Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmụta Na-adịru Oge Ndụ Nile

Mmụta Na-adịru Oge Ndụ Nile

Mmụta Na-adịru Oge Ndụ Nile

“Bible [bụ] ihe nduzi kasịnụ na nkà ibi ndụ.”—Thomas Tiplady, 1924.

Ọ BỤGHỊ ikwubiga okwu ókè ịsị na nkụzi nke dabeere na Bible pụrụ inwogha ndụ. O mewo ka ndị na-enwebughị nzube na olileanya nwee nzube na olileanya. Otu nne nanị ya na-azụ ụmụ bụ́ onye si mba Namibia degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na South Africa akwụkwọ, sị:

“Adị m afọ 29, ejikwa m nanị ụbọchị abụọ gụchaa akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. O ruru m n’obi n’ụzọ miri emi n’ihi na owu na-ama m n’ezie. Enyi m nwoke nwụrụ n’ihe mberede ụgbọala wee hapụ mụ na ụmụaka abụọ. Anyị na-ata ahụhụ nke ukwuu. Mgbe ụfọdụ m na-eche na ọ ga-aka mma igbu ha ma gbuzie onwe m. Ma mgbe m nwetara akwụkwọ a, agbanwere m obi m. Biko nyerenụ m aka site n’iduziri m omụmụ Bible n’efu.”

Bible bụ akwụkwọ nduzi pụrụ inyere ndị mmadụ aka inwe ihe ịga nke ọma n’akụkụ nile nke ndụ—ná mmekọrịta ha na ezinụlọ ha, ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, na ndị obodo ha. (Abụ Ọma 19:7; 2 Timoti 3:16) Ọ na-enye nduzi dị mma banyere ụzọ isi na-eme ihe ọma ma zere ihe ọjọọ. Ọ bụ akwụkwọ na-ekwu banyere ndụ n’ụzọ ziri ezi. Ka ị na-agụ ya, ị ga-achọpụta na o jupụtara n’akụkọ banyere ndị dịrị adị n’ezie. Ị ga-ahụ ihe mere ndị ụfọdụ ji nwee obi ụtọ na afọ ojuju ná ndụ ebe ndị ọzọ nwere ihe mgbu ma ghara inwe obi ụtọ. Ihe ndị kwesịrị ekwesị na ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị ga-edo gị anya.

Mmụta Maka Ndụ A Dị Ugbu A

Bible na-emesi ịdị mkpa nke ezi amamihe ike. Ọ na-ekwu, sị: “Isi ihe ka amamihe bụ; nweta amamihe.” (Ilu 4:7) Ọ na-egosikwa na ndị mmadụ adịghị enwekebe amamihe, ya mere ọ na-adụkwa ọdụ, sị: Ọ bụrụ na amamihe fọdụụrụ onye ọ bụla n’ime unu inwe, ya rịọ n’aka Chineke, Onye na-enye mmadụ nile n’afọ ofufo.”—Jemes 1:5.

Olee otú Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, si enye amamihe n’afọ ofufo? Ọ na-eme otú ahụ site n’Okwu ya, bụ́ Bible, bụ́ nke ọ na-agba anyị ume ịgụ. Chineke na-arịọ, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ị tọọrọ amamihe ntị gị n’ala, . . . ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta. N’ihi na Jehova na-enye amamihe.” (Ilu 2:1, 2, 5, 6) Mgbe anyị tinyere ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke n’ọrụ ma hụ otú o si baa uru, anyị na-amata na ọ na-egosipụta amamihe Chineke n’ezie.

Were dị ka ihe atụ, ihe banyere ịnagide ịda ogbenye. Bible na-akwado ịdị uchu ma na-adọ aka ná ntị megide ime ihe ndị na-eme ka e mefusịa ihe ole na ole e nwere. Ya mere, o doro anya na ihe ọjọọ ndị dị ka iji ụtaba eme ihe na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè megidere ụkpụrụ Bible.—Ilu 6:6-11; 10:26; 23:19-21; 2 Ndị Kọrint 7:1.

