Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

M̀ Kwesịrị Ịgwa Mmadụ na M Dara Mbà n’Obi?

M̀ Kwesịrị Ịgwa Mmadụ na M Dara Mbà n’Obi?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

M̀ Kwesịrị Ịgwa Mmadụ na M Dara Mbà n’Obi?

“Ọ bụrụ na mụ adaa mbà n’obi, na mbụ adịghị m achọ ikwu banyere ya n’ihi na ndị mmadụ nwere ike chee na m bụ akpa nsogbu. Ma mgbe ahụ ọ na-edo m anya na ọ dị mkpa ka mụ na mmadụ kwurịta okwu ka m wee nweta enyemaka.”—Alejandro, dị afọ 13.

“Ọ bụrụ na mụ adaa mbà n’obi, adịghị m agakwuru ndị enyi m n’ihi na echeghị m na ha pụrụ inyere m aka. Ha ga-eji m mere nanị ihe ọchị.”—Arturo, dị afọ 13.

IHE fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-enwe nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ. * Otú ọ dị, n’ihi na ị bụ nwata nakwa onye na-enwechaghị ahụmahụ, nrụgide nke ndụ nwere ike irikpu gị n’ụzọ dị mfe. Ihe ndị mụrụ gị, ndị enyi, na ndị nkụzi gị chọrọ gị n’aka; mgbanwe anụ ahụ na nke mmetụta uche nke oge ịgba ajị; ma ọ bụ gị iche na ị baghị n’ihe n’ihi ụmụ emezighị emezi ụfọdụ—ihe ndị a nile pụrụ ime ka ị daa mbà n’obi ma nọrọ ná mwute.

Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ọ dị mma inwe onye ị ga-akọrọ ya. “Ọ bụrụ na enweghị m ike ịgwa mmadụ banyere nsogbu m, ọ na-adị m ka obi ọ̀ ga-agbawa m,” ka Beatriz dị afọ 17 na-ekwu. Otú ọ dị, ọ dị mwute ikwu na ọtụtụ ndị ntorobịa adịghị akọ nsogbu ha—ugboro ugboro kwa, ha na-achọpụta na obi nkoropụ na-erikpu ha karị. María de Jesús Mardomingo, bụ́ prọfesọ na Ngalaba Nkà Ọgwụ na Ahụ Ike na Madrid, na-ekwu na ndị na-eto eto bụ́ ndị na-agaru n’ókè nke ịnwa igbu onwe ha na-abụkarị ndị owu na-amasi ike. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-anwụghị ka ha nwasịrị igbu onwe ha sịrị na ha enweghị ike ịchọta onye ọ bụla meworo okenye ha pụrụ iso kparịta ụka, bụkwa onye ha pụrụ ịkọrọ ihe nzuzo ha.

Olee banyere gị? Ì nwere onye ị ga-agwa okwu mgbe ị dara mbà n’obi? Ọ bụrụ na i nweghị, ònye ka ị pụrụ ịgakwuru?

Kọọrọ Ndị Mụrụ Gị

Alejandro, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, na-akọwa ihe ya na-eme ma ya daa mbà n’obi: “M na-agakwuru nne m n’ihi na kemgbe a mụrụ m, ọ nọwo na-enye m nkwado, ọ na-emekwa ka m nwee obi ike. M na-agakwurukwa nna m n’ihi na o nwewo ahụmahụ ndị yiri nke m. Ọ bụrụ na ihe ewute m ma ọ dịghị onye m kọọrọ, mgbe ahụ ka ọ na-ewute m karị.” Rodolfo, onye dị afọ 11, na-echeta, sị: “Mgbe ụfọdụ, onye nkụzi anyị na-akparị m ma ọ bụ na-abara m mba, n’ihi ya iwe na-ewe m nke ukwuu. M na-aga n’ụlọ mposi ga bee ákwá. N’ikpeazụ, m kọọrọ mama m, o nyekwaara m aka ịgwọta nsogbu m. A sị na mụ esoghị ya kwurịta okwu, ọ gaara ewute m karị.”

