị bụ́ Laskiv nke dị na Ukraine, na nso ókèala Poland. Enyi m tọrọ m bụ́ Stepan rụrụ ọrụ dị ka onye na-ebu ozi, na-esi na Poland ezobata akwụkwọ e ji amụ Bible na Ukraine. Otu abalị, onye na-eche nche n’ókè ahụ hụrụ ya, chụọ ya ọsọ ma gbagbuo ya. Afo iri na abụọ ka nke ahụ gasịrị, ọnwụ Stepan nwere mmetụta dị ịrịba ama ná ndụ m, dị ka m ga-akọwa ma e mesịa.

KA Ọ na-erule mgbe a mụrụ m na Laskiv na 1932, ezinụlọ iri n’obodo anyị bụ Ndị Mmụta Biblẹ, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Nne na nna m so n’ime ha, bụ́ ndị setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke iguzosi ike n’ihe nye Jehova ruo mgbe ha nwụrụ n’etiti afọ ndị 1970. Ná ndụ m nile, iguzosi ike n’ihe nye Chineke abụrụwokwa nchegbu m bụ́ isi.—Abụ Ọma 18:25.

Na 1939, bụ́ mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere, e webatara ebe ọwụwa anyanwụ nke Poland bụ́ ebe anyị bi n’ime Soviet Union. Anyị nọ n’okpuru ọchịchị Soviet ruo June 1941, bụ́ mgbe ndị Germany wakporo ógbè anyị ma bichie ya.

N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, enwere m ihe isi ike ụfọdụ n’ụlọ akwụkwọ. A kụziiri ụmụaka ịbụ abụ na-egosi na ha hụrụ ala ha n’anya na ikere òkè n’ọzụzụ ndị agha. N’ezie, otu akụkụ nke ọzụzụ anyị gụnyere ịmụ otú e si atụ bọmbụ nta bụ́ grenade. Ma ajụrụ m ịbụ abụ ịhụ mba n’anya ahụ na ikere òkè n’ọzụzụ agha ọ bụla. Ịmụta n’oge m bụ nwata ịgọpụrụ nkwenkwe m dabeere na Bible nyeere m aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke n’afọ ndị sochirinụ.

E nwere ọtụtụ ndị nwere mmasị n’eziokwu Bible n’ókèala ọgbakọ anyị nke na e kenyere ndị ọsụ ụzọ abụọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, ọrụ n’ógbè anyị iji nye aka ịkụziri ha ihe. Otu n’ime ndị ọsụ ụzọ ahụ, bụ́ Ilja Fedorovitsch, mụkwaara m Bible ma zụọ m n’ozi. N’oge ahụ ndị Germany bichiri ebe ahụ, a gbaara Ilja ụgbọ nwa mkpi wee tụkpuo ya n’otu n’ime ogige ịta ahụhụ nke ndị Nazi, bụ́ ebe ọ nọ nwụọ.

Mgba Papa M Gbara Ịnọpụ Iche

Na 1941, ndị ọchịchị Soviet gbalịrị ime ka papa m bịanye aka n’akwụkwọ, na-ekwe nkwa ịkwụ ego iji kwadoo agha. Ọ gwara ha na ya apụghị ịkwado akụkụ nke ọ bụla n’agha ahụ nakwa na dị ka ohu nke ezi Chineke, ya ga-anọpụ iche. E weere papa m dị ka onye iro ma maa ya ikpe ịga mkpọrọ afọ anọ. Ma ọ nọrọ nanị abalị anọ. N’ihi gịnị? N’ihi na, na Sunday sochiri ụbọchị a tụrụ ya mkpọrọ, ndị agha Germany bịara bichie n’ógbè ahụ anyị bibu.

Mgbe ndị nche ụlọ mkpọrọ nụrụ na ndị Germany nọ nso, ha mepere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ wee gbalaga. N’èzí, ndị agha Soviet gbagburu ihe ka ọtụtụ n’ime ndị mkpọrọ ahụ. Papa m apụghị ozugbo ahụ, ma ka e mesịrị, ọ gbagara n’ụlọ ndị enyi ya. O si ebe ahụ zigara mama m ozi ka o wetara ya akwụkwọ ya, bụ́ ndị na-egosi na a tụwo ya mkpọrọ n’ihi ịjụ ịkwado ndị Soviet n’agha ahụ. Mgbe papa m gosiri ndị ọchịchị Germany akwụkwọ ndị a, ha egbughị ya.

