Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ahụ Ike Ka Mma—À Na-achọ Ya n’Ụzọ Ọzọ?

Ahụ Ike Ka Mma—À Na-achọ Ya n’Ụzọ Ọzọ?

Ahụ Ike Ka Mma—À Na-achọ Ya n’Ụzọ Ọzọ?

Ọ bụ ihe ole na ole na-echegbu ndị mmadụ karịa ahụ ike. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ka e nwere ọtụtụ echiche haruru ka ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ahụ ike. Kama ịkwado otu akụkụ, Teta! gbalịrị iji usoro isiokwu a kọọ banyere ojiji a na-ejiwanye ọgwụgwọ ndị a na-akpọkarị ụdị ọzọ eme ihe. Anyị adịghị akwado nlekọta ahụ ike ọ bụla anyị ga-atụle ma ọ bụ nke ọ bụla ọzọ. A kpọtụghị ọtụtụ ụzọ e si agwọ ọrịa aha—ụfọdụ na-ewu nnọọ ewu, ụfọdụ na-akpali arụmụka. Anyị kwenyere na inwe ihe ọmụma banyere okwu ahụ ike bara uru n’ozuzu ya; mkpebi n’ihe metụtara okwu ahụ ike bụ nnọọ ihe dịịrị onwe onye.

ONYE ọ bụla chọrọ inwe ahụ ike. Ma ahụ ike pụrụ isi ike nnweta, dị ka a pụrụ ịhụ n’ọnụ ọgụgụ ndị nwere nsogbu ahụ ike. O yiri ụfọdụ ka ọtụtụ ndị hà na-arịa ọrịa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

Iji lụsoo ọrịa ọgụ, ọtụtụ ndị dọkịta na-adabere nnọọ n’idepụta ọgwụ ndị ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ mepụtara ma na-akpọsasi ike. N’ụzọ dị ịrịba ama, ịzụ ahịa ọgwụ ndị dị otú ahụ ná mba nile arịala nnọọ elu n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, malite na nanị ijeri dollar ole na ole n’otu afọ ruo ọtụtụ narị ijeri dollar kwa afọ. Gịnị siworo na ya pụta?

Ọgwụ ndị dọkịta depụtara enyeworo ọtụtụ ndị aka. Ma, ahụ ike nke ndị ụfọdụ na-aṅụ ọgwụ ka dị otú ọ dị ma ọ bụ ka njọ. N’ihi ya, n’oge na-adịbeghị anya ụfọdụ amalitewo ịnara ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ.

Ihe Ọtụtụ Ndị Na-echigharịkwuru

N’ebe ndị iji ụdị ọgwụgwọ Bekee nke oge a eme ihe nọworo na-abụ nlekọta a na-enyekarị, ọtụtụ ndị na-echigharịkwuruzi ihe a kpọworo usoro ọgwụgwọ ọzọ, ma ọ bụ nke nkwado. “Nnukwute ihe mgbochi ahụ nke kewaworo usoro ọgwụgwọ ọzọ na ụdị ọgwụgwọ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-anara yiri ka ọ na-ada ada,” ka magazin bụ́ Consumer Reports nke May 2000 na-ekwu.

Magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association (JAMA), nke November 11, 1998, na-ekwu, sị: “Usoro ọgwụgwọ ọzọ, bụ́ nke a na-akọwa, na-adabere n’otú o si arụ ọrụ, dị ka inye ọgwụ mgbochi ọrịa bụ́ nke a na-adịghị akụzi n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ nkà ọgwụ na ahụ ike, nke a na-adịghịkwa enyekebe n’ụlọ ọgwụ ndị dị na United States, adọtawo mmasị dị ukwuu nke usoro mgbasa ozi, ndị ọrụ ahụ ike, ụlọ ọrụ gọọmenti, na ọha na eze.”