Ì chewo echiche ka gị na ndị mụrụ gnwee mkparịta ụka sitere n’obi? Ikekwe ị na-eche na, ma eleghị anya, ha agaghị enwe ike ịghọta nsogbu gị. Ma ọ̀ bụ otú ọ dị n’ezie? Ha nwere ike ghara ịghọtacha nrụgide nile ndị na-eto eto na-eche ihu n’ụwa nke taa; ma, ọ́ bụghị eziokwu na ikekwe ha maara gị karịa ka onye ọ bụla ọzọ n’ụwa maara gị? Alejandro na-asị: “Mgbe ụfọdụ ọ naghị adịrị ndị mụrụ m mfe imetere m ebere ma ghọta kpọmkwem mmetụta m na-enwe.” Ka o sina dị, ọ na-ekweta, sị: “Amaara m na m pụrụ ịgakwuru ha.” Ọtụtụ ugboro, ọ na-eju ndị na-eto eto anya ịchọpụta otú ndị mụrụ ha si aghta nsogbu ha nke ọma! N’ihi na ha tọrọ ha ma nwee ahụmahụ ka ukwuu, ọtụtụ ugboro ha pụrụ inye ndụmọdụ bara uru—nke a bụ eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na ha nwere ahụmahụ n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.

“Ọ bụrụ na mụ agwa ndị mụrụ m okwu, m na-enweta agbamume na ihe ngwọta ndị na-enye aka maka nsogbu m,” ka Beatriz, bụ́ onye e hotaburu ihe o kwuru, na-ekwu. Ya mere, e nwere ezi ihe mere Bible ji na-enye ndị ntorobịa ndụmọdụ a: “Nwa m, chebe ihe nna gị nyere n’iwu, ahapụkwala iwu nne gị. Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.”—Ilu 6:20; 23:22.

Otú ọ dị, o siri ike ịkọrọ ndị mụrụ gị ihe nzuzo gị ma ọ bụrụ na gị na ha adịghị ná mma. Dị ka Dr. Catalina González Forteza si kwuo, nnyocha e mere n’etiti ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu gosiri na ndị kwuru na ha anwawo igbu onwe ha chere na ha abachaghị uru, ha na ndị mụrụ ha adịghịkwa ná mma. N’ụzọ dị iche, ndị ntorobịa bụ́ ndị na-ezere ụdị iche echiche na-ebibi onwe onye dị otú ahụ na-abụkarị “ndị ha na nne na nna ha dị ná mma.”

Ya mere, jiri amamihe rụọ ọrụ iji mee ka gị na ndị mụrụ gị dị ná mma. Mee ka ọ bụrụ àgwà gị iso ha na-akparịta ụka mgbe nile. Na-agwa ha ihe na-aga ná ndụ gị. Na-ajụ ha ajụjụ. Mkparịta ụka ndị dị otú ahụ a tụsaara ahụ na-enwe pụrụ ime ka ọ ka mfe ịgakwuru ha mgbe i nwere nsogbu siri ike.

Ịkọrọ Enyi Gị

Ma ọ́ gaghị aka mfe ịga kọsara onye ọgbọ gị nsogbu gị? Ọ dị mma inwe ndị enyi ị pụrụ ịtụkwasị obi. Ilu 18:24 na-ekwu na “[e nwere enyi, NW] na-arapara n’ahụ karịa nwanne.” Ma n’agbanyeghị na ndị ọgbọ gị pụrụ imetere gị ọmịiko ma kwadoo gị, ha nwere ike ghara inye gị ndụmọdụ kasị mma mgbe nile. E kwuwerị, dị ka ọ na-adịkarị ha enweghị ahụmahụ ná ndụ karịa gị. Ì chetara Rehoboam? Ọ bụ eze n’oge Bible. Kama ịnara ndụmọdụ nke ndị ikom tozuru okè, bụ́ ndị nwere ahụmahụ, ọ ṅara ndị ọgbọ ya ntị. Gịnị si na ya pụta? Ọdachi! Rehoboam tụfuru ma nkwado nke ndị ka ọtụtụ ná mba ya ma nnwapụta Chineke.—1 Ndị Eze 12:8-19.

