Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngwagbu nke Akụkọ

Ngwagbu nke Akụkọ

Ngwagbu nke Akụkọ

“Site n’ịnọgide na-eji nkà agbasa echiche, a pụrụ ọbụna ime ka eluigwe yie hel n’anya ndị mmadụ, ma ọ bụkwanụ mee ka ndụ kasị dị mwute yie paradaịs.”—ADOLF HITLER, MEIN KAMPF.

EBE ọ bụ na usoro mgbasa ozi amụbawo—site n’akwụkwọ e biri ebi ruo na telifon, redio, telivishọn, na Internet—mgbasa nke ozi ndị na-eme ka a gbanwee echiche amụbawo nke ukwuu. Oké mgbanwe a e nwere ná nzirịta ozi emewo ka ozi buo ibu, na-eme ka ntị ndị mmadụ ju n’ọtụtụ ozi na-abịa site n’akụkụ ọ bụla. Nrụgide a na-akpali ọtụtụ ndị ikweta ihe ozi kwuru ngwa ngwa karị na ịnabata ha n’ajụghị ase ma ọ bụ tụlee ha atụlee.

Ndị na-eji nkà agbasa echiche na-enwe mmasị ná nleghara anya ndị dị otú ahụ—karịsịa ndị na-eleghara echiche amamihe dị na ya anya. Mgbasa echiche na-akwalite nke a site n’ịkpali mmetụta uche, site n’iji enweghị obi ike eme ihe, site n’ilekwasị anya ná mgbagwoju anya nke asụsụ, na site n’ịgwagbu ụkpụrụ ndị na-achịkwa echiche ezi uche dị na ya. Akụkọ ihe mere eme na-akwado na ụzọ ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị nnọọ irè.

Eziokwu Banyere Mgbasa Echiche

Taa okwu ahụ bụ́ “mgbasa echiche” na-enye echiche na-adịghị mma, na-egosi ime ihe n’ụzọ eziokwu na-adịghị na ya, ma nke ahụ abụghị ihe mbụ e bu n’obi jiri okwu ahụ mewe ihe. O yiri ka e nwetara okwu Bekee a sụgharịrị ịbụ “mgbasa echiche” site n’aha Latin nke òtù ndị kadinal Roman Katọlik, bụ́ Congregatio de Propaganda Fide (Ọgbakọ Maka Mgbasa nke Okwukwe ahụ). Ọ bụ Popu Gregory nke Iri na Ise hiwere kọmitii a—a kpọrọ Propaganda (Mgbasa Echiche) ná mkpọbiri—na 1622 ka ha na-elekọta ndị ozi ala ọzọ. “Mgbasa echiche” ji nke nta nke nta bịa ghọọ mgbalị ọ bụla e mere iji gbasaa nkwenkwe.

Ma echiche mgbasa echiche na-enye abụghị ihe o nyere na narị afọ nke 17. Malite n’oge ochie, ndị mmadụ ejiwo ụzọ ọ bụla ha nwere gbasaa echiche ma ọ bụ mee ka a marakwuo aha na ike ha. Dị ka ihe atụ, nkà abụrụwo ihe ndị na-agbasa echiche na-eji eme ihe kemgbe oge fero ndị e nwere n’Ijipt. Ndị eze a rụrụ pyramid ha ka ha gosipụta ike na nnọte aka. N’otu aka ahụ, e ji ịtụ ụkpụrụ ụlọ nke ndị Rom mee ihe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị—ito mba. “Mgbasa echiche” bịara nyekwuo echiche na-adịghị mma n’ozuzu ya n’Agha Ụwa Mbụ mgbe gọọmenti dị iche iche malitere ikere òkè dị ukwuu n’ikpebi akụkọ agha a na-agbasa n’usoro mgbasa ozi. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, Adolf Hitler na Joseph Goebbels gosipụtara na ha bụ ndị ọkà n’ịgbasa echiche.

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, mgbasa echiche ghọwanyere ihe bụ́ isi a na-eji akwalite ụkpụrụ mba. Ma mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ma ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ mere mkpọsa dị ukwuu iji mee ka ọtụtụ ndị na-adịghị ebe ha kwụ dụnyere ha úkwù. E ji akụkọ ọ bụla nke ndụ na ụkpụrụ mba mee ihe iji gbanwee echiche. N’afọ ndị na-adịbeghị anya a hụwo ọganihu e nwere n’ịgbasa echiche n’achụmnta votu nakwa ná mkpọsa ngwá ahịa ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ụtaba. E jiriwo ndị a sị na ha bụ ndị ọkachamara na ndị ọzọ bụ́ ndị ndú mee ihe iji gosi na ise siga na-adọrọ mmasị ma bụrụ ihe na-akwalite ahụ ike kama ịbụ ihe na-eyi ahụ ike ọha na eze egwu, nke bụ́ ihe ọ bụ n’ezie.

