Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Gị!

A Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Gị!

A Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Gị!

Bible jupụtara na ndụmọdụ ndị dị irè pụrụ ịbara ndị di na ndị nwunye uru. Nke a abụtụghị ihe ijuanya, n’ihi na Onye nyere ike e ji dee Bible bụkwa Onye Mmalite nke ndokwa alụmdi na nwunye.

BIBLE na-enye nkọwa bụ́ eziokwu banyere alụmdi na nwunye. Ọ na-ekweta na di na nwunye ga-enwe “mkpagbu” ma ọ bụ, dị ka New English Bible si kwuo ya, “ihe mgbu na iru újú.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Ma, Bible kwukwara na alụmdi na nwunye pụrụ ma kwesị inye ọṅụ, ọbụna oké obi ụtọ. (Ilu 5:18, 19) Echiche abụọ a adịghị emegiderịta onwe ha. Nanị ihe ha na-egosi bụ na n’agbanyeghị nsogbu ndị siri ike, di na nwunye pụrụ inwe mmekọrịta chiri anya na nke ịhụnanya dị na ya.

Nke ahụ ọ̀ kọrọ n’alụmdi na nwunye gị? Ihe mgbu na ndakpọ olileanya ò kpuchiwo mkpachi anya na ọṅụ e jibu mara mmekọrịta unu? Ọ bụrụgodị na alụmdi na nwunye unu anọwo n’ọnọdụ ịhụnanya kọrọ ruo ọtụtụ afọ, a pụrụ ime ka ọ dịghachi otú ọ dịbu. Otú ọ dị, ị ghaghị ile ihe anya otú ọ dị n’ezie. Ọ dịghị nwoke na nwanyị na-ezughị okè nwere ike inwe alụmdi na nwunye zuru okè. Ka o sina dị, ọ dị ihe ndị ị pụrụ ime iji dozie nsogbu.

Ka ị na-agụ ihe ọmụma na-esonụ, gbalịa ịmata isi ihe ndị metụtara alụmdi na nwunye gị kpọmkwem. Kama ilekwasị anya n’ihe ndị onye òtù ọlụlụ gị na-adịghị emezi emezi, họrọ aro ole na ole pụrụ itinye n’ọrụ, ma na-etinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ. Ị pụrụ ịchọpụta na e nwere olileanya dịnụ maka alụmdi na nwunye gị karịa ka i chere.

Ka anyị buru ụzọ tụlee àgwà n’ihi na otú i si ele inyefe onwe onye anya na mmetụta i nwere n’ebe onye òtù ọlụlụ gị nọ kasị mkpa.

Otú I Si Ele Inyefe Onwe Onye Anya

Ọ dị oké mkpa ile alụmdi na nwunye gị anya dị ka ihe e hiwere ịnọte aka ma ọ bụrụ na ị gaje ime ihe iji meziwanye ya. E kwuwerị, ọ bụ Chineke mere ndokwa alụmdi na nwunye iji jikọta mmadụ abụọ n’ụzọ a na-apụghị ikewa ekewa. (Jenesis 2:24; Matiu 19:4, 5) N’ihi ya, mmekọrịta gị na onye òtù ọlụlụ gị adịghị ka ọrụ ị pụrụ ịkwụsị ma ọ bụ ụlọ ị pụrụ ịhapụ site nanị n’imebi nkwekọrịta gị na onye nwe ya na ịkwapụ na ya. Kama nke ahụ, mgbe ị na-aga ịlụ di ma ọ bụ nwunye i kwesiri nkwa ike na mee elu mee ala ị ga-arapara n’ahụ onye òtù ọlụlụ gị. Inwe ezi echiche nke nnyefe onwe onye kwekọrọ n’ihe Jisọs Kraịst kwuru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”—Matiu 19:6.

