Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Na-enye Obi Ike Ma Na-ewusi Okwukwe Ike’

‘Ọ Na-enye Obi Ike Ma Na-ewusi Okwukwe Ike’

‘Ọ Na-enye Obi Ike Ma Na-ewusi Okwukwe Ike’

USORO ỌMỤMỤ BIBLE NKE ZURU ỤWA ỌNỤ nke Ndịàmà Jehova na-ahụ maka ya gụnyere n’oge na-adịbeghị anya ọmụmụ ihe were ọtụtụ ọnwa banyere akụkọ ihe mere eme nke mgbe ochie nakwa amụma, dị ka e dekọrọ ha n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel. Rịba ekele e kwupụtara ama, nke dị n’akwụkwọ ozi na-esonụ sitere Poland.

“Ruo ogologo oge, ọ gụrụ anyị agụụ ịghọta amụma Bible nke Daniel n’ụzọ ziri ezi. Ugbu a, e mejuwo agụụ ahụ. Akwụkwọ na-enye aka n’ịmụ Bible e ji mee ihe, bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, nwere arụmụka dị mfe, asụsụ doro anya, ihe osise ndị na-akpali akpali. Ihe a nile na-eru n’uche na n’obi mmadụ. Nke a emewo ka anyị nwekwuo obi ike na a ga-emezu nzube Chineke n’oge nke ya. Akwụkwọ a magburu onwe ya e ji amụ ihe na-enye obi ike ma na-ewusi okwukwe ike.”

Àgwà inwe obi abụọ nke oge a nke gụnyeworo nkatọ na-enweghị isi a na-akatọ akụkọ ihe mere eme nke Bible, ò nyewo gị nsogbu n’obi? Ọ bụrụ otú ahụ, akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! ga-akpali mmasị gị ma tọọ gị ụtọ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta fọm a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na magazin a ma zite ya n’adres e dere na fọm ahụ ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 32]

Otu akụkụ mgbidi nke Peasia: Site n’akwụkwọ bụ́ The Coloured Ornament of All Historical Styles

Alexander Onye Ukwu