Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Dị Mkpa Ndị Nọọsụ Na-arụ

Ọrụ Dị Mkpa Ndị Nọọsụ Na-arụ

Ọrụ Dị Mkpa Ndị Nọọsụ Na-arụ

Nọọsụ bụ onye na-enye nkwado, agbamume, na nchebe—onye dị njikere ilekọta onye ọrịa, onye merụrụ ahụ, na onye agadi.”—Nursing in Today’s World—Challenges, Issues, and Trends.

Ọ BỤ ezie na achọghị ọdịmma onwe onye nanị dị oké mkpa, ọ bụghị nanị ya na-eme mmadụ nọọsụ maara nke a na-akọ. Ọzụzụ dị ukwuu na ahụmahụ sara mbara dịkwa ezigbo ndị nọọsụ mkpa. Otu ihe dị oké mkpa a chọrọ bụ ọmụmụ ihe na ọzụzụ itinye ihe a na-amụ n’ọrụ bụ́ nke na-ewe site n’otu afọ ruo afọ anọ ma ọ bụ karịa. Ma àgwà ndị dị aṅaa na-eme mmadụ ezigbo nọọsụ? Ihe na-esonụ bụ azịza ụfọdụ sitere n’ọnụ ndị nọọsụ nwere ahụmahụ bụ́ ndị Teta! gbara ajụjụ ọnụ.

“Dọkịta na-agwọ ọrịa, ma nọọsụ na-elekọta onye ọrịa. Nke a na-achọkarị iwusi ndị ọrịa ike bụ́ ndị nweworo nchekasị na mgbakasị ahụ mgbe, dị ka ihe atụ, a gwara ha na ha nwere ọrịa na-adịghị ala ala ma ọ bụ na ha ga-anwụ n’oge na-adịghị anya. Ị ga-abụrụ onye ọrịa nne.”—Carmen Gilmartín, Spain.

“Ọ dị mkpa inwe ihe mgbu na nhụjuanya nke onye ọrịa na-enwe nakwa ịchọ inye aka. Obiọma na ogologo ntachi obi dị mkpa. Ị ghaghị ịchọ mgbe nile ịmụtakwu ihe banyere ọrụ nọọsụ na ịgwọ ọrịa.”—Tadashi Hatano, Japan.

“N’afọ ndị a, ọ dịwo ndị nọọsụ mkpa ịmarakwu ọrụ ha. Ya mere, ọchịchọ ịmụ ihe na ikike ịghọta ihe a mụrụ dị oké mkpa. Ọzọkwa, ọ dị ndị nọọsụ mkpa ime mkpebi ngwa ngwa na ime ihe n’egbughị oge mgbe ọnọdụ chọrọ ya.”—Keiko Kawane, Japan.

“Dị ka nọọsụ, ị ghaghị ịdị na-egosipụta omume enyi. Ị ghaghị ịdị na-anagide ihe ma na-egosipụta mmetụta ọmiịko.”—Araceli García Padilla, Mexico.

“Ezigbo nọọsụ aghaghị ịdị na-amụsi ihe ike, na-eleru anya ala, ma bụrụ nnọọ onye maara ọrụ nke ọma. Ọ bụrụ na nọọsụ adịghị achụ onwe ya n’àjà—ọ bụrụ na ọ na-achọtụ ọdịmma onwe ya nanị ma ọ bụ na-ajụ ịnabata okwu ndụmọdụ sitere n’ọnụ ndị ka ya n’ọrụ ahụ ike—ihe nọọsụ ahụ agaghị amasị ma ndị ọrịa ma ndị ọrụ ibe ya.”—Rosângela Santos, Brazil.

“Ọtụtụ àgwà dị oké mkpa: inwe ike ime mgbanwe, ịnagide ihe, na ndidi. Ị ghaghịkwa ịdị na-anabata echiche ọzọ, na-enwe ikike nke iso ndị ọrụ ibe gị na ndị ka gị n’ọrụ ahụ ike na-enwe ezi mmekọrịta. Ị ghaghị ịdị ngwa n’ịghọta nkà ndị ọhụrụ iji nọgide na-arụ ọrụ gị nke ọma.”—Marc Koehler, France.

