Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Nyere Aka Zọpụta Ndụ Ya

O Nyere Aka Zọpụta Ndụ Ya

O Nyere Aka Zọpụta Ndụ Ya

Mbipụta “Teta!” nke January 8, 2000 bu isiokwu bụ́ “Ịtọrọ Mmadụ—Ihe Iyi Egwu E Ji Achụ Ego.” William Louis Terrell kwuru na mbipụta a nke “Teta!” nyere aka zọpụta ndụ ya.

NWA obere oge mgbe ọ kụsịrị elekere iri n’ụtụtụ Friday, March 10, 2000, Joseph C. Palczynski, Jr. tụdere Terrel égbè ma tọrọ ya n’ụlọ ya. Isiokwu Teta! ahụ, bụ́ nke Terrell kwuru na ya nọgidere na-echeta n’oge ahụmahụ ọjọọ ahụ, bu ndụmọdụ ndị na-esonụ ndị ọkachamara nyere banyere ihe mmadụ ga-eme ma a tọrọ ya:

“Mee ihe a sị gị mee; zere isi ọnwụ. A na-emekpọkarị ndị e jichiri ejichi bụ́ ndị na-adịghị ekwe ekwe ọnụ, ha na-aka etinye onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e gburu ma ọ bụ ndị a ga-enye ahụhụ ma hapụ ndị ọzọ.

“Atụla ụjọ. Buru n’uche na a na-emesị tọhapụ ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a na-atọrọ.”

“Soro ha kparịtatụ ụka ma o kwe mee, gbalịakwa imepe ụzọ nkwurịta okwu. Ọ bụrụ na ndị tọọrọ gị ahụ gị dị ka mmadụ, o yikarịghị ka ha ga-emerụ gị ahụ ma ọ bụ gbuo gị.

“Jiri nkwanye ùgwù mee ka ha [ndị tọọrọ gị] mara ihe na-akpa gị.”

“Mmekọrịta echebewo ndị a tọọrọ, dị ka akwụkwọ bụ́ Criminal Behavior na-akọwa: ‘Ka ndị a tọọrọ na ndị tọọrọ ha na-amata onwe ha karị, otú ahụ ka o yiri ka hà ga-enwe mmasị n’ebe ibe ha nọ karị. Ihe ijuanya a na-egosi na mgbe oge ụfọdụ gasịrị onye ahụ jichiri mmadụ eyikebeghị ka ọ̀ ga-emerụ onye o jichiri ahụ.’”

William Terrell, onye dị afọ 53 ma bụrụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, mere ihe nile o nwere ike ime iji gbasoo ndụmọdụ dị otú a n’oge e jichiri ya ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ awa 14, bụ́ mgbe a tụdere ya égbè n’ihe ka ọtụtụ n’ime oge ahụ. Ahụmahụ ọjọọ ahụ malitere n’oge na-adịghị anya mgbe Palczynski kụsịrị aka n’ọnụ ụzọ Terrell n’otu ime obodo dị nso n’Interstate Highway 95, bụ́ ebe mmanụ ụgbọala Palczynski zutere n’ohi nọ gwụ.

Mgbe ọ nụsịrị ọnọdụ nke onye ahụ ọ na-amabughị, Terrell gosipụtara ọchịchọ inyere ya aka. Palczynski rịọrọ ka e kunye ya otu iko mmiri nakwa ka e buga ya Baltimore, Maryland, U.S.A. Terrell kwuru na ya ga-eme ndokwa maka onye ga-ebuga ya obodo bụ́ Fredericksburg, Virginia, bụ́ ebe ọ ga-enwe ike inweta bọs ga-eburu ya ebe ọ na-eje. Mgbe Terrell buteere onye ahụ ọ na-amabughị iko mmiri, ọ tụdere ya égbè. Palczynski nyere Terrell iwu ka o buga ya ebe ọ na-eje.

Ịgbaso Ndụmọdụ Ahụ

Mgbe ha gbaara na-aga n’ụzọ Interstate Highway 95 ahụ, Terrell gbasoro ntụziaka Palczynski nyere ya ka ọ ghara ịgafe ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ iwu kwadoro nakwa ka ọ gharakwa ịnya ụgbọala n’ụzọ ga-adọrọ anya ndị mmadụ gaa n’ebe ha nọ. N’ịbụ onye obi ruru ala, Terrell sooro Palczynski dị afọ 31 na-akparịta ụka, na-egosipụta ezi mmasị n’ebe ọ nọ dị ka mmadụ nakwa n’ọnọdụ ndị mere ka ha zute. Palczynski kọrọ na ụbọchị atọ tupu mgbe ahụ, na ya gara ịhụ enyi ya nwanyị bụ́ Tracy, bụ́ onye gbahapụworo ya. N’ebe ahụ, ọ gbagburu mmadụ abụọ n’ime ndị enyi Tracy na otu onye agbata obi ya, bụ́ ndị nwara igbochi ya ịkpọrọ Tracy. Ka e mesịrị Tracy gbapụrụ.

