Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nleta E Mere n’Ebe A Na-ere Ọgwụ Ndị China

Nleta E Mere n’Ebe A Na-ere Ọgwụ Ndị China

Nleta E Mere n’Ebe A Na-ere Ọgwụ Ndị China

KWOK KIT anọwọ n’ọrịa eri ọtụtụ ụbọchị, ya mere o kpebiri na ya kwesịrị ịhụ dọkịta. Dị ka onye China, ọ họọrọ ịhụ dọkịta na-eji ọgwụ ọdịnala China agwọ ọrịa. Otu enyi ezinụlọ ya maara nnọọ dọkịta dị otú ahụ, bụ́ onye nwere ma na-elekọta otu ụlọ ahịa a na-ere mkpá akwụkwọ bụ́ nke dị ya nso. Enyi ya ahụ gwara Kwok Kit na dọkịta ahụ pụrụ ịkwadebe tii ahịhịa ga-agwọ ihe na-arịa ya.

Ịhụ dọkịta na China, dị ka ọ dị n’ihe ka ọtụtụ n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, dị nnọọ iche n’ịhụ dọkịta n’ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ịhụ dọkịta na-agụnyekarị iyi oge, ịga n’ọfịs dọkịta ahụ, ịbụ onye e lere ahụ, nakwa onye e depụtaara ọgwụ. Mgbe ahụ onye ọrịa ahụ aghaghị ịga ebe a na-ere ọgwụ iji nweta ọgwụ ahụ e depụtaara ya. N’ihe banyere onye China bụ́ dọkịta, usoro ahụ dị nnọọ mfe karị. Ị ga-aga n’ụlọ ahịa a na-ere mkpá akwụkwọ, bụ́ ebe a na-enwe dibịa mkpọrọgwụ na-anọ ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile, onye bụkwa dọkịta n’usoro ọgwụgwọ ndị China. Ọ pụrụ ile gị ahụ, chọpụta ihe na-enye gị nsogbu, kwuo ọ̀tụ̀tụ̀ ọgwụ mkpá akwụkwọ a ga-enye gị ma gwa gị otú ị ga-esi na-aṅụ ha—ihe a nile n’otu ugboro ị nọrọ n’ebe ahụ nwa oge! *

È Kwesịrị Ịṅụ Mkpá Akwụkwọ Dị Ka Ọgwụ?

Ọ bụ ezie na ịṅụ mkpụrụ ọgwụ, ọgwụ rọba, na ịgba ọgwụ ọgbụgba maara ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ahụ, ụdị ọgwụ ndị dị otú ahụ pụtara ọhụrụ. Ruo ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ adaberewo n’ihe ndị si n’okike iji gwọọ ọrịa. Dị ka ihe atụ, ndị Hibru bụ́ ndị dibịa n’oge Bible ji ọgwụ ndị dị ka mmanụ, balm, na mmanya mee ihe. (Aịsaịa 1:6; Jeremaịa 46:11; Luk 10:34) O yiri ka e ji bandeeji ndị e ji fig ndị kpọrọ nkụ mee gwọọ etuto.—2 Ndị Eze 20:7.

N’eziokwu, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na mba ma ọ bụ mmadụ nile ejitụwo ụdị mkpá akwụkwọ na mmiri ọgwụ dị iche iche gwọọ ọrịa. E jibu ọbụna ọtụtụ ihe e ji eme ka nri dị ụtọ taa eme ihe maka ikike ịgwọ ọrịa ha. Nke a apụtaghị na e nwechara ihe ịga nke ọma n’ọgwụgwọ ndị dị otú ahụ. N’ụzọ dị iche, nkwenkwe ụgha na amaghị nke a na-akọ na-emetụtakarị nke a. Ka o sina dị, e jiwo ụzọ ndị dị otú ahụ e si agwọ ndị ọrịa mee ihe eri ọtụtụ narị afọ iri. Ọ bụ n’ahịhịa ka e si enweta ọbụna ụfọdụ n’ime ọgwụ ndị kasị bụrụ ndị a na-aṅụkarị taa.

Nchepụta na Ọgwụgwọ Ndị China

Iji ọgwụ mkpá akwụkwọ agwọ ọrịa bụ akụkụ dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke China. Akụkọ ọdịnala na-ekwu na ọ bụ Huang Di, bụ́ Eze Ukwu Odo Odo dere Nei Jing, bụ́ ụkpụrụ ọgwụgwọ ọrịa ahụ nkịtị, nke ndị dọkịta nọ na China ka na-agụ. * Ụkpụrụ a, bụ́ nke a na-arụ ụka banyere oge e dere ya, nwere ọtụtụ n’ime otu isiokwu ndị ahụ pụrụ ịdị n’akwụkwọ na-ekwu banyere ọgwụ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ọ na-ekwu ọ bụghị nanị banyere nchọpụta ọrịa, mgbaàmà, ihe ndị na-akpata ọrịa, ọgwụgwọ, na mgbochi nke ọrịa kamakwa banyere akụkụ ahụ mmadụ na ihe ndị ha na-arụ.