“Ị ghaghị ịhụ ndị mmadụ n’anya ma chọọ inyere ndị ọzọ aka n’ezie. Ị ghaghị inwe ike ịnagide nrụgide n’ihi na ọrụ nọọsụ achọghị mmehie ihe. Ị ghaghị ịdị njikere ime mgbanwe iji rụọ otu ọrụ ahụ mgbe ụfọdụ i nwere ndị ọrụ ole na ole ị ga-eso rụọ ọrụ—n’ebelataghị ezigbo ọrụ ị na-arụ.”—Claudia Rijker-Baker, Netherlands.

Nọọsụ Dị Ka Onye Na-enye Nlekọta

Akwụkwọ bụ́ Nursing in Today’s World na-ekwu na “ọrụ nọọsụ bụ inyere mmadụ aka n’ọnọdụ dị iche iche metụtara ahụ ike. Ya mere, anyị na-ejikọta n’uche anyị ojiji a na-eji ọgwụ agwọ onye ọrịa na ọrụ nọọsụ nke metụtara ilekọta onye ọrịa.”

N’ihi ya, nọọsụ bụ onye na-enye nlekọta. Ya mere, o doro anya na nọọsụ aghaghị inye nlekọta. N’oge gara aga, a jụrụ ndị nọọsụ 1,200 gọọmenti nyere ikike, sị, “Gịnị kasị dịrị gị mkpa n’ọrụ gị dị ka nọọsụ?” Inye nlekọta dị mma bụ azịza pasent 98 nyere.

Mgbe ụfọdụ, ndị nọọsụ na-eleda uru ha baara ndị ọria anya. Carmen Gilmartín, nke e hotara okwu ya n’elu, bụ́ onye rụworo ọrụ nọọsụ ruo afọ 12, gwara Teta!, sị: “Otu mgbe agwara m otu enyi m na ọ na-adị m ka amachaghị m ihe m na-eme mgbe m na-elekọta ndị na-arịasi ọrịa ike. M na-ele onwe m anya dị ka ‘Plasta.’ Ma enyi m zaghachiziri, sị: ‘Ị bụ “Plasta” bara oké uru, n’ihi na mgbe mmadụ na-arịa ọrịa, ị bụ ihe a chọrọ karịa ihe ọ bụla ọzọ—nọọsụ nwere ọmịiko.’”

Ọ baghị uru ikwu na inye nlekọta dị otú ahụ pụrụ iwetara nọọsụ bụ́ onye na-arụ ọrụ awa iri ma ọ bụ karịa kwa ụbọchị oké ihe isi ike! Gịnị kwaliri ndị a na-achụ onwe ha n’àjà ịghọ ndị nọọsụ?

N’ihi Gịnị Ka Mmadụ Ga-eji Bụrụ Nọọsụ?

Teta! gbara ndị nọọsụ nọ gburugburu ụwa ajụjụ ọnụ, sị: “Gịnị kwaliri gị ịghọ nọọsụ?” Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime azịza ha.

Terry Weatherson arụwo ọrụ nọọsụ ruo afọ 47. Ọ na-arụ ọrụ ugbu a dị ka nọọsụ bụ́ ọkachamara n’ilekọta ndị ọrịa ná Ngalaba Na-agwọ Ọrịa Ọwara Mamịrị n’ụlọ ọgwụ dị na Manchester, England. “A zụlitere m dị ka onye Katọlik, agakwara m akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Katọlik a na-ebi ebi na ya,” ka ọ na-ekwu. “Dị ka nwata nwanyị, ekpebiri m na achọrọ m ịghọ nọn ma ọ bụ nọọsụ. Enwere m ọchịchọ ijere ndị ọzọ ozi. Ị pụrụ ịkpọ ya ọkpụkpọ. Dị ka ị pụrụ ịhụ, ahọọrọ m ọrụ nọọsụ.”

