Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ileba Anya n’Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ

Ileba Anya n’Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ

Ileba Anya n’Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ

“Ime ka ndị dọkịta na ndị na-enye ụdị ọgwụgwọ ọzọ kwurịta banyere ọrụ ha dị oké mkpa iji na-enye ndị ọrịa na-ahọrọ usoro ọgwụgwọ ọzọ nlekọta ahụ ike ka mma.”

E DERE okwu ahụ na magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association (JAMA) ná mbipụta ya nke November 11, 1998. Isiokwu ahụ kwuru, sị: “A pụrụ ịtụ anya na mkpa a [nke nkwurịta okwu] ga-amụba ma e jiri usoro ọgwụgwọ ọzọ na-eme ihe, karịsịa ka atụmatụ inshọransị ahụ ike na-agụnye usoro ọgwụgwọ ndị dị otú ahụ n’ụgwọ ndị ọ na-akwụ.”

Ọnụ ọgụgụ na-ebuwanye ibu nke ndị ọrịa na-anara usoro ọgwụgwọ ọzọ ka ha na-anabata ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ a na-ejikarị eme ihe. Ma, ụfọdụ adịghị agwa dọkịta ha ihe ha na-eme. N’ihi ya, akwụkwọ akụkọ bụ́ Tufts University Health & Nutrition Letter nke April 2000 gbara ume, sị: “I kwesịrị ime ihe ga-akasị baara gị uru site n’iso dọkịta gị na-emekọ ihe ọnụ kama ime ihe nanị gị.” O kwukwara, sị: “Ma ọ̀ kwadoro ihe ị chọrọ ime, ị ka ga-erite uru site n’iso ya kerịta ihe ọmụma ahụ.”

E kwuru nke a n’ihi ihe ize ndụ ahụ ike pụrụ ịdị mgbe a gwakọtara mkpá akwụkwọ ụfọdụ na usoro ọgwụgwọ a na-ejikarị eme ihe. N’ịmata na ụfọdụ n’ime ndị ha na-agwọ na-ahọrọ usoro ọgwụgwọ ọzọ, ọtụtụ ndị ọkachamara n’ọrụ ahụ ike na-agbalị ịghara ikwe ka echiche ha banyere nlekọta ahụ ike gbochie ha iso ndị na-eji usoro ọgwụgwọ ọzọ agwọ ọrịa emekọ ihe maka abamuru nke onye ọrịa.

Iji mee ka ndị na-agụ akwụkwọ anyị matatụ usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ mmadụ na-ebuwanye ibu n’ọtụtụ mba na-eji eme ihe ugbu a, anyị na-enye nkọwa dị mkpirikpi banyere ole na ole n’ime ha. Otú ọ dị, biko rịba ama na Teta! adịghị akwado nke ọ bụla n’ime ha ma ọ bụ ụdị ọgwụgwọ ọ bụla ọzọ.

Ọgwụ Mkpá Akwụkwọ

Ọgwụ ndị a pụrụ ịbụ ụdị ọgwụgwọ ọzọ nke kasị zuo ebe nile. N’agbanyeghị na e jiwo mkpá akwụkwọ gwọọ ọrịa eri ọtụtụ narị afọ, ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ ahịhịa dị nnọọ nta ka ndị ọkà mmụta sayensị nyochaworo nke ọma. Ọbụna ọnụ ọgụgụ dị nta karị nke ahịhịa na mmiri ka e nyochaworo nke ọma ruo n’ókè nke inwe ihe ọmụma banyere adịghị ize ndụ ha nakwa ịdị irè ha. Ihe ka ukwuu n’ihe ọmụma banyere mkpá akwụkwọ dabeere n’ahụmahụ e nwetara site n’ojiji e ji ha eme ihe.