Ụfọdụ pụrụ ikwu, sị: ‘Anyị ka bi. Nke a ọ́ dịghị egosi na anyị nwere echiche nke nnyefe onwe onye?’ Ma eleghị anya ọ na-egosi. Otú ọ dị, dị ka e kwuru ná mmalite nke usoro isiokwu a, di na nwunye ụfọdụ bụ́ ndị na-ebikọ ọnụ na-anọgide ná nsogbu, ha tọrọ atọ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ. Nzube gị bụ ime ka alụmdi na nwunye gị bụrụ nke na-enye ọṅụ, ọ bụghị nanị nke a pụrụ ịnagide. Inwe echiche nraranye kwesịrị igosipụta ikwesị ntụkwasị obi ọ bụghị nanị nye njikọ alụmdi na nwunye kamakwa nye onye ahụ i kwere nkwa ịhụ n’anya na ilekọta.—Ndị Efesọs 5:33.

Ihe ndị ị na-agwa onye òtù ọlụlụ gị pụrụ ikpughe nnọọ ókè i nyeferuru onwe gị n’alụmdi na nwunye unu. Dị ka ihe atụ, mgbe e nwere oké arụmụka, n’ebughị ụzọ chee echiche, di na nwunye ụfọdụ na-ekwu ihe ndị dị ka “Aga m ahapụ gị!” ma ọ bụ “Aga m achọ onye ọzọ ga-eji m kpọrọ ihe!” Ọ bụrụgodị na e jighị okwu ndị dị otú ahụ kpọrọ ihe, ha na-emebi nnyefe mmadụ nyefere onwe ya site n’igosi na a pụrụ ikewa mgbe ọ bụla nakwa na onye kwuru ya dị njikere mgbe ọ bụla ime ihe o kwuru.

Iji mee ka ịhụnanya dịghachi n’alụmdi na nwunye gị, kwụsị iyi egwu dị otú ahụ ná mkparịta ụka unu. E kwuwerị, ị̀ ga-achọ ụlọ mma ma ọ bụrụ na ị ma na ị pụrụ ịkwapụ na ya mgbe ọ bụla? N’ihi gịnịzi ka i ji atụ anya ka onye òtù ọlụlụ gị rụọ ọrụ n’alụmdi na nwunye nwere ike ghara ịdịte aka? Kpebisie ike na ị ga-agbalịsi ike ịrụ ọrụ iji nweta ihe ngwọta ya.

Nke a bụ ihe otu nwanyị mere mgbe ya na di ya gabigasịrị oge ha nwere nsogbu. “Ọ bụ ezie na ihe ya adịghị amasị m mgbe ụfọdụ, adịghị m eche echiche ịhapụ mmekọrịta ahụ,” ka ọ na-ekwu. “Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya butere nsogbu ahụ, anyị na-aga idozi ya n’ụzọ ụfọdụ. Ugbu a kwa, ka afọ abụọ nke inwe ttnsogbu gasịrị, apụrụ m ikwu n’eziokwu na anyị na-enwekọ obi ụtọ ọnụ ọzọ.”

Ee, inyefe onwe onye pụtara imekọ ihe ọnụ—ọ bụghị nanị ibikọ kama ịrụkọ ọrụ maka otu nzube. Otú ọ dị, ị pụrụ iche na n’ọnọdụ a ọ bụ nanị echiche nke ibu ọrụ ji alụmdi na nwunye gị itisa. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, enwela obi nkoropụ. O nwere ike ịbụ na a pụrụ ịmaliteghachi ịhụ gị n’anya. N’ụzọ dị aṅaa?

Ịsọpụrụ Onye Òtù Ọlụlụ Gị

Bible na-ekwu, sị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile.” (Ndị Hibru 13:4; Ndị Rom 12:10) Ụdị okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ihe a na-asọpụrụ” bụkwa nke a sụgharịrị “ihe e ji kpọrọ oké ihe,” “ihe a na-akwanyere ùgwù,” na “ihe dị oké ọnụ ahịa,” n’ebe ndị ọzọ na Bible. Mgbe anyị ji ihe kpọrọ oké ihe, anyị na-etinye mgbalị dị ukwuu iji lekọta ya. Ikekwe ị hụwo na nke ahụ bụ eziokwu n’ihe banyere onye nwere ụgbọala ọhụrụ dara oké ọnụ. Ọ na-eme ka ụgbọala ya dị oké ọnụ ahịa na-adị ọcha ma dị mma. Nye ya ọbụna obere mkpụcha bụ nnukwu ihe! Ndị ọzọ na-elekọta ahụ ike ha n’otu ụzọ ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ji ọdịmma ha akpọrọ ihe, n’ihi ya ha chọkwara ichebe ya.