Chiwa Matsunaga si Saitama, Japan, elekọtawo ụlọ ahụ ike nke ya ruo afọ asatọ. Ọ na-ekwu, sị: “Agbasoro m echiche papa m na ‘ọ kasị mma ịmụ ọrụ aka ga-eme ka i nwee ike ịrụ ọrụ ná ndụ gị nile.’ Ya mere, ahọọrọ m ọrụ nọọsụ.”

Etsuko Kotani si Tokyo, Japan, bụ́ onyeisi ndị nọọsụ nke rụworo ọrụ nọọsụ ruo afọ 38, kwuru, sị: “Mgbe m ka nọ n’ụlọ akwụkwọ, papa m tụbọrọ, ọbara gbakwara ya nke ukwuu. Ka m na-elekọta papa m n’ụlọ ọgwụ, m kpebiri na m chọrọ ịbụ nọọsụ ka m wee nwee ike inyere ndị ọrịa aka n’ọdịnihu.”

Ahụmahụ ndị ọzọ nwere mgbe ha na-arịa ọrịa bụ ihe kwaliri ha. Eneida Vieyra, nọọsụ na Mexico, na-ekwu, sị: “Mgbe m dị afọ isii, anọrọ m izu abụọ n’ụlọ ọgwụ maka ọzịza nke opi akpa ume, ọ bụkwa mgbe ahụ ka m kpebiri na m chọrọ ịbụ nọọsụ.”

N’ụzọ doro anya, ịbụ nọọsụ chọrọ ịchụ onwe onye n’àjà n’ụzọ dị ukwuu. Ka anyị lerukwuo anya ma n’ihe ịma aka ma n’ụgwọ ọrụ ndị dị n’ọrụ a magburu onwe ya.

Ọṅụ Ndị Dị n’Ịbụ Nọọsụ

Ọṅụ ndị dị aṅaa dị n’ọrụ nọọsụ? Azịza nke ajụjụ ahụ ga-adabere n’ụdị ihe mmadụ na-arụ n’ọrụ nọọsụ. Dị ka ihe atụ, ụmụ nwanyị na-eji ime na-enwe afọ ojuju maka ọmụmụ nwa ọ bụla gara nke ọma. “Ọ bụ ihe magburu onwe ya inye aka n’ịmụ nwa nwere ahụ ike bụ́ onye i lekọtara mgbe ọ nọ n’afọ,” ka otu nwanyị na-eji ime si Netherlands na-ekwu. Jolanda Gielen-Van Hooft, sikwa Netherlands, na-ekwu, sị: “Inye aka n’ịmụ nwa bụ otu n’ime ihe ndị kasị mma di na nwunye—na onye ọrụ ahụ ike—pụrụ inwe ahụmahụ ya. Ọ bụ ọrụ ebube!”

Rachid Assam si Dreux, France, bụ nọọsụ gọọmenti nyere ikike ịgba ọgwụ nkụnwụ ahụ bụ́ onye nọ ná mmalite afọ ndị 40 ya. N’ihi gịnị ka o ji enwe ọṅụ n’ọrụ nọọsụ? N’ihi “afọ ojuju nke ịbụ onye tụnyere ụtụ n’ịga nke ọma nke ịwa ahụ nakwa n’ịbụ onye so n’ọrụ na-akpali akpali ma na-aga n’ihu mgbe nile,” ka ọ na-ekwu. Isaac Bangili, sikwa France, kwuru, sị: “Ngosipụta ekele anyị na-enweta site n’aka ndị ọrịa na ezinụlọ ha na-emetụ m n’ahụ, karịsịa mgbe e nwere ọnọdụ mberede ma anyị jisie ike mee ka onye ọrịa anyị chere na e nwekwaghị olileanya na ọ ga-adị ndụ gbakee.”

E zigaara Terry Weatherson, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, ngosipụta ekele dị otú ahụ. Otu nwanyị di ya nwụrụ dere, sị: “Agaghị m ekwe ka oge a gafee n’ezoghị aka ọzọ n’omume ọnụnọ gị mere ka ahụ ruo anyị ala nakwa ka anyị nwee obi ike n’oge ahụ dum Charles na-arịa ọrịa. Omume enyi gị kụjụrụ mwute anyị, ọ ghọkwaara anyị ihe nkwado nke nyere anyị ume.”

