Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Tọrọ Atọ n’Alụmdi na Nwunye Ịhụnanya Kọrọ

Ndị Tọrọ Atọ n’Alụmdi na Nwunye Ịhụnanya Kọrọ

Ndị Tọrọ Atọ n’Alụmdi na Nwunye Ịhụnanya Kọrọ

“N’ọha mmadụ nwere oké ịgba alụkwaghịm, ọ bụghị nanị na ọtụtụ alụmdi na nwunye obi ụtọ kọrọ pụrụ itisa n’ịgba alụkwaghịm, kamakwa, ọtụtụ alụmdi na nwunye pụrụ ịghọ ndị obi ụtọ kọrọ.”KANSỤL NA-AHỤ MAKA EZINỤLỌ N’AMERICA.

E KWUWO na ihe ka ukwuu n’obi ụtọ na nhụsianya nke ndụ na-esite n’otu ebe—alụmdi na nwunye mmadụ. N’ezie, ọ bụ ihe ole na ole ná ndụ pụrụ ịkpata oké ọṅụ—ma ọ bụ nhụjuanya dị ka ya. Dị ka igbe dị n’isiokwu a na-egosi, ọtụtụ di na nwunye na-enwe nke ikpeazụ ahụ gabiga ókè.

Ma ndekọ ọnụ ọgụgụ nke ndị na-agba alụkwaghịm na-egosi nanị otu akụkụ nke nsogbu ahụ. Maka alụmdi na nwunye ọ bụla tisaranụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-etisaghị etisa ma nọrọ ná nsogbu. “Ezinụlọ anyị nweburu obi ụtọ, ma afọ 12 gara aga adịtụghị mma,” ka otu nwanyị lụrụ di eri ihe karịrị afọ 30 kọrọ. “Di m enweghị mmasị ná mmetụta m. N’ezie, ọ bụ ya kasị bụrụ onye iro m n’ụzọ mmetụta uche.” N’otu aka ahụ, otu onye bụworo di ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 25, kwara arịrị, sị: “Nwunye m agwawo m na ya ahụghịzi m n’anya. Ọ na-ekwu na ọ bụrụ nanị na anyị pụrụ ibikọ ọnụ n’otu ọnụ ụlọ, onye ọ bụla ana-agakwara onwe ya n’oge ntụrụndụ, a pụrụ ịnagide ọnọdụ a.”

Otú ọ dị, ndị ụfọdụ bụ́ ndị nọ n’ajọ nsogbu dị otú ahụ, na-etisa alụmdi na nwunye ha. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị, ịgba alụkwaghịm abụtụghị ihe ha ga-eme. N’ihi gịnị? Dị ka Dr. Karen Kayser si kwuo, ihe ndị dị ka ụmụ, ihe ihere ọ bụ n’anya obodo, ego, ndị enyi, ndị ikwu, na nkwenkwe okpukpe pụrụ ime ka di na nwunye nọgide na-ebi, ọbụna n’ọnọdụ ịhụnanya kọrọ. “Ebe ọ na-eyighị ka ha ga-agba alụkwaghịm n’ụzọ iwu kwadoro,” ka ọ na-ekwu, “di ma ọ bụ nwunye ndị a na-ekwe ka ha na onye òtù ọlụlụ ha gbara alụkwaghịm n’obi ha, nọgide na-ebi.”

Di na nwunye mmekọrịta ha mebiworo hà ga-anọrịrị na-ebi ndụ na-adịghị enye afọ ojuju? Alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ ọ̀ bụ nanị ihe a ga-eji dochie ịgba alụkwaghịm? Ahụmahụ na-egosi na a prịzọpụta ọtụtụ alụmdi na nwunye nwere nsogbu—ọ bụghị nanị pụọ n’oké ihe mgbu nke nkewa kamakwa pụọ ná nhụsianya nke ụkọ ịhụnanya.

[Igbe dị na peeji nke 3]

ỊGBA ALỤKWAGHỊM N’ỤWA NILE

Australia: Ọ fọrọ nke nta ka ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm jiri okpukpu anọ rịa elu eri mmalite afọ ndị 1960.

Britain: Dị ka e kwuru, alụmdi na nwunye 4 n’ime 10 ga-etisa n’ịgba alụkwaghịm.

Canada na Japan: Ịgba alụkwaghịm na-emetụta ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke alụmdi na nwunye.

United States: Kemgbe 1970, ndị na-alụ di na nwunye nwere ohere dị nanị pasent 50 nke inwe ike ibikọ na pasent 50 nke enweghị ike ịnọgide na-ebikọ.

Zimbabwe: Ịgba alụkwaghịm na-etisa ihe dị ka alụmdi na nwunye 2 n’ime 5 ọ bụla.