Ndị Germany chọrọ ịma aha ndị nile kwadoworo ndị Soviet. Ha rụgidere papa m ịkpọ aha ha, ma ọ jụrụ ajụ. Ọ kọwara nguzo nnọpụiche ya. Ọ bụrụ na ọ kpọrọ aha onye ọ bụla, a gaara agbagbu onye ahụ. N’ihi ya, nnọpụiche papa m chebekwara ndụ ndị ọzọ, bụ́ ndị nwere ekele dị ukwuu nye ya.

Ịrụ Ọrụ na Nzuzo

Ndị Soviet lọghachiri na Ukraine n’August 1944, na May 1945 kwa, Agha Ụwa nke Abụọ nke Europe biri. Mgbe nke ahụ gasịrị, ihe ahụ a na-akpọ Ihe Mgbochi Ígwè kewapụrụ anyị bụ́ ndị nọ na Soviet Union n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụwa nọ. Ọbụna iso Ndịàmà Jehova nọ na Poland ma a gafee ókè ahụ na-enwe mmekọrịta siri ike. Ndịàmà nwere obi ike na-amịfe ókè ahụ ma jiri magazin lNche ole na ole dị oké ọnụ ahịa lọta. Ebe ókèala ahụ dị nanị kilomita asatọ site n’ụlọ anyị dị na Laskiv, anụrụ m banyere ihe ize ndụ nke ndị a na-ebu ozi a na-eche ihu.

Dị ka ihe atụ, otu Onyeàmà aha ya bụ Silvester gafere ugboro abụọ ma lọtachaa n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ma na nke atọ ọ gara, ndị na-eche nche n’ókè ahụ na nkịta ndị ha ji eche nche hụrụ ya. Ndị agha ahụ tiri mkpu ka ọ kwụsị, ma Silvester gbara ọsọ maka ndụ ya. Nanị ohere o nwere izere nkịta ndị ahụ bụ ịmabanye n’ime ọdọ mmiri dị nso. Ọ nọrọ abalị ahụ nile n’ime mmiri ahụ, na-esepụta nanị isi ya, na-ezo n’ahịhịa dị ogologo. N’ikpeazụ, mgbe ike gwụrụ ndị agha ahụ ịchọ ya, Silvester daara lawa, n’ike ọgwụgwụ.

Dị ka m kọrọ ná mmalite, e gburu nwa nwoke nke nwanne Silvester, bụ́ Stepan mgbe ọ na-agbalị ịgafe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị mkpa na anyị ga-anọgide na-eso ndị Jehova na-enwe mmekọrịta. Site ná mgbalị nke ndị obu ozi nwere obi ike, anyị nwere ike inweta nri ime mmụọ na ntụziaka bara uru.

N’afọ sochiri ya, na 1948, e mere m baptism n’otu ntakịrị ọdọ mmiri dị nso n’ụlọ anyị. Ndị a ga-eme baptism zukọtara n’ụlọ anyị, ma amaghị m ndị ha bụ, ebe ọ bụ na ọchịchịrị gbara, e meekwa ihe nile na nzuzo n’emeghị mkpọtụ. Anyị bụ́ ndị a ga-eme baptism ekwurịtaghị okwu. Amaghị m onye kwuru okwu baptism, onye jụrụ m ajụjụ baptism ka anyị kwụ ọtọ na nso ọdọ mmiri ahụ, ma ọ bụ onye mikpuru m na mmiri. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, mgbe mụ na otu ezigbo enyi m na-atụle ihe anyị deturu edetu, anyị chọpụtara na anyị abụọ so ná ndị e mere baptism n’abalị ahụ!