Dị ka ọ dị n’ihe ka ọtụtụ na nkà nke Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, nkwenkwe yin-yang nwere mmetụta na-ezighị ezi ná nchepụta na ọgwụgwọ ndị China. N’ọnọdụ a, yin na-anọchite anya oyi, yang na-anọchitekwa anya ihe dị ọkụ—ha na-anọchitekwa anya ọtụtụ ihe ndị dị iche n’ibe ha. * Ọzọkwa, n’ịchọpụta ọrịa na ịgwọ ya, a na-elebara ebe ndị a na-adụnye mmadụ agịga n’ahụ iji gwọọ ya ọrịa, anya. A na-ekwu ka a na-aṅụ ọgwụ mkpá akwụkwọ ma na-eri nri ndị e weere na ha jụrụ oyi ma ọ bụ dị ọkụ iji mee ka yin-yang hara nhata n’ahụ onye ọrịa.

Dị ka ihe atụ, a na-ewere onye nwere ahụ ọkụ dị ka onye dị ọkụ, ya mere a ga-agwa ya ka ọ ṅụọ ọgwụ mkpá akwụkwọ na-eme ka ahụ jụọ oyi. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na a dịghịzi akpọ yin-yang aha kpọmkwem, a ka ji otu ụkpụrụ ndị ahụ ekpebi ụzọ isi gwọọ onye ọrịa. Ma, olee otú dọkịta ji ọgwụ China agwọ ọrịa si achọpụta ọrịa? Oleekwa otú ụlọ ahịa na-ere mkpá akwụkwọ na-adị? Iji chọpụta, gịnị ma anyị soro Kwok Kit gaa n’ụlọ ahịa ahụ enyi ya tụọrọ ya aro ka ọ gaa?

Ụlọ Ahịa Mara Mma Na-ere Mkpá Akwụkwọ

Ọ bụ ihe ijuanya! Taa Kwok Kit aghaghị ichere ka o wee hụ dọkịta. Ọ dị ka e nwere ntiwapụ nke ahụ ọkụ, ya mere ndị ọrịa abụọ bu ya ụzọ bịa. Ka anyị legharịa anya n’ụlọ ahịa ahụ ka anyị na-echere.

Ka anyị na-abanye, ihe ndị mbụ dọọrọ anya anyị bụ ikpo ihe ndị e chekpọrọ echekpọ—ero, akpakoro, akịrịkọ, fig, akị, na ihe ndị ọzọ a na-eri eri—a gbasara n’arịa ndị ghere oghe dị n’ebe mbata. Ee, e nwere ihe ndị a na-eri eri dị ebe a. Ma ụfọdụ n’ime ha pụkwara iso n’ihe ndị e ji agwọ ọrịa.

N’ile anya gabiga ihe ndị ahụ, anyị hụrụ ihe ndị e ji akpọwa ihe bụ́ ndị e ji enyo rụọ n’akụkụ abụọ nke ụlọ ahịa ahụ na-ebughị ibu. Mkpá akwụkwọ ndị a a na-adịghị ahụkebe ma ọ bụ ndị pụrụ iche, ihe ndị e gwutere n’ala, na akụkụ ahụ ụmụ anụmanụ e chekpọrọ echekpọ, bú ndị na-ada oké ọnụ, dị n’ihe ndị a e ji akpọwa ha. N’ileru anya nke ọma, anyị hụrụ mpi mgbada, pearl, na ngwere ndị e chekpọrọ echekpọ, ya na azụ̀ sea horse, nakwa ihe ndị ọzọ mara mma. Ruo n’afọ ndị na-adịbeghị anya, a pụrụ ịhụ mpi anụ rhino, mgbuilu anụ bear, na akụkụ anụmanụ ndị ọzọ dị ka ndị a n’ihe ndị dị otú ahụ e ji akpọwa ihe, ma a machibidowo ihe ndị a iwu ugbu a.

N’akụkụ ọzọ nke ụlọ ahịa ahụ, anyị hụrụ ngwugwu mkpá akwụkwọ ndị a gwara ọgwa maka ọrịa ndị a na-arịakarị dị ka azụ̀zụ̀ na nsogbu afọ nakwa ọgwụ ndị gwara ọgwa e gbunyere na karama bụ́ ndị si China. Nanị gwa onye na-elekọta ụlọ ahịa ahụ ihe bụ nsogbu gị, ọ ga-atụkwa aro ka ị zụrụ ọgwụ a gbanyere na karama ma ọ bụ nye gị ngwugwu mkpá akwụkwọ ndị a gwara ọgwa ma gwa gị otú ị ga-esi kwadebe ya n’ụlọ gị.

