Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Pyramid Mexico

Pyramid Mexico

Pyramid Mexico

Site N’aka Onye Nta Akụkọ Teta! na Mexico

IHE ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa maara ihe banyere pyramid Ijipt. Na kọntinent America kwa, ndị ọkà mmụta ihe ochie achọpụtawo ọtụtụ ihe owuwu ndị dị ka pyramid, karịsịa na Mexico. Dị ka ndị ogbo ha n’Ijipt, pyramid Mexico adịruwo ọtụtụ narị afọ, ma bụrụ ihe ndị siri ike nghọta.

Pyramid Ijipt bụ ili dị n’ime nnukwu ikpo nkume a wụliri elu. Ụzọ a wara n’ime ya na-eduga n’ili, bụ́ akụkụ kasị mkpa nke pyramid ahụ. Otú ọ dị, pyramid Mexico bụ nnukwu ikpo ájá nke nwere ụlọukwu n’elu elu ya kpọmkwem nakwa steepụ ndị dị ná mpụta ya bụ́ ndị e ji arịgo n’ọnụ ọnụ ya. E wezụga ole na ole, pyramid ndị dị na kọntinent America abụghị ili.

Teotihuacán—“Obodo nke Chi Dị Iche Iche”

Otu n’ime ebe kasị pụta ìhè e nwere pyramid na Mexico bụ Teotihuacán. N’ịbụ nke dị ihe dị ka kilomita 50 site n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Mexico City, Teotihuacán ka bụ ihe omimi nye ndị ọkà mmụta mmalite mmadụ na ndị ọkà mmụta ihe ochie. Ndị wuru obodo ukwu ochie a gbahapụrụ ya ihe karịrị afọ 500 tupu a malite inwe ọdịbendị ndị Aztec. Aha ahụ bụ́ Teotihuacán, bụ́ nke si n’asụsụ Nahuatl, pụtara “Obodo nke Chi Dị Iche Iche” ma ọ bụ “Ebe Ụmụ Mmadụ Ghọrọ Chi.” A na-eche na ndị Aztec gụrụ obodo ahụ aha ahụ mgbe ha letara ya.

Otu n’ime ndị editọ magazin bụ́ National Geographic, bụ́ George Stuart, na-akọwa na “Teotihuacan bụ obodo ukwu mbụ e nwere n’ezie n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa . . . O bidoro n’ihe dị ka mmalite nke oge ndị Kraịst, dịruo ihe dị ka narị afọ asaa, ghọzie ihe a na-akọ n’akụkọ. Mgbe ọ kasị nwee ọganihu, n’ihe dị ka 500 A.D., a na-eme atụmatụ na e nwere ihe dị ka mmadụ 125,000 ruo mmadụ 200,000 bi n’ebe ahụ.”

N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’etiti obodo ahụ ka nnukwu Pyramid Anyanwụ dị. Ala ya dị mita 220 n’otu akụkụ na mita 225 n’akụkụ ya nke ọzọ, okpukpu ya ise dị elu ruo ihe dị ka mita 63 ọ dị ugbu a. Iji ruo n’elu pyramid ahụ, mmadụ aghaghị ịrị ihe karịrị steepụ 240. Pyramid Ọnwa, bụ́ nke ịdị elu ya dị mita 40 dị n’ebe ugwu nke obodo ochie ahụ. Ọ dị mgbe e nwere ụlọ nsọ dị iche iche n’elu pyramid abụọ ndị a kasị elu.

N’afọ iri ndị na-adịbeghị anya, a mụtawo ihe dị ukwuu banyere pyramid ndị a. Otú ọ dị, dị ka Stuart si kwuo ya, “anyị ka bụ ndị na-amabeghị ihe ọ bụla banyere otú ndị Teotihuacan si malite, asụsụ ha sụrụ, otú e si hazie obodo ha, na ihe kpatara ọdịda ha.”

Ebe Ndị Ọzọ Pyramid Dị

N’etiti Mexico City kpọmkwem, mmadụ pụrụ ileta Nnukwu Ụlọukwu nke ndị Aztec. Ọ bụ ezie na ọ dịghị pyramid ndị dị ebe ahụ, a ka pụrụ ịhụ mkpọmkpọ ebe nke otu pyramid bụ́ ebe bụ́ isi e si rụọ Nnukwu Ụlọukwu ahụ. Ndị ọkà mmụta ihe ochie egwupụtawo ebe ịchụàjà abụọ a na-achụ mmadụ n’àjà.