Otú ọ dị, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, e nwewo ọtụtụ ihe ọmụmụ sayensị na-egosi uru mkpá akwụkwọ ụfọdụ bara n’ịgwọ nsogbu ndị dị ka ịdatụ mbà n’obi, nsogbu ichezọ ihe n’ihi afọ ndụ, na mgbaàmà ibu ibu na-adịghị oké njọ nke akụkụ ahụ bụ́ prostate. Otu mkpá akwụkwọ e nyochaworo bụ black cohosh, nke a na-akpọ black snakeroot, bugbane, ma ọ bụ rattleroot mgbe ụfọdụ. Ndị American Indian na-esi mkpọrọgwụ ya esi ma jiri ya mee ihe banyere nsogbu ịhụ nsọ na ịmụ nwa. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Harvard Women’s Health Watch nke April 2000 si kwuo, nnyocha ndị e mere na nso nso a na-egosi na mmiri a pịpụtara nke ọma na black cohosh nke a na-ere na Germany pụrụ ịdị irè “n’ibelata mgbaàmà nke nkwụsị ịhụ nsọ.”

O yiri ka ihe dị ukwuu n’ọchịchọ a na-achọ ọgwụ ndị dị otú ahụ sitere n’okike hà na-adabere n’echiche bụ́ na ha adịrughị ize ndụ ka ọgwụ ndị aka mere. Ọ bụ ezie na ọtụtụ mgbe nke a pụrụ ịbụ eziokwu, ụfọdụ mkpá akwụkwọ na-enwe mmetụta ndị ọzọ, karịsịa ma ọ bụrụ na a ṅụkọta ha na ọgwụ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu mkpá akwụkwọ a ma ama, nke a na-akpọsa dị ka ihe sitere n’okike nke e ji agwọ imi mkpọchi na nke na-eme ka mmadụ felata pụrụ ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị na nke obi ji akụ rịa elu.

E nwekwara mkpá akwụkwọ ndị ga-eme ka ọbara na-agba onye ọrịa karị. Ọ bụrụ na a ṅụkọta mkpá akwụkwọ ndị a na ọgwụ ndị “na-eme ka ọbara ghara ịrọ arọ,” nsogbu ndị siri ike pụrụ isi na ya pụta. Ndị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala, dị ka ọrịa shuga ma ọ bụ ọbara mgbali elu, ma ọ bụ ndị na-aṅụ ọgwụ ndị ọzọ kwesịrị ịkpachara anya n’ịṅụ ọgwụ mkpá akwụkwọ.—Lee igbe so isiokwu a.

Ihe ọzọ na-akpata nchegbu n’ọgwụ mkpá akwụkwọ bụ enweghị otu ụkpụrụ, a tụkwasịrị obi, na-achịkwa mmepụta ha. N’afọ ndị na-adịbeghị anya e nwewo akụkọ banyere ọgwụ ndị nwere ọla ndị dị arọ na ihe mmetọ ndị ọzọ n’ime ha. Ọzọkwa, a hụwo ụfọdụ ọgwụ mkpá akwụkwọ ndị nwere ntakịrị ma ọ bụ ghara inwe ihe ndị e depụtara n’akwụkwọ a mapawara n’ahụ ha na-ekwu ihe ndị e jiri mee ha. Ihe atụ ndị a na-emesi ike mkpa ọ dị ịzụrụ ọgwụ mkpá akwụkwọ, nakwa ọgwụ ndị ọzọ, site n’aka ndị a ma ama, ndị a pụkwara ịtụkwasị obi.

Ihe Ndị Na-enyere Ihe Oriri Aka

A kọwo na ihe ndị na-enyere ihe oriri aka, dị ka vitamin na mineral, enyewo aka n’igbochi na ịgwọ ọtụtụ nsogbu ahụ ike, gụnyere ụkọ ọbara na ọrịa ọkpụkpụna ọbụna n’ịgbochi ụfọdụ nkwarụ ndị sitere n’ọmụmụ. A na-ele ọ̀tụ̀tụ̀ vitamin na mineral gọọmenti tụrụ aro ka a na-aṅụ kwa ụbọchị anya dị ka nke bara uru nakwa nke na-adịghị ize ndụ ruo n’ókè ụfọdụ.