Iche Ihe Ịma Aka Ya Ihu

N’agbanyeghị ọṅụ ndị dị n’ọrụ nọọsụ, o nwekwara ọtụtụ ihe ịma aka. Ọ chọghị mmehie ihe! Ma ọ̀ na-enye ọgwụ ma ọ bụ na-amịrị ọbara ma ọ bụ na-adụnye ntụtụ n’akwara ma ọ bụ ọbụna nanị na-akwagharị onye ọrịa, nọọsụ aghaghị ịkpachapụ nnọọ anya. Ọ gaghị achọ imehie ihe—nke a dị otú a karịsịa n’ala ebe ndị ịgba akwụkwọ bụ ihe a na-emekarị. Ma, mgbe ụfọdụ a na-etinye nọọsụ n’ọnọdụ siri ike. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nọọsụ chere na dọkịta edepụtaraghị onye ọrịa ọgwụ ziri ezi ma ọ bụ na o nyewo iwu ka e mee ihe na-abụghị maka ọdịmma onye ọrịa. Gịnị ka nọọsụ ahụ pụrụ ime? Ọ̀ ga-ama dọkịta ahụ aka? Nke ahụ chọrọ obi ike, akọ, na nkà nkwurịta okwu—ihe ize ndụ dịtụkwa na ya. Ọ dị mwute ikwu na ndị dọkịta ụfọdụ adịghị anabata aro ndị si n’aka ndị ha na-ele anya dị ka ndị nọ n’okpuru ha.

Gịnị ka ndị nọọsụ ụfọdụ kwuworo banyere nke a? Barbara Reineke si Wisconsin, U.S.A., bụ́ onye bụworo nọọsụ gọọmenti nyere ikike ruo afọ 34, gwara Teta!, sị: “Nọọsụ aghaghị inwe obi ike. Nke mbụ, iwu ji ya maka ọgwụ ma ọ bụ ọgwụgwọ ọ bụla o nyere nakwa maka nsogbu ọ bụla ha kpatara. Ọ ghaghị inwe ike ịjụ ime ihe dọkịta nyere ya iwu ka o mee ma o chee na ya ekwesịghị ime ya ma ọ bụ ọ bụrụ na o chee na iwu ahụ ezighị ezi. Ọrụ nọọsụ abụkwaghị ihe ọ bụ n’oge Florence Nightingale ma ọ bụ ọbụna n’afọ 50 gara aga. Ugbu a ọ dị nọọsụ mkpa ịmata mgbe ọ ga-asị dọkịta ee e nakwa mgbe ọ ga-arụgide dọkịta ịhụ onye ọrịa ọbụna ma ọ bụrụ n’etiti abalị. Ọ bụrụkwa na i zighị ezi, ị ghaghị inwe ike idi emo ọ bụla dọkịta pụrụ ịkwa gị.”

Nsogbu ọzọ ndị nọọsụ na-aghaghị iche ihu bụ ihe ike a na-emeso ha n’ebe ọrụ. Otu akụkọ si South Africa na-ekwu na ‘a ma ndị nọọsụ ama dị ka ndị kasị nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị a kparịrị ma mesoo ihe ike n’ebe ha na-arụ ọrụ. N’eziokwu, o yikarịrị ka a ga-awakpo ndị nọọsụ n’ọrụ karịa ka a ga-awakpo ndị nche ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ ndị isi ndị uwe ojii, 72% nke ndị nọọsụ echeghịkwa na ha nweere onwe ha pụọ ná mwakpo.’ A kọrọ ọnọdụ yiri nke ahụ banyere United Kingdom, bụ́ ebe pasent 97 nke ndị nọọsụ zaghachirinụ ná nnyocha ahụ e mere na nso nso a maara banyere ndị nọọsụ e tiri ihe n’afọ gara aga. Gịnị na-akpata ime ihe ike a? Nsogbu a na-esitekarị n’aka ndị ọrịa ṅụrụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ndị ṅụbigaworo mmanya ókè ma ọ bụ ndị nwere nchekasị ma ọ bụ mwute.