Okwu Ụgha, Okwu Ụgha!

N’ezie, ụzọ kasị eru onye na-agbasa echiche aka bụ ịgha ụgha pụtara ìhè. Dị ka ihe atụ, tụlee ụgha Martin Luther ghagidere ndị Juu nọ na Europe na 1543 bụ́ nke e dere n’akwụkwọ: “Ha nwere olulu mmiri nwere nsí, ha egbuwo ndị a ma ama, tọrọ ụmụaka . . . Ha bụ agwọ nwere obi ọjọọ, na-ebu ajọ iro, na-abọ ọ́bọ̀, ma dị aghụghọ, ndị na-egbu ndị a ma ama, bụrụkwa ụmụ Ekwensu bụ́ ndị na-agba agba ma na-emerụ mmadụ ahụ.” Gịnị ka ọ gbara ndị sị na ha bụ ndị Kraịst ume ime? “Suo ụlọ nzukọ ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ ha ọkụ . . . [E kwesị]kwara ịkwatu na ibibi ụlọ ha.”

Otu prọfesọ n’ihe ọmụmụ banyere gọọmenti na omume na ọdịdị mmadụ bụ́ onye mụrụ ihe banyere oge ahụ na-ekwu, sị: “N’ụzọ bụ́ isi ọ bụghị omume ndị Juu kpaliri mmegide a na-emegide ụmụ Shem, n’ihi ya kwa, ihe ọmụma onye na-emegide ụmụ Shem adabereghị kpọmkwem n’àgwà ndị Juu.” Ọ na-ekwukwa, sị; “Ọ bụ ndị Juu na-eme ihe ọ bụla na-ezighị ezi, nke na a na-ekwu na ọ bụ ndị Juu na-akpata nsogbu ebumpụta ụwa na nke ọha mmadụ.”

Akapịghị Okwu Ọnụ

Ụzọ ọzọ dị nnọọ irè nke isi jiri mgbasa echiche eme ihe bụ ikwu okwu a na-akapịghị ọnụ. Akapịghị okwu ọnụ na-ekpuchikarị ihe ndị dị mkpa n’ihe a na-ekwu okwu ya n’ezie, a na-ejikarịkwa ya eweda ìgwè mmadụ dị iche iche n’ozuzu ha ala. Dị ka ihe atụ, “ndị si mba ọzọ kwabata bụcha ndị ohi” bụ okwu a na-anụkarị ná mba Europe ụfọdụ. Ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?

Richardos Someritis, bụ́ onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ, na-ekwu na n’otu mba, echiche ndị dị otú ahụ mere ka e nwee “ntiwapụ nke ịtụ ndị ọbịa ụjọ nakwa mgbe ụfọdụ ịkpa ókè agbụrụ” megide ndị mba ọzọ. Otú ọ dị, e gosiwo na a bịa n’ihe banyere omume nnupụisi, o yiri ka ọ bụ ma ụmụ afọ mba ahụ ma ndị si mba ọzọ na-eme ha. Dị ka ihe atụ, Someritis kwuru na nnyocha ndị e mere na-egosi na na Gris, “ọ bụ [ndị Gris] na-eme 96 n’ime 100 mpụ ndị a na-eme.” “Ihe ndị na-akpata mpụ bụ ihe ndị metụtara ego na ọha mmadụ,” ka ọ na-ekwu, “ọ bụghị ihe ndị metụtara ‘agbụrụ.’” Ọ tara usoro mgbasa ozi ụta “maka iji nwayọọ nwayọọ na-akpali ịtụ ndị ọbịa ụjọ na ịkpa ókè agbụrụ” site n’ibo ndị ọzọ ebubo mpụ n’ụzọ na-ezighị ezi.

