Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide Ihe Ndọghachi Azụ Site n’Isetịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ

Ịnagide Ihe Ndọghachi Azụ Site n’Isetịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ

Ịnagide Ihe Ndọghachi Azụ Site n’Isetịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ

OTU ụlọ dị nso n’Ọdụ Ụgbọelu LaGuardia dị na New York bụ ebe obibi William (Bill) Meiners na nwunye ya, bụ́ Rose. N’ebe ahụ ka Rose, nwanyị nwere obiọma dị afọ 75 nke nwere onye ọbịa, ji ihu ọchị na-anabata onye ọbịa ya. N’ime ụlọ ahụ, mmadụ aghaghị ịhụ otú palọ ha na-eme ka ahụ ruo mmadụ ala si egosipụta àgwà inwe nchekwube ya. Okooko osisi ndị mara mma e debere n’usoro na nso ọnụ ụzọ na ihe ndị mara mma e sere n’ahụ ájá na-egosi ọṅụ na mmasị ha nwere ná ndụ.

Ọnụ ụlọ ọzọ a ga-ahụ ma a gafee palọ ahụ bụ otu ọnụ ụlọ ìhè dị na ya bụ́ ebe Bill, bụ́ onye dị afọ 77, ji azụ dinara n’àkwà nwere matarasị a pụrụ ịgbada agbada nke mere ka isi ya gbalite elu. Mgbe ọ hụrụ onye ọbịa ya, anya ya nke na-egosipụta obiọma gbukepụrụ, ọ mụmụọkwa nnọọ ọnụ ọchị. Ọ gaara amasị ya ibili ọtọ, ikwe n’aka, nakwa ibi ọma, ma o nweghị ike ha. E wezụga aka ekpe ya, ahụ Bill kpọnwụrụ akpọnwụ site n’olu ya gbadaa.

N’ihi na Bill echewo nsogbu ahụ ike ihu eri ọ dị afọ 26, a jụrụ ya ihe nyewooro ya aka ịnagide ọrịa ruo ihe karịrị ọkara narị afọ. Bill na Rose lerịtara onwe ha anya dị ka a gwara ha ihe ọchị. “Anyị amaghị onye ọ bụla na-arịa ọrịa!” ka Rose na-ekwu ka ọ na-achị ọchị dara ụda n’ọnụ ụlọ ahụ. Bill asaghee anya ya n’obi ụtọ; ọ chịtụ ọchị ma kwee n’isi iji gosi na ya kwenyere. “Ọ dịghị onye na-arịa ọrịa ebe a,” ka o kwuru otu otu site n’akpịrị ya. Rose na Bill kwurịtara okwu n’ụzọ egwuregwu, n’oge na-adịghị anya ọchị jupụtara n’ọnụ ụlọ ahụ. N’ụzọ doro anya, ịhụnanya Bill na Rose nwere n’ebe ibe ha nọ mgbe ha zutere laa azụ na September 1945 ka siri nnọọ ike. A jụrụ Bill ọzọ, sị: “Ma, egwuregwu laa azụ, ihe ndọghachi azụ ndị dị aṅaa ka i nweworo? Gịnị nyewokwaara gị aka ịtachi obi ma nọgide na-enwe echiche ziri ezi ná ndụ?” Mgbe e jiri nwayọọ gbatụsịa ya ume, Bill kwetara ịkọ akụkọ ya. Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ọtụtụ mkparịta ụka Teta! na Bill na nwunye ya nwere.

Ihe Ndọghachi Azụ Amalite

N’October 1949—afọ atọ mgbe ọ lụsịrị Rose nakwa ọnwa atọ mgbe a mụsịrị nwa ha nwanyị, bụ́ Vicki—a gwara Bill na o nwere akpụ cancer n’otu n’ime akwara ụda olu ya, a wapụkwara akpụ ahụ. Ọnwa ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, dọkịta Bill gwara ya banyere ihe ndọghachi azụ ọzọ—ọrịa cancer ahụ emetụtawo akwara nkọlọ ya dum. “A gwara m na ọ bụrụ na e bepụghị akwara nkọlọ ahụ dum—m ga-adị ndụ ruo nanị afọ abụọ.”