N’aka nke ọzọ, ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu nke vitamin a na-ekwu ka a ṅụọ iji gwọọ ọrịa ụfọdụ pụrụ ịbụ ihe ize ndụ nye ahụ ike. Ha pụrụ imetụta mmịrị nke ahụ na-amịrị ihe ndị ọzọ na-edozi ya ma ọ bụ ịrụ ọrụ ha, ha pụkwara inwe mmetụta ndị ọzọ dị oké njọ. E kwesịghị ileghara ihe a pụrụ imenụ, nakwa enweghị ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ na-akwado iji ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu nke vitamin eme ihe, anya.

Iji Ihe Na-akpata Ọrịa Agwọ Ọrịa

A malitere usoro nke iji ihe na-akpata ọrịa agwọ ọrịa n’afọ ndị 1700 dị ka ụdị ọgwụgwọ dị nro karịa ndị a na-ejikarị eme ihe n’oge ahụ. Iji ihe na-akpata ọrịa agwọ ọrịa dabeere n’ụkpụrụ bụ́ na “ihe yiri ihe na-agwọ ihe o yiri” nakwa n’echiche nke iji ọ̀tụ̀tụ̀ kasị dị ala nke ọgwụ eme ihe. A na-enweta ọgwụ e ji eme ihe n’usoro iji ihe na-akpata ọrịa agwọ ọrịa site n’ịgwagbu ya ọtụtụ ugboro—mgbe ụfọdụ, ịgwagbu ya nnọọ nke na ọbụna otu n’ime ihe ndị e ji mee ya agaghị afọdụzi.

Ka o sina dị, mgbe e ji ya tụnyere ojiji a na-eji ihe ndị a na-enye n’ọnọdụ ọgwụ eme ihe, a chọpụtara na ọgwụ ndị a na-eji eme ihe n’usoro iji ihe na-akpata ọrịa agwọ ọrịa na-adịtụ irè n’ịgwọ ihe ndị dị ka ụkwara ume ọkụ, ahụ ịsọ ihe, na otoro. A na-ewere ọgwụ ndị a na-eji eme ihe n’usoro iji ihe na-akpata ọrịa agwọ ọrịa dị ka ndị na-adịghị ize ndụ, ebe ọ bụ na a gwagburu ha nnọọ agwagbu. Otu isiokwu e bipụtara ná mbipụta JAMA nke March 4, 1998, kwuru, sị: “Nye ọtụtụ ndị ọrịa nwere nsogbu na-adịghị ala ala a na-achọpụtaghị ihe ha bụ, usoro iji ihe na-akpata ọrịa agwọ ọrịa pụrụ ịbụ ọgwụgwọ dị mkpa, nke bakwara uru a pụrụ ịhọrọ. Ọ bụrụ na e jiri ya mee ihe n’ụzọ a kpaara ókè, usoro iji ihe na-akpata ọrịa agwọ ọrịa pụrụ ịkwado ọgwụgwọ nke oge a dị ka, ‘ụzọ ọzọ a pụrụ isi mee ihe.’” Otú ọ dị, n’ọnọdụ mberede ndị pụrụ itinye ndụ n’ihe ize ndụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya karị ịnara ọgwụgwọ a na-ejikarị eme ihe.

Usoro Ọgwụgwọ nke Ịgbatị Ọkpụkpụ Azụ

E nwere ọtụtụ usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ metụtara ịgbatị ahụ. Usoro ọgwụgwọ nke ịgbatị ọkpụkpụ azụ so n’ụdị ọgwụgwọ ndị ọzọ a kasị eji eme ihe, karịsịa na United States. Ọ dabeere n’echiche bụ́ na a pụrụ ịgwọ ọrịa ọsọ ọsọ mgbe a gbaziri ọkpụkpụ azụ na-akwụghị ọtọ. Ọ bụ nke a mere ndị na-eji usoro ịgbatị ọkpụkpụ azụ agwọ ọrịa ji bụrụ ndị ọkachamara n’ịgbazi ya iji mee ka ọkpụkpụ nke ndị ha na-agwọ nọzie.

Ụdị ọgwụgwọ a na-ejikarị eme ihe adịghị agwọtakarị azụ mgbu. N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ndị e nyere ọgwụgwọ nke ịgbatị ọkpụkpụ azụ ha kọrọ na ha nwere afọ ojuju dị ukwuu. E nwekebeghị ihe àmà na-egosi na a na-eji usoro ọgwụgwọ nke ịgbatị ọkpụkpụ azụ agwọ nsogbu ndị ọzọ ma e wezụga ahụ mgbu.