Na 1949, Ndịàmà nọ na Ukraine natara ozi site na Brooklyn bụ́ nke gbara ha ume idegara ndị ọchịchị nọ na Moscow akwụkwọ mkpesa ka ha nye ọrụ nkwusa ha nkwado iwu na Soviet Union. N’ịgbaso nduzi ahụ, e zigaara Òtù Kansụl Kasị Elu nke U.S.S.R. akwụkwọ mkpesa site n’aka minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime mba ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, a gwara Mykola Pyatokha na Ilya Babijchuk ka ha gaa Moscow inweta ihe gọọmenti zara ná mkpesa anyị. Ha kweere wee gaa Moscow n’oge okpomọkụ ahụ.

Onye ọchịchị nke nabatara ndị nnọchianya a gere ntị ka ha kwuru ihe dabeere na Bible mere anyị ji arụ ọrụ anyị. Ha kọwara na a na-arụ ọrụ anyị iji mezuo amụma Jisọs buru na “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:14) Otú ọ dị, onye ọchịchị ahụ kwuru na Ọchịchị ala ahụ agaghị enye anyị nkwado iwu ma ọlị.

Ndịàmà ahụ lọtara wee gaa n’isi obodo Ukraine bụ́ Kiev inweta nkwado iwu maka ọrụ anyị n’ebe a na Ukraine. Ọzọ, ndị ọchịchị jụrụ ime ihe ahụ a rịọrọ ha. Ha kwuru na a gaghị enye Ndịàmà Jehova nsogbu nanị ma ọ bụrụ na ha akwado Ọchịchị. Ha kwuru na Ndịàmà kwesịrị ije ozi n’òtù ndị agha ma soro ná ntụli aka. Ọzọ, a kọwara nguzo nnọpụiche anyị, ya bụ, na n’iṅomi Nna Ukwu anyị bụ́ Jisọs Kraịst, anyị agaghị abụ akụkụ nke ụwa ma ọlị.—Jọn 17:14-16.

Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, e jidere Nwanna Pyatokha na Babijchuk, boo ha ebubo, maakwa ha ikpe ịga mkpọrọ afọ 25. N’ihe dị ka n’oge ahụ, na 1950, ndị ọchịchị kpụụrụ ọtụtụ Ndịàmà, tinyere papa m. A mara ya ikpe ịga mkpọrọ afọ 25 wee kpọga ya Khabarovsk, bụ́ ebe dị ná ngwụcha nke ebe ọwụwa anyanwụ Soviet Union n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilomita 7,000 site n’ebe anyị bi!

A Chụga Anyị Siberia

E mesịa, n’April 1951, Ọchịchị Soviet jikọtara aka kpagbuo Ndịàmà ná mba ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ ya bụ́ ndị a maara ugbu a dị ka Latvia, Estonia, Lithuania, Moldova, Belarus, na Ukraine. N’ọnwa ahụ, a chụgara ihe dị ka anyị mmadụ 7,000 na Siberia tinyere mụ na mama m. Ndị agha bịara nnọọ n’ụlọ anyị n’abalị ma kpụrụ anyị gaa n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè. N’ebe ahụ, a kpọchiri anyị n’ime ụgbọala ndị e ji ebu ehi—ihe dị ka mmadụ 50 n’otu ụgbọala—mgbe ihe karịrị izu abụọ gasịkwara, a kwọsara anyị n’otu ebe a na-akpọ Zalari, bụ́ nke dị nso n’Ọdọ Mmiri Baikal nke dị n’ógbè Irkutsk.

Ka m na-eguzo na snow, n’ifufe nke jụrụ oké oyi, bụrụkwa onye ndị agha bu ngwá agha gbara gburugburu, echere m ihe na-eche anyị ihu. Olee otú m ga-esi nwelie ike iguzosi ike n’ihe nye Jehova n’ebe a? Anyị malitere ịbụ abụ Alaeze iji mee ka obi anyị pụọ n’oyi ahụ. Ndị manịja ụlọ ọrụ dị iche iche nke obodo ahụ bịara. Ụfọdụ chọrọ ndị ikom maka ọrụ siri ike, ebe ndị ọzọ chọrọ ndị inyom maka ihe ndị dị ka ilekọta ụmụ anụmanụ. A kpọọrọ mụ na mama m gaa n’ụlọ owuwu ihe bụ́ ebe a na-ewu Ụlọ Ọrụ Tagninskaya Ji Mmiri Enye Ọkụ Eletrik.