Ndị nọọsụ aghaghịkwa ịlụso oké ike ọgwụgwụ nke nchekasị na-akpata, ọgụ. Enweghị ndị ọrụ zuru ezu bụ otu n’ime ihe na-akpata ya. Mgbe nọọsụ nke na-arụ ọrụ ya nke ọma na-enweghị ike inye onye ọrịa nlekọta zuru ezu n’ihi oké ọrụ o nwere ịrụ, n’oge na-adịghị anya ọ na-amalite inwe nchekasị. Ịgbalị ịnagide ọnọdụ ahụ site n’akwụsịtụghị ọrụ na ịrụfe oge ọrụ yiri nanị ka ọ na-eme ka e nwekwuo nkụda mmụọ.

Gburugburu ụwa ọtụtụ ụlọ ọgwụ enweghị ndị ọrụ zuru ezu. “Anyị enweghị ndị nọọsụ zuru ezu n’ụlọ ọgwụ anyị,” ka otu akụkọ dị na magazin Madrid bụ́ Mundo Sanitario na-akọ. “Onye ọ bụla nlekọta ahụ ike dịworo mkpa na-amata ịdị mkpa nke ndị nọọsụ.” Gịnị ka e kwuru na ọ bụ ya na-akpata ụkọ a? Ịchọ ichekwa ego! Otu akụkọ ahụ kwuru na ụlọ ọgwụ ndị dị na Madrid chọkwuru ndị nọọsụ 13,000 a zụrụ azụ!

Ihe ọzọ e kwuru na-akpata nchekasị bụ na oge ọrụ na-adịkarị oké ogologo, ụgwọ a na-akwụ na-adịkarịkwa ntakịrị. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Scotsman kwuru, sị: “Ihe karịrị otu onye n’ime ndị nọọsụ ise nọ na Britain na otu ụzọ n’ime ụzọ anọ nke ndị na-enyere ndị nọọsụ aka nwere ọrụ ọzọ ha na-arụ iji kpata ihe ha ji ebi ndụ, dị ka òtù ndị na-ejere ọha na eze ozi, bụ́ Unison, si kwuo.” Mmadụ 3 n’ime ndị nọọsụ 4 ọ bụla na-eche na a dịghị akwụ ha ezigbo ụgwọ. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha echewo echiche ịhapụ ọrụ ahụ.

E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eso akpata nchekasị nke ndị nọọsụ na-enwe. Site n’ihe ndị nọọsụ nọ gburugburu ụwa gwara Teta!, ọnwụ onye ọrịa pụrụ ime ka ha nwee nkụda mmụọ. Magda Souang, si Ijipt, na-arụ ọrụ na Brooklyn, New York. Mgbe a jụrụ ya ihe mere ka ọrụ ya sie ike, ọ zara, sị: “Ịhụ ka ọ dịkarịa ala mmadụ 30 na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta bụ́ ndị m lekọtara nke ọma nwụrụ n’ime afọ iri. Nke ahụ ga-agwụ gị ike.” Ka a sịkwa ihe otu akwụkwọ ji kwuo, sị: “Mmadụ ịnọgide na-etinye mgbalị n’ilekọta ndị ọrịa ga-emesị nwụọ pụrụ ịkpaghasị ọnọdụ mmadụ.”

Ọdịnihu Dịịrị Ndị Nọọsụ

Ọganihu na mmetụta nke nkà na ụzụ na-eme ka nrụgide dị n’ọrụ nọọsụ ka njọ. Ihe ịma aka bụ ijikọta nkà na ụzụ na ịdị nro, ụzọ ọmịiko nke isi na-emeso ndị ọrịa ihe. Ọ dịghị ígwè ọrụ a pụrụ iji dochie nlekọta na ọmịiko nke nọọsụ.