Gịnị banyere mmetụta ndị enyi anyị pụrụ inwe ná ndụ anyị? Bible na-ekwu, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ị̀ chọpụtawo na nrụgide ndị ọgbọ edugawo ndị mmadụ mgbe mgbe—ma ndị na-eto eto ma ndị agadi—n’ịṅụbiga mmanya ókè, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ime omume rụrụ arụ? Ee, ọ bụrụ na anyị na ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ na-akpakọrịta, anyị ga-adị ka ha, ọbụna dị ka Bible na-ekwu, sị: “Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.”—1 Ndị Kọrint 15:33.

N’ezie, anyị nile chọrọ inwe obi ụtọ. Ma olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume? Ị̀ maara na Bible na-ekwu na ọ bụchaghị ihe ndị dịgasi iche pụrụ ime ka anyị nwee obi ụtọ, kama na ọ bụ àgwà na mmekọrịta ndị kwesịrị ekwesị, karịsịa, iso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta? (1 Timoti 6:6-10) Jisọs Kraịst kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama na ndị obi ụtọ na-adịrị n’ezie bụ ndị “maara mkpa nke ime mmụọ ha,” (NW) “ndị dị nwayọọ n’obi,” ‘ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ n’ezi omume,’ “ndị ebere,” “ndị dị ọcha n’obi,” na “ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo.”—Matiu 5:1-9.

Mgbe i chemiri echiche echemi banyere ihe ndị Bible na-akụzi, ị ga-aghọta otú ha pụrụ isi nye aka duzie ndụ anyị. Dị ka ebe e si enweta okwu ndụmọdụ, Bible pụrụ iche. Ndụmọdụ ọ na-enye na-aba uru mgbe nile—ọ bụghị nchepụta efu nkịtị, ọ dịghịkwa mgbe ọ na-eme ihe ga-emegide anyị. Ndị na-etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ na-erite uru mgbe nile.

Mmụta Na-adịru Oge Ndụ Nile

Ma, tụkwasị n’ịbụ ihe na-abara anyị uru ugbu a, Bible na-enye olileanya maka ndụ n’ọdịnihu. Ọ na-ekwu banyere ime ka ụwa dị ọcha n’ụzọ na-akpali mmasị na omume a ga-eme ka ọ bụrụ ebe obibi magburu onwe ya maka ndị na-ejere Chineke ozi. Rịba ama ihe a na-enye obi ụtọ e dekọrọ banyere ọdịnihu: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4; Ilu 2:21, 22.

Cheedị nnọọ: A gaghị enwekwa ụmụaka na-arịa ọrịa, ịnọ agụụ agaghị adịkwa, ọrịa ndị a na-atụ ụjọ agaghị adịkwa bụ́ ndị na-agwụchasị mmadụ ike, ajọ ihe mgbu agaghị adịkwa! Anya mmiri nke na-egosi nkụda mmụọ, ndakpọ olileanya, na iru újú ga-akwụsị, n’ihi na a ga-agbanwe ma ọ bụ wepụ ọnọdụ ndị na-akpata ihe ndị dị otú ahụ. Ebe ọ bụ na usuu ndị mmụọ ozi Chineke ga-ebibiworị ndị ma ụma eme ihe ọjọọ, ndị ohi, ndị na-egbu mmadụ, ndị ụgha, na ndị ọzọ na-eme ka ndụ ghara inwe nchebe agakwaghị anọ. Ndị mmadụ ga-enwe ike inwe ebe obibi nke ha ma nụ ụtọ ha ná nchebe.—Aịsaịa 25:8, 9; 33:24; 65:17-25.

Nke ahụ ò yiri gị ihe dị mma? Ọ̀ ga-amasị gị ịmụtakwu banyere itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ka i wee nwee ike irite uru n’onwe gị ugbu a nakwa n’ọdịnihu? Ọ bụrụ otú ahụ, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova, obi ga-adịkwa ha ụtọ ime ka gị na ezinụlọ gị sonye n’usoro ihe omume ha zụrụ ụwa ọnụ nke “mmụta na-adịru oge ndụ nile.”