Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Ịhụnanya Ji Adalata?

N’ihi Gịnị Ka Ịhụnanya Ji Adalata?

N’ihi Gịnị Ka Ịhụnanya Ji Adalata?

“O yiri ka ọ ka nnọọ mfe ịmalite ịhụ n’anya karịa ịnọgide na-ahụ n’anya.”—DR. KAREN KAYSER.

IKEKWE, mmụba nke alụmdi na nwunye ndị ịhụnanya kọrọ abụghị ihe ijuanya. Alụmdi na nwunye bụ mmekọrịta na-esiri ndị mmadụ ike, ọtụtụ ndị adịghị adị njikere tupu ha abanye na ya. “A na-achọ ka anyị gosipụta na aka sitụrụ anyị ike mgbe anyị na-achọ inweta akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala,” ka Dr. Dean S. Edell, na-ekwu, “ma a pụrụ inweta akwụkwọ ikike alụmdi na nwunye site n’ịbịanye aka n’akwụkwọ.”

N’ihi ya, ka ọtụtụ alụmdi na nwunye na-aga nke ọma ma na-enwe obi ụtọ n’ezie, ọtụtụ na-enwe nsogbu. Ikekwe otu n’ime ha ma ọ bụ ha abụọ ji oké atụmanya banye n’alụmdi na nwunye ma ghara inwe nkà ndị dị mkpa maka inwe mmekọrịta na-adịte aka. “Mgbe mbụ ndị mmadụ nwere mmasị n’ebe ibe ha nọ,” ka Dr. Harry Reis na-akọwa, “ha na-enwe nnọọ obi ike n’ebe ibe ha nọ.” Ọ na-adị ha ka onye òtù ọlụlụ ha ọ̀ bụ “nanị onye ọzọ na-ele ihe anya otú ha si ele. Mmetụta ahụ na-akwụsị mgbe ụfọdụ, mgbe nke ahụ mere, ọ pụkwara ịkpa nnọọ alụmdi na nwunye ahụ aka ọjọọ.”

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ezinụlọ adịghị eru n’ọnọdụ ahụ. Ma ka anyị tụlee ná nkenke ihe ole na ole meworo ka ịhụnanya dalata n’ọnọdụ ụfọdụ.

Ndakpọ Olileanya —“Ihe A Abụghị Ihe M Tụrụ Anya Ya”

“Mgbe m lụrụ Jim,” ka Rose na-ekwu, ‘echere m na alụmdi na nwunye anyị ga-atọgbu onwe ya n’ụtọ—na-enwe mmekọrịta ịhụnanya na mmeso dị nro na nchebara echiche maka ibe anyị.’ Ma, nwa obere oge, di ọma Rose abụghịzi nwoke ọma dị ka o chere. “Emesịrị m nwee oké ndakpọ olileanya n’ebe ọ nọ,” ka ọ na-ekwu.

Ọtụtụ ihe nkiri sịnịma, akwụkwọ, na abụ ndị na-ewu ewu na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu banyere ịhụnanya. Mgbe ha na-eme mbedo, nwoke na nwanyị pụrụ iche na ha enwetawo ihe ha chọrọ; ma mgbe afọ ole na ole nke alụmdi na nwunye gasịrị, ha na-ekwubi na ọ ghaghị ịbụ nrọ ka ha na-arọ! Mmekọrịta ịhụnanya na-adịghị ka nke dị n’akwụkwọ akụkọ ifo nwere ike ime ka alụmdi na nwunye pụrụ ịga nke ọma yie ihe na-enweghị nnọọ isi.

Otú ọ dị, ihe ụfọdụ a na-atụ anya ha n’alụmdi na nwunye kwesịrị nnọọ ekwesị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị mmadụ ịtụ anya ịhụnanya, nlebara anya, na nkwado nke onye òtù ọlụlụ ya. Otú ọ dị, e nwere ike ọbụna ghara inweta ihe ndị a a chọrọ. “Ọ fọrọ nke nta ka ọ dị m ka alụbeghị m di,” ka Meena, bụ́ nwunye ọhụrụ na-akatabeghị ahụ n’India na-ekwu. “Owu na-ama m, ọ na-adịkwa m ka o leghaara m anya.”

Ekwekọghị Ekwekọ —“Ọ Dịghị Ihe Na-amasị M Na-amasị Ya”

“Ọ fọrọ nke nta ka ihe nile m na-eme dị iche na nke di m na-eme,” ka otu nwanyị na-ekwu. “M na-akwa ụta kwa ụbọchị maka mkpebi m mere ịlụ ya. Anyị ekwekọtụghị nnọọ ekwekọ.”