Otu magazin kwuru, sị: “Ọrụ nọọsụ bụ ọrụ ga-adịru mgbe ebighị ebi. . . . Ruo ogologo oge ihe a kpọrọ mmadụ ga-adị adị, ọ dịghị mgbe a na-agaghị na-enwe mkpa nke nlekọta, ọmịiko, na nghọta.” Ọrụ nọọsụ na-egbo mkpa ahụ. Ma e nwere ihe ka ukwuu mere a ga-eji nwee atụmanya mara mma n’ihe banyere nlekọta ahụ ike. Bible na-egosi na oge ga-abịa mgbe ọ dịghị onye ga-asị, “Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ndị dọkịta, ndị nọọsụ, na ụlọ ọgwụ agaghị adị mkpa n’ụwa ọhụrụ nke Chineke kweworo ná nkwa.—Aịsaịa 65:17; 2 Pita 3:13.

Bible na-ekwekwa nkwa na “Chineke . . . ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Otú ọ dị, ka ọ dịgodị, anyị kwesịrị inwe ekele maka nlekọta nile ọtụtụ nde ndị nọọsụ n’ụwa nile na-enye nakwa àjà ha na-achụ, ndị bụ́ ma e wezụga ha ịnọ n’ụlọ ọgwụ agachaghị abụ ihe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ gaghị abụ ihe na-agaghị ekwe omume! Mgbe ahụ, lee ka ajụjụ ahụ bụ́ “Ndị nọọsụ—gịnị ka anyị ga-eme ma e wezụga ha?” si kwesị ekwesị.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

Florence Nightingale—Onye Kwalitere Ọrụ Nọọsụ nke Oge A

N’ịbụ onye ndị Britain bara ọgaranya mụrụ n’Itali na 1820, e nyere Florence Nightingale nlekọta gabigara ókè. Florence na-eto eto jụrụ ndị bịaara ya di ma malite ịmụ banyere ahụ ike na ilekọta ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. N’agbanyeghị mmegide nke ndị mụrụ ya, Florence malitere ọrụ n’otu ụlọ akwụkwọ a na-azụ ndị nọọsụ dị na Kaiserswerth, Germany. Ka e mesịrị, ọ gara akwụkwọ na Paris, mgbe ọ dị afọ 33, ọ ghọrọ onyeisi nlekọta nke ụlọ ọgwụ ndị inyom dị na London.

Ma o chere ihe ịma aka kasịnụ o nwere ihu mgbe o wepụtara onwe ya ilekọta ndị soja merụrụ ahụ na Crimea. N’ebe ahụ, ya na ndị nọọsụ ya dị 38 zachara ma kpochaa otu ụlọ ọgwụ òké jupụtara. Ọrụ ahụ tara akpụ, n’ihi na ná mmalite ncha adịghị, e nweghị efere ịkwọ aka ma ọ bụ ákwà nhicha aka, e nweghịkwa ihe ndina nta, matarasị, ma ọ bụ bandeeji zuru ezu. Florence na ndị òtù ya meriri ihe ịma aka ahụ, ka ọ na-erule mgbe agha ahụ biri, o mewo ka e nwee mgbanwe n’ọrụ nọọsụ nakwa ná nlekọta nke ụlọ ọgwụ n’ụwa nile. Na 1860 ọ malitere Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Nọọsụ nke Nightingale dị n’Ụlọ Ọgwụ St. Thomas na London—ụlọ akwụkwọ mbụ a na-azụ ndị nọọsụ na ya bụ́ nke na-enweghị njikọ nke okpukpe. Tupu ya anwụọ na 1910, ọ bụ onye ọrịa na-adịghị ebili n’àkwà ruo ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nọgidere na-ede akwụkwọ dị iche iche ná mgbalị ime ka usoro nlekọta ahụ ike dịwanye mma.