Mgbe anyị rutere, anyị hụrụ ogige ndị e ji osisi wuo ụlọ ha, bụ́ ebe obibi maka ndị a chụpụrụ n’obodo ha. E kenyere m ọrụ ịnya traktọ na dị ka onye ọrụ ọkụ eletrik, e kenyekwara mama m ịrụ ọrụ n’ugbo. Ndị isi weere anyị dị ka ndị a gbaara ụgbọ nwa mkpi, ọ bụghị dị ka ndị mkpọrọ. N’ihi ya, anyị nweere onwe anyị ịgagharị gburugburu ebe na-adịghị anya site ụlọ ọrụ ọkụ eletrik ahụ, ọ bụ ezie na a machibidoro anyị ileta ndị bi n’ogige nke ọzọ bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 50 site n’ebe anyị nọ. Ndị isi manyere anyị ịbịanye aka n’akwụkwọ, na-ekwupụta na anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi. Nke ahụ dara m ka oge dị ogologo gabiga ókè, onye dị afọ 19, n’ihi ya, ajụrụ m ịbịanye aka. Ma, anyị nọrọ afọ 15 n’ebe ahụ.

Na Siberia ebe ahụ, ókèala Poland adịghịzi ihe dị ka nanị kilomita 8 kama ihe karịrị kilomita 6,000 site n’ebe anyị bi! Anyị bụ́ Ndịàmà mere ihe nile anyị nwere ike ime iji hazie onwe anyị n’ọgbakọ n’ọgbakọ, na-ahọpụta ndị ikom idu ndú. Na mbụ, anyị enweghị akwụkwọ e ji amụ Bible ma e wezụga akwụkwọ ole na ole Ndịàmà ụfọdụ jisiri ike were si Ukraine bịa. E ji aka depụtaghachi ha, anyị kesakwara ha n’etiti onwe anyị.

N’oge na-adịghị anya, anyị malitere inwe nzukọ. Ebe ọ bụ na ọtụtụ n’ime anyị bi n’ogige ndị agha, anyị na-ezukọta n’ọtụtụ uhuruchi. Ihe mejupụtara ọgbakọ anyị bụ ihe dị ka mmadụ 50, e kenyekwara m iduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. E nwere ndị ikom ole na ole n’ọgbakọ anyị, n’ihi ya, ndị inyom na-ekwukwa okwu ndị mmụta, bụ́ usoro a malitere n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’ebe ndị ọzọ na 1958. Mmadụ nile jiri ihe omume ha kpọrọ ihe, na-ewere ụlọ akwụkwọ ahụ dị ka ụzọ isi too Jehova ma gbaa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ume.

A Gọzie Ozi Anyị

Ebe ọ bụ na anyị na ndị ọzọ na-abụghị Ndịàmà bi n’ogige ndị agha ahụ, ọ na-esi ike ka otu ụbọchị gafee ka anyị ghara ịgwa ndị ọzọ banyere okwukwe anyị, ọ bụ ezie na a machibidoro ya nnọọ iwu. Mgbe Joseph Stalin, bụ́ onyeisi ala Soviet, nwụsịrị na 1953, ihe bịara dịtụ mma. E nyekwuru anyị ohere isoro ndị ọzọ na-ekwurịta banyere nkwenkwe anyị dabeere na Bible n’ihu ọha. Site n’iso ndị enyi anyị nọ na Ukraine na-ederịta akwụkwọ ozi, anyị matara ebe Ndịàmà ndị ọzọ n’ógbè anyị nọ ma kpọtụrụ ha. Nke a mere ka anyị nwee ike ịhazi ọgbakọ anyị dị iche iche na sekit na sekit.

Na 1954, alụrụ m Olga, bụ́kwa onye a chụpụrụ na Ukraine. Eri ọtụtụ afọ, ọ kwadowo m n’ụzọ dị ukwuu n’ozi m na-ejere Jehova. Ọ bụ nwanne Olga, bụ́ Stepan, ka a gbagburu n’ókè Ukraine na Poland na 1947. Mgbe e mesịrị, anyị mụrụ nwa nwanyị bụ́ Valentina.

