Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka M Ji Dị Nnọọ Gịrịgịrị?

N’ihi Gịnị Ka M Ji Dị Nnọọ Gịrịgịrị?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka M Ji Dị Nnọọ Gịrịgịrị?

JUSTIN dị gịrịgịrị, gbasiekwa ike ma otú ahụ ya dị adịghị amasịcha ya. “Ana m agbalị ibutụ ibu,” ka ọ na-ekweta. Ya mere ihe ọ na-eri ugbu a bụ ugboro nri ise n’ụbọchị, bụ́ nke nwere ihe ruru calorie 4,000. Otú ọ dị, ọ chọrọ ka ibu ahụ ya ga-ebukwu ghọọ uru ahụ siri ike. Ya mere ọ na-ekwukwa, sị: “N’ụbọchị ụfọdụ, mụ na otu enyi m na-ebili n’isi ụtụtụ gaa n’ụlọ egwuregwu tupu oge ọrụ, ịga buo ihe ndị dị arọ.”

Vanessa dịkwa gịrịgịrị. Ma o nwere nnọọ afọ ojuju n’otú ọ hà n’ibu. “Mgbe m bụ nwata, ụmụaka na-adị achọ m okwu ma na-akpọ m ogwu azụ,” ka Vanessa na-echeta. “Ma adịghịzi m enye onwe m nsogbu. Ana m ewere nnọọ onwe m otú m dị.”

‘Were onwe gị otú ị dị.’ Nke ahụ na-ada ka okwu ndụmọdụ dị mma. Ma ọ pụrụ ịbụ okwu ndụmọdụ ga-esiri gị ike itinye n’ọrụ. Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma, ị pụrụ ịnọ ná “ntoju ntorobịa.” (1 Ndị Kọrint 7:36, NW) Mgbe a na-enwe nsogbu karịsịa bụ oge ahụ a na-enwe oké mgbanwe n’ahụ bụ́ mgbe a maara dị ka mmalite oge uto. Ná mmalite oge uto, akụkụ ahụ gị dị iche iche pụrụ ito n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche; aka, ụkwụ, na ihe ndị dị gị n’ihu pụrụ iyi ka hà ebuola nnọọ ibu karịa otú ha kwesịrị. * Nke a pụrụ ime ka i nwee nkụda mmụọ ma ghara inwe mmasị n’otú ị dị. Ihe ọzọ bụkwa eziokwu bụ na ọ bụghị ndị ntorobịa nile na-eto n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha nhata. Ya mere ọ bụ ezie na ndị ọgbọ gị ụfọdụ pụrụ ịgba dimkpa ma ọ bụ tojuo agbọghọbịa, ị ka pụrụ iyi ka ị dị gịrịgịrị ma è were gị tụnyere ha.

Ọ bụ ezie na e kwuwo ọtụtụ ihe banyere ndị ntorobịa na-eche na ha bubigara ibu ókè, a na-elegharakarị ndị ntorobịa na-eche na ha dị oké gịrịgịrị anya. Nke a pụrụ ịdị otú ahụ karịsịa n’etiti agbụrụ ụfọdụ nakwa ná mba ụfọdụ ebe a na-adịghị ele ịdị gịrịgịrị anya dị ka ihe e ji ama onye mara mma. N’ógbè ndị dị otú ahụ, a pụrụ ịdị na-ama nwa agbọghọ dị gịrịgịrị ajọ njakịrị maka ịdị “tịga tịga.”

Gịnị banyere ụmụ okoro? Dị ka onye nchọpụta bụ́ Susan Bordo si kwuo, “nnyocha ndị e mere banyere ọdịdị ahụ mmadụ n’iri afọ ndị bu afọ ndị 1980 ụzọ gosiri na ọ bụrụ na ndị inyom elee anya n’enyo, nanị ihe ha na-ahụ bụ ihe ndị na-adịghị mma.” Gịnịkwanụ banyere ndị ikom? Bordo na-aga n’ihu ikwu, sị: “Ndị ikom na-ele anya n’enyo ma na-ahụ, ma ọ́ bụghị onyinyo dị otú o kwesịrị ya abụrụ nke dị mma ọbụna karịa ihe a chọrọ.” Ma n’afọ ndị na-adịbeghị anya, nke ahụ amalitewo ịgbanwe. Ka ọ na-ekwu na ọ bụ ndị ikom mejupụtara ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị na-awa ahụ iji makwuo mma, Bordo kwuru na ihe kpatara mmasị na-arị elu nke ụmụ okorobịa na-enwe ugbu a n’ịdị gịrịgịrị bụ ahụ ndị ikom “zuru okè” nke a na-egosi ná mkpọsa ngwá ahịa a na-eme maka uwe ime na United States na ná mba ndị ọzọ dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, nke a enwewo mmetụta n’ebe ụmụ okoro nọ n’afọ iri na ụma nọ. Ha pụrụ iche na ọ dị ihe kọrọ ha ma ọ bụrụ na ọdịdị ahụ ha adịghị ka nke ndị ikom e ji eme mkpọsa ngwá ahịa.