N’otu akụkụ mgbidi dị n’azụ onye na-elekọta ụlọ ahịa ahụ, anyị hụrụ shelf ndị dị ogologo bụ́ ndị e ji ugegbe mee bụ́ ndị mkpọrọgwụ dị iche iche e chekpọrọ echekpọ, akwụkwọ osisi, na obere alaka osisi dị iche iche dị n’ime ha. Ndị ahịa maara mkpá akwụkwọ ndị a, mmadụ pụkwara ịzụ ha ma kwadebe ha n’onwe ya ma ọ bụ sie ha esie. N’akụkụ nke ọzọ nke ụlọ ahịa ahụ, e nwere kọbọd si n’ala ruo n’uko bụ́ nke nwere ọtụtụ drọwa meworo nnọọ ochie. A na-akpọ ya baizigui, ma ọ bụ “kọbọd nwere otu narị ụmụ,” n’ihi na a pụrụ inwe ihe dị ka otu narị drọwa ma ọ bụ karịa n’ụdị kọbọd a a na-etinye mkpá akwụkwọ. Drọwa ndị a na-eme ka ọ dị mfe iweta mkpá akwụkwọ ndị kasị bụrụ ndị a na-enyekarị ndị mmadụ, ndị a kasị eji eme ihe na-adị n’ebe ndị kasị dị mfe iwere ihe na ha. Na a mapawaghị ihe e dere ede na drọwa ndị a abụghị ihe ọhụrụ. Ndị na-elekọta ụlọ ahịa a bụ́ ndị nwere ahụmahụ maara kpọmkwem ebe mkpá akwụkwọ nke ọ bụla dị.

Rịba ama ụdị nkà onye na-elekọta ụlọ ahịa a ji na-atụ mkpá akwụkwọ ọ na-enye nwanyị a n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. O ji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-esighị ike bụ́ nke ziri ezi nke ndị Esia na-eme ihe—mkpịsị osisi e dere ọnụ ọgụgụ n’ahụ ya nke e ji eriri atọ kegide otu efere n’otu akụkụ ya nakwa ihe e ji atụ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’akụkụ ya ọzọ. Ọ maara na mkpá akwụkwọ ụfọdụ pụrụ igbu egbu ma ọ bụrụ na a ṅụfee ha ókè, ya mere ọ ghaghị ịkpachara anya n’ihe ndị ọ na-atụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ọ bụghị ihe nile ka a na-atụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ugbu a anyị na-ahụ ka ọ na-achịta mkpá akwụkwọ na-ejughị ya aka site na nke ọ bụla n’ime mkpá akwụkwọ ndị dị na drọwa dị iche iche ma na-achịsa ha n’ibe akwụkwọ e ji ekechi ihe. Ee, i kwutere ya, okpokoro ébé so n’ọgwụ ahụ ọ na-enye ya. Ka ọ na-ekechi ọgwụ ahụ, ọ gwara nwanyị ahụ otú ọ ga-esi kwadebe ya.

A na-akwadebe ọgwụ mkpá akwụkwọ ma na-aṅụ ha n’ụzọ dị iche iche. A na-egweri ụfọdụ egweri. Onye ọrịa ga-awụnye ha ná mmiri ọkụ wee ṅụzie ha. Ụfọdu na-arọ arọ. A na-etinye ha mmanụ aṅụ ma ọ bụ tinye ha na mmanya ọkụ. Otú ọ dị, a gwara nwanyị a ka ọ kwadebe ya otú ọtụtụ ndị mmadụ si akwadebe ya, ya bụ, isi ya n’ọkụ. Nke a pụtara na ọ ga-eji ite nkụwa sie mkpá akwụkwọ ndị ahụ n’ọkụ ruo ihe dị ka otu awa. Ọ ga-aṅụzi mmiri ya kwa awa ole na ole. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọọ inwetakwu ọgwụ ahụ, nanị ihe ọ ga-eme bụ ịgaghachi n’ụlọ ahịa ahụ maka ọzọ.