Mụ na Olga nwetara ọtụtụ ngọzi n’ozi ndị Kraịst anyị jere na Siberia. Dị ka ihe atụ, anyị zutere George, onye bụbu onye ndú nke òtù Baptist. Anyị kpọtụụrụ ya mgbe mgbe ma mụọrọ ya magazin lNche ọ bụla anyị nwere. N’oge na-adịghị anya, George bịara ghọta na ihe ndị ohu Jehova na-ekwusa site na Bible bụ eziokwu. Anyị malitekwara ịmụrụ ọtụtụ n’ime ndị enyi ya bụ́ ndị Baptist ihe. Lee ihe obi ụtọ ọ bụụrụ anyị mgbe e mere George na ọtụtụ n’ime ndị enyi ya baptism, ha aghọọkwa ụmụnna ime mmụọ anyị!

Na 1956, a họpụtara m dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ nke mere ka ọ dị mkpa na m ga-eleta otu ọgbakọ n’ógbè anyị kwa izu. M ga-arụ ọrụ n’ụtụtụ na n’ehihie ma jiri ọgba tum tum mụ bilie ije n’uhuruchi iji soro ọgbakọ ahụ zukọọ. N’isi ụtụtụ echi ya, m ga-alaghachi wee gaa ọrụ. Mykhailo Serdinsky, bụ́ onye a họpụtara inyere m aka n’ọrụ njegharị ahụ nwụrụ n’ihe ọghọm okporo ụzọ na 1958. Ọ nwụrụ na Wednesday ma anyị hapụrụ olili ya ruo Sunday iji nye ọtụtụ Ndịàmà dị ka o kwere omume ohere ịbịa.

Mgbe ìgwè buru ibu nke anyị mejupụtara malitere ịga n’ebe olili ozu ahụ, ndị òtù nke Ndị Nchebe Obodo sowere anyị. Ikwu okwu metụtara olileanya anyị nke mbilite n’ọnwụ dabeere na Bible pụtara ịnọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye e jidere. Ma enwere m mkpali ikwu okwu banyere Mykhailo na olileanya magburu onwe ya o nwere maka ọdịnihu. N’agbanyeghị na m jiri Bible mee ihe, Ndị Nchebe Obodo ahụ ejideghị m. O yiri ka ha chere na o nweghị ihe ha ga-erite na ya, ha makwaara m nke ọma, ebe m bụwooro ha “ọbịa” ọtụtụ ugboro n’isi ụlọ ọrụ ha maka ịgba m ajụjụ.

Onye Mgbaàmà Raara Anyị Nye

Na 1959, Ndị Nchebe Obodo jidere Ndịàmà 12 bụ́ ndị nọworo na-edu ndú n’ọrụ nkwusa. A kpọrọ ọtụtụ ndị ọzọ maka ịgba ha ajụjụ, esokwa m na ha. Mgbe o ruru ka a gbaa m ajụjụ, o juru m anya ịnụ ka ndị ọrụ ahụ na-akọ ihe nzuzo dị iche iche banyere ọrụ anyị. Olee otú o si bụrụ na ha maara ihe ndị a? N’ụzọ doro anya, e nwere onye mgbaàmà, onye maara ọtụtụ ihe banyere anyị, bụ́kwa onye nọworo na-arụrụ ndị Ọchịchị ọrụ ruo oge ụfọdụ.

Mmadụ 12 ahụ e jideworo nọ n’ụlọ nga ndị a rụnyere n’akụkụ ibe ha, ha kwetakwara na ha agaghị atụpụkwara ndị ọchịchị ọnụ ọzọ. N’ụzọ dị otú ahụ, onye mgbaàmà ahụ ga-apụta n’onwe ya n’oge a ga-ekpe ikpe ma gbaa akaebe megide ha. Ọ bụ ezie na a gbaghị m akwụkwọ n’ụlọikpe, agara m n’ụlọikpe ịhụ ihe ga-eme. Ọkàikpe jụrụ ọtụtụ ajụjụ, ma mmadụ 12 ahụ azaghachighị. Mgbe ahụ, otu Onyeàmà aha ya bụ Konstantyn Polishchuk, bụ́ onye m mawooro ruo ọtụtụ afọ, gbara akaebe megide mmadụ 12 ahụ. Ikpe ahụ biri n’ịma ụfọdụ n’ime Ndịàmà ahụ ikpe ịga mkpọrọ. N’okporo ámá dị n’èzí ụlọikpe ahụ, ezutere m Polishchuk.