Otú ọ dị, n’ịrịba ihe ndị na-eme na nso nso a ama, akwụkwọ bụ́ Journal of Managed Care Pharmacy kọwara na 1997, sị: “N’oge gara aga, ndị dọkịta enwewo obi abụọ banyere iji ụdị ọgwụgwọ ọzọ eme ihe, ma ụlọ akwụkwọ nkà ọgwụ na ahụ ike 27 dị na United States [akụkọ e nwetara na nso nso a karị kwuru 75], gụnyere Harvard, Stanford, Mahadum Arizona, na Yale na-akụzi ugbu a ihe ọmụmụ banyere iji ụdị ọgwụgwọ ọzọ eme ihe bụ́ nke mmadụ ga-agụ ma ọ masị ya.”

Magazin ahụ bụ́ JAMA kwuru ihe ọtụtụ ndị ọrịa na-eme ná mgbalị ime ka ahụ ike ha ka mma. Ọ kọrọ, sị: “Na 1990, ihe e mere atụmatụ ya ịbụ 1 onye (19.9%) n’ime mmadụ 5, bụ́ ndị jere hụ dọkịta maka otu ọkpụrụkpụ ọrịa, jikwara usoro ọgwụgwọ ọzọ mee ihe. Ọnụ ọgụgụ a mụbara ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 onye (31.8%) n’ime mmadụ 3 na 1997.” Isiokwu ahụ kwukwara, sị: “Nnyocha mba e mere n’ebe ndị na-abụghị United States na-egosi na iji ụdị ọgwụgwọ ọzọ eme ihe na-ewu ewu ná mba nile mepere emepe.”

Dị ka JAMA si kwuo, nkezi nke ọnụ ọgụgụ ndị jiri ụdị ọgwụgwọ ọzọ mee ihe n’ime ọnwa 12 na-adịbeghị anya bụ pasent 15 na Canada, pasent 33 na Finland, na pasent 49 n’Australia. “Ịdị ukwuu nke ọchịchọ a na-achọ usoro ọgwụgwọ ọzọ kwesịrị ịrịba ama,” ka JAMA kwetara. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’ihi eziokwu bụ́ na usoro ọgwụgwọ ọzọ adịghị esokebe n’ihe ndị ụlọ ọrụ inshọransị na-akwụ ụgwọ maka ha. N’ihi ya isiokwu ahụ dị na JAMA kwubiri, sị: “Ojiji e ji ya eme ihe n’oge a yiri ka ọ gaghị egosipụtaru ókè a ga-ejiru usoro ọgwụgwọ ọzọ mee ihe n’ọdịnihu ma ọ bụrụ na ụlọ ọrụ inshọransị amụbaa ọnụ ọgụgụ ọgwụgwọ ndị ọzọ ha na-akwụ ụgwọ maka ha n’ọdịnihu.”

Omume nke ijikọta usoro ọgwụgwọ ọzọ na nke Bekee abụwo ihe ọtụtụ ndị na-eme eri ogologo oge n’ọtụtụ mba. Dr. Peter Fisher, nke Royal London Homeopathic Hospital, kwuru na ụdị ndị bụ́ isi nke usoro ọgwụgwọ nkwado aghọwo “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-ejikarị eme ihe n’ọtụtụ ebe. E nwekwaghị ụdị ọgwụgwọ abụọ, nke Bekee na nke nkwado,” ka ọ na-ekwu. “Nanị ihe e nwere bụ ezigbo ọgwụgwọ na ọgwụgwọ na-adịghị mma.”

N’ihi ya, taa ọtụtụ ndị ọkachamara n’ihe banyere nkà ọgwụ na-aghọta ịdị mkpa nke ma ọgwụgwọ Bekee ma usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ. Kama ikwu na onye ọrịa ga-anakwererịrị otu ụdị ọgwụgwọ ma bọzọ, ha na-atụ aro iji nke ọ bụla baara onye ọrịa uru, n’ime ụdị nile nke usoro ọgwụgwọ, eme ihe.

Olee ụfọdụ ụzọ ịgwọ ọrịa e nwere n’ihe a na-akpọ ụdị ọgwụgwọ ọzọ, ma ọ bụ nke nkwado? Ole mgbe, ọ bụkwa ole ebe ka ụfọdụ n’ime ha malitere? N’ihi gịnịkwa ka ọtụtụ ndị ji eji ha eme ihe?