N’ikpeazụ o ruola oge Kwok Kit ga-ahụ dọkịta ahụ. Ee e, dọkịta ahụ eleghị ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ya ji erugharị hà ma ọ bụ gee ntị n’ọkụkụ nke obi ya. Ma ọ jụrụ Kwok Kit banyere mgbaàmà ndị ọ na-enwe. Olee otú o si arahụ ụra? Olee otú nri o riri si agbari, ọ̀ na-enwe ọchịchọ iri nri, otú ime afọ ya dị, ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ ya, nakwa otú ọnọdụ akpụkpọ ahụ ya na ụcha ya dị? Dọkịta ahụ enyobaa ya anya n’anya na otú akụkụ dị iche iche nke ire ya na-acha. Ugbu a ọ na-ele otú akwara Kwok Kit si eme umere site n’ijide ya aka n’ụdị dị iche iche n’ọtụtụ ebe n’aka ya abụọ, usoro a na-ewere na ọ na-egosi ọnọdụ nke akụkụ ahụ dị iche iche. Dọkịta ahụ na-arịbadị ama ọbụna ísì ọ bụla ọ nụrụ bụ́ nke ọ na-ekwesịghị ịnụ! Gịnị ka ọ chọpụtara? Ọ bụghị ihe ijuanya na ahụ ọkụ ji Kwok Kit. Ahụ ya chọrọ ka o dinara n’àkwà nakwa ṅụọ mmiri dị ukwuu, ya na ọgwụ e nyere ya ọ ga-esi n’ọkụ ṅụọ. Ihe a ga-esichapụta na ya bụ́ tii ahịhịa ga-elu ilu, ma ọ ga-eme ka ọ gbakee. Tinyere ịgwa Kwok Kit nri ndị o kwesịrị izere, dọkịta ahụ ji obiọma nye Kwok Kit ihe ọ ga-eji na-atacha ọnụ mgbe ọ ṅụsịrị ọgwụ ya.

Ya mere, Kwok Kit weere ngwugwu mkpá akwụkwọ ya lawa. Ịhụ dọkịta ahụ na ọgwụ o nyere ya were ya ihe na-erughị $20—ọ dị nnọọ ọnụ ala. Ọ bụ ezie na mkpá akwụkwọ ndị ahụ agaghị agwọ ya n’ụzọ ọrụ ebube, Kwok Kit ga-agbake n’ime ụbọchị ole na ole. Ma o kwesịghị ihie ụzọ dị ka ndị ọzọ meworo, na-eche na ịṅụ ọgwụ karịa ókè a gwara ya ṅụọ ga-aka mma. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ banyere ndị nwere oké nsogbu n’ihi ịṅụbiga ọgwụ mkpá akwụkwọ ókè.

Ná mba ụfọdụ, e nweghị ụkpụrụ na-achịkwa mkpá akwụkwọ ma ọ bụ ndị dibịa na-enye ọgwụ ọdịnala ndị China. Nke a emewo ka ndị na-amaghị nke a na-akọ n’ihe banyere mkpá akwụkwọ na-ere ya, nakwa ọbụna na-ere ọgwụ mkpá akwụkwọ adịgboroja ndị dị ize ndụ. Mgbe ahụ, a pụrụ ịghọta ihe mere na mgbe a bịara n’ihe banyere ịhọrọ dibịa ọgwụ ọdịnala ndị China, ọtụtụ ndị Esia na-arịa ọrịa na-adabere n’aro ndị ikwu ha na ezi ndị enyị ha tụọrọ ha.

N’ezie, ọ dịghị ọgwụgwọ—ọ masị ya bụrụ nke e ji mkpá akwụkwọ enye ma ọ bụ nke e ji ọgwụ Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa enye—pụrụ ịgwọ ọrịa nile. Ka o sina dị, ebe a na-ere ọgwụ ndị China na dibịa ọgwụ ọdịnala ya ka bụ akụkụ dị mkpa nke ndụ ndị Esia.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Teta! adịghị akwado otu ụdị ọgwụgwọ maka nsogbu ahụ ike ọ bụla. Ndị Kraịst kwesịrị ijide n’aka na ụdị ọgwụgwọ ọ bụla ha na-anara emegideghị ụkpụrụ Bible.

^ par. 8 E kwuru na Eze Ukwu Odo Odo, bụ́ onye ọchịchị a ma ama dịrị ndụ tupu usoro ndị eze Zhou, chịrị site na 2697 ruo 2595 T.O.A. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwenyere na e deghị Nei Jing n’akwụkwọ ruo mgbe usoro ndị eze Zhou gwụsịrị, bụ́ nke dịrị site n’ihe dị ka 1100 ruo 250 T.O.A.

^ par. 9 Okwu China bụ́ “yin” pụtara ma a sụgharịa okwu ya efu “ndo” ma ọ bụ “onyinyo,” ọ na-anọchitekwa anya ọchịchịrị, oyi, ịbụ nwanyị. “Yang,” nke dị iche na nke a, na-anọchite anya ihe ndị na-enye ìhè, dị ọkụ, ịbụ nwoke.

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

A pụrụ ịhụ ihe ndị mara mma, gụnyere azụ̀ “sea horse” e chekpọrọ echekpọ n’ụlọ ahịa ahụ a na-ere mkpá akwụkwọ

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

A na-eji nlezianya atụ mkpọrọgwụ, akwụkwọ osisi, na obere alaka osisi n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