Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Lee Okwukwe Ule na Poland

E Lee Okwukwe Ule na Poland

E Lee Okwukwe Ule na Poland

DỊ KA JAN FERENC SI KỌỌ

ABỤ m nnọọ nwata mgbe Agha Ụwa nke Abụọ na-akpọtụ. Echetara m nwanne papa m nke nwoke nke ọma, onye bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ na-abịa na nke anyị ma na-agụrụ anyị Bible. Ndị mụrụ m enweghị mmasị, ma mụ na nwanne m nwoke bụ́ Józef, nwanne m nwanyị bụ́ Janina, nwere nnọọ mmasị. N’oge na-adịghị anya, onye ọ bụla n’ime anyị gosipụtara nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site n’ime baptism. Mgbe e mere m baptism, adị m nanị afọ 14.

N’ịbụ ndị hụrụ mmetụta dị mma ọmụmụ Bible nwere ná ndụ anyị, ndị mụrụ anyị malitere gewa ntị. Mgbe papa m ghọtara na Bible katọrọ ikpere arụsị, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nke a bụ ihe Okwu Chineke kwuru, ndị ụkọchukwu emewo ka anyị nọrọ n’ìsì. Nwa m nwoke, chịrị ihe oyiyi nile dị n’ahụ ájá chịfuo!” Ka ihe dị ka afọ abụọ gasịrị, e mere ndị mụrụ m baptism. Ha jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ha.

Nsogbu Ndị Anyị Chere Ihu

Ndịàmà Jehova zutere oge ihe isi ike mgbe agha ahụ biri. Dị ka ihe atụ, Ngalaba Na-ahụ Maka Nchebe wakporo ọfịs dị na Lodz, e jidekwara ndị na-arụ ọrụ n’ebe ahụ. N’ịbụ ndị ndị ụkọchukwu Katọlik rụgidere, Ndị Agha Mba ji ike wakpoo Ndịàmà Jehova n’ebe ọwụwa anyanwụ Poland. *

Ihe dịkwa ka n’oge a, ndị ọchịchị Kọmunist kagburu ikike ha nyeburu anyị inwe mgbakọ, ha gbalịkwara imeghasị mgbakọ ndị a nọworị na-enwe. Ma, mmegide ahụ na-akawanye njọ mere nanị ka anyị kpebisikwuo ike ịnọgide na-ekwusa Alaeze Chineke. Na 1949, ihe karịrị nnọọ Ndịàmà 14,000 nyere akụkọ ozi na Poland.

N’oge na-adịghị anya, aghọrọ m ọsụ ụzọ, onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Ebe mbụ e kenyere m ọrụ dị ihe dị ka kilomita 500 site n’ụlọ anyị. Otú ọ dị, ka oge na-aga, a họpụtara m ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’otu ebe dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Lublin, bụ́ ebe na-adịghị anya site n’ebe ndị mụrụ m bi.

E Jide M Ma Kpagbuo M

Na June 1950, ndị ọchịchị Kọmunist jidere m ma bo m ebubo na m na-emere United States nledo. A tụbara m n’ime ụlọ na-ajụ oyi. Otu ọfịsa na-eme nchọpụta kpọpụtara m n’abalị ịgba m ajụjụ. “Òtù okpukpe ị nọ na ya bụ ịrọ òtù, ya na Ọchịchị anyị adịghịkwa ná mma,” ka ọ gwara m. “Ọfịs unu na-arụrụ ụlọ ọrụ nledo nke America ọrụ. Anyị pụrụ ịgosipụta nke a! Ụmụnna gị ekwetaworị na ha na-aga ebe dị iche iche ná mba a ma na-enweta ihe ọmụma banyere ụlọ ndị agha na ụlọ mmepụta ngwá agha.”

N’ezie, ebubo ndị a bụcha ụgha. Ka o sina dị, ọfịsa ahụ dụrụ m ọdụ ịbịanye aka n’otu ihe odide na-egosi na mụ ajụla ihe ọ kpọrọ “nzukọ unu na-eweta ihere.” Ọ gbalịrị ugboro ugboro ime ka m bịanye aka na ya. Ọ gbalịrị ọbụna ime ka m detuo aha na adres Ndịàmà nile m maara na ebe ndị e si ekesa akwụkwọ anyị. Mgbalị ndị o mere enweghị isi.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ọfịsa ahụ kụgidere m okpiri ruo mgbe m na-amakwaghị onwe m. Mgbe ahụ, ha gbara m mmiri ka m wee teta, mgbe nke ahụ gasịrị, ha maliteghachiri ịgba m ajụjụ. N’abalị na-eso ya, e ji obi ọjọọ kụọ m ihe n’ikiri ụkwụ. Eji m olu dara ụda rịọ Chineke ka o nye m ume iji tachie obi. Echere m na o nyere m ya. Ajụjụ ndị ahụ ha na-agba m n’abalị weere ọnọdụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ n’esepụghị aka.

A tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ n’April 1951, ma ọtụtụ Ndịàmà ka nọ n’ụlọ mkpọrọ. Agakwuuru m otu Onyeàmà nwere ibu ọrụ ma gwa ya ka o kenye m ọrụ ọhụrụ. “Ị́ dịghị atụ egwu na a ga-ejide gị ọzọ?” ka ọ jụrụ m. “Ekpebisiwo m ike ọbụna karị ịrụ ọrụ n’ebe mkpa ka ukwuu,” ka m zaghachiri. Amaliteghachiri m ọrụ m dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ka e mesịkwara, a gwara m ka m hazie obibi na nkesa akwụkwọ anyị na Poland.

Laa azụ n’oge ahụ, anyị na-eji ígwè mimeograph na stencil mgbe ochie ebipụtaghachi lNche. Ọdịdị akwụkwọ anyị na-ebi adịchaghị mma, anyị na-akwụkwa ego buru ibu maka akwụkwọ, bụ́ nke dị ụkọ n’oge ahụ. A na-ebipụtaghachi akwụkwọ ndị ahụ n’ebe ndị zoro ezo, dị ka ọbá, okpukpu nke ime ala, na n’uko ụlọ. Nye ndị a nwụdere, ntaramahụhụ ha bụ ịga mkpọrọ.

Echetara m otu olulu mmiri na-adịghị na ya anyị ji mee ihe. N’ahụ ya, e nwere otu oghere, bụ́ nke dị ihe dị ka mita iri n’okpuru ala, na-eduga n’otu obere ọnụ ụlọ anyị na-anọ na-ebipụtaghachi magazin. Iji ruo ebe ahụ, a ghaghị iji ụdọ budaa anyị. Otu ụbọchị, e ji bọket osisi buru ibu na-ebuda m mgbe ụdọ ahụ dọbiri na mberede. Adaruru m n’ala ya ma gbajie ụkwụ. Mgbe m nọsịrị n’ụlọ ọgwụ, alaghachiri m iji ígwè ahụ e ji ebipụtaghachi akwụkwọ na-arụ ọrụ.

N’ihe dị ka n’oge a, ezutere m Danuta, bụ́ onye ozi ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi. Na 1956, anyị lụrụ di na nwunye, n’afọ anọ sochikwara ya, anyị rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ozi n’ebe etiti Poland. Ka ọ na-erule 1960 anyị amụọla ụmụ abụọ, anyị kpebikwara na Danuta ga-akwụsị ozi oge nile iji lekọta ha. Nwa obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, e jidere m ọzọ, n’oge a e tinyekwara m n’ụlọ mkpọrọ òké jupụtara. Ka ọnwa asaa gasịrị, a mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ abụọ.

Ịga na Ịpụta na Mkpọrọ

E nwere ihe karịrị ndị mkpọrọ 300 n’ụlọ mkpọrọ dị na Bydgoszcz, ekpegakwaara m Jehova ekpere ka m wee nwee ike isoro ndị nwere obi eziokwu kerịta ozi Alaeze ahụ. Agwara m onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ okwu, na-atụ aro na apụrụ m ịrụ ọrụ dị ka onye na-akpụ isi. O juru m anya na o kwere. N’oge na-adịghị anya, amalitere m ịkpụ ndị mkpọrọ isi ma na-agbara ndị yiri ka hà nwere mmasị àmà.

N’oge na-adịghị anya onye mkpọrọ mụ na ya na-akpụ isi nabatara mkparịta ụka ndị anyị na-enwe. Ọ malitere ọbụna isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe ndị ọ na-amụta na Bible. N’oge na-adịghị anya, onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ nyere anyị iwu ka anyị ghara ịgbasa ihe ọ kpọrọ “mgbasa echiche na-ebibi ihe.” Onye mụ na ya na-akpụ isi kwụsiri ike. Ọ kọwara, sị: “Ana m ezubu ohi, ma ugbu a adịghị m ezukwa. Abụbu m onye nicotine riri ahụ, ma akwụsịwo m ise siga. Achọtawo m nzube ná ndụ m, achọkwara m ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.”