Ịkọ Ọnụ

Ụfọdụ ndị na-akparị ndị na-ekwenyereghị ha site n’inyo àgwà na ebumnobi ha enyo kama ilekwasị anya n’ihe bụ eziokwu. Ịkọ ọnụ na-enye mmadụ, ìgwè, ma ọ bụ echiche, aha ọjọọ dị mfe ncheta. Ọkọ ọnụ ahụ na-atụ anya na a gaghị echezọ aha mkparị ahụ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ajụ onye ahụ ma ọ bụ echiche ahụ n’ihi aha ọjọọ ahụ kama ịtụle ihe àmà n’onwe ha, ụzọ ọkọ ọnụ ahụ ji mee ihe arụpụtala ihe.

Dị ka ihe atụ, n’afọ ndị na-adịbeghị anya a gbasara echiche ọjọọ megide ịrọ òtù n’ọtụtụ mba na Europe na n’ebe ndị ọzọ. Omume a akpaliwo mmetụta uche, ile mmadụ anya dị ka onye iro, meekwa ka ajọ mbunobi e nwere megide okpukpe ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ ka njọ. Ọtụtụ mgbe, a na-eji “ịrọ òtù” emere okwu njimara. “Ihe ọzọ a pụrụ ịkpọ ‘ịrọ òtù’ bụ ‘onye jụrụ okwukwe,’” ka onye Germany bụ́ Prọfesọ Martin Kriele dere na 1993, “[a na-egbu]kwa onye jụrụ okwukwe taa na Germany, dị ka a na-eme n’oge gara aga—ma ọ́ bụghị site n’isu ya ọkụ . . . , ọ bụrụ site n’imebi aha ya, ikewapụ ya iche nakwa ime ka ihe siere ya ike.”

Òtù Na-enyocha Mgbasa Echiche na-ekwu na “aha mkparị dị iche iche ekerewo òkè dị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke ụwa nakwa n’ọganihu anyị n’otu n’otu. Ha emebiwo aha ọma, . . . mee ka [ndị mmadụ] gaa mkpọrọ, kpasuokwa ndị mmadụ iwe mere ha ji gaa agha ma gbuo mmadụ ibe ha.”

Iji Mmetụta Uche Eme Ihe

Ọ bụ ezie na mmetụta nwere ike ghara ịdị mkpa iji ghọta ihe bụ́ eziokwu ma ọ bụ arụmụka amamihe dị na ya, ọ na-ekere òkè dị ukwuu n’ime ka a gbanwee echiche. Ọ bụ ndị nnọchiteanya nwere nkà nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi, bụ́ ndị na-eji mmetụta uche eme ihe otú ahụ onye na-akpọ piano na-eji nkà eme ihe, na-echepụta okwu mkpali.

Dị ka ihe atụ, tegwu bụ mmetụta uche pụrụ ime ka a ghara ime mkpebi amamihe dị na ya. Dị ka ọ dị n’ihe banyere anyaụfụ, a pụkwara iji egwu mee ihe. Akwụkwọ akụkọ Canada bụ́ The Globe and Mail, nke February 15, 1999, kọrọ ihe na-esonụ mere na Moscow: “Mgbe ụmụ agbọghọ atọ gburu onwe ha na Moscow n’izu gara aga, ụlọ ọrụ mgbasa ozi Russia kwuru ozugbo na ha pụrụ ịbụ Ndịàmà Jehova na-anụbiga ọkụ n’obi ókè.” Rịba okwu bụ́ “na-anụbiga ọkụ n’obi ókè” ama. Dị ka o kwesịrị ịdị, ndị mmadụ ga-atụ òtù okpukpe na-anụbiga ọkụ n’obi ókè egwu bụ́ nke e weere na ọ na-akpali ndị na-eto eto igbu onwe ha. N’ezie, ọ̀ dị ihe ọ bụla jikọrọ ụmụ agbọghọ a nwere ihe ndabara ọjọọ na Ndịàmà Jehova?

Akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ Globe gara n’ihu, sị: “Ndị uwe ojii mesịrị kweta na ọ dịghị ihe jikọrọ ụmụ agbọghọ ahụ na [Ndịàmà Jehova]. Ma tupu mgbe ahụ otu ụlọ ọrụ telivishọn Moscow akatọọlarị òtù ahụ ọzọ, na-agwa ndị mmadụ na Ndịàmà Jehova kwadoro Adolf Hitler na Nazi Germany—n’agbanyeghị akụkọ ihe mere eme na-egosi na a tụbara ọtụtụ puku n’ime ndị òtù ha n’ogige ọnwụ ndị Nazi.” N’uche ndị e duhiere nakwa ndị ọ pụrụ ịbụ na ha na-atụ egwu, Ndịàmà Jehova bụ òtù nzuzo na-egbu onwe ha ma ọ bụ ndị na-akwado ndị Nazi!

kpasbụ mmetụta uche siri ike ndị na-agbasa echiche na-eji eme ihe. Okwu ọjọọ na-adịkarị irè n’ịkpasu ya. O yiri ka ọ fọrọ nke nta ka e nwee ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke okwu ọjọọ ndị na-akwalite ma na-akpali ịkpọ otu agbụrụ, ebo, ma ọ bụ òtù okpukpe asị.

Ụfọdụ ndị na-agbasa echiche na-akpali nganga. Ọtụtụ mgbe anyị pụrụ ịmata okwu ndị e ji akpali nganga site n’ịchọ okwu ndị bụ́ isi dị ka: “Onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi maara na . . . ” ma ọ bụ, “Onye gụruru akwụkwọ ka gị aghaghị ịmata na . . . ” Ụzọ dị iche na nke ahụ, nke isi kpalie nganga na-eji egwu anyị na-atụ iyi ndị nzuzu eme ihe. Ndị bụ́ ọka n’ime ka a gbanwee echiche maara nke ahụ nke ọma.

Okwu Njimara na Ihe Nnọchianya

Okwu njimara bụ okwu ndị na-edoghị anya a na-ejikarị egosipụta echiche ma ọ bụ nzube. N’ihi na ha adịghị edo anya, ọ na-adị mfe ịnabata ha.

Dị ka ihe atụ, e nwee ọgba aghara ma ọ bụ agha mba, ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị pụrụ ịdị na-ekwu okwu njimara ndị dị ka “Mba m, ma ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi,” “Ala Nna Mmadụ, Okpukpe, Ezinụlọ,” ma ọ bụ “Nnwere Onwe Ma Ọ Bụ Ọnwụ.” Ma ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ hà na-atụle nke ọma ihe ndị kpaliri ọgba aghara ma ọ bụ agha ahụ n’ezie? Ka hà na-ekwere ihe a gwara ha n’ajụghị ase?

Mgbe ọ na-ede banyere Agha Ụwa Mbụ, Winston Churchill kwuru, sị: “Ihe a chọrọ bụ nanị otu ihe mkpali iji mee ka imerime ndị nkịtị a na ndị ọrụ nọ n’udo ghọọ ìgwè buru ibu ga-egbusịrịta onwe ha.” O kwukwara na mgbe a gwara ha ihe ha ga-eme, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ṅara ntị n’echeghị echiche.

Onye na-agbasa echiche na-enwe nnọọ ọtụtụ ihe nnọchianya ọ na-eji egosipụta nzube ya—ọnụ égbè 21, mgbuchapụ ekele ndị agha, ọkọlọtọ. A pụkwara iji ịhụ nne na nna n’anya mee ihe. N’ihi ya, ihe nnọchianya ndị dị otú ahụ dị ka ala nna mmadụ, obodo a mụrụ mmadụ, ma ọ bụ okpukpe mmadụ, bụ ihe ndị na-eji akọ eme ka a gbanwee echiche na-eji eme ihe.

Ya mere nkà aghụghọ nke mgbasa echiche pụrụ ịkpaghasị echiche, mee ka mmadụ ghara iche echiche nke ọma na inwe ikike nghọta, na-akpalikwa ndị mmadụ ime ihe n’ìgwè. Olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

Nkà aghụghọ nke mgbasa echiche pụrụ ịkpaghasị echiche ma mee ka a ghara iche echiche nke ọma

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

ỌRỤ NDỊÀMÀ JEHOVA Ọ̀ BỤ ỊGBASA ECHICHE NA-EDUHIE EDUHIE?

Ụfọdụ ndị na-emegide Ndịàmà Jehova ebowo ha ebubo ịgbasa echiche na-eduhie eduhie nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndị ọzọ ebowo ebubo na ozi Ndịàmà na-akwado Ọchịchị Kọmunist. Ndị ọzọkwa ekwuwo na ọrụ Ndịàmà Jehova na-akwado echiche na ọdịmma nke “ike ọchịchị America.” E nwekwara ndị na-ekwusi ike na Ndịàmà na-enupụrụ ọchịchị isi, na-akpata ọgba aghara iji gbanwee ọnọdụ ụmụ mmadụ, akụ̀ na ụba, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ iwu. O doro anya na ebubo ndị a nile na-emegide onwe ha apụghị ịbụ eziokwu.