Ya mere ọ bụrụ na ị dị gịrịgịrị, ị pụrụ ịdị na-ajụ onwe gị sị, ‘Gịnị bụ nsogbu m?’ Ihe ọma dị na ya bụ na o yighị ka i nwere nsogbu.

Ihe Mere I Ji Dị Gịrịgịrị

Nye ọtụtụ ndị ntorobịa, ịdị gịrịgịrị bụ ihe dị nnọọ otú o kwesịrị. Ọ na-abụkarị nnọọ ihe oké uto na ịrụ ọrụ ngwa ngwa nke ahụ na-akpata, bụ́ nke ya na oge uto na-agakọ. Ihe na-emekarị bụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ịrụ ọrụ nke ahụ gị ga-ebelata ka ị na-emekwu okenye. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị dị nnọọ gịrịgịrị n’agbanyeghị na ị na-eri ezigbo nri, ọ ga-adị mma ịga hụ dọkịta gị iji jide n’aka na i nweghị ọrịa, dị ka ọrịa shuga, bụ́ nke pụrụ ịkpata ịta ahụ.

Steven Levenkron, bụ́ ọkachamara a ma nke ọma n’ihe banyere nsogbu achọghị iri ihe, gwara Teta!, sị: “Ana m echeta otu nwa agbọghọ tara nnukwu ahụ a gwara ka ọ bịa na nke m bụ́ onye nchọpụta e meworo gosiri na o nwere nsogbu achọghị iri ihe, o yikwara onye nwere nsogbu iri ihe n’ezie. Ma n’oge na-adịghị anya achọpụtara m na nsogbu ya bụ nke anụ ahụ, ọ bụghị nke uche. Dọkịta ezinụlọ ya emeghị nchọpụta maka ọrịa Crohn, bụ́ ajọ ọrịa eriri afọ. Nchọpụta ahụ a na-emeghị gaara egbu nwa agbọghọ a.” Ọ bụrụ na ọrịa shuga ma ọ bụ ọrịa ọzọ na-akpata ịta ahụ na-arịa gị, ọ ga-abụrụ gị ihe amamihe iji nlezianya gbasoo ntụziaka nke dọkịta gị.

Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ịdị gịrịgịrị prịbụ mgbaàmà nke nsogbu mmetụta uche. N’akwụkwọ ya bụ́ Anatomy of Anorexia, Dr. Levenkron na-ekwu banyere ihe ndị nchọpụta ụfọdụ na-ekwu na ọnụ ọgụgụ dịtụ ukwuu nke “ndị na-arịa ọrịa shuga bụ́ ndị na-aṅụ ọgwụ nwere insulin na-enwe nsogbu iri ihe, site n’ajọ iribiga nri ókè ruo n’inwebiga agụụ nri ókè, ruokwa ná nsogbu achọghị iri ihe.” Dọkịta ma nke a na-akọ pụrụ ịchọpụta ma è nwere ụdị nsogbu iri ihe dị otú ahụ. *

Aro Ndị Dị Irè

Ka anyị were ya na ị hụla dọkịta gị nakwa na ị dị gịrịgịrị ma ahụ dị gị ike. Gịnị ka ị ga-eme ugbu a? Na Job 8:11, Bible na-ekwu, sị: “Papyrus, Ọ̀ ga-etolite elu ma apịtị adịghị? Amị, ọ̀ ga-ebu ibu ma mmiri adịghị?” Dị nnọọ ka ihe ọkụkụ na-eme nke ọma ma o nwee ọnọdụ na nri ala dị mma, otú ahụkwa ka nri na-edozi ahụ dị gị mkpa ma ọ bụrụ na ị ga-eto bụrụ dimkpa nwere ahụ ike. Nke a dị mkpa ma ị̀ na-agbalị ibukwu ibu ma ọ bụ ịta ahụ.