N’ụzọ dị ịrịba ama, a dịghị enwekebe mmetụta ndị ọzọ na-esi n’ịgbatị ọkpụkpụ azụ nke ndị ọkachamara nwere nkà mere apụta. Ma, n’otu oge ahụ, mmadụ kwesịrị ịmata na e nwere ezigbo ihe ize ndụ ndị a na-ejikọta ha na ịgbatị olu, gụnyere ọrịa strok na ahụ mkpọnwụ. Iji belata ihe ize ndụ nke inwe nsogbu, ụfọdụ ndị ọkachamara na-atụ aro ka mmadụ mee nnyocha nke ọma iji hụ ma otu ụdị ịgbatị ahụ ọ̀ dịịrị ya mma.

Ịhịa Aka

Ọ dịwo anya a matara abamuru nke ịhịa aka n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọdịbendị nile. A kọrọ n’ime Bible ọbụna banyere iji ya eme ihe. (Esta 2:12) “Usoro ịhịa aka dị iche iche na-ekere ókè dị ukwuu ná nlekọta ahụ ike ọdịnala nke ndị China na ndị India,” ka magazin bụ́ British Medical Journal (BMJ) nke November 6, 1999, kwuru. “Ọ bụ Per Henrik Ling, bụ́ onye malitere ihe a maara ugbu a dị ka ịhịa aka ndị Sweden, mere ka ịhịa aka nke ndị Europe nwee usoro ná mmalite narị afọ nke 19.”

A na-ekwu na ịhịa aka na-eme ka uru ahụ dị nro, na-eme ka ọbara na-erugharị n’ụzọ ka mma, na-ewepụkwa nsí ndị gbakọjuworo n’anụ ahụ. Ugbu a ndị dọkịta na-edepụtara mmadụ ịhịa aka maka ọrịa ndị dị ka azụ mgbu, isi ọwụwa, na nsogbu mgbari nri. Ihe ka ọtụtụ ná ndị a na-ahịa aka na-ekwu banyere otú o si eme ka ahụ dị ha mma. Dị ka Dr. Sandra McLanahan si kwuo, “ọ bụ ahụ erughị ala na-akpata pasent iri asatọ nke ọrịa dị iche iche, ịhịa aka na-ebelatakwa ahụ erughị ala.”

“Ihe ka ọtụtụ n’usoro ịhịa aka dị iche iche nwere ihe ize ndụ dị ala nke inwe mmetụta ndị na-adịghị mma,” ka BMJ na-akọ. “A na-ejikarị ezi uche amata ọnọdụ ndị ga-eme ka ịhịa aka ghara ịbụ ihe kwesịrị ekwesị (dị ka ihe atụ, izere ichihịa ebe ọkụ dara mmadụ ma ọ bụ ịhịa aka n’ụkwụ nke akwara dị n’ime ime ya nwere ọbara kpụkọrọ akpụkọ) . . . Ọ dịghị ihe àmà na-egosi na ịhịa onye nwere ọrịa cancer aka na-eme ka mkpụrụ ndụ bu ọrịa gbasakwuo.”

“Ka ịhịa aka na-aghọwanye ihe ọtụtụ ndị ji eme ihe, ndị chọrọ ya enwewela nchegbu banyere iru eru nke onye na-eji ịhịa aka agwọ ọrịa, ha kwesịkwara inwe nchegbu,” ka E. Houston LeBrun, bụbu onyeisi Òtù Na-eji Ịhịa Aka Agwọ Ọrịa nke America, kwuru. Magazin bụ́ BMJ dụrụ ọdụ na iji zere omume na-ekwesịghị ekwesị n’ọrụ, “ndị ọrịa kwesịrị ijide n’aka na e debara aha ndị na-eji ya agwọ ọrịa n’akwụkwọ nke òtù kwesịrị ekwesị na-achịkwa ọrụ ahụ.” Otu akụkọ a natara n’afọ gara aga kwuru na e nyere ndị na-eji usoro ahụ agwọ ọrịa akwụkwọ ikike na steeti 28 na United States.