“N’ihi gịnị ka i ji na-arara anyị nye?” Ka m jụrụ.

“N’ihi na ekwenyeghịzi m,” ka ọ zara.

“Gịnị ka ị na-ekwenyeghịzi na ya?” ka m jụrụ.

“Apụghịzi m nnọọ ikwere na Bible,” ka ọ zara.

Polishchuk gaara ararakwu m nye, ma n’akaebe ọ gbara, ọ kpọtụghị aha m. N’ihi ya, ajụrụ m ya ihe mere na o meghị otú ahụ.

“Achọghị m ka ị gaa mkpọrọ,” ka ọ kọwara. “Obi m ka na-ama m ikpe banyere ọnwụ nwanne nwunye gị, bụ́ Stepan. Ọ bụ m mere e ji zije ya n’ofe ókè ahụ n’abalị ahụ e gburu ya. Nke ahụ na-ewute m n’ezie.”

Okwu ya juru m anya. Lee nnọọ otú akọ n’uche ya siworo gbagọọ agbagọọ! Ọnwụ Stepan wutere ya, ma ugbu a ọ rarawo ndị ohu Jehova nye. Ahụghị m Polishchuk ọzọ. Ọ nwụrụ ọnwa ole na ole mgbe nke a gasịrị. Nye m, ịhụ ka onye m tụkwasịrị obi ruo ọtụtụ afọ raara ụmụnna anyị nye mere ka m nwee àpà dị omimi ná mmetụta uche m. Ma ahụmahụ ahụ kụziiri m otu ihe bara uru: Polishchuk eguzosighike n’ihe n’ihi na kwsrị ịgna ikwere na Bible.

N’ezie, ọ dị anyị mkpa iburu ihe mmụta a n’uche: ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova, ọ dị anyị mkpa ịdị na-amụchi Akwụkwọ Nsọ anya. Bible na-ekwu, sị: “Chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” Ọzọkwa, Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst ka ha lezie anya. N’ihi gịnị? “Ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma eleghị anya n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ.”—Ilu 4:23; Ndị Hibru 3:12.

Ịlaghachi Ukraine

Mgbe nchụga a chụgara anyị na Siberia bịara ná njedebe ya na 1966, mụ na Olga laghachiri Ukraine, gaa n’otu obodo a na-akpọ Sokal, bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 80 site na L’viv. Anyị nwere ọtụtụ ihe ime, ebe e nwere nanị Ndịàmà 34 na Sokal nakwa n’obodo ndị dị ya nso bụ́ Cervonograd na Sosnivka. N’ógbè a taa, e nwere ọgbakọ 11!

Olga nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi na 1993. Mgbe afọ atọ gasịrị, alụrụ m Lidiya, kemgbe ahụkwa, o nyewo m nkwado dị ukwuu. Tụkwasị na nke ahụ, nwa m nwanyị bụ́ Valentina na ezinụlọ ya bụ ndị ohu Jehova na-anụ ọkụ n’obi, ha abụrụwokwa isi iyi nke agbamume. Otú ọ dị, ihe nọgidere na-ewetara m ọṅụ kasị ukwuu bụ na eguzosiwo m ike n’ihe nye Jehova, bụ́ Chineke nke na-eji iguzosi ike n’ihe emeso mmadụ ihe.—2 Samuel 22:26.

Alexei Davidjuk nwụrụ n’iguzosi ike n’ihe nye Jehova na February 18, 2000, mgbe a na-akwadebe ihe odide a maka mbipụta.

[Foto dị na peeji nke 24]

Ọgbakọ anyị, bụ́ nke na-ezukọ n’ogige ndị agha ahụ na 1952 n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Siberia

[Foto dị na peeji nke 27]

Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na 1953

[Foto dị na peeji nke 27]

Ememe olili ozu nke Mykhailo Serdinsky na 1958

[Foto dị na peeji nke 28]

Mụ na nwunye m bụ́ Lidiya