Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọgwụgwọ Ị Na-ahọrọ

Ọgwụgwọ Ị Na-ahọrọ

Ọgwụgwọ Ị Na-ahọrọ

N’AKWỤKWỌ ya na-ekwu banyere ụdị ọgwụgwọ ọzọ, Dr. Isadore Rosenfeld mere ka isi ihe a pụta ìhè: “Ọgwụgwọ ma ọ bụ ihe mgbochi ọrịa ọ bụla e nyere ìgwè mmadụ a họọrọ aghara aghara, bụ́ ndị e mesiri obi ike na ọ ga-arụ ‘ọrụ’ pụrụ ime ka ọkara nke ndị ọrịa ahụ gbakee.”

A na-akpọ nke a mmetụta nke ihe ndị a na-enye n’ọnọdụ ọgwụ, nke pụtara na ọbụna mkpụrụ ọgwụ e ji shuga mee pụrụ ịrụ ọrụ ma ọ bụrụ na onye ahụ ekwenye na ọ ga-arụ. Mmetụta nke ihe ndị a na-enye n’ọnọdụ ọgwụ pụrụ ibelata mgbaàmà dị iche iche mmadụ na-enwe n’onwe ya, gụnyere ihe mgbu, agbọ onunu, ike ọgwụgwụ, ajụ obubu, nchegbu, na ịda mbà n’obi. Gịnị ka eziokwu a na-egosi?

Otu ihe bụ na ọ na-egosi na inwe obi ike n’ọgwụgwọ ọ bụla mmadụ na-enweta bụ, n’ọtụtụ ọnọdụ, isi ihe dị mkpa iji gbakee. N’otu oge ahụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe ịchọpụta ma otu ụdị ọgwụgwọ ọ̀ na-agwọ nsogbu ahụ n’onwe ya kama ịgwọ nanị mgbaàmà ya. A pụrụ ime nke a site n’iji ngwá ọrụ e ji achọpụta ihe, dị ka nnyocha nke ụlọ ime nnyocha na foto X ray, tụọ mmetụta nke ọgwụgwọ ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.

Ma, ọ dị ihe ndị ọzọ mmadụ pụrụ ime mgbe ọ na-ahọrọ ụdị ọgwụgwọ ọ ga-anara.

Ihe Ndị Dị Mkpa A Ga-eme

Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime nchọpụta tupu i mee mkpebi. Jụọ ajụjụ. Olee ihe ndị a pụrụ ịtụ anya ha ga-esi na ya pụta? Gịnị bụ uru na ọghọm dị na ya, ego olekwa ka a ga-atụ anya na ọ ga-efu nakwa ogologo oge hà aṅaa ka ọgwụgwọ ahụ ga-adịru? Soro ndị e nyeworo ọgwụgwọ ahụ ị na-achọ ịnara kwurịta okwu. Jụọ ha ma ọ rụrụ ọrụ. Otú ọ dị, cheta na ihe àmà dabeere n’ahụmahụ mmadụ nwere pụrụ iduhie eduhie.

Usoro ọgwụgwọ na-abụghị nke Bekee pụrụ ịbụ nke amamihe na-adịghị na ya ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka mmadụ kwụsị ọgwụgwọ a maara dị ka nke na-arụ ọrụ, ọ bụ ezie na ọ̀tụ̀tụ̀ ịrụ ọrụ nke usoro ọgwụgwọ Bekee ahụ dị ntakịrị. E nyere ihe àmà nke mmerụ ahụ pụrụ isi na ya pụta n’otu akụkọ dị na magazin bụ́ The New England Journal of Medicine. Magazin ahụ kọwara otú ọrịa cancer si ka njọ n’ahụ ndị na-eto eto abụọ bụ́ ndị jụrụ ịnara usoro ọgwụgwọ a na-ejikarị eme ihe mgbe ha na-aṅụ ụdị ọgwụ ọzọ. Otu n’ime ndị ọrịa a nwụrụ.

Ndị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala ma ọ bụ ndị na-eyi ndụ egwu kwesịrị iji amamihe nọrọ na nche banyere eziokwu ahụ bụ́ na ha pụrụ ịbụ ndị ndị adịgboroja, bụ́ ndị na-akwalite usoro ọgwụgwọ wayo, na-elekwasị anya dị ka ndị a pụrụ ịghọrị. Kpachara anya maka ọgwụ ọ bụla a na-ekwu na ọ na-agwọ ọrịa dịgasị iche iche. Otu ihe atụ e nwere n’oge na-adịbeghị anya bụ banyere otu vitamin ọhụrụ e kwuru na o ‘nyewo aka gwọọ ihe ọ bụla malite ná nsogbu iku ume na enweghị ume ruo n’ọrịa ndị na-eyi ndụ egwu.’ Nnyocha e nyochara “vitamin” ahụ gosiri na ọ bụ nanị mmiri nnu.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụdị ọgwụgwọ ọzọ ụfọdụ pụrụ ịba uru n’ịkwalite ahụ ike. Otú ọ dị, na-enwe ezi uche n’atụmanya gị. Ọ bụ ihe amamihe itinye mgbalị n’iri nri na-edozi ahụ, ihi ụra nke ọma, imega ahụ n’ụzọ zuru ezu, na ịkpachara anya mgbe ị na-ahọrọ ọgwụgwọ.

E Nweta Ihe A Na-achọ

O doro anya na ọ dịghị ụdị ọgwụgwọ sitere n’aka mmadụ nke pụrụ ịgwọ ọrịa nile na ọnwụ ha na-akpata. Nke a bụ n’ihi na anyị ketara ihe ndị a site n’aka nna anyị mbụ, mmadụ mbụ, bụ́ Adam. (Job 14:4; Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Ọtụtụ ọgwụgwọ—ụdị ọ sọrọ ya bụrụ—pụrụ ịba uru ma eleghị anya, ma, ha bụ nanị ọgwụgwọ ndị na-adịru nwa oge bụ́ ndị pụrụ ime ka ndụ dịtekwuo aka ma dịkwuo ụtọ ruo oge ụfọdụ. Otú ọ dị, e nwere ihe ngwọta e ji n’aka maka nsogbu ahụ ike, ọtụtụ nde mmadụ achọpụtalarị ya.

Ọ bụ Onye Okike anyị, Jehova Chineke, bụ́ Dibịa Ukwu ahụ, nyere ihe ngwọta ahụ. Site n’inwe okwukwe na ya nakwa iji uru mkpuchi mmehie nke àjà mgbapụta Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst mee ihe, ị ga-enwe ike inwe ahụ ike zuru okè na ndụ ebighị ebi n’ime ụwa nke ọrịa na-agaghị adị na ya! (Matiu 20:28) Bible na-ekwe nkwa na n’ụwa ọhụrụ ahụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa. 33:24.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]

Ọtụtụ nde mmadụ achọtawo nanị otu olileanya e ji n’aka maka ahụ ike zuru okè