Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ugbu A Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nhapụ Papa M Hapụworo Anyị?

Ugbu A Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nhapụ Papa M Hapụworo Anyị?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Ugbu A Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nhapụ Papa M Hapụworo Anyị?

“Itolite n’enweghị papa n’ụlọ siiri m ike. Achọrọ m nnọọ obere nlebara anya.”—Henry. *

JOAN dị afọ 13 mgbe nna ya hapụrụ ụlọ. N’ịbụ onye mmanya na-aba n’anya riri nnọọ ahụ, o mekebeghị mgbalị ịkpọtụrụ ụmụ ya mgbe ọ kwapụsịrị. Ọ dị mwute na ọ bụghị nanị Joan; ọtụtụ ndị ntorobịa abụrụwo ndị nna ha gbahapụrụ.

Ọ bụrụ na nke a emewo gị, ọ pụrụ isiri gị ike nnagide n’ezie. Mmetụta nke ihe mgbu na iwe pụrụ irikpu gị mgbe ụfọdụ. Ị pụrụ inwe mwute na ịda mbà n’obi mgbe ụfọdụ. A pụrụ ọbụna ịkpali gị inupụ isi. Dị ka onye so dee Bible bụ́ Solomọn kwuru n’otu oge, “mmegbu na-eme ka onye maara ihe ghọọ onye nzuzu.”—Eklisiastis 7:7.

‘Ime Dị Ka Onye Nzuzu’

James ‘mere dị ka onye nzuzu’ mgbe nna ya hapụsịrị ụlọ. James kwuru, sị: “Erubeghịrị m ịbụisi ọ bụla isi, ọbụnadị mama m. Adabara m n’ọtụtụ nsogbu. Ana m agha ụgha mgbe nile ma na-ezopụ n’abalị n’ihi na ọ dịghị onye na-enye m ọzụzụ. Mama m gbalịrị ịkwụsị m, ma ọ pụghị.” Nnupụisi ò meziwanyere ọnọdụ James ná ndụ n’ezie? Ọ dịghị ma ọlị. James sịrị na n’oge na-adịghị anya na ya nọ “na-anwale ọgwụ ọjọọ, na-ahapụ ije akwụkwọ, ma na-ada n’ule.” N’oge na-adịghị anya àgwà ọjọọ ahụ bịara ka njọ. “Ezugasịrị m ihe n’ụlọ ahịa,” ka o kwupụtara, “apụnakwaara m ndị mmadụ ihe. A nwụchiri m ugboro abụọ ma tụba m n’ụlọ mkpọrọ ruo nwa oge, ma nke ahụ emeghị ka m kwụsị.”

Mgbe a jụrụ ya ihe mere o ji enupụkarị isi, James sịrị: “N’ihi na nna m akwapụwo, enweghịzi m ọzụzụ. N’ezie, echetụdịghị m otú m si na-emejọ mama m, nwanne m nwoke nke nta na nwanne m nwanyị, nakwa onwe m. Achọrọ m nlebara anya na ọzụzụ nke papa m.”

Ma inupụ isi na-eme nanị ka ọnọdụ ọjọọ ka njọ. (Job 36:18, 21) Dị ka ihe atụ, James buteere ọ bụghị nanị onwe ya nsogbu, kamakwa nne ya na ụmụnne ya, bụ́ ndị na-enwe nchekasị na uche mkpasasị ha na-ekwesịghị inwe. Ọbụna nke ka njọ bụ eziokwu ahụ bụ́ na akparamàgwà nnupụisi pụrụ ime ka mmadụ na Chineke n’onwe ya ghara ịdị ná mma. E kwuwerị, Jehova nyere ndị na-eto eto iwu irubere nne ha isi.—Ilu 1:8; 30:17.

Imeri Iwe Ahụ

Oleezi otú i nwere ike isi merie iwe na ọnụma ị pụrụ inwe n’ebe nna gị nọ? Nke mbụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ichetara onwe gị na ọpụpụ nna gị pụrụ esighị gị n’aka. Ọ pụtachaghịkwa na ọ hụghịzi gị n’anya ma ọ bụ na-eche banyere gị. N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ ihe mwute mgbe nna na-emekebeghị mgbalị ịkpọ na fon ma ọ bụ ime nleta. Ma dị ka isiokwu bu nke a ụzọ n’usoro isiokwu a si gosi, * ọtụtụ nna gbahapụrụ ụmụ ha adịghị ezitere ha ozi, ọ bụghị n’ihi na ha ahụghị ha n’anya, kama n’ihi na obi amamikpe na ihere erikpuwo ha. Ndị ọzọ, dị ka nna Joan, bụ ndị ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mmanya na-aba n’anya riworo ahụ, nke a na-egbochikwa ikike ha ime ihe ha kwesịrị ime.