Otú ọ dị, abụla onye a nwara ịmalite iri nri ndị nwere abụba ka i wee buo ibu ngwa ngwa. Mgbe ọ na-eme nnyocha banyere ụdị nri ndị a na-eri mgbe mmadụ na-azụ ahụ ya iji gbaa dịmkpa site ná mmega ahụ, ọkachamara n’ihe banyere nri bụ́ Susan Kleiner kwuru na ha na-eri ihe dị ka calorie 6,000 kwa ụbọchị! Ma dị ka Kleiner si kwuo, “ihe a chọpụtara na-enye nsogbu banyere nnyocha a bụ na ha na-eri ihe karịrị gram 200 nke ihe ndị nwere abụba, ná nkezi, kwa ụbọchị. Nke ahụ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ ha ka abụba dị ná mkpọ bọta abụọ! N’oge na-adịghị anya, nke ahụ ezuwo ịkpatara ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ọrịa. Ọ bụrụ na ọ mara mmadụ ahụ iri ya ruo ogologo oge, ọ̀tụ̀tụ̀ abụba buru ibu otú ahụ ga-akpatara ya ọrịa obi.”

Dị ka Ngalaba Ọrụ Ugbo nke United States (USDA) si kwuo, ihe mejupụtara ihe bụ́ isi ná nri na-edozi ahụ bụ nri ndị na-enye ike dị ka bred, mkpụrụ ihe ọkụkụ, osikapa, na nri ndị dị ka macaroni. Ndị ọzọ sochiri ya n’ịdị mkpa bụ akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi. USDA na-atụ aro ka a na-eri anụ nanị n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-ebuchaghị ibu, ya na ihe ndị e ji mmiri ara ehi mepụta.

Iji mara nnọọ ihe ị na-eri na otú ọ hà, ị pụrụ ịgbalị inwe akwụkwọ ị ga-eji na-edetu ihe ị na-eri. Na-eji akwụkwọ ndekọ na-aba n’akpa uwe ruo otu izu, detuokwa ihe nile ị na-eri na mgbe ị na-eri ha. Ọ pụrụ iju gị anya ịchọpụta na ị dịghị eri ihe oriri ruo n’ókè i chere na ị na-eri, karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-erikarị nri ọkụ ọkụ. Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma nke dị gara gara, ị pụrụ imefusi calorie 3,000 ma ọ bụ karịa n’ụzọ dị mfe kwa ụbọchị! Ị pụkwara ịchọpụta na nri gị adịghị edozi ahụ dị ka o kwesịrị—ebe ị na-eri ọtụtụ nri ngwa ngwa dị ka kpọf kpọf, n’adịghịkwa eri mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri n’ọ̀tụ̀tụ̀ a chọrọ.

Gịnị banyere ihe ndị na-edozi ahụ dị ná nri, bụ́ ndị dị oké ọnụ? E nwere ike ha adịghị mkpa. Ọtụtụ ndị ọkachamara kwenyere na ị pụrụ inweta ihe nile na-edozi ahụ bụ́ ndị ahụ gị chọrọ site n’iri ezigbo nri. Karịsịa, zere ihe ngwọta ndị e nwetara ọkụ ọkụ dị ka ọgwụ na-eme ka mmadụ gbaa dimkpa ruo nwa oge. Ọ dị mwute ikwu na iji ọgwụ na-eme ka a gbaa dimkpa eme ihe aghara aghara abụghị nsogbu dị nanị n’etiti ụmụ okoro nọ n’afọ iri na ụma. Magazin bụ́ The New York Times na-akọ, sị: “Ịrị elu nke iji [ọgwụ ndị na-eme ka a gbaa dimkpa] eme ihe n’etiti ụmụ agbọghọ, bụ́ nke ndị nchọpụta ụfọdụ na-ekwu na ihe so na-akpata ya bụ ịnọkata nwewe nsogbu achọghị iri ihe, eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụmụaka ndị nwoke ruru n’afọ ndị 1980 bụ́ mgbe ọ malitere.” Ọnụ ọgụgụ bara oké ụba bụ́ ụmụ agbọghọ 175,000 nọ n’afọ iri na ụma na United States kwetara na ha na-aṅụ ọgwụ na-eme ka a gbaa dimkpa ruo nwa oge. E kwuwo na ọgwụ ndị a na-akpata ọtụtụ ajọ nsogbu, gụnyere ajị ihu a na-achọghị, nsogbu ịhụ nsọ, ọrịa cancer ara na-arịa ndị inyom, ọrịa cancer mkpụrụ amụ na-arịa ndị ikom, akwara ọbara na-enweghị oghere na ọrịa cancer imeju bụ́ nke na-arịa ma ndị inyom ma ndị ikom. E kwesịghị ịṅụ ọgwụ na-eme ka a gbaa dimkpa ma ọ bụrụ na dọkịta edepụtaghị ma kwuo otú a ga-esi aṅụ ha.