Chichén Itzá bụ otu n’ime ebe ndị e nwere pyramid a kasị eje eleta na Mexico. E nwere ọtụtụ mkpọmkpọ ebe nke mgbe ochie n’ógbè ndị na-asụ asụsụ Maya, ma a kasị aga ná ndị a n’ihi na ha dị nso n’obodo Mérida nke dị na Yucatán. Ọ bụ ezie na e wuru ha n’ókèala ndị na-asụ asụsụ Maya, ihe owuwu ndị a na-egosi na o nwere mgbe ndị Toltec bụ ndị a ma ama n’ógbè ndị a. Ihe owuwu ụfọdụ na-egosi na ndị wuru ha maara mgbakọ na mwepụ na nkà mmụta mbara igwe nke ọma.

Na Palenque, ndị ọbịa ga-ahụ ihe owuwu ndị mara mma nke ndị Maya bụ́ ndị oké ọhịa Chiapas gbara gburugburu. N’etiti ọtụtụ pyramid na ụlọ, e nwere Obí na Ụlọukwu nke Ihe E Dere Ede. Ụlọukwu nke Ihe E Dere Ede “bụ otu n’ime ụlọukwu ndị a ma ama n’Ebe Etiti America n’ihi na ọ bụghị nanị ebe e si malite iwu ụlọukwu dị ka ndị ọzọ nile bụ, kama ọ bụ ihe ncheta nke olili ozu,” ka akwụkwọ bụ́ The Mayas—3000 Years of Civilization na-akọwa. “N’ime ebe ahụ, e nwere steepụ a rụnyere bụ́ nke na-eduga n’ebe kasị mma a na-eli ozu nke a hụtụrụla n’ógbè ndị Maya.” E wuuru otu gọvanọ dịrị ndụ na narị afọ nke asaa ili ahụ—Pacal, ma ọ bụ Uoxoc Ahau.

Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime pyramid ndị dị na Mexico. A pụrụ ịhụ mkpọmkpọ ebe na pyramid ndị ọzọ n’ọtụtụ ebe ná mba ahụ dum. E nwekwara pyramid ndị buru ibu na Guatemala na Honduras. Ihe owuwu ndị a nile nke oge ochie na-egosi na ndị bi n’Ebe Etiti America chọrọ ebe ndị dị elu ha ga-ewukwasị ebe ha na-anọ efe ofufe. Walter Krickeberg, bụ́ onye dere akwụkwọ bụ́ Las Antiguas Culturas Mexicanas, dere, sị: “Omume nke iwukwasị ebe a na-anọ efe ofufe n’ebe a na-arịgo arịgo malitere laa azụ n’ofufe a na-efe ihe ndị dị elu n’oge ochie.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ bụ ezie na anyị na-ewere eluigwe dị ka ‘uko,’ nye ndị ọzọ ọ na-anọchi anya ugwu nke anyanwụ na-esi na ya arịgo n’ụtụtụ ma rịdata n’uhuruchi; ya mere, a na-ewu ebe ndị e si arịdata ya dị ka steepụ nke nnukwu ụlọ. N’ihi ya, e mere ka ‘ugwu ahụ aka wuru’ . . . ghọọ pyramid nwere steepụ, dịkwa ka a ghọtara site n’akụkọ mgbe ochie na omenala, e mere ya ịghọrọ ọtụtụ ndị Ebe Etiti America ihe atụ nke eluigwe.”

Echiche a pụrụ ichetara ndị na-amụ Bible ihe e dekọrọ na Bible banyere Ụlọ Elu Bebel, nke dị n’obodo e mesịrị mara dị ka Babilọn. Jenesis 11:4 na-ekwu banyere ndị wuru ụlọ elu a, sị: “Ha wee sị, Ngwa, ka anyị wuoro onwe anyị obodo, na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru n’eluigwe, ka anyị meekwara onwe anyị aha.” Ndị ọkà mmụta ihe ochie ahụwo pyramid ndị a maara dị ka ziggurat n’ebe na-adịchaghị anya ná mkpọmkpọ ebe nke Babilọn.

Ụdị ofufe nke malitere na Babilọn gbasaruru ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ikekwe na-eru n’ógbè a bịara mara dị ka Mexico. Ọ gaghị abụ ihe ijuanya ma ọ bụrụ na ziggurat nile nke Babilọn nakwa okpukpe a na-ekpe n’ebe ahụ abụrụ ebe e si nweta nnukwu pyramid dị iche iche nke Mexico, bụ́ ndị siri ike nghọta ma na-emetụ mmadụ n’ahụ.

[Foto dị na peeji nke 22]

Teotihuacán

[Ebe E Si Nweta Foto]

CNCA.-INAH.-MEX Reproducción Autorizada por el Instituto Nacional de Antropología e Historia

[Foto dị na peeji nke 23]

Palenque