Ụfọdụ ndị ekwetaghị na Florence Nightingale nwere àgwà nke ịchọ ọdịmma ndị ọzọ, na-arụ ụka na e kwesịrị, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ịjakwa ndị ọzọ mma maka ụtụ ha tụnyere n’ọrụ nọọsụ. Tụkwasị na nke a, e nwewo oké arụmụka banyere àgwà ya. Dị ka akwụkwọ bụ́ A History of Nursing si kwuo, ụfọdụ ndị na-ekwu na “o nwere obi ọkụ, na-atụ ụka, ọ dịghị anabata echiche ndị ọzọ, ọ na-ewe iwe ọkụ ma dị aka ike,” ebe ndị ọzọ nwere mmasị ‘n’ọgụgụ isi nakwa mma ya, ike ya na-eju anya, na àgwà ya na-emegiderịta ibe ha.’ Ihe ọ sọrọ ya bụrụ àgwà ya n’ezie, otu ihe doro anya: ụzọ o si rụọ ọrụ nọọsụ ma lekọta ụlọ ọgwụ gbasaruru ọtụtụ mba. A na-ele ya anya dị ka onye kwalitere ọrụ nọọsụ dị ka anyị maara ya taa.

[Foto]

Ụlọ Ọgwụ St. Thomas mgbe a malitesịrị Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Nọọsụ nke Nightingale

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke National Library of Medicine

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

Iru Eru nke Nọọsụ

Nọọsụ: “Onye a kwadebere karịsịa n’ụzọ nkà sayensị maka ilekọta ndị ọrịa ma bụrụ onye ruru ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ ụfọdụ a chọrọ ma mara nke a na-akọ n’ihe banyere inye ọgwụgwọ.”

Nọọsụ Gọọmenti Nyere Ikike: “Onye gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ndị nọọsụ bụ́ onye iwu nyere ikike ịrụ ọrụ mgbe òtù bọọdụ mba na-ahụ maka ile ndị nọọsụ ule lesịrị ya ule . . . bụ́kwa onye iwu nyere ikike iji utu aha ahụ bụ́ R.N. [Nọọsụ Gọọmenti Nyere Ikike] eme ihe.”

Nọọsụ Bụ́ Ọkachamara n’Ilekọta Ndị Ọrịa: “Nọọsụ gọọmenti nyere ikike nke nwere nnọọ ihe ọmụma, nkà, onye makwaara nke a na-akọ n’otu akụkụ pụrụ iche nke ọrụ nọọsụ.”

Nọọsụ Na-eji Ime: “Onye e nyere ọzụzụ ma n’ilekọta ndị ọrịa ma n’iji ime.”

Nọọsụ Na-agaghị Ụlọ Akwụkwọ Ndị Nọọsụ: “Onye nweworo ahụmahụ n’ilekọta ndị ọrịa ma ọ gaghị ụdị ụlọ akwụkwọ ọ bụla a na-azụ ndị nọọsụ na ya.”

Nọọsụ E Nyere Ọzụzụ: “Onye gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ a na-azụ ndị nọọsụ na ya . . . bụ́ onye iwu nyeworo ikike ịrụ ọrụ dị ka nọọsụ e nyere ọzụzụ.”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ihe ndị a sitere n’akwụkwọ United States bụ́ Dorland’s Illustrated Medical Dictionary

UN/J. Isaac

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]

‘Idé ná Nlekọta Ahụ Ike’

Ná Nnọkọ Nkwurịta Okwu Mba Nile nke Mgbaafọ Otu Narị nke Kansụl Na-ahụ Maka Ndị Nọọsụ nwere na June 1999, Dr. Gro Harlem Brundtland, ọga kpata kpata nke Òtù Ahụ Ike Ụwa, kwuru, sị:

“Ndị nọọsụ, dị ka ndị bụ idé n’ọrụ ahụ ike, nọ n’ọnọdụ pụrụ iche ịbụ ndị dị ike na-eme ka e nwee mbara ala nke nwere ahụ ike. . . . Ebe ọ bụ na ndị nọọsụ na ụmụ nwanyị na-eji ime emejupụtaworị ihe ruru 80% nke ndị ruru eru na-arụ ọrụ ahụ ike n’ihe ka ọtụtụ n’usoro ọrụ ahụ ike nke mba dị iche iche, ha na-anọchite anya ikike dị ike nke pụrụ iweta mgbanwe ndị dị mkpa iji mee ka e nwee Ahụ Ike Maka Mmadụ Nile na narị afọ nke 21. N’ezie, ụtụ ha na-atụnye n’ọrụ ahụ ike na-erute akụkụ nile nke nlekọta ahụ ike . . . O doro anya na ndị nọọsụ bụ idé nke ihe ka ọtụtụ n’ìgwè ndị nlekọta ahụ ike.”