Ịdị Obi Umeala na Inwe Echiche Ziri Ezi

Bible na-agwa anyị ka anyị ‘jiri obi umeala soro Chineke anyị na-eje ije.’ (Maịka 6:8) Obi umeala na-agụnye mmadụ ịmara ihe ọ na-agaghị emeli. Obi umeala ga-enyere gị aka inwe echiche ziri ezi banyere ọdịdị gị. Ee e, ọ dịghị ihe ọjọọ dị ná mmadụ ịchọ ka ya maa mma ile anya. Ma ichegbubiga onwe gị ókè banyere ọdịdị gị adịghị abara onye ọ bụla uru—e wezụga, ma eleghị anya ụlọ ọrụ na-emepụta ihe oyiyi na ihe oriri. Ndị ọkachamara n’ọdịdị mmadụ na-ekweta na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ nwoke enweghị mkpụrụ ndụ ihe nketa ga-eme ka ha bụrụ ndị gbara dimkpa a ma ama n’ụwa, n’agbanyeghị otú ha si eri ihe nke ọma ma ọ bụ otú ha na-emegaru ahụ. Ọ bụrụkwa na ị bụ nwa agbọghọ, e nwere ike ahụ gị agaghị eju eju, n’agbanyeghị ókè nri ị na-eri hà.

N’ụzọ na-akpali mmasị, ilebakwu anya n’ụdị ákwà ndị ị na-eyi pụrụ inye aka n’ụzọ dị ukwuu iji gbanwee ihe ndị ị pụrụ ịdị na-ele anya dị ka ntụpọ anụ ahụ. Kwụsị iyi ákwà ndị na-eme ka ọdịdị ahụ gị ndị dị otú ahụ na-apụta ìhè n’ụzọ na-adịghị mkpa. Ndị ụfọdụ na-atụ aro ka a na-eyi ákwà ndị ụcha ha pụtara apụta, ebe ọ bụ na ákwà ndị ụcha ha na-apụtaghị apụta na-emekarị ka ndị dị gịrịgịrị dị ka ha dị oké gịrịgịrị.

Chetakwa na ụdị onye ị bụ dị mkpa karịa ọdịdị ahụ gị. Mee elu mee ala, ịmụmụ ezi ọnụ ọchị na omume obiọma ga-eme ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ebe ị nọ karịa ka ahụ mara mma ile anya ma ọ bụ otu ụdị ákwà ga-eme. Ọ bụrụ na ndị enyi gị na-eledakarị gị anya n’ihi otú ị dị, chọọ ndị ji ụdị mmadụ ị bụ n’ime—ihe Bible kpọrọ “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi”—kpọrọ ihe. (1 Pita 3:4) N’ikpeazụ, echezọla na “mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.”—1 Samuel 16:7.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . M̀ Na-etolite dị ka O Kwesịrị?” ná mbipụta Teta! nke March 8, 1994.

^ par. 12 Lee isiokwu ndị bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . N’ihi Gịnị Ka M Ji Echegbubiga Onwe M Ókè Banyere Ibu M?” na “Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ichegbubiga Onwe M Ókè Banyere Ibu M?,” dị ná mbipụta Teta! nke May 8 na June 8, 1999.

[Foto dị na peeji nke 14]

Ndị ntorobịa ụfọdụ na-akatọ onwe ha n’ihi na ha dị gịrịgịrị