Na-egosipụta otu nlekọta na-enye nchebe dị otú ahụ n’ebe alụmdi na nwunye gị dị. Bible kwuru na ịhụnanya “na-ele anya ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) Kama ịdaba n’echiche enweghị nchekwube—ma eleghị anya na-eche na ihe apụghị ịka mma site n’ikwu, sị, “Ọ dịghị mgbe anyị hụrụ onwe anyị n’anya n’ezie,” “Anyị lụrụ n’oge anyị dị nnọọ na nwata,” ma ọ bụ “Anyị amataghị ihe anyị na-eme”—gịnị ma i nwee olileanya maka ihe ndị ka mma ma rụọ ọrụ iji mee ka ihe ka mma, jiri ndidi chere ihe ga-esi na ya pụta? “M na-anụ ka ọtụtụ n’ime ndị na-akpọtụrụ m na-ekwu, sị, ‘Apụkwaghị m ịnagide ya!’” ka otu onye ndụmọdụ alụmdi na nwunye na-ekwu. “Kama ịtụle mmekọrịta ahụ iji hụ akụkụ ndị ọ dị mkpa ka e mezie, ha na-echezọ mgbalị ahụ dum ngwa ngwa, gụnyere ihe ndị ha abụọ ji akpọrọ ihe, ọtụtụ ihe ndị ha meworo, na ihe ịga nke ọma ọ bụla ha pụrụ inwe n’ọdịnihu.”

Ahụmahụ ndị dị aṅaa ka ị na-akọrọ onye òtù ọlụlụ gị? N’agbanyeghị nsogbu ndị dị ná mmekọrịta unu, ị pụrụ n’ezie iche banyere oge obi ụtọ, ihe ndị unu rụzuru, na ihe ịma aka ndị unu abụọ chekọrọ ihu. Na-atụgharị uche n’oge ndị a, ma na-egosi na ị na-asọpụrụ alụmdi na nwunye gị na onye òtù ọlụlụ gị site n’iji obi eziokwu na-arụ ọrụ iji meziwanye mmekọrịta unu. Bible na-egosi na Jehova Chineke na-egosi mmasị dị ukwuu n’otú ndị òtù ọlụlụ na-esi emeso ibe ha ihe. Dị ka ihe atụ, n’oge Malakaị onye amụma, Jehova katọrọ ndị di bụ́ ndị Israel ghọgburu nwunye ha site n’ịgba ha alụkwaghịm n’enweghị ezi ihe mgbakwasị ụkwụ. (Malakaị 2:13-16) Ndị Kraịst chọrọ ka alụmdi na nwunye ha wetara Jehova Chineke nsọpụrụ.

Esemokwu—Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Ọ Dị Njọ?

Ihe kasị akpata alụmdi na nwunye ndị ịhụnanya kọrọ yiri ka ọ bụ di na nwunye enweghị ike nke idozi esemokwu. Ebe ọ bụ na ọ dịghị mmadụ abụọ ọ bụla kwekọrọ kpam kpam, alụmdi na nwunye nile ga na-enwe nghọtahie site n’oge ruo n’oge. Ma di na nwunye ndị na-enwekarị nghọtahie pụrụ ịchọpụta na ịhụnanya ha adaala n’ime afọ ndị gafeworonụ. Ha pụrụ ọbụna ikwubi, sị, ‘Anyị ekwekọghị nnọọ nke ọma. Anyị na-esekarị okwu!’

Ma, inwetụ esemokwu ekwesịghị ịbụ ihe ga-etisa alụmdi na nwunye. Ajụjụ bụ, Olee otú e si edozi esemokwu? N’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, di na nwunye amụtawo ikwurịta banyere nsogbu ha n’aghọghị, dị ka otu dọkịta kpọrọ ya, “ndị iro na-akpachi anya.”