Dị ka ọ na-adịkarị, ọ naghị adị anya di na nwunye achọpụta na ha ekwekọrughị otú o yiri ka hà kwekọrọ mgbe ha na-eme mbedo. “Alụmdi na nwunye na-ewepụtakarị àgwà ndị ndị òtù ọlụlụ jisiri ike zochiere ibe ha n’oge ahụ nile ha na-alụbeghị di na nwunye,” ka Dr. Nina S. Fields dere.

N’ihi ya, mgbe ha lụsịrị di na nwunye, ụfọdụ pụrụ ikwubi na ha ekwekọtụghị ekwekọ. “N’agbanyeghị myirita ụfọdụ ná nhọrọ ha na-eme na n’àgwà ha, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-abanye n’alụmdi na nwunye na-enwe nnukwu esemokwu n’ihi ụzọ ime ihe, àgwà, na omume,” ka Dr. Aaron T. Beck na-ekwu. Ọtụtụ di na nwunye amaghị otú e si edozi esemokwu ndị ahụ.

Esemokwu— “Anyị Na-arụ Ụka Mgbe Nile”

“Ókè anyị na-eseru okwu juru anyị anya—mbigbọ, ma ọ bụ ọbụna nke ka njọ, ibu iwe n’obi na-agagharị ruo ọtụtụ ụbọchị,” ka Cindy, bụ́ onye na-echeta mmalite nke alụmdi na nwunye ya, na-ekwu.

A pụghị izere inwe nghọtahie n’alụmdi na nwunye. Ma olee otú e si edozi ha? “N’alụmdi na nwunye dị mma,” ka Dr. Daniel Goleman na-ede, “di na nwunye nweere onwe ha ikwupụta ihe na-enye ha nsogbu. Ma ọtụtụ mgbe karị a na-eme mkpesa n’ụzọ dị njọ mgbe a na-ewe iwe, iji katọọ àgwà onye òtù ọlụlụ.”

Mgbe nke a mere, mkparịta ụka na-aghọ ọgbọ agha bụ́ ebe a na-akwado echiche n’eleghị anya n’azụ ma jiri okwu na-emere ngwá agha kama iji ha emere ihe e ji enwe nkwurịta okwu. Otu ìgwè ndị ọkachamara na-ekwu, sị: “Otu n’ime ihe ndị kasị njọ n’arụmụka ndị na-agafe ókè bụ na ndị òtù ọlụlụ na-ekwukarị okwu ndị na-eyi ihe kasị mkpa n’alụmdi na nwunye ha egwu.”

Enweghị Mmasị—“Ike Agwụwo Anyị”

“Ike ịgbalị ime ka alụmdi na nwunye anyị gaa nke ọma agwụwo m,” ka otu nwanyị kwupụtara ka afọ ise nke alụmdi na nwunye ya gasịrị. “Amaara m na ọ dịghị ihe ga-eme ka o nwee ihe ịga nke ọma ugbu a. N’ihi ya, nanị ihe bụ nchegbu m bụ ụmụaka anyị.”

E kwuwo na ihe na-emegide ịhụnanya n’ezie abụghị ịkpọasị kama ọ bụ enweghị mmasị. N’ezie, enweghị mmasị pụrụ nnọọ ibibi alụmdi na nwunye dị ka ibu iro.

Otú ọ dị, ọ dị mwute na alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ na-amara ndị òtù ọlụlụ ụfọdụ ahụ nke na ha na-akwụsị inwe olileanya maka mgbanwe ọ bụla. Dị ka ihe atụ, otu di kwuru na ịlụ nwanyị ruo afọ 23 yiri “ịrụ ọrụ na-amasịghị gị.” O kwukwara, sị: “Ị ga-eme ihe i nwere ike ime n’ọnọdụ ahụ.” N’otu aka ahụ, otu nwanyị aha ya bụ Wendy enwekwaghị olileanya n’ebe di ya ọ lụrụ ruo afọ asaa, nọ. “Agbalịrị m ọtụtụ ugboro,” ka ọ na-ekwu, “ma ọ na-emechu m ihu mgbe nile. Emesịrị m daa mbà n’obi. Achọkwaghị m ka o mee m ọzọ. Ọ bụrụ na mụ atụwa anya ihe ka mma, ọ ga-ewetara m nanị mkpasụ iwe. Ọ ga-akara m mma ịghara ịtụ anya ihe ọ bụla—agaghị m enwe nnukwu ọṅụ, ma, ma ọ dịghị ihe ọzọ agaghị m ada mbà n’obi.”

