Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere E Ji Nwee Nsogbu Omume

Ihe Mere E Ji Nwee Nsogbu Omume

Ihe Mere E Ji Nwee Nsogbu Omume

N’OCTOBER gara aga otu onye edemede nọ na Loja, Ecuador, kwupụtara ekele ya maka ozi Ndịàmà Jehova. Tinyere ihe ndị ọzọ, o kwuru, sị:

“Otu n’ime ihe otiti ndị kasị njọ na-emetụta ihe a kpọrọ mmadụ bụ nsogbu omume . . . O yiri ka ndị mmadụ echezọwo idebe Iwu Iri ahụ ma leghara akọ na uche ha anya, bụ́ ihe ndị na-egbochi ndị mmadụ ịghọta ibe ha. N’ebe nile na n’ụbọchị nile, anyị na-anụ banyere ịkpọasị, ime ihe ike, mpụ, ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ, iyi ọha egwu, nakwa asọpụrụghị ùgwù mmadụ. . . .

“Ndịàmà Jehova, n’abụghị ndị na-eme oké ngosi, na-arụ ọrụ ha n’udo na n’ụzọ dị nwayọọ, na-eleta ndị agbata obi ha site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, na-enyefe magazin abụọ ha mara mma, bụ́ Ụlọ Nche na Teta!, nke a na-ede isiokwu ndị kasị adọrọ mmasị. Karịsịa, Teta! na-ebu isiokwu dịgasị iche na-adọrọ mmasị bụ́ ndị na-ekwu n’ụzọ doro anya banyere sayensị na ọdịbendị. N’ihe a nile, a dịghị enwe ndehie ihe, ha na-edokwa anya n’ụzọ magburu onwe ya.”

Nsogbu omume nke taa pụtara ìhè, ma dị ka e kwuru na peeji nke 4 nke magazin a n’akụkụ bụ́ “Ihe Mere E Ji Na-ebipụta Teta!,” Teta! “na-enyoba anya n’ime ime wee na-arụ aka n’ihe ihe ndị na-eme ugbu a pụtara.” Broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? na-ekwupụta ahụhụ ndị mmadụ diworo, ma ọ na-eme ihe karịrị nke a. Ọ na-egosi ihe mere nsogbu omume nakwa ihe ndị dị egwu na-esi na ya apụta ji dịrị. Nke ka mkpa, ọ na-egosi otú mmadụ ga-esi nwere onwe ya pụọ n’ihe ndị a n’oge na-adịghị anya.

Ị pụrụ inweta otu broshuọ a na-akasị obi, bụ́ nke nwere peeji 32 site n’ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.