‘Ike nke Ire’

Gị na onye òtù ọlụlụ gị ùnu maara otú unu ga-esi na-ekwurịta banyere nsogbu unu? Ha abụọ kwesịrị ịdị njikere ikwupụta ha. N’ezie, nke a bụ nkà—nke pụrụ isi ike mmụta. N’ihi gịnị? Otu ihe bụ na n’ihi ịbụ ndị na-ezughị okè, anyị nile ‘na-asụ ngọngọ n’okwu’ site n’oge ruo n’oge. (Jemes 3:2) Ọzọkwa, a zụlitere ụfọdụ n’ebe obibi bụ́ ebe nne ma ọ bụ nna na-ewe iwe mgbe nile. N’otu echiche, malite na nwata a zụrụ ha ikwere na iwe iwe ọkụ na okwu ọjọọ kwesịrị ekwesị. Nwatakịrị nwoke a zụlitere n’ebe dị otú ahụ pụrụ itolite ghọọ “onye iwe,” nke “na-enwe ọnụma hie nne.” (Ilu 29:22) N’otu aka ahụ, nwa agbọghọ a zụlitere n’ụzọ dị otú ahụ pụrụ ịghọ “nwanyị nwere ọnụ ọjọọ ma na-ewe iwe.” (Ilu 21:19, The Bible in Basic English) Ọ pụrụ isi ike ịkwụsị ụzọ iche echiche na inwe mmekọrịta ndị gbamiri mkpọrọgwụ. *

Mgbe ahụ, idozi esemokwu na-agụnye ịmụta ụzọ ọhụrụ dị iche iche mmadụ ga-esi na-ekwupụta echiche ya. Ihe a abụghị obere okwu, n’ihi na otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Ọnwụ na ndụ dị ire n’aka.” (Ilu 18:21) Ee, ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ihe na-adịghị ihe ọ bụ, otú i si agwa onye òtù ọlụlụ gị okwu pụrụ imebi ma ọ bụ ịtụte mmekọrịta unu. “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha,” ka ilu ọzọ nke Bible na-ekwu, “ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.”—Ilu 12:18.

Ọ bụrụgodị na o yie ka ọ bụ onye òtù ọlụlụ gị na-akasị emehie na nke a, chebara ihe ndị na-ekwu mgbe unu nwere nghọtahie echiche. Okwu gị ọ̀ na-agba agba, ka ọ na-agwọ agwọ? Ọ̀ na-akpasu iwe ka ọ na-eme ka ọ dajụọ? “Okwu mwute na-akpali iwe,” ka Bible na-ekwu. N’ụzọ dị iche, “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.” (Ilu 15:1) Okwu mwute—ọbụna ma ọ bụrụ na e ji nwayọọ kwuo ya—ga-eme ka ọnọdụ ahụ ka njọ.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ dị ihe na-enye gị nsogbu, i nweere onwe gị ikwupụta ya. (Jenesis 21:9-12) Ma ị pụrụ ime otú ahụ n’ejighị okwu mkparị, na okwu nlelị mee ihe. Kpaara onwe gị ókè ị na-agaghị agafe ma ọlị—ihe ụfọdụ ị ga-ekpebi ghara ịgwa onye òtù ọlụlụ gị, dị ka “Akpọrọ m gị asị” ma ọ bụ “Ọ dị m ka ya bụrụ na anyị alụghị.” Ọ bụkwa ezie na onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi adịghị ekwu kpọmkwem banyere alụmdi na nwunye, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịzere ịdaba n’ihe ọ kpọrọ “esemokwu n’ihi okwu efu” na “oké esemokwu banyere ihe ndị na-abaghị uru (NW).” * (1 Timoti 6:4, 5) Ọ bụrụ na onye òtù ọlụlụ gị na-eme otú ahụ, ọ dịghị gị mkpa imekwa otú ahụ. Ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, na-agbasonụ udo.—Ndị Rom 12:17, 18; Ndị Filipaị 2:14.