Mgbe a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ, e zigara m Poznan ilekọta “ebe a na-eme bred,” dị ka anyị na-akpọ ebe nzuzo ndị anyị na-anọ ebipụta akwụkwọ. Ka ọ na-erule ná ngwụsị afọ ndị 1950, akwụkwọ ndị anyị na-ebipụta bịara ka mma n’ụzọ dị ukwuu. Anyị mụtara ụzọ isi mee ka peeji akwụkwọ dị ntakịrị site n’ise ha foto—ihe dị ịrịba ama na nkà na ụzụ anyị—nakwa otú e si eji ígwè obibi akwụkwọ bụ́ Rotaprint arụ ọrụ. Na 1960, anyị malitekwara ibi na imepụta akwụkwọ ukwu.

Nwa obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, otu onye agbata obi anyị kpere anyị, e jidekwara m ọzọ. Mgbe a tọhapụsịrị m na 1962, e kenyere mụ na ọtụtụ ndị ọzọ ije ozi na Szczecin. Ma tupu anyị agawa, anyị nwetara ihe anyị chere na ọ bụ ntụziaka sitere n’aka ụmụnna ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe ịgazi Kielce. Otú ọ dị, e jidere anyị n’ebe ahụ, a makwara m ikpe ịga mkpọrọ otu afọ na ọkara ọzọ. Ọ bụ ndị aghụghọ anyị na ha nọ raara anyị nye. Ka oge na-aga, a chọpụtara ha ma chụpụ ha n’etiti anyị.

Mgbe e mesịrị tọhapụ m n’ụlọ mkpọrọ, a họpụtara m ilekọta ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ na Poland nile. Na 1974, mgbe a na-ejideghị m ruo afọ iri, a chọtara m ma jide m n’Opole. Nwa obere oge mgbe nke ahụ gasịrị, a tụrụ m mkpọrọ na Zabrze. “Ọrụ bishọp gị abịala ná njedebe,” ka onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ gwara m. “Ọ bụrụ na ị nọgide na-agbasa echiche gị na-eduhie eduhie, a ga-atụba gị n’ụlọ mkpọrọ ị ga-anọ nanị gị.”

Ime Nkwusa n’Ụlọ Mkpọrọ

Otú ọ dị, ọrụ m dị ka onye ozi abịaghị ná njedebe. N’eziokwu, amaliteere m mmadụ abụọ n’ime ndị mkpọrọ ibe m ọmụmụ Bible. N’ikpeazụ, ha nwere ọganihu ruru n’ókè na m mere ha baptism ná nnukwu ọ́kwá ịsa ahụ dị n’ụlọ mkpọrọ ahụ.

Ndị mkpọrọ ọzọ gekwara ntị ná nkwusa anyị, n’April 1977, anyị gbakọtakwara ọnụ ime Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. (Luk 22:19) Ka ọnwa abụọ gasịrị, na June 1977, a tọhapụrụ m, e jideghịkwa m ọzọ.

Ka ọ na-erule mgbe ahụ ndị ọchịchị ekwerekwuola ka anyị na-arụ ọrụ anyị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nleta ndị ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova nyere aka n’ụzọ dị ukwuu. Na 1977, atọ n’ime ha so ndị nlekọta, ndị ọsụ ụzọ, na ndị bụworo Ndịàmà ruo ogologo oge kwurịta okwu n’obodo dị iche iche. N’afọ sochiri ya, abụọ n’ime ha gara n’Ọfịs Na-ahụ Maka Ihe Ndị Metụtara Okpukpe. Otú ọ dị, ọ bụ nanị na 1989 ka e wepụrụ iwu ahụ a machibidoro ọrụ anyị. Ka ọ dị ugbu a, ihe dị ka Ndịàmà 124,000 na-eje ozi na Poland.

N’ihi ahụ esighị ike, Danuta enwebeghị ike isoro m n’afọ ndị a, ma ọ na-agba m ume ma chọọ ka m nọgide na-eleta ọgbakọ dị iche iche. M ga-enwe ekele ruo mgbe ebighị ebi maka enyemaka ya wusiri m ike n’ọtụtụ oge m gara mkpọrọ.

Mkpebi m mere n’afọ 50 gara aga ijere Jehova Chineke ozi bụ n’ezie nke ziri ezi. Enwetawo m ọṅụ dị ukwuu n’iji obi m dum jeere ya ozi. Mụ na nwunye m ahụwo ịbụ eziokwu nke okwu ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 40:29: “Ọ [Jehova] bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Lee 1994 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 213-222.

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Anyị ji ìgwè e ji ebipụtaghachi akwụkwọ mee ihe, ka e mesịkwara anyị ji ìgwè obibi akwụkwọ bụ́ Rotaprint na-ebi akwụkwọ

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Mụ na nwunye m, bụ́ Danuta