Onye bụbu President Mexico bụ́ Ernesto Zedillo Ponce de León jara ndị nọọsụ Mexico mma pụrụ iche n’otu okwu o kwuru mgbe ọ sịrị: “Site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, unu nile . . . na-enye ihe ọmụma nile unu, ịdị n’otu unu, na ije ozi unu iji chebe ma weghachite ahu ike ndị Mexico. Site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị unu na-enye ndị ọ dị mkpa ọ bụghị nanị enyemaka unu kamakwa nkasi obi sitere n’àgwà obiọma, nke nraranye, na nke afọ ọma miri emi unu na-egosipụta. . . . Unu bụ ngalaba kasịnụ n’usoro ọrụ ahụ ike anyị. . . . Ná ndụ ọ bụla a napụtara, na nwatakịrị ọ bụla a gbara ọgwụ mgbochi ọrịa, na nwa ọ bụla e nyere aka mụọ, n’okwu ahụ ike ọ bụla, n’ọgwụgwọ ọ bụla, n’onye ọrịa ọ bụla nwetara nlekọta na ezi nkwado, aka ndị nọọsụ anyị dị na ya.”

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Foto UN/DPI nke Greg Kinch sere

Foto UN/DPI nke Evan Schneider sere

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

Dọkịta nke Nwere Ekele

Dr. Sandeep Jauhar nke Ụlọ Ọgwụ Presbyterian dị na New York kwetara na ya ji ezigbo ndị nọọsụ ụgwọ. Otu nọọsụ ji akọ mee ka o kweta na otu onye ọrịa nọ n’ọnụ ọnwụ chọkwuru morphine. O dere, sị: “Ezigbo ndị nọọsụ na-akụzikwara ndị dọkịta ihe. Ndị nọọsụ nọ n’ọnụ ụlọ ndị ọrịa pụrụ iche dị ka ngalaba a na-enye nlekọta kpụ ọkụ n’ọnụ na ha bụ ụfọdụ n’ime ndị ọkachamara a zụrụ nke ọma n’ụlọ ọgwụ. Mgbe m na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ dị ka nwa akwụkwọ, ha kụziiri m otú e si etinye tuubu n’ahụ na idozi ngwá e ji eku ume. Ha gwara m ọgwụ ndị a na-agaghị enye.”

Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị nọọsụ na-enye ndị ọrịa nkwado nke uche, n’ihi na ha na ha na-anọkarị. . . . Ọ dịchaghị mgbe m na-eme ihe ngwa ngwa karịa ka m na-eme mgbe nọọsụ m tụkwasịrị obi gwara m na m aghaghị ịhụ onye ọrịa ozugbo.”

[Foto dị na peeji nke 7]

“Enwere m ọchịchọ ijere ndị ọzọ ozi.”—Terry Weatherson, England.

[Foto dị na peeji nke 7]

“Ka m na-elekọta papa m n’ụlọ ọgwụ, m kpebiri na m chọrọ ịbụ nọọsụ.”—Etsuko Kotani, Japan.

[Foto dị na peeji nke 7]

‘Inye aka mụọ nwa bụ otu n’ime ihe kasị mma nwanyị na-eji ime pụrụ inwe ahụmahụ ya.’—Jolanda Gielen-Van Hooft, Netherlands.

[Foto dị na peeji nke 8]

Ndị inyom na-eji ime na-enwe ọṅụ na afọ ojuju site n’inye aka mụọ nwa