N’eziokwu, mgbe iwe dị ọkụ, ọ na-esi ike mmadụ ịchịkwa ọnụ ya. “Ire bụkwa ọkụ,” ka Jemes bụ́ onye so dee Bible na-ekwu. “Ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti mmadụ pụrụ imeju ire anya; ọ bụ ihe ọjọọ nke na-adịghị eguzo n’otu ebe, ọ bụ ihe jupụtara n’ire agwọ na-eweta ọnwụ.” (Jemes 3:6, 8) Mgbe ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime mgbe iwe malitere ịdị ọkụ? Olee otú ị pụrụ isi gwa onye òtù ọlụlụ gị okwu n’ụzọ ga-eme ka esemokwu ahụ kwụsị kama ime ka ọ ka njọ?

Ịkwụsị Arụmụka Na-akpata Esemokwu

Ụfọdụ achọpụtawo na ọ bụrụ na ha elekwasị anya ná mmetụta ha na-enwe kama ịbụ n’omume onye òtù ọlụlụ ha na ọ na-akara ha mfe ịkwụsịlata iwe iwe ma kwurịta ihe ndị bụ́ isi kpatara esemokwu. Dị ka ihe atụ, “Ihe i kwuru na-ewute m” na-adị nnọọ irè karịa “Ị kpasuru m iwe” ma ọ bụ “I kwesịrị ịma ihe dị mma ikwu karịa ikwu ya otú ahụ.” N’ezie, mgbe ị na-ekwupụta mmetụta ị na-enwe, ụda olu gị ekwesịghị igosipụta iwe ma ọ bụ nlelị. Nzube gị kwesịrị ịbụ ime ka a mata nsogbu ahụ kama ịbụ imegide onye ahụ.—Jenesis 27:46–28:1.

Ọzọkwa, cheta mgbe nile na e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.” (Eklisiastis 3:7) Mgbe mmadụ abụọ na-ekwu okwu otu mgbe, ọ dịghị nke na-ege ntị, ọ dịghịkwa ihe a ga-emezụ. N’ihi ya mgbe o ruuru gị ige ntị, bụrụ onye “na-anụ ihe ọsọ ọsọ, . . . na-adịghị ngwa ikwu okwu.” Ọ dịkwa mkpa ịbụ onye ‘na-adịghị ngwa iwe iwe.’ (Jemes 1:19) Aghọcharala okwu ọjọọ ọ bụla onye òtù ọlụlụ gị kwuru; “ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị.” (Eklisiastis 7:9) Kama nke ahụ, gbalịa ịmata ihe kpatara ihe onye òtù ọlụlụ gị kwuru. “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ,” ka Bible na-ekwu, “ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie.” (Ilu 19:11) Ezi uche pụrụ inyere di ma ọ bụ nwunye aka ịchọ ịmata ihe kpatara nghọtahie.

Dị ka ihe atụ, mkpesa nwanyị na-eme na di ya adịghị ewepụta oge ka ya na ya nọkọọ yiri ka ọ bụghị nanị banyere awa na minit. Ọ pụrụ ịbụ n’ihi na a na-eleghara ya anya ma ọ bụ na a naghị eji ya akpọrọ ihe. N’otu aka ahụ, iwe di na-ewe banyere ihe nwunye ya na-azụ aghara aghara nwere ike ghara ịbụ nanị n’ihi na ọ na-emefu ego. Ọ pụrụ ịbụ n’ihi na a dịghị agụnye ya n’ime mkpebi. Di ma ọ bụ nwunye nwere nghọta ga-achọ ileba anya n’ime ma mata ihe kpatara nsogbu ahụ.—Ilu 16:23.

Nke a ọ̀ na-adị mfe okwukwu karịa omume? Kpọmkwem! Mgbe ụfọdụ, n’agbanyeghị itinye mgbalị kasị mma, a na-ekwu okwu ọjọọ ma wee iwe. Mgbe ị hụrụ ka nke a na-amalite ime, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ị gbasoo ndụmọdụ nke Ilu 17:14: “Tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.” Ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’iyigharị mkparịta ụka ahụ ruo mgbe iwe dajụrụ. Ọ bụrụ na ọ na-esi ike ikwurịta okwu n’enweghị nnukwu esemokwu, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ime ka enyi unu tozuru okè nọnyere unu abụọ ma nyere unu aka idozi esemokwu unu. *

Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi

Enwela nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na alụmdi na nwunye gị abụghị ihe i chere na ọ ga-abụ mgbe unu na-eme mbedo. Otu ìgwè ndị ọkachamara na-ekwu, sị: “Nye ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ, alụmdi na nwunye abụghị ọnọdụ na-eweta ọṅụ na-adịgide adịgide. Mgbe ụfọdụ ọ na-amagbu onwe ya ma dị njọ n’oge ọzọ.”

