Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ọ̀ Dị Mkpa Ịjụta Echiche n’Ebe Ọzọ?

“A bịa n’ihe metụtara ịjụta echiche n’ebe ọzọ banyere ịgwọ ọrịa, ihe dị nnọọ ukwuu n’ime anyị na-asọ anya. Ma enweghị anya ike dị otú ahụ pụrụ ịnapụ ndị ọrịa ndụ ha,” ka The News nke Mexico City na-ekwu. Ndị ọrịa na-atụkarị ụjọ na dọkịta ha ga-eche na a kparịrị ha ma ọ bụrụ na ha achọọ ịjụta echiche n’ebe ọzọ. Ma “ọ dịghị ewute ọtụtụ ndị dọkịta ndị ọrịa ịjụta,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. “Ọ bụrụ na ọ na-ewute onye nke gị, ọ pụrụ igosi na nsogbu dị n’ihu.” Taa, ma ndị dọkịta ma ụlọ ọrụ inshọransị na-ele ịjụta echiche n’ebe ọzọ anya dị ka ụzọ dị mma iji hụ na ndị ọrịa nwetara ọgwụgwọ kasị mma. Dr. Michael Andrews, onyeisi Òtù Na-agwọ Akpụ na Georgia, sịrị na ya na-agba ndị ya na-agwọ ume ịjụta echiche n’ebe ọzọ n’ihi na ha na-abịaghachikarị nwekwuo obi ike n’aro ya. Onye ntụzi nke otu ìgwè na-ahụ maka ahụ ike ọha na eze sịrị: “Ọ dị mkpa ka ndị ọrịa cheta na ọ bụ ahụ ha dị n’ihe ize ndụ.”

Ndị Enyi Dị Ize Ndụ

Dị ka otu ihe ọmụmụ nke The Journal of the American Medical Association kọrọ banyere ya si kwuo, ndị ọkwọ ụgbọala nọ n’afọ iri na ụma pụrụ nnọọ inwe ajọ ihe mberede karị ma ọ bụrụ na ha bu ndị mmadụ n’ụgbọala. Ndị nnyocha nọ na Mahadum Johns Hopkins, Maryland, U.S.A., chọpụtara na ohere onye ọkwọ ụgbọala dị afọ 16 nwere ịnwụ ji pasent 39 ka ukwuu mgbe o bu otu onye, jiri pasent 86 ka ukwuu mgbe o bu mmadụ abụọ, jirikwa pasent 282 ka ukwuu mgbe o bu mmadụ atọ ma ọ bụ karị. Isi ihe ndị e hotara n’ihe ọmụmụ ahụ bụ́ ndị kpatara nke ahụ bụ “àgwà nke ịkwọ ụgbọala n’ụzọ dị ize ndụ . . . , nke ihe mere nnọọ o ji dị otú ahụ bụ ọnụnọ ndị ọgbọ ha nọ ya.” Àgwà ndị dị ize ndụ dị otú ahụ na-agụnye ife ọsọ, ịnọ ụgbọala nọ n’ihu oké nso, ịgbafere ọkụ na-akwụsị ndị ọkwọ ụgbọala, ịkwọ ụgbọala mgbe mmadụ ṅụrụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mgbe mmanya na-egbu ya, na ịbụ onye ndị e bu ebu bụ́ ndị na-egwu oké egwuregwu dọpụrụ uche ya.

‘Imewanye Agadi Ma Na-enwekwu Amamihe’

Ndị nnyocha achọpụtawo na akụkụ ụfọdụ nke ụbụrụ nwere ike imepụta mkpụrụ ndụ ọhụrụ ka mmadụ na-aka nká, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na-akọ. Na mbụ, e kweere na mkpụrụ ndụ ụbụrụ adịghị emepụta ndị ọhụrụ mgbe mmadụ tozuworo etozu. “Ụzọ e si akwalite mmepụta a bụ iji ụbụrụ na-eme ihe,” ka The Times kwuru. Nnyocha e nyochara ndị gafeworo afọ 65 ná nso nso a gosiri na ịmụ ihe na iso ndị ọzọ na-emekọ ihe yiri ka ọ na-eme ka mkpụrụ ndụ ụbụrụ na njikọ ha na-emepụta ndị ọhụrụ. Ndị nnyocha ahụ chọpụtara na iso ndị ọzọ na-emekọ ihe na-akwalite “ahụ ike, ogologo ndụ na ọdịdị ndụ.” Ọkà mmụta akwara ozi ụbụrụ bụ́ Susan Greenfield na-asị: “Ka ị na-enwekwu ahụmahụ otú ahụ ka njikọ i nwere na-amụba. Ya mere mmadụ na-emewanye agadi ma na-enwekwu amamihe.”

