Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Tulip Nyeere Ha Aka Ịdịgide Ndụ

Tulip Nyeere Ha Aka Ịdịgide Ndụ

Tulip Nyeere Ha Aka Ịdịgide Ndụ

N’ỌNWA ndị ikpeazụ nke Agha Ụwa nke Abụọ na Europe, nnọchibido nke ndị agha Nazi gbochiri ụzọ nile a na-eji esi na mmiri ebubata ihe oriri n’obodo ukwu ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ Netherlands. Ihe ndị si n’ime ya pụta mebiri ihe, dị ka ọtụtụ ndị lanarịrị oge ahụ pụrụ ịkwado.

Mmadụ kwesịrị inweta site n’ihe dị ka calorie 1,600 ruo calorie 2,800 kwa ụbọchị. Ma ka ọ na-erule n’April 1945, ụfọdụ n’ime ndị bi n’Amsterdam, Delft, The Hague, Leiden, Rotterdam, na Utrecht na-ejisi ike enweta nri ndị a na-ekenye ha kwa ụbọchị bụ́ ndị na-enye calorie dị site na 500 ruo 600 kwa ụbọchị. N’ihi nke a, e kweere na n’Oge Oyi ahụ E Nwere Agụụ na 1944/1945, ọ dịkarịa ala ndị nkịtị 10,000 nwụrụ n’ihi erighị ihe ndị na-edozi ahụ.

Dị ka otu onye lanarịrịnụ bụ́ Susan Monkman si kọọ, ezinụlọ ya malitere iri tulip. “Tulip nwere mkpo siri ezigbo ike,” ka Monkman na-ekwu. “N’agbanyeghị otú e siruru ya, ọ dịghị adị nro. Otú o sina dị, anyị nwere obi ụtọ iji nlezianya na-ata ya nwayọọ nwayọọ. Ha na-eme ka akpịrị na-afụ anyị ụfụ ruo ọtụtụ ụbọchị.” Iji nye aka belata ụfụ ọ na-akpata, a na-agwakọta tulip na karọt ole na ole ma ọ bụ sugar beet, ma ọ bụrụ na ha dị.

Tulip dị 100 gram n’arọ na-enwe ihe dị ka calorie 148, protein dị gram 3, fat dị gram 0.2, na carbohydrate dị gram 32. Ya mere, tulip na-adịghị atọ ụtọ pụrụ inyewo aka mee ka agụụ ghara ịgụgbu ọtụtụ ndị Netherlands.

Mmeso ọjọọ mmadụ na-emeso ibe ya, nke gbanyesiri mkpọrọgwu ike n’obi ọtụtụ ndị o metụtara, na-egosi nnọọ ókè ọ dịruru ihe a kpọrọ mmadụ mkpa ịhụ mmezu nke nkwa Bible bụ́: “Dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]

Internationaal Bloembollen Centrum, Holland