Ee, o nwere ike alụmdi na nwunye abụghị mmekọrịta ịhụnanya nke akwụkwọ akụkọ ifo, ma o kwesịghị ịbụ ọdachi. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mgbe gị na onye òtù ọlụlụ gị na-aghaghị ịnagiderịta ibe unu, a ga-enwekwa mgbe unu pụrụ ịhapụ esemokwu unu ma nweta nnọọ ọṅụ site n’ịnọkọ ọnụ, ikpori ndụ, na ikwurịta okwu dị ka ndị enyi. (Ndị Efesọs 4:2; Ndị Kọlọsi 3:13) Ndị a bụ oge mgbe unu ga-enwe ike ịtụte ịhụnanya ahụ dalataworonụ.

Cheta na mmadụ abụọ na-ezughị okè apụghị inwe alụmdi na nwunye zuru okè. Ma ha pụrụ inwe obi ụtọ ruo n’ókè ụfọdụ. N’ezie, n’agbanyeghị nsogbu, mmekọrịta gị na onye òtù ọlụlụ gị pụrụ ịbụ isi iyi nke afọ ojuju dị ukwuu. Otu ihe doro anya: Ọ bụrụ na gị na onye òtù ọlụlụ gị etinye mgbalị ma dịrị njikere ime mgbanwe, na-achọkwa ọdịmma nke onye nke ọzọ, e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na a prịzọpụta alụmdi na nwunye gị.—1 Ndị Kọrint 10:24.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 Mmetụta ndị mụrụ ụmụ abụghị ihe ngọpụ maka mmadụ ịgwa onye òtù ọlụlụ ya okwu ọjọọ. Otú ọ dị, ọ pụrụ inye aka kọwaa otú ọchịchọ dị otú ahụ pụrụ isi ghọọ nke gbamiri mkpọrọgwụ ma sie ike nkwụsị.

^ par. 25 A pụkwara ịsụgharị okwu Grik mbụ a sụgharịrị “oké esemokwu banyere ihe ndị na-abaghị uru” ịbụ “mkpasurịta iwe.”

^ par. 31 Ndịàmà Jehova nwere ndị okenye ọgbakọ dị ka ndị ha pụrụ ịgakwuru maka enyemaka. Ọ bụ ezie na ọ bụghị ọrụ ha itinye ọnụ n’okwu dịịrị di na nwunye, ndị okenye pụrụ ịbụ ndị na-enyere ndị di na nwunye nọ ná nsogbu aka ịdịghachi ná mma.—Jemes 5:14, 15.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Okwu gị ọ̀ na-agba agba, ka ọ na-agwọ agwọ?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]

JIRI NWAYỌỌ NA-ATỤ BỌL AHỤ

Bible na-ekwu, sị: “Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mata otú unu na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:6) N’ezie, nke a kwesịrị ekwesị n’alụmdi na nwunye! Iji maa atụ: N’egwuregwu ịtụ bọl, ị ga-eji nwayọọ tụọ bọl ka ọ dị mfe nghọta. Ị gaghị atụsi ya ike otú ọ ga-emerụ onye gị na ya na-atụ ya ahụ. Gbasoo otu ụkpụrụ a mgbe gị na onye òtù ọlụlụ gị na-ekwurịta okwu. Ịgwa ya okwu ọjọọ, ga-emerụ ya ahụ. Kama nke ahụ, jiri nwayọọ—na-eji amara ekwu okwu—ka onye òtù ọlụlụ gị nwee ike ịghọta ihe ị na-ekwu.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

CHETA!