Iji Ịdụnye Agịga n’Ahụ Agwọ Ọrịa

Iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa bụ usoro ịgwọ ọrịa nke na-ewuzi nnọọ ewu n’ụwa nile. Ọ bụ ezie na okwu bụ́ “iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa” na-agụnye ọtụtụ usoro dị iche iche, ọ gụnyere karịsịa ịdụnye ụmụ obere agịga n’akụkụ ahụ ụfọdụ kpọmkwem iji gwọọ ọrịa. Nnyocha e mere n’ime ọtụtụ iri afọ gara aga na-egosi na iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa pụrụ ịrụ ọrụ n’ọnọdụ ụfọdụ site n’ime ka ahụ wepụta mmiri ọgwụ ndị na-emetụta ụbụrụ na akwara, dị ka endorphin, bụ́ nke pụrụ inye aka belata ihe mgbu na ahụ ọzịza.

Nnyocha ụfọdụ na-egosi na iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa pụrụ ịdị irè n’ịgwọ nnọọ ọtụtụ ọrịa nakwa na ọ bụ ụdị ọgwụgwọ ọzọ na-adịghị ize ndụ ka iji ọgwụ ndị na-akụnwụ ahụ eme ihe. Òtù Ahụ Ike Ụwa kwadoro iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ nsogbu 104. Otu kọmitii nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ahụ Ike na United States họpụtara, hotara ihe àmà na-egosi na iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa bụ usoro ọgwụgwọ a nabatara n’iji gwọọ ihe mgbu na-esochi ịwa ahụ, ihe mgbu nke uru ahụ, ihe mgbu nke ịhụ nsọ, na agbọ onunu nakwa ịgbọ agbọ ndị iji ọgwụ agwọ ọrịa ma ọ bụ afọ ime na-akpata.

Ọ bụ ezie na iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa enwekebeghị mmetụta ndị ọzọ na-adịghị mma na-esi na ya apụta, mmadụ ụfọdụ pụrụ inwe ihe mgbu, ahụ nsinwụ, ma ọ bụ ahụ iri izizi. Isi agịga n’ọkụ nke ọma ma ọ bụ iji agịga ndị a pụrụ ịtụfu atụfu eme ihe pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke ibute ọrịa. Ọtụtụ ndị na-eji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa enweghị nkà ọgwụ dị mkpa iji mee nchọpụta kwesịrị ekwesị banyere ọrịa ma ọ bụ iji tụọ aro maka usoro ọgwụgwọ ndị kwesịrị ekwesị karị. Ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya ileghara enweghị nkà a nke ịchọpụta ọrịa anya, karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-ahọrọ usoro iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa iji belata mgbaàmà nke nsogbu ndị na-adịghị ala ala.

E Nwere Ọtụtụ Ihe A Pụrụ Isi na Ha Họrọ

Ihe ndị ahụ e kwuru bụ nanị ihe atụ nke ọtụtụ usoro ọgwụgwọ ndị a na-ezo aka na ha n’ebe ụfọdụ ugbu a dị ka ụdị ọzọ. N’ọdịnihu a pụkwara iwere ụfọdụ n’ime ndị a, nakwa ndị ọzọ a na-atụleghị n’ebe a, dị ka ihe ndị a na-ejikarị eme ihe, ọbụna dị ka ha bụrụwooro n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa. Otú ọ dị, a pụrụ ịkwụsị iji ndị ọzọ eme ihe ma ọ bụ ọbụna ha abụrụ ndị a na-elezi anya ọjọọ.

Ọ dị mwute na ihe mgbu na ọrịa bụ nnọọ otu akụkụ nke ahụmahụ ụmụ mmadụ, ọbụna dị ka Bible kwuru nnọọ n’ụzọ ziri ezi, sị: “Anyị matara na ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Ọ bụ ihe a ga-atụ anya ya na ndị mmadụ ga-achọ ngwọta. Ma olee ebe anyị pụrụ iche ihu? Biko tụlee nchọpụta ụfọdụ ndị pụrụ inyere gị aka n’ọgwụgwọ ị na-ahọrọ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

Ịgwakọta Mkpá Akwụkwọ na Ọgwụ—Olee Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya?

