Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-eri Akwụkwọ Nri Gị!

Na-eri Akwụkwọ Nri Gị!

Na-eri Akwụkwọ Nri Gị!

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA BRAZIL

“Ha na-elu ilu.” “Ụtọ ha adịghị mma.” “Eritụbeghị m ha.”

IHE ndị a bụ nanị ihe ole na ole n’ime ihe ndị mere ọtụtụ ndị ji ajụ iri akwụkwọ nri. Gịnị banyere gị onwe gị? Ị̀ na-eri akwụkwọ nri kwa ụbọchị? Teta! gbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ iji mata ihe mere akwụkwọ nri ji amasị ụfọdụ ndị na ihe mere o jighị amasị ndị ọzọ.

Ndị na-eri akwụkwọ nri kwuru na ndị mụrụ ha kụziiri ha ịdị mkpa nke iri akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi. N’ụzọ dị iche, iri akwụkwọ nri amaghị ọtụtụ ndị na-adịghị eri ya ahụ mgbe ha bụ ụmụaka. Kama nke ahụ, ha na-ahọrọ nri ratụ ratụ. Otú ọ dị, ọbụna ndị a kweere na akwụkwọ nri dị mkpa iji nọgide na-enwe ezi ahụ ike.

Ndị mụrụ ụmụ, na-akụzirinụ ụmụ unu iri akwụkwọ nri! N’ụzọ dị aṅaa? Akwụkwọ bụ́ Facts for Life, nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara, na-atụ aro ka a na-enye ụmụ ọhụrụ ruru ihe dị ka ọnwa isii akwụkwọ nri e siri esi, berie eberie, ma sụzie ya asụọ, ma ọ dịkarịa ala otu ugboro n’ụbọchị mgbe e nyesịrị ha ara ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ụmụaka. Ka a na-enye nwatakịrị ụdị nri dị iche iche karị, otú ahụ ka ọ ga-adị ya mma n’ahụ karị. Dr. Vagner Lapate, onye Brazil bụ́ ọkachamara n’ihe banyere nwatakịrị, na-ekwu na ọ bụ ezie na mmiri ara bụ nri bụ́ isi a na-enye n’afọ abụọ mbụ, inye nri ndị ọzọ “na-agba nwa ọhụrụ ume ịmata otú nri ndị ọzọ na-atọ.”

N’akwụkwọ bụ́ Medicina—Mitos y Verdades (Ọgwụ—Akụkọ Ọdịbendị Na-emeghị Eme na Eziokwu), Carla Leonel na-atụ aro na a pụrụ inye nwa ọhụrụ ntakịrị mmiri oroma, mkpụrụ osisi e gwere egwe (dị ka unere, apple, na pọpọ), nri ọka, na ofe akwụkwọ nri n’oge karịa ka e kwuru n’elu. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na e nwere echiche dịgasị iche banyere nke a, ọ ga-abụ ihe amamihe ka ị gakwuru ọkà n’ọrịa ụmụaka.