Gụọ akwụkwọ ozi na kaadị ndị e dere n’oge gara aga. Kirie foto. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị dọtara mmasị m n’ebe onye òtù ọlụlụ m nọ? Olee àgwà ndị masịkarịsịrị m? Olee ihe omume ndị anyị mekọrọ ọnụ? Gịnị mere ka anyị chịa ọchị?’ Mgbe ahụ soro onye òtù ọlụlụ gị kwurịta banyere ihe ndị a i chetara. Mkparịta ụka nke jiri nkebi okwu bụ́ “Ì chetara mgbe . . . ?” malite pụrụ inyere gị na onye òtù ọlụlụ gị aka ịtụte mmetụta ahụ unu abụọ nweburu.

[Igbe dị na peeji nke 12]

ONYE ÒTÙ ỌLỤLỤ ỌHỤRỤ, OTU NSOGBU AHỤ

Ọ na-adị ndị òtù ọlụlụ ụfọdụ chere na ha tọrọ atọ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ ka ha na onye òtù ọlụlụ ọhụrụ malite n’isi. Ma Bible katọrọ ịkwa iko, na-ekwu na onye na-eme mmehie a bụ onye “obi amamihe kọrọ [“bụ onye nzuzu na-enweghị uche,” New English Bible]” nakwa na ọ “na-emebi mkpụrụ obi nke aka ya.” (Ilu 6:32) N’ikpeazụ, onye na-akwa iko nke na-enweghị nchegharị na-akwụsị inwe ihu ọma Chineke—ụdị mbibi kasị njọ a pụrụ inwe.—Ndị Hibru 13:4.

A na-egosipụta ajọ nzuzu dị n’omume ikwa iko n’ụzọ ndị ọzọkwa. Otu ihe bụ na onye na-akwa iko nke gara lụrụ di ma ọ bụ nwunye ọhụrụ yiri ka ọ ga-eche otu nsogbu ndị ahụ jupụtara n’alụmdi na nwunye mbụ ya ihu. Dr. Diane Medved na-ewepụta ihe ọzọ a ga-atụle: “Ihe mbụ onye òtù ọlụlụ ọhụrụ gị ga-amata banyere gị,” ka ọ na-ekwu, “bụ na ị chọghị ikwesị ntụkwasị obi. Ọ maara na ị pụrụ ịghọgbu onye i kwere nkwa ịkwanyere ùgwù. Na ị maara otú e si enye ihe ngọpụ. Na a pụrụ ịdọpụ uche gị n’ebe ibu ọrụ gị dị. Na ihe ụtọ anụ ahụ ma ọ bụ ịfụli onwe onye elu ga-arafu gị. . . . Olee otú onye òtù ọlụlụ nke abụọ ga-esi mara na a gaghị arafu gị ọzọ?”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

AMAMIHE SITERE N’ILU BIBLE

Ilu 10:19: “N’ọtụtụ okwu njehie adịghị akwụsị: ma onye na-egbochi egbugbere ọnụ ya abụọ bụ onye nwere uche.”

Mgbe iwe na-ewe gị, ị pụrụ ikwu ihe ị na-achọghị ikwu—ma mesịa kwaa ụta.

Ilu 15:18: “Onye ọnụma na-akpali iseokwu: ma onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka ịlụ ọgụ dị jụụ.”

Ebubo na-agba agba ná ntị yiri ka ọ ga-eme ka onye òtù ọlụlụ gị chọọ ịgọpụ onwe ya, ebe iji ndidi na-ege ntị ga-enyere unu abụọ aka ịrụ ọrụ maka mkpezi.

Ilu 17:27: “Onye na-egbochi okwu ọnụ ya maara ihe ọmụma: ọzọ, onye mmụọ ya jụụrụ ajụrụ bụ onye nghọta.”

Mgbe ị chọpụtara na iwe adịwala ọkụ, ọ kasị mma imechi ọnụ iji zere nnukwu esemokwu.

Ilu 29:11: “Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.”

Njide onwe onye dị oké mkpa. Iji obi ọkụ na-ekwu okwu ọjọọ ga-eme ka onye òtù ọlụlụ gị kewapụ onwe ya n’ebe ị nọ.