Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu “Ozu” Adịghachi Ndụ

Otu “Ozu” Adịghachi Ndụ

Otu “Ozu” Adịghachi Ndụ

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! n’INDONESIA

NA JULY 17, 1997, a mara ọkwa pụrụ iche n’akụkọ anyasị n’Indonesia. Otu n’ime osisi ndị na-awa okooko, bụ́ ndị kasị ibu n’ụwa amawo ifuru. Gịnị mere e ji were nanị ịma ifuru nke osisi dị ka ihe kwesịrị ịbụ isiokwu nke akụkọ anyasị? N’ihi na osisi a dị iche—ọ pụrụ ịma ifuru, bụ́ nke na-anọru nanị ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ, ugboro atọ ma ọ bụ anọ n’ime afọ 40 ọ na-anọru ndụ. Mgbe a masịrị ọkwa ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-eleta Ubi Ihe Ọkụkụ nke Bogor, bụ́ ebe osisi ahụ dị, jiri pasent 50 rịa elu. N’eziokwu, ihe karịrị mmadụ 20,000 bịara leta osisi ahụ nanị n’otu ụbọchị!

Aha e ji mara osisi ahụ bụ Amorphophallus titanum. Ndị ụfọdụ na-akpọbiri ya titan arum, ma ihe ka n’ọtụtụ ndị Indonesia na-akpọ ya osisi ozu n’ihi na ísì ọ na-esi mgbe ọ mara ifuru na-echetara ha ozu azụ̀ rere ere ma ọ bụ òké rere ere. Ísì ọjọọ ya na-agwa aṅụ na-ebufe ntụ ifuru ya n’osisi ọzọ na osisi ahụ amaala ifuru.

E wezụga ísì ya pụrụ iche, ihe ọzọ mere titan arum ji dị iche bụ ogo ya. Osisi ya nke tochaworonụ na-aka mmadụ nile ogo ma e wezụga ndị mmadụ toro oké ogologo. Otu osisi ya nke dị n’Ubi Ihe Ọkụkụ nke Bogor toruru mita 2.5 n’ogologo, o sikwa n’úkwù ya dị mita 2.6 n’obosara nke yiri ọkwá okooko osisi, pupụta. Okooko osisi a buru nnukwu ibu si na mkpọrọgwụ dị ihe fọrọ nke nta ka o ruo 100 kilogram n’arọ, tolite!

N’agbanyeghị na ifuru ya buru oké ibu, titan arum apụghị ịbụ osisi na-awa okooko kasị ibu n’ụwa n’ihi na ihe osisi a na-awa n’ezie abụghị otu okooko, kama ọtụtụ obere okooko.

Osisi titan arum bụ nanị ihe atụ ọzọ na-egosi ịbụ eziokwu nke ihe ọbụ abụ ahụ kwuru: “Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m, bụ́ oké ọrụ Gị nile, . . . Ọ dịghị nke a ga-eji tụnyere gị.”—Abụ Ọma 40:5, NW.