Nsogbu ọzọ dị ná mmadụ ịkọrọ ndị ọgbọ ya ihe nzuzo ya nwere ike ịbụ okwu banyere idebe ihe nzuzo. Arturo, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, na-ekwu, sị: “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ụmụ okoro m maara na-agwa ndị enyi ha okwu mgbe ihe na-ewute ha. Ma ka oge na-aga, ndị enyi ha na-ekpughere ndị ọzọ ihe nile ma jiri ha mere ihe ọchị.” Gabriela dị afọ 13 enwewo ahụmahụ yiri nke ahụ. Ọ na-asị: “Otu ụbọchị achọpụtara m na enyi m nọ na-akọrọ enyi ya banyere ihe metụtara nanị m, n’ihi ya akọrọghị m ya ihe nzuzo m ọzọ. Ee, ana m akọrọ ndị ọgbọ m ihe, ma m na-agbalị ka m ghara ịkọrọ ha ihe ndị pụrụ imetụta m n’ụzọ dị njọ ma ọ bụrụ na ha akọọrọ ha ndị ọzọ.” Ya mere mgbe ị na-achọ enyemaka, ọ dị mkpa ịchọta onye ‘na-adịghị ekpughe izu nzuzo nke onye ọzọ.’ (Ilu 25:9) Onye dị otú ahụ yikarịrị ka ọ ga-abụ onye tọrọ gị.

Ya mere, ọ bụrụ na n’ihi ihe ụfọdụ, i nweghị ike inweta nkwado n’ụlọ, ọ dị mma ịchọta enyi ị ga-akọrọ ihe nzuzo gị, kama jide n’aka na onye ahụ nwere ahụmahụ ná ndụ, marakwa ụkpụrụ dị iche iche nke Bible. N’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị, obi abụọ adịghị ya na e nwere ndị kwekọrọ ná nkọwa ahụ. Liliana dị afọ 16 na-asị: “Akọworo m ụfọdụ n’ime ụmụnna m nwanyị bụ́ ndị Kraịst ihe nzuzo m, nke a abawokwa nnọọ uru. Ebe ọ bụ na ha tọrọ m, ndụmọdụ ha na-adị mma. Ha aghọwo ndị enyi m.”

Gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ ime mmụọ gị amalitewokwa ịdalata? Ikekwe ihe anọwo nnọọ na-ewute gị nke na ị malitewo ileghara ekpere ma ọ bụ ịgụ Bible anya. Na Jemes 5:14, 15, Bible na-enye ndụmọdụ a: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike? Ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya; ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị: ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ́ na-adịghị ike, Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilie.” Ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị nwere ndị okenye bụ́ ndị nwere ahụmahụ n’inyere ndị nwere nkụda mmụọ ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ aka. Alala azụ n’ịgwa ha okwu. Bible na-ekwu na ndị ikom dị otú ahụ pụrụ ịdị “ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.”—Aịsaịa 32:2.

“Meenụ ka Chineke Mara Ihe Nile Unu Na-arịọ”

Otú ọ dị, isi iyi enyemaka kasị mma bụ “Chineke nke nkasi obi nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3) Mgbe ihe na-ewute gị, ị daakwa mbà n’obi, gbasoo ndụmọdụ dị ná Ndị Filipaị 4:6, 7: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” Jehova dị njikere mgbe nile ige gị ntị. (Abụ Ọma 46:1; 77:1) Mgbe ụfọdụkwa ekpere bụ nanị ihe dị gị mkpa iji mee ka obi ruo gị ala.

Ọ bụrụ na ihe ewute gị ma ọ bụ na ị na-ada mbà n’obi site n’oge ruo n’oge, echefula mgbe ọ bụla na ọtụtụ ndị ntorobịa ọzọ enwewo otu mmetụta ndị ahụ. Ka oge na-aga, mmetụta ndị ahụ na-akwụsịkarị. Ma ka ọ dịgodị, atala ahụhụ nanị gị. Mee ka mmadụ mara na e nwere ihe na-ewute gị. Ilu 12:25 na-asị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huruo ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” Olee otú ị ga-esi enweta “okwu ọma” ahụ na-agba ume? Site n’ịkọrọ ya mmadụ—onye nwere ahụmahụ, ihe ọmụma, na amamihe Chineke iji nye gị nkasi obi na enyemaka dị gị mkpa.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụrụ na mwute ajụ ịla ala, ọ pụrụ ịbụ ihe àmà nke ajọ nsogbu uche ma ọ bụ nke ahụ ike. Ọ ga-adị mma inweta nlekọta ahụ ike ozugbo ahụ. Lee isiokwu bụ́ “Imeri n’Agha A Na-ebuso Obi Ịda Mbà,” ná mbipụta nke March 1, 1990, nke magazin anyị a na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Ụlọ Nche.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

“Ọ bụrụ na mụ agwa ndị mụrụ m okwu, m na-enweta agbamume na ihe ngwọta ndị na-enye aka”

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke, ọ bụghị ndị ọgbọ gị, na-anọkarị n’ọnọdụ kasị mma inye gị ndụmọdụ