N’uhuruchi sochiri ya, n’oge Palczynski na-agbalị izuru otu ụgbọala, otu n’ime mgbọ ya tụrụ otu nwatakịrị dị afọ abụọ, gbajaa agbà nwatakịrị ahụ. Mgbọ tụtakwara ụgbọala Jennifer Lyn McDonel na-anya. N’ụzọ dị mwute, mgbọ gburu Jennifer, ọzọ tụtakwara oche ụgbọala mmadụ na-anọghị na ya, bụ́ nke nwa ha dị otu afọ na-anọ. Jennifer na di ya bụ́ Thomas, nọ na-aga Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova, bụ́ ebe ha abụọ ga-eme ihe omume e kenyere ha ime ná nzukọ n’uhuruchi ahụ. Sarah Francis, bụ́ mama Jennifer, na-akọwa, sị: “Ọ bụ nanị n’abalị ahụ ka ha na-akpọghị nwa ọhụrụ ahụ gaa Ụlọ Nzukọ Alaeze. [Ma ọ́ bụghị ya] anyị gaara anọ na-eru újú ha abụọ.”

Ka Terrell nọgidere jiri nwayọọ soro onye tọọrọ ya na-akparịta ụka, Palczynski kwuru na ọ dịghị mgbe ọ bụ ọchịchọ ya imerụ onye ọ bụla ahụ, nakwa na ya hụrụ Tracy n’anya n’ezie ma chọọ ka ya na ya biri. Terrell kọwara, sị: “Agwara m ya na ọ pụghị ịgbanwe ihe gaworo aga ma na ọ pụrụ ịgbanwe ọdịnihu, agbakwara m ya ume ka o nyefee onwe ya n’aka ndị uwe ojii. Agwara m ya na m ga-abịa na-eleta ya n’ụlọ mkpọrọ ma soro ya na-amụ Bible.” Ka e mesịrị a kọrọ na eri ọ gụsirị kọleji na 1987, Palczynski anọwo afọ ndụ ya nile, ma e wezụga ọnwa iri, n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ n’ebe a na-elekọta ndị isi na-adịghị mma ma ọ bụ bụrụ onye a na-anwale anwale.

N’iji ahụmahụ ya dị ka onye Kraịst bụworo okenye eri ogologo oge eme ihe, Terrell nọgidere na-eme ka obi dajụọ nwa okorobịa ahụ obi na-adịghị mma site n’iji ihe atụ ndị mere eme dị na Bible mee ihe. Dị ka ihe atụ, ọ kọrọ ahụmahụ nke otu nwoke bụ́ onye ezi omume, Eze Israel bụ́ Devid, bụ́ onye nwebigara ọchịchọ ókè maka nwunye Uraịa, nke bụ́ otu n’ime ndị agha Devid. Mgbe Devid tụwara nwanyị ahụ ime, ọ kpara nkata ka Uraịa nwụọ n’agha. Mgbe e ji akọ chee Devid mmehie ya n’ihu, o chegharịrị n’obi eziokwu ma nwetaghachi ihu ọma Chineke.—2 Samuel 11:2–12:14.

Terrell mere ka ya na onye ahụ na-agba ọsọ nwee mmekọrịta dị mma, na-akpọ ya utu aha ya bụ́ Joby. Mgbe ha kwụsịrị n’otu ụlọ ahịa, o zigakwa Terrell ịzụta nri na obere telivishọn, Palczynski kwuru na ya ga-egbukwu ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nwaa ime ka onye ọ bụla mara ihe na-aganụ. Ebe ọ ghọtara na obi erughị onye ahụ na-agba ọsọ ala, Terrel mere ihe o kwuru. Ka e mesịrị, mgbe o kirisịrị akụkọ elekere 11 banyere mpụ Palczynski, Palczynski biri Terrel ọma ma mịbanye n’ógbè dịpụrụ adịpụ na Baltimore.

Ka ihe dị ka otu izu gasịrị, a gbara ụlọ Palczynski nọ na ya gburugburu bụ́ ebe o jichiri ndị mmadụ. A kpọrọ Terrell, bụ́ onye nwoke ahụ na-agba ọsọ kwuru okwu banyere ya ka ọ bịa nye aka n’ime mkpezi. Ọ dị mwute na nke a agaghị nke ọma, na March 22, ndị uwe ojii bụ́ ndị ji iwe bata n’ebe obibi ahụ gbagburu Palczynski. Ọ dịghị onye ọzọ e merụrụ ahụ.

Ka e mesịrị, Terrell nwetara mkpụrụ 600 nke Teta! ahụ o kwuru na ọ bụ ya nyere aka zọpụta ndụ ya. O nyewo ndị ọzọ ọtụtụ narị n’ime ha. Terrell nwere ekele na o mewo ka ọ bụrụ àgwà ya ịgụ ihe ọmụma bara oké uru na-adị na Teta!, anyị chekwara na gị onwe gị ga-enwekwa ekele.

[Foto dị na peeji nke 24]

William Terrell