Ụzọ Oké Osimiri nke Ebe Ugwu

Ọ dị mgbe onye na-agba ahịa ụda, bụ́ Robert Thorne, nke biri na narị afọ nke 16 nwere ọchịchọ ịchọta ụzọ oké osimiri sitere na Europe gafere ógbè Arctic wee ruo Ebe Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Taa, ọchịchọ Thorne emezuwo n’ihi ikpo ọkụ nke ụwa na-ekpo, ka The Times nke London na-akọ. Mmiri ndị dị n’akụkụ ụsọ oké osimiri Russia na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Siberia fọrọ obere ugbu a ka ha ghakwara ịkpụkọ akpụkọ n’ọnwa nile nke oge okpomọkụ, na-eme ka ụgbọ mmiri na-ebu ibu nwee ike isi n’Oké Osimiri Ugwu, na gburugburu Ógbè Arctic, gafere Bering Strait wee banye na Pacific. Mgbe mmiri ahụ kpụkọrọ akpụkọ, ụgbọ mmiri si Europe ga-esi Ọwà Mmiri Suez, ma ọ bụ gaa n’akụkụ ndịda ọnụ ọnụ Africa, ma ọ bụ si n’Ọwà Mmiri Panama gafere iji ruo Ebe Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ. Uru ego a na-erite n’isi n’ụzọ oké osimiri nke ebe ugwu dị nnọọ ukwuu. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ na-eke ịdị ogologo nke isi na Hamburg, Germany, ruo Yokohama, Japan abụọ—ịbụ nke na-erughị kilomita 13,000 nke njem ụgbọ mmiri.

Nsogbu Inyocha Ọbara

“Ihe karịrị ọkara nke mba ndị dị n’ụwa adịghị enyocha ọbara e nyere n’onyinye n’ụzọ zuru ezu, na-amụba ohere nke ịgbasa ọrịa AIDS na ọrịa ndị ọzọ,” ka akụkọ si n’ụlọ ọrụ Associated Press na-ekwu. Akụkọ a, bụ́ nke dabeere n’ozi si n’aka Òtù Ahụ Ike Ụwa, na-azọrọ na “a na-eme atụmatụ na pasent 5 ruo pasent 10 nke ndị bu nje AIDS butere ya site ná mmịnye ọbara.” Otú ọ dị, ọrịa AIDS bụ nanị otu n’ime ọrịa ndị a na-esi otú a ebufe. Kwa afọ, a na-ekesa nde 8 ruo nde 16 nke ọrịa ịba ọcha n’anya nke B nakwa nde 2 ruo nde 4 nke ọrịa ịba ọcha n’anya nke C site ná mmịnye ọbara na usoro ndị dị ize ndụ nke ịgbanye ọgwụ n’ahụ. Otu ihe e kwuru mere a dịghị enyocha ọbara n’ụzọ zuru ezu bụ na ọ na-efu oké ego. Ọ na-efu malite na $40 ruo $50 iji nyochaa otu unit maka ihe ndị a na-emetọ ihe. E wezụga nke ahụ, nnyocha ndị dị otú ahụ bụ ndị “a na-apụghị ịdabere na ha mgbe nile, karịsịa ma ọ bụrụ ndị ọrụ a na-azụghị nke ọma mere ha ma ọ bụ e jiri ngwá ọrụ na-ekwesịghị ekwesị mee ha,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.

Imetọ Ụmụaka n’India

Kwa minit iri ọ bụla, a na-akwanye otu nwatakịrị n’ịgba akwụna n’India, ka The New Indian Express na-akọ. Nke a pụtara na a na-amanye ihe dị ka ụmụaka India 50,000 ịgba akwụna kwa afọ. Na steeti Kerala, otu nzukọ ọmụmụ ihe e nwere n’ihe banyere idina ụmụaka kọrọ banyere nchọpụta ọzọ na-atụ n’anya. Ndị dọkịta n’ebe ahụ “na-ala azụ n’ilebara ndị e dinara n’ike anya ebe ọ bụ na ha abụghị ndị ọkachamara na ya, ha achọghịkwa itinye aka na ya,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị mụrụ ụmụ na-eso akpata nsogbu ahụ. Onyeisi Nlekọta Ụlọ Ọrụ Nledo Etiti bụ́ Superintendent Sreelekha, na-asị: “Ndị mụrụ ụmụ lara azụ n’ime ka gọọmenti mata banyere ndị [e dinara n’ike] n’ihi mmechuihu ọ pụrụ iwetere ha n’ebe ọha mmadụ nọ na mmeso ọjọọ a ga-emeso ha.”