Ndakpọ olileanya, ekwekọghị ekwekọ, esemokwu, na enweghị mmasị bụ nanị ụfọdụ n’ime ihe ndị pụrụ iso kpata alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ. O doro anya na e nwere ndị ọzọ—ndị a kpọtụrụ ole na ole n’ime ha aha n’igbe dị na peeji nke 5. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, ọ̀ dị olileanya dịịrị ndị òtù ọlụlụ yiri ka hà tọrọ atọ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya kọrọ?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

ALỤMDI NA NWUNYE NDỊ HỤNANYA KỌRỌ—IHE FỌDỤ ZỌ NA-AKPATA YA

Ego: “Mmadụ pụrụ iche na ime atụmatụ mmefu ego ga-enye aka mee ka di na nwunye dị n’otu site na ha ịbụ ndị na-aghaghị imekọ ihe ọnụ, na-ejikọta ego ha ọnụ maka ihe ndị bụ́ isi ná ndụ, na-anụkwa ụtọ ihe ndị ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ inweta. Ma n’ihe banyere nke a kwa, ihe pụrụ ime ka di na nwunye dị n’otu n’imekọ ihe ọnụ na-abụkarị ihe na-ekewa ha.”—Dr. Aaron T. Beck.

Ịbụ Nne Ma Ọ Bụ Nna: “Anyị achọpụtawo na afọ ojuju nke pasent 67 nke ndị di na nwunye na-enwe n’alụmdi na nwunye na-ebelata nke ukwuu mgbe ha mụrụ nwa mbụ, esemokwu ha na-amụbakwa okpukpu asatọ. Nke a bụ, n’otu akụkụ, n’ihi na ike na-agwụ ndị mụrụ ụmụ, ha adịghịkwa enwe oge buru ibu maka onwe ha.”—Dr. John Gottman.

Aghụghọ: “Ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye na-agụnyekarị aghụghọ, aghụghọ bụ n’ezie imebi ntụkwasị obi. Ebe a chọpụtara na ntụkwasị obi keere òkè dị ukwuu n’alụmdi na nwunye nile gara nke ọma ma dịtee aka, ọ̀ bụ ihe ijuanya na aghụghọ pụrụ ịkpa mmekọrịta alụmdi na nwunye aka ọjọọ?”—Dr. Nina S. Fields.

Mmekọahụ: “Ka ọ na-erule mgbe ndị mmadụ tinyere akwụkwọ ịgba alụkwaghịm, ọ na-abụkarị na a kwụsịwo nnọọ iso ha na-enwe mmekọahụ ruo ọtụtụ afọ. N’ọnọdụ ụfọdụ ọ dịtụghị mgbe mmekọahụ nwere ezi ọnọdụ n’alụmdi na nwunye ha, ná ndị ọzọkwa, mmekọahụ ha bụ nanị iji mezuo iwu, nanị iji gboo mkpa anụ ahụ nke onye òtù ọlụlụ.”—Judith S. Wallerstein, ọkà n’akparamàgwà mmadụ.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

OLEE OTÚ O SI EMETỤTA ỤMỤAKA?

Otú alụmdi na nwunye unu dị ọ̀ pụrụ imetụta ụmụ unu? Dị ka Dr. John Gottman, bụ́ onye nyochaworo ndị di na nwunye ruo ihe dị ka afọ 20 si kwuo, azịza ya bụ ee. “Ná nnyocha abụọ were afọ iri n’otu n’otu,” ka ọ na-ekwu, “anyị chọpụtara na obi ụmụ ọhụrụ nke ndị mụrụ ha na-enweghị obi ụtọ na-akụ akụ karị mgbe a na-egwusa ha egwu, ha apụghịkwa ịgụgụ onwe ha dị ka ndị ọzọ. Ka oge na-aga, esemokwu alụmdi na nwunye na-akpata emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, n’agbanyeghị ọgụgụ isi nke ụmụaka ahụ.” N’ụzọ dị iche, Dr. Gottman na-ekwu na ụmụ nke ndị di na nwunye na-akpa ezi àgwà “na-eme nke ọma karị ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ọha mmadụ, n’ihi na ndị mụrụ ha egosiwo ha otú e si eji nkwanye ùgwù emeso ndị ọzọ ihe ma na-achịkwa mkpasu iwe.”