N’agbanyeghị ọnọdụ dịnụ, gbalịa icheta na ndị mụrụ gị ezughị okè. Bible na-ekwu, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23; 5:12) N’ezie, nke a adịghị eme ka akparamàgwà ọjọọ ma ọ bụ nke ejighị ihe akpọrọ ihe zie ezie. Ma ịghọta eziokwu ahụ bụ́ na anyị nile ketara ezughị okè pụrụ ime ka ọ kara gị mfe ịhapụ iwe na ọnụma na-ebibi ihe.

Ihe e kwuru n’Eklisiastis 7:10 pụrụ inyere gị aka imeri iwe na ọnụma ị pụrụ inwe n’ebe ndị mụrụ gị nọ. Rịba ama otú o si dọọ aka ná ntị megide ilekwasị anya n’oge gara aga: “Asịla, Gịnị kpatara ụbọchị mbụ ji dị mma karịa ụbọchị ndị a? n’ihi na i siteghị n’amamihe jụọ ajụjụ banyere nke a.” Ya mere, kama ilekwasị anya n’otú ihe dị n’oge gara aga, ọ ka mma ilekwasị anya n’iji ọnọdụ gị mee ihe kasị mma.

Ibute Ụzọ

Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịtụle ibute ụzọ n’ịkpọtụrụ nna gị. N’eziokwu, ọ bụ ya hapụrụ gị, ị pụkwara iche n’ụzọ ziri ezi na ọ bụ ibu ọrụ ya ibu ụzọ mee ihe. Ma ọ bụrụ na o mebeghị otú ahụ, gị ana-enwekwa mwute na obi ilu n’ihi na ị kpọtụrụbeghị ya, ọ̀ pụrụ ikwesị ekwesị gị ịgbalị imeziwanye ọnọdụ ahụ n’onwe gị? Tụlee otú Jisọs Kraịst si meghachi omume mgbe ụfọdụ n’ime ndị enyi ya mejọrọ ya. N’abalị ikpeazụ nke ndụ ya dị ka mmadụ, ndị ozi ya gbahapụrụ ya. Pita etuworị ọnụ na ya ga-arapagidesi ike n’ahụ Jisọs ihe ọ sọrọ ya mee. Otú ọ dị, Pita gọnahụrụ Jisọs—ọ bụghị otu ugboro kama ugboro atọ!—Matiu 26:31-35; Luk 22:54-62.

Otú ọ dị, Jisọs nọgidere na-ahụ Pita n’anya n’agbanyeghị adịghị ike ya. Mgbe Jisọs bilitesịrị n’ọnwụ, o butere ụzọ n’ime ka ha nweghachi ezi mmekọrịta site n’ime ka Pita hụ ya anya n’ụzọ pụrụ iche. (1 Ndị Kọrint 15:5) N’ụzọ na-akpali mmasị, mgbe Jisọs jụrụ Pita ajụjụ bụ́, “Ị hụrụ m n’anya?” Ihe Pita zaghachiri ya bụ “Ee, Onyenwe anyị; Gị onwe gị matara na Ị bụ enyi m.” N’agbanyeghị omume ya ndị na-eme ihere, Pita ka hụrụ Jisọs n’anya.—Jọn 21:15.

Dị ka ọ dị n’ihe banyere Pita na Jisọs, ọ pụrụ ịbụ na ọnọdụ gị na nna gị abụghị nke olileanya na-adịghị na ya dị ka o yiri. Ikekwe, ọ ga-emeghachi omume n’ụzọ dị mma ma i bute ụzọ n’ihe ndị dị ka ịkpọ fon, ide akwụkwọ ozi, ma ọ bụ ime nleta. Henry, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-echeta, sị: “M degaara papa m akwụkwọ ozi otu ugboro, o zitekwaara m akwụkwọ ozi, na-ekwu na ya ji m eme ọnụ. Etinyere m akwụkwọ ozi ahụ n’ọbọ enyo ma dowe ya n’ahụ ájá ruo ọtụtụ afọ. M ka dowere ya ruo taa.”

N’otu aka ahụ, Joan na ụmụnne ya butere ụzọ n’ije na nke nna ha bụ́ onye aṅụrụma. “Ọnọdụ ya amagbughị onwe ya,” ka Joan na-ekweta, “ma ịhụ ya anya ka dị mma.” Ikekwe, ibute ụzọ ga-abara gị uru. Ọ bụrụ na o meghachighị omume n’ụzọ dị mma ná mmalite, ị pụrụ ịhapụ ka oge ụfọdụ gafee, mgbe ahụ nwaakwa ọzọ.