Irikọ Nri Dị Ka Ezinụlọ Kasị Mma Maka Ahụ Ike

Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma nne na nna ga-esi hụ na ụmụ ha nwere ahụ ike bụ iso ha na-eri nri abalị, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe and Mail na-ekwu. Dị ka Dr. Matthew Gillman nke Ụlọ Akwụkwọ Ọgwụ nke Harvard si kwuo, “nri abalị ezinụlọ na-enwe ihe oriri ndị ka mma maka ahụ ike karịa nke ụmụaka na ndị nọ n’oge uto pụrụ iri n’ebe ọzọ.” O yikarịrị ka ụmụaka ndị na-eri nri a na-esi n’ezinụlọ hà ga na-eri mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri ndị a tụrụ aro ka a na-eri, na-eri vitamin na mineral ahụ ha chọrọ, ma na-eri shụga na abụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka dị ala. Ndị nnyocha chọpụtakwara na iri nri abalị dị ka ezinụlọ na-akwalite ịkparịta ụka banyere iri nri n’ókè kwesịrị ma na-akụnye àgwà ka mma nke iri nri na-edozi ahụ n’obi ụmụaka—àgwà ndị ha ga-ebu pụọ mgbe ha na-eri nri n’èzí. Nchọpụta ọhụrụ a, bụ́ nke e nwetara ná nnyocha na-aga n’ihu nke a na-enyocha ụmụaka 16,000 nọ n’agbata afọ 9 na 14, gosiri na “nanị mmadụ abụọ n’ime ụmụaka ise toruworo ịga akwụkwọ na-eso nne na nna ha n’ezie eri nri abalị ihe ka n’ọtụtụ ụbọchị, otu onye n’ime mmadụ ise adịghị eme otú ahụ ma ọlị,” ka Globe ahụ na-ekwu.

Ndị Ọkà n’Ịkpa Ihe

“Ọnyà ududo bụ otu n’ime ihe ndị kasị sie ike n’Ụwa,” ka magazin bụ́ New Scientist na-ekwu. Eriri ya ọ bụla pụrụ ịdọtị malite n’okpukpu abụọ ruo okpukpu atọ nke ịdị ogologo ya tupu ya adọbie, o sikwara nnọọ ike nke na e kwuwo na otu ọnyà ududo nke buru ibu ka pensịl pụrụ ịkwụsị ụgbọelu jumbo na-efe efe. Ndị nnyocha anọwo na-anwa ịmata ụzọ ududo si akpa ihe maka iji ya eme ihe n’ọrụ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ihe a na-ahọrọ ugbu a iji eme uwe mgbọ na-apụghị ịtụpu bụ Kevlar, bụ́ ákwà nke ihe e ji eme ya bụ “sulphuric acid kpụkọrọ akpụkọ bụ́ nke e sigidere n’ọkụ ruo mgbe ọ chọwara ịgbọ agbọ,” ka magazin ahụ na-ekwu. Ma ọ bụ ezie na ihe ndị na-apụta mgbe a na-emepuṭa Kevlar na-enwe nsí ma sie ike ikpofu, ihe ududo ji akpa ọnyà ya bụ “protein na mmiri nkịtị mgbe ha ghọrọ acid nakwa mgbe ikpo ọkụ ha dị ka nke dị n’ọnụ mmadụ.” Ọzọkwa, ọ na-akpa ngwakọta nke mmiri na protein a ka ọ bụrụ eriri mmiri ozuzo na-apụghị ịsachapụ. Ya mere, New Scientist na-asị: “N’agbanyeghị ọtụtụ afọ nke ihe ọmụmụ, ọnyà ududo ka bụ ihe mgbagwoju anya.”

Mmetọ n’Ebe Obibi

“Ime ụlọ gị ji okpukpu iri yie ihe a ga-emetọ karịa ubi dị n’ihu ụlọ gị,” ka The Times nke London na-ekwu. Nnyocha nke Ụlọ Ọrụ Na-enyocha Ihe Owuwu nyochara ebe obibi 174 ndị Britain gosiri na ọ̀tụ̀tụ̀ uzu ọkụ formaldehyde, nke si ná ngwá ụlọ e ji ntụ osisi mee na ihe ndị ọzọ aka mere pụta, ji okpukpu iri dị elu n’ime ụlọ karịa n’èzí. Ikuku dị n’ụlọ 12 n’ime ndị e nyochara erughị ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị mma nke Òtù Ahụ Ike Ụwa chọrọ. Ngwá ụlọ aka mere, vinyl e ji eme ala ụlọ, ihe ndị e ji ewu ma na-achọ ụlọ mma, ihe nhicha ndị e ji mmiri ọgwụ mee, ma ọ bụ ihe ndị e ji eme ka ihe kpoo ọkụ ma ọ bụ e ji esi nri pụrụ ịhịọ anwụrụ ọkụ, iwepụta nitrogen dioxide, uzu ọkụ benzene, ma ọ bụ uzu ọkụ ndị na-agbaze ngwa ngwa n’ikuku. Uzu ọkụ benzene, bụ́ ihe a ma ama na-akpata ọrịa cancer na-adị n’ihe nhicha ụfọdụ a na-agba agba, nakwa n’anwụrụ ọkụ ụtaba, bụ́ ihe ọzọ na-emetọ ime ụlọ. Charlotte Gann, onye nchịkọta akụkọ magazin bụ́ Health Which?, na-ekwu na ọtụtụ ndị na-eji pasent 80 ruo pasent 90 nke oge ha anọ n’ime ụlọ. Ọ na-adọ aka ná ntị “iwetulata aka n’ihe ụfọdụ e ji mmiri ọgwụ mee, imepe ụfọdụ windo na ilebera ihe ndị na-eji gas arụ ọrụ anya” iji wee mee ka ikuku e nwere n’ime ụlọ dịkwuo mma.