Eziokwu pụtara ìhè bụ na ọ dịghị nke ọ bụla Ndịàmà Jehova na-eme n’ime ihe ndị ahụ dị n’elu. Ndịàmà na-arụ ọrụ ha ná nrubeisi zuru ezu nye iwu Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Nzube nke ọrụ ha bụ nanị iji kwusaa ozi ọma nke Alaeze eluigwe—ihe Chineke ga-eji weta udo n’ụwa nile.—Matiu 6:10; 24:14.

Ọ dịghị ihe ndị maara Ndịàmà Jehova hụrụla gosiri na ìgwè ndị Kraịst a abụtụwo ndị kpaghasịrị udo nke mba ọ bụla.

Ọtụtụ ndị odeakụkọ, ndị ọkàikpe, na ndị ọzọ ekwuwo banyere nkwado bara uru Ndịàmà Jehova nyeworo obodo ndị ha bi na ha. Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Mgbe ọ gasịrị otu mgbakọ Ndịàmà Jehova, otu onye nta akụkọ si ebe ndịda Europe kwuru, sị: “Ndị a nwere nkekọ ezinụlọ siri ike, a na-akụziri ha ịhụ n’anya na ịgbaso akọ na uche ha ka ha ghara imejọ ndị ọzọ.”

Odeakụkọ ọzọ, nke na-ekwubu ihe na-ezighị ezi banyere Ndịàmà, kwuru, sị: “Ha na-ebi ndụ kwesịrị nṅomi. Ha adịghị emebi ụkpụrụ ndị na-ekpebi omume ọma na ihe ziri ezi.” Otu ọkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru ihe yiri ya banyere Ndịàmà: “Ha na-eji nnọọ obiọma, ịhụnanya na ịdị nwayọọ emeso ndị ọzọ ihe.”

Ndịàmà Jehova na-akụzi izi ezi nke mmadụ ido onwe ya n’okpuru ndị ọchịchị. Dị ka ụmụ amaala na-erube isi n’iwu, ha na-agbaso ụkpụrụ Bible nke ime ihe n’eziokwu, ikwu eziokwu, na ịdị ọcha. Ha na-akụnye omume ọma n’ime ezinụlọ nke aka ha, ha na-enyekwara ndị ọzọ aka ịmụta ụzọ ha pụrụ isi meekwa otú ahụ. Ha na mmadụ nile na-ebi n’udo, ha adịghị etinye aka ná njegharị iwe na-akpata ọgba aghara ma ọ bụ mgbanwe ọchịchị. Ndịàmà Jehova na-agbalị ịbụ ihe nlereanya n’irube isi n’iwu ndị ọchịchị ka elu nke ụmụ mmadụ, ka ha ji ndidi na-echere Onye Kasị Elu, bụ́ Eze Onyenwe anyị Jehova, iweghachi udo zuru okè na ọchịchị ezi omume n’ụwa a.

N’otu oge ahụ, ọrụ Ndịàmà na-enye ihe mmụta. N’iji Bible eme ihe dị ka ihe ndabere, ha na-akụziri ndị mmadụ n’ụwa nile ịtụgharị uche n’ụkpụrụ Bible ma si otú a mụta ụkpụrụ ziri ezi nke na-achịkwa àgwà na omume ọma. Ha na-akwado ụkpụrụ ndị na-eme ka ndụ ezinụlọ ka mma ma na-enyere ndị na-eto eto aka ịnagide ihe ịma aka ndị na-eche ha ihu karịsịa. Ha na-enyekwara ndị mmadụ aka ịzụlite mmụọ nke imeri àgwà ndị na-emerụ ahụ na ịzụlite àgwà ga-eme ka ha na ndị ọzọ nọrọ n’udo. A gaghị ekwu na ọrụ dị otú ahụ bụ “mgbasa echiche na-eduhie eduhie.” Dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, n’ebe onye ọ bụla nweere onwe ya ikwu echiche ya, “mgbasa echiche dị iche ná nkụzi.”

[Foto]

Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Na-akụzi ụkpụrụ ezinụlọ na ụkpụrụ ndị dị elu

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Mgbasa echiche e ji akpali agha ma na-akwado ise siga esowo kpata ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