Ịnagide Ihe Mgbu nke Ịbụ Onye A Jụrụ Ajụ

Solomọn na-echetara anyị na e nwere “mgbe ịchọ achọ, na mgbe ime ka ihe laa n’iyi.” (Eklisiastis 3:6) Mgbe ụfọdụ, onye ntorobịa aghaghị ịnakwere eziokwu ahụ dị mwute bụ́ na nna ya achọghị iso ụmụ ya nwee mmekọrịta. Ọ bụrụ na nna gị mere otú ahụ, ikekwe otu ụbọchị ọ ga-aghọta otú ihe funahụworo ya hà n’ihi ya ejigideghị mmekọrịta gị na ya.

Ma, ka ọ dịgodị, jide n’aka na ọjụjụ ọ jụrụ gị apụtaghị na ị baghị uru. Ọbụ abụ so dee Bible bụ́ Devid kwuru, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Ee, ị ka dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.—Luk 12:6, 7.

Ya mere ọ bụrụ na i nwee nkụda obi ma ọ bụ mwute, bịaruo Chineke nso n’ekpere. (Abụ Ọma 62:8) Gwa ya kpọmkwem otú ọ dị gị. Jide n’aka na ọ ga-ege gị ntị ma kasie gị obi. Ọbụ abụ ọzọ so dee Bible dere, sị: “Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 94:19.

Gị na ndị Kraịst ibe gị inwe ezi mkpakọrịta pụkwara inyere gị aka ịnagide ọjụjụ dị otú ahụ. Ilu 17:17 na-ekwu, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” Ị pụrụ ịchọta ezi ndị enyi dị otú ahụ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova. Ọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka karịsịa ịmata ụfọdụ n’ime ndị nlekọta ọgbakọ. Nwanne Joan nke nwoke bụ́ Peter na-enye ndụmọdụ a: “Soro ndị okenye nọ n’ọgbakọ kwurịta okwu, ha ga-enyekwa aka nke ukwuu. Ọ bụrụ na nna gị agbahapụwo gị, mee ka ha mara otú ọ dị gị.” Ndị nlekọta ọgbakọ pụkwara ịtụ aro ụfọdụ dị irè banyere ịrụ ọrụ ụfọdụ nna gị na-arụbu, dị ka ịrụzi ụlọ.

Nne gị pụkwara inye nkwado. N’eziokwu, ọ pụrụ ịdị na-enwe nsogbu mmetụta uche n’onwe ya. Ma ọ bụrụ na i were nkwanye ùgwù kwupụta mmetụta gị, obi abụọ adịghị ya na ọ ga-eme ike ya.

Kwado Ezinụlọ Unu!

Ọpụpụ nna gị nwere ike imetụta ezinụlọ unu n’ọtụtụ ụzọ. Ọ pụrụ ịdị nne gị mkpa inweta ọrụ—ikekwe ọbụna ọrụ abụọ—iji nweta ihe e ji ebi ndụ. Ọ pụrụ ịbụ na gị na ụmụnne gị aghaghị iburu ibu ọrụ ndị ọzọ nke ezinụlọ. Ma ị pụrụ ịnagide mgbanwe ndị dị otú ahụ ma ị zụlite ịhụnanya nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị dị ka onye Kraịst. (Ndị Kọlọsi 3:14) Nke a pụrụ inyere gị aka ijigide àgwà ziri ezi ma merie mkpasu iwe. (1 Ndị Kọrint 13:4-7) Peter na-ekwu, sị: “Inyere ezinụlọ anyị aka bụ ihe ziri ezi ime, ana m enwetakwa afọ ojuju ịmara na ana m enyere mama m na ụmụnne m ndị nwanyị aka.”

Obi abụọ adịghị ya na nna ịhapụ ụlọ bụ ọdachi na ihe mwute. Ma ị pụrụ ijide n’aka na site n’enyemaka Chineke nakwa n’enyemaka ndị enyi na ezinụlọ na-ahụ n’anya bụ́ ndị Kraịst, gị na ezinụlọ unu pụrụ ịnagide ya. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwere aha.

^ par. 11 Lee isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . N’ihi Gịnị Ka Papa M Ji Hapụ Anyị?” dị ná mbipụta anyị nke December 8, 2000.

^ par. 27 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ibi n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna, lee isiokwu “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” bụ́ ndị dị ná mbipụta (Bekee) ndị nke December 22, 1990, na March 22, 1991.

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Ụfọdụ ndị ntorobịa ebutewo ụzọ n’ịkpọtụrụ nna ha