A gwara Bill na Rose ihe ga-esi n’ịwa ahụ a pụta. Akwara nkọlọ ahụ, ma ọ bụ ebe na-ewepụta ụda okwu, malitere n’úkwù ire ruo n’ebe akwara gara n’akpa ume malitere. Akwara ụda olu abụọ dị n’ime akwara nkọlọ. Mgbe ikuku si n’akpa ume gafere n’akwara ndị ahụ, ha na-ama jijiji ma wepụta ụda okwu. E bepụ akwara nkọlọ, a na-ejikọta isi akwara gara n’akpa ume na oghere ga-adịgide adịgide e bepuru n’akpịrị. Mgbe a wasịrị mmadụ ahụ, ọ ga-esi n’oghere a na-eku ume—ma ọ gaghịzi na-ekwu okwu.

“Mgbe m nụrụ nkọwa a, iwe bịara m,” ka Bill na-ekwu. “Anyị nwere obere nwa nwanyị, m na-arụ ezigbo ọrụ, anyị nwere atụmanya dị ukwuu ná ndụ anyị, ma ugbu a atụmanya m nile adaala.” Ma ebe ọ bụ na ibepụ akwara nkọlọ pụrụ ịzọpụta ndụ ya, Bill kweere ka a waa ya ahụ. “Mgbe a wasịrị m ahụ,” ka Bill na-akọ, “enweghị m ike ilo ihe. Enweghị m ike ikwupụta otu mkpụrụ okwu. Adara m ogbi.” Mgbe Rose bịara leta Bill, ọ na-ekwu okwu nanị site n’ide ihe ná mpempe akwụkwọ. Ọ bụụrụ ha oge ọjọọ. Iji nagide ihe ndọghachi azụ a, ha setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ ndị ọhụrụ.

Ịda Ogbi na Enweghị Ọrụ

Ọ bụghị nanị na akwara nkọlọ ahụ e bepụrụ mere ka Bill bụrụ onye ogbi kamakwa onye na-enweghị ọrụ. Ọ na-arụbu n’ebe a na-ejikọta akụkụ ahụ ígwè ọrụ, ma ugbu a ọ pụrụ nanị iku ume site n’oghere dị n’akpịrị ya, uzuzu na anwụrụ ọkụ pụrụ itinye akpa ume ya n’ihe ize ndụ. Ọ dị ya mkpa ịchọta ọrụ ọzọ. Ebe ọ ka nwebeghị ike ikwu okwu, o denyere aha ya n’otu ụlọ akwụkwọ ịmụ ịrụ elekere mgbanaka. “O yiri ọrụ ochie m,” ka Bill na-ekwu. “Amaara m otú e si ejikọta akụkụ ahụ ígwè ọrụ, mgbe ị na-arụkwa elekere mgbanaka, ị ga na-ejikọtakwa akụkụ dị iche iche. Nanị na akụkụ ndị ahụ adịghị kilogram 22.6 n’arọ!” Ozugbo ọ gụchara akwụkwọ maka ịrụ elekere mgbanaka, ọ chọtara ọrụ dị ka onye na-arụ elekere mgbanaka. O ruwo otu ihe mgbaru ọsọ.

Ka ọ dịgodị, Bill malitekwara ịga klas a na-akụzi otú e si eji okpo akpịrị ekwu okwu. N’iji okpo akpịrị ekwu okwu, ọ bụghị akwara ụda olu na-ewepụta okwu kama ọ bụ ịma jijiji nke okpo akpịrị, bụ́ akwara na-esi n’akpịrị ebuga nri n’afọ. Na mbụ, a ga-amụ otú e si elo ikuku ma mee ka ọ gbadaa n’okpo akpịrị. Mgbe ahụ, onye ahụ ga-ebi nkọ n’ụzọ a chịkwara achịkwa. Ka ikuku ahụ na-apụta, ọ na-eme ka akụkụ okpo akpịrị na-ama jijiji. Nke a na-ewepụta ụda dị ala, bụ́ nke mmadụ pụrụ iji ọnụ na egbugbere ọnụ ya mee ka ọ ghọọ okwu.