Ọtụtụ mgbe a dọwo ọha na eze aka ná ntị banyere ịṅụkọta ụfọdụ ọgwụ ndị dọkịta na-edepụtara mmadụ na ndị ọzọ ma ọ bụ ịṅụkọta ha na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. È nwekwara ihe ize ndụ dị n’ịṅụkọta otu ụdị ọgwụ mkpá akwụkwọ na ọgwụ ndị dọkịta na-edepụtara mmadụ? Ruo ókè hà aṅaa ka a na-eme ya?

Otu isiokwu dị na magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association kwuru okwu banyere “ịṅụkọta ọgwụ ndị dọkịta na-edepụtara mmadụ na ọgwụ mkpá akwụkwọ.” O kwuru, sị: “N’ime 44% nke ndị toworo eto bụ́ ndị kwuru na ha na-aṅụ ọgwụ dọkịta depụtaara ha mgbe nile, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 onye (18.4%) n’ime mmadụ 5 kọrọ na ha ṅụkọtara ha na 1 ọgwụ mkpá akwụkwọ ma ọ dịkarịa ala, ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu nke vitamin, ma ọ bụ ha abụọ.” Ọ dị mkpa ịmata ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị n’omume dị otú ahụ.

Ndị na-aṅụ ụfọdụ ọgwụ mkpá akwụkwọ kwesịkwara ichebara ya echiche mgbe ha na-anata usoro ọgwụgwọ nkụnwụ ahụ. Dr. John Neeld, bụ́ onyeisi Òtù Ndị Dibịa Nkụnwụ Ahụ nke America, kọwara, sị: “E nwere akụkọ nke ahụmahụ ụfọdụ ndị nwere na ụfọdụ mkpá akwụkwọ na-ewu ewu, gụnyere ahịhịa bụ́ ginseng na St. John’s wort, pụrụ ịkpata oké mgbanwe n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị. Nke ahụ pụrụ ịdị nnọọ ize ndụ n’oge a kụnwụrụ mmadụ ahụ.”

Dọkịta a gbakwụnyere, sị: “Ndị ọzọ, dị ka osisi ginkgo biloba, ginger na feverfew, pụrụ ime ka ọbara ghara ịkpụkọta, nke bụ́ ihe ize ndụ karịsịa mgbe a kụnwụrụ ọkpụkpụ azụ—ọ bụrụ na e nwee ọbara ọgbụgba n’ebe dị nso n’ọkpụkpụ azụ, ọ pụrụ ịkpata ahụ mkpọnwụ. Ahịhịa bụ́ St. John’s wort pụkwara ịmụba mmetụta nke ọgwụ ụfọdụ na-akụjụ ahụ ma ọ bụ ndị na-akụnwụ ahụ.”

N’ụzọ doro anya, ọ dị mkpa ịmata ihe ize ndụ pụrụ ịdị n’ịgwakọta mkpá akwụkwọ na ọgwụ dị iche iche. Ụmụ nwanyị dị ime na ndị nke na-enye nwa ara karịsịa kwesịrị ịmata mmerụ ahụ nke ịgwakọta mkpá akwụkwọ ụfọdụ na ọgwụ dị iche iche pụrụ ịkpatara ụmụ ha. N’ihi ya, a na-agba ndị ọrịa ume isoro onye na-agwọ ha kwurịta banyere ọgwụ ndị ha na-aṅụ, ma hà bụ ụdị ọzọ ma ha abụghị.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Mkpá akwụkwọ bụ́ “black cohosh”

Mkpá akwụkwọ ụfọdụ abawo uru n’ịgwọ nsogbu ahụ ike

Mkpá akwụkwọ bụ́ “Saint-John’s-wort”

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Bill Johnson/Visuals Unlimited

[Foto dị na peeji nke 23]

Iji rụpụta ihe kasị mma, ọ dị mkpa ka ndị ọrịa na ndị ọkachamara n’ihe banyere nlekọta ahụ ike na-emekọ ihe ọnụ