Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị a kpọtụrụ uche, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 23. Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)

1. Mgbe e meriri ụmụ Israel na Ai n’ihi imebi iwu Chineke nyere banyere Jeriko, ọ dịghịkwa onye kwupụtara ya, olee otú e si kpughee onye kpara àgwà ọjọọ ahụ? (Joshua 7:14-21)

2. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka nwa nwoke Juda bụ́ Ọnan nwụọ? (Jenesis 38:7-10)

3. Ònye chere na Hana bụ́ onye ezi omume, ṅụrụ mmanya ma baara ya mba? (1 Samuel 1:13, 14)

4. N’ihi gịnị ka Jisọs ji kwuo na ndị odeakwụkwọ “ga-enwe ezi ọmụma ikpe gabigara ókè karịa ndị ọzọ”? (Luk 20:46, 47)

5. Ònye dere akwụkwọ abụọ nke Ihe E Mere? (Nehemaịa 12:26)

6. Gịnị ka e ji mee ihe atụ nke ume ma ọ bụ ike na Bible? (Jeremaịa 32:17)

7. Olee okwu e ji mee ihe maka ibé ala nke otu ìgwè oké ehi pụrụ ịrụ n’otu ụbọchị na Bible? (1 Samuel 14:14)

8. Olee ebe Negeb dị? (Ọpụpụ 26:18, NW)

9. Olee nwa Noa nke ndị Ijipt, ndị Etiopia, na ndị Kenean bụ ụmụ ya? (Jenesis 10:6)

10. Ọ̀ bụ n’ọnwa dị aṅaa, kwekọrọ ná mpụta nke ọnwa, ka e wusịrị ụlọ nsọ Solomọn? (1 Ndị Eze 6:38)

11. Olee osisi keere òkè dị ukwuu ná mmeri Devid meriri ndị Filistia na ndagwurugwu Refaim? (2 Samuel 5:24)

12. Olee ụzọ ọzọ onye na-agba ịnyịnya nke anọ nke Mkpughe si gbuo ndị mmadụ? (Mkpughe 6:8, NW)

13. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ ndị Nefilim “ndị a maara aha ha”? (Jenesis 6:4)

14. Site n’iwu Jehova nyere, gịnị ka e mere ka ọgbọ ndị na-abịa n’ihu nwee ike ịhụ manna ụmụ Israel riri n’ọzara? (Ọpụpụ 16:32, 33)

15. Gịnị ka Timoti maara ‘site n’oge ọ dị na nwa ọhụrụ,’ nke mere ka o nwee ike bụrụ “onye amamihe ịnata nzọpụta”? (2 Timoti 3:15)

16. Olee ndị buturu ozu Sọl na ụmụ ya ná mgbidi Bet-shan, ebe ndị Filistia kpọgidere ha, ma lie ha n’ụzọ dị ùgwù? (1 Samuel 31:11-13)

17. Olee ebe Jisọs nọ kpọọ Pita, Andru, Jemes, na Jọn ka ha bụrụ ụmụazụ ya? (Matiu 4:18-22)

18. Olee eze Asiria nke Menahem, bụ́ eze Israel, na-atụrụ ụtụ ka o wee hapụ ụmụ Israel aka? (2 Ndị Eze 15:19)

[Igbe dị na peeji nke 23]

Aziza Nye Ajụjụ

1. Jehova kpere ha ikpe, buru ụzọ họpụta ebo, ezinụlọ, n’ikpeazụ họpụta nwoke ahụ bụ́ Ekan

2. N’ịbụ onye nupụụrụ nna ya isi na iji anyaukwu mee ihe, Ọnan mere ihe iji ghara ịmụtara nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ, bụ́ Ịa, onye nketa

3. Onyeisi nchụàjà bụ́ llaị

4. N’ihi na ha na-achọkarị ịnọ n’isi ọnọdụ, jiri anyaukwu “na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ,” na-emekwa ka hà dị nsọ site n’ikpe ogologo ekpere

5. Ezra

6. Ogwe aka

7. “Otu acre”

8. N’ebe ndịda

9. Ham

10. Bul

11. Osisi balsam

12. Site “n’ajọ ihe otiti”

13. Nke a na-ezo aka, ọ bụghị n’ịbụ ndị a ma ama n’ebe Chineke nọ, kama n’ihi egwu ha na-emenye ndị mmadụ dị ka ndị ọchọ okwu na ndị aka ike

14. E weere otu ite, tinye nju omer nke manna n’ime ya ma dọwa ya “n’ihu Jehova”

15. “Ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ”

16. Ndị ikom nwere obi ike si Jebesh-gilead

17. Oké Osimiri Galili

18. Pul (Tiglath-pileser nke Atọ)