“Na mbụ, m na-ebi nkọ nanị mgbe m ribigara nri ókè,” ka Bill ji ịmụmụ ọnụ ọchị kwuo, “ma ugbu a aghaghị m ịmụta ụzọ isi na-ebi nkọ n’esepụghị aka. Ná mmalite, ana m ejisi ike ekwu nanị otu okwu n’otu mgbe, dị ka nke a: ‘[m kuru ume, loo ya, bie nkọ] Olee [m kuru ume, loo ya, bie nkọ] otú [m kuru ume, loo ya, bie nkọ] i [m kuru ume, loo ya, bie nkọ] mere?’ Ọ dịghịrị m mfe. Mgbe ahụ, onye nkụzi m gwara m ka m na-aṅụhi mmanya ginger ale nne n’ihi na ukoro ya ga-enyere m aka ibi nkọ. Ya mere mgbe ọ bụla Rose na Vicki gara mkpagharị, m ga-anọ nnọọ na-aṅụ mmanya ma na-ebi nkọ. Etinyere m nnukwu mgbalị na ya!”

Ọ bụ ezie na ihe dị ka pasent 60 nke ndị nile e bepụrụ akwara nkọlọ ha adịghị amụtali iji okpo akpịrị ekwu okwu, Bill nwere ọganihu. Vicki, bụ́ onye dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ mgbe ahụ, na-akwali ya n’amaghị ama. Bill na-akọwa, sị: “Vicki na-agwa m okwu ma na-elezi m anya, na-eche ka m zaghachi ya. Ma apụghị m ikwu otu mkpụrụ okwu ná nzaghachi. Ọ na-ekwu ihe ọzọ, ma o nweghịkwa ihe m na-azaghachi ya. N’ịbụ onye iwe were, Vicki na-agakwuru nwunye m ma kwuo, sị: ‘Gwanụ papa m ka ọ gwa m okwu!’ Okwu ya na-emetụ m n’ahụ ma mee ka m kpebisie ike ikwu okwu ọzọ.” Bill nwere ihe ịga nke ọma bụ́ nke mere ka Vicki, Rose, na ndị ọzọ nwee ọṅụ. O ruru otu ihe mgbaru ọsọ ọzọ.

Inwe Ọdachi Ọzọ

Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ 1951, Bill na Rose banyere ọzọ n’ọnọdụ amaghị nke a ga-eme. N’ịtụ egwu na ọrịa cancer ahụ ga-abịaghachi, ndị dọkịta nyere Bill ndụmọdụ ka e jiri ụzarị ọkụ gwọọ ya. Bill kweere. Mgbe a gwọchara ya, ọ nụrụ ya ọkụ n’obi ịmaliteghachi ndụ. Ọ maghị na ọdachi ọzọ gaje imetụta ahụ ike ya!

Ihe dị ka otu afọ gafere. Mgbe ahụ, otu ụbọchị mkpịsị aka Bill sinwụrụ. Ọzọ, ọ pụghị ịrịgo steepụ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, ọ dara n’ala ka ọ na-aga ije, ọ pụghịkwa iji ụkwụ ya guzoro ọtọ. Ahụ e lere ya gosiri na ụzarị ọkụ ahụ e ji gwọọ Bill (bụ́ nke na-adịrughị mma n’oge ahụ otú ọ dị taa) emebiwo akwara ọkpụkpụ azụ ya. A gwara ya na ọnọdụ ya ga-aka njọ. Otu dọkịta gwara ya ọbụna na o ‘nweghị ohere ọ bụla’ ịdị ndụ. Bill na Rose nwere nchegbu dị ukwuu.

N’agbanyeghị nke ahụ, ná mgbalị ịnagide ihe ndọghachi azụ a, Bill nọrọ ọnwa isii n’ụlọ ọgwụ ebe e ji usoro mmega ahụ na-agwọ ọrịa. Ọ bụ ezie na usoro ọgwụgwọ ahụ agbanweghị ọnọdụ ahụ ike ya, ọnụnọ ọ nọrọ n’ụlọ ọgwụ ahụ gbanwere ụzọ ndụ ya—mgbanwe nke mesịrị mee ka ọ mara Jehova. Olee otú nke ahụ si mee?

Ịbụ Onye E Wusiri Ike Site n’Ịghọta Ihe Kpatara Ndọghachi Azụ

N’ime ọnwa isii ahụ, Bill na ndị ikom 19 nwere ahụ mkpọnwụ nọkọrọ n’otu ọnụ ụlọ nke ụlọ ọgwụ ndị Juu—ha nile bụ ndị Juu na-ekpe okpukpe Ọtọdọks. Ndị ikom a na-ekwurịta banyere Bible kwa ehihie. Bill, bụ́ onye na-aga chọọchị Baptist, nọ na-egere nanị egere. Ma ka ọ na-erule mgbe o si n’ụlọ ọgwụ ahụ lọta, ọ nụwo ihe ga-ezuru ya ikpebi na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile bụ nanị otu onye nakwa na ozizi Atọ n’Ime Otu megidere Bible. N’ihi ya, Bill agaghị chọọchị ya ọzọ. Otú o sina dị, ọ dị ya mkpa inweta nduzi ime mmụọ iji nagide ndọghachi azụ nke ndụ. “Anọgidere m na-arịọ Chineke maka enyemaka,” ka Bill na-ekwu, “ọ zakwara ekpere m.”

N’otu Saturday na 1953, Roy Douglas, otu nwoke kataworo ahụ bụ́ onye bụbu onye agbata obi ya, bụ́kwa onye nụrụ banyere ọnọdụ Bill, bịara na nke ya. Roy, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, gwara Bill ka ya na ya na-amụ Bible, Bill kwetakwara. Ihe Bill gụtara na Bible nakwa n’akwụkwọ bụ́ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu” * meghere anya ya. Ọ gwara Rose ihe ọ mụtara, o wee sonye n’ọmụmụ ihe ahụ. Rose na-echeta, sị: “A gwara anyị na chọọchị na ọrịa bụ ntaramahụhụ sitere n’aka Chineke, ma ọmụmụ Bible anyị gosiri na nke a abụghị eziokwu. Obi ruru anyị ala.” Bill na-ekwukwa, sị: “Isi na Bible mụta ihe kpatara nsogbu nile, gụnyere ọrịa m, na ịchọpụta na ọdịnihu ka mma gaje ịbịa, nyeere anyị aka ịnagide ọnọdụ m.” Na 1954, Bill na Rose ruru ihe mgbaru ọsọ ọzọ. E mere ha abụọ baptism dị ka Ndịàmà Jehova.

Imekwu Mgbanwe

Ka ọ dịgodị, ahụ mkpọnwụ Bill eruwo n’ókè nke na o nweghịzi ike ịrụ ọrụ ya. Iji nweta ihe e ji ebi ndụ, Bill na Rose gbanwerịtara ọrụ: Bill na Vicki na-anọ n’ụlọ, Rose malitekwara ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ na-arụ elekere mgbanaka—ọrụ ọ rụruru afọ 35!

“Ilekọta nwa anyị nwanyị nyere m ọṅụ dị ukwuu,” ka Bill na-akọ. “Ọ masịkwara obere Vicki. Ọ na-eji nganga agwa onye ọ bụla ọ hụrụ: ‘m na-elekọta papa m!’ Ka e mesịrị, mgbe ọ malitere akwụkwọ, m na-enye aka emere ya ihe omume ọ na-eme n’ụlọ, anyị na-azụkwa okwe mgbe mgbe. Ọzọkwa, enwere m ohere dị mma inye ya ntụziaka Bible.”

Ịga nzukọ ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ihe ọzọ na-enye Bill na ezinụlọ ya ọṅụ. Ọ na-ewe ya otu awa isi n’ụlọ ya tere ụkwụ ruo Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ dịghị ahapụ ịga nzukọ. Ka e mesịrị, mgbe ha kwagasịrị n’akụkụ ọzọ nke obodo ahụ, Bill na Rose zụtara otu obere ụgbọala, ọ bụkwa Rose na-ebu ezinụlọ ahụ aga ụlọ nzukọ ha. Ọ bụ ezie na Bill na-enwe ike ekwu okwu ruo nanị nwa oge, o denyere aha ya n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke dị ka nwa akwụkwọ. Bill na-akọwa, sị: “M na-edepụta ihe m ga-ekwu, ọ bụkwa nwanna ọzọ na-ekwu ya. Mgbe e kwuchara okwu ahụ, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na-enye m ndụmọdụ na-adabere n’ihe m dere.”

Ndị dị iche iche nọ n’ọgbakọ nyekwaara Bill aka ikere òkè n’ọrụ nkwusa mgbe nile. N’abụghịkwa ihe ijuanya nye ndị maara maka ikwesị ntụkwasị obi ya, e mesịrị họpụta Bill dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Mgbe ahụ, mgbe ụkwụ ya na-ekwekwaghị ya, ahụ mkpọnwụ ahụ akakwa njọ, ọ dịghịzi enwe ike isi n’ụlọ apụta ma mesịa bụrụ onye na-adịghị esi n’àkwà ebili. Ọ̀ pụrụ ịnagide ihe ndọghachi azụ a?

Ihe Mmegharị Aka Na-enye Afọ Ojuju

“N’ihi ịnọ n’ụlọ ogologo ụbọchị dum, achọrọ m ihe m ga-eji na-emegharị aka,” ka Bill na-ekwu. “Ise foto na-amasị m tupu m nwee ahụ mkpọnwụ. Ya mere echiche ise ihe osise bịara m n’isi, ọ bụ ezie na esetụbeghị m ihe ná ndụ m. Ọzọkwa, ana m eme aka nri, ma aka nri m dum na mkpịsị aka abụọ nke aka ekpe m kpọnwụrụ akpọnwụ. Ka o sina dị, Rose zụtara ọtụtụ akwụkwọ ndị na-akụzi otú e si ese ihe. Agụrụ m ha ma malite iji aka ekpe m na-ese ihe. A kpọrọ ọtụtụ n’ime ihe ndị m sere ọkụ, ma ka e mesịrị amalitere m ịmụta ya.”

Ihe osise ndị nwere àgwà dị iche iche bụ́ ndị chọrọ ụlọ Bill na Rose mma ugbu a na-egosi na Bill nwere ihe ịga nke ọma karịa otú ọ tụrụ anya ya. “N’ihe dị ka afọ ise gara aga,” ka Bill na-ekwukwasị, “aka ekpe m malitere ịma jijiji nke ukwuu nke na akwụsịrị m ise ihe kpam kpam, ma ruo ọtụtụ afọ ihe a m ji emegharị aka nyere m afọ ojuju dị ukwuu.”

Ihe Mgbaru Ọsọ nke Fọdụrụnụ

Bill na-akọ, sị: “Ihe karịrị afọ 50 agafewo ugbu a eri nsogbu ahụ ike m malitere. Ịgụ Bible ka na-akasi m obi, karịsịa mgbe m gụrụ Abụ Ọma na akwụkwọ Job. M na-enwekwa mmasị ịgụ akwụkwọ dị iche iche Watch Tower Society na-ebipụta. M na-enwetakwa agbamume dị ukwuu ma ndị ọgbakọ anyị na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị bịa na nke m ma kọọrọ m ahụmahụ ndị na-ewuli elu. Tụkwasị na nke a, usoro telifon jikọtara ụlọ anyị na Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ka m na-ege ntị ná nzukọ, m na-enwetakwa ọbụna ihe omume mgbakọ bụ́ ndị e tinyere na teepu.

“M nwere ekele na e ji nwunye na-ahụ n’anya gọzie m. N’ime ọtụtụ afọ ahụ nile, ọ nọwo na-abụ ezi enyi m. Ọzọkwa, nwa anyị nwanyị, bụ́ onye ya na ezinụlọ nke ya na-ejere Jehova ozi ugbu a, ka bụ ihe na-enye m nnukwu ọṅụ. M na-ekele Jehova karịsịa maka inyere m aka ịbịa Ya nso. Taa, ka ike na-agwụwanye ahụ m na ụda olu m, m na-echetakarị ihe Pọl onyeozi kwuru: ‘Ike agwụghị anyị n’obi; kama a sị na ọ bụ ezie na mmadụ elu ahụ anyị na-ere ure, ma a na-eme ka mmadụ ime anyị bụrụ ihe ọhụrụ kwa ụbọchị.’ (2 Ndị Kọrint 4:16) Ee, ịmụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụhaala na m dị ndụ—nke ahụ ka bụ ihe mgbaru ọsọ m.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara; a dịghịzi ebipụta ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

“Mgbe a wasịrị m ahụ, enweghị m ike ilo ihe. Enweghị m ike ikwupụta otu mkpụrụ okwu. Adara m ogbi.”

[Foto dị na peeji nke 25]

Bill na Rose taa