Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nke ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e depụtara, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 16. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)

1. N’ọzara, olee okwu e ji mee ihe maka ebe obibi Mosis na maka ụlọikwuu ahụ dị nsọ? (Ọpụpụ 33:7; 39:40)

2. Olee ebe ụlọ nsọ Daịana dị, bụ́ nke e weere dị ka otu n’ime ihe ịtụnanya asaa nke ụwa oge ochie? (Ọrụ 19:26, 27)

3. N’Iwu Mosis, òkè dị aṅaa ka a ga-ekenye ndị Livaị, n’ihi gịnịkwa? (Deuterọnọmi 26:12)

4. Olee onye bụbu nwanyị na-akwa iko nke ghọrọ nne nne Jisọs? (Matiu 1:5)

5.N’obodo dị aṅaa ka Pọl matara Akwila na Prisila? (Ọrụ 18:1-3)

6. “Ịchọ mma” dị aṅaa ka Pita tụrụ aro ya maka ndị inyom bụ́ ndị Kraịst? (1 Pita 3:3, 4)

7. Ọrụ dị aṅaa ka a na-aghaghị ịrụ tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe a eruo? (Matiu 24:14)

8. Aha ahụ bụ́ Siza ghọrọ utu aha kwekọrọ na gịnị?

9. Olee akụkụ dị ịrịba ama n’ihe agha ime mmụọ nke onye Kraịst nke na-enyere ya aka “imenyụ àkụ́ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ”? (Ndị Efesọs 6:16)

10. N’oge ochie, gịnị ka a na-eji eme ka ụgbọ mmiri na-aga aga? (Ezikiel 27:6, 7, 29)

11. Olee ihe na-esoghị n’ihe oriri mmadụ tupu Iju Mmiri ahụ? (Jenesis 9:3, 4)

12. Olee ihe na-egbochi mmiri ịbanye n’ihe, nke e ji mee ihe n’iwu ụgbọ ahụ? (Jenesis 6:14)

13. Gịnị ka Jisọs kwuru na ọ dị “aghụghọ,” nke pụrụ ịkpagbu okwu Alaeze ahụ ma mee ka mmadụ ghara ‘ịmị mkpụrụ’? (Matiu 13:22)

14. Gịnị ka Pita kwuru ga-esi na mmadụ ime ka mkpụrụ obi ya dị ọcha site ‘n’ịṅa eziokwu ahụ ntị’ pụta? (1 Pita 1:22)

15. Mgbe “Mmụọ Nsọ gbochiri ha ikwu okwu Chineke n’Esia” na njem ozi ala ọzọ nke abụọ ya, olee ebe Pọl jewere? (Ọrụ 16:6)

16. Nganihu dị aṅaa nke pụtara “nwa,” ka a na-ahụkarị n’aha ndị Hibru? (Jenesis 35:18)

17. Gịnị mere Eze Ụzaịa mgbe o mesịrị omume mpako ya nke isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụlọ nsọ ahụ? (2 Ihe E Mere 26:19-21)

18. Gịnị ka a na-ejikarị eme uwe mwụda nke onye amụma? (2 Ndị Eze 1:8; Matiu 3:4)

19. Dị ka ihe àmà na-egosi, olee Siza nke mere ka e gbuo Pọl?

20. Ònye bụ onye mbụ e kwuru kpọmkwem nke ji aha Chineke mee ihe? (Jenesis 4:1)

Azịza Nye Ajụjụ

1. “Ụlọikwuu nzute”

2. N’Efesọs

3. Otu ụzọ n’ụzọ iri. N’ihi na ha enweghị ihe nketa n’ala ahụ kama ha tinyere onwe ha n’ije ozi ụlọ nsọ ahụ

4. Rehab

5. Kọrint

6. “Mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo”

7. A ghaghị ikwusa ‘ozi ọma nke Alaeze’ ahụ n’ụwa nile

8. Eze Ukwu

9. “Ọta nke bụ́ okwukwe”

10. Ákwà ifufe na ụmara

11. Anụ

12. Bitumen

13. “Akụ̀”

14. “Ịhụnanya nke ihu abụọ na-adịghị ya”

15. “N’ala Frijia na Galetia”

16. Ben

17. Jehova mere ka ekpenta bịakwasị ya

18. Ajị camel ma ọ bụ ajị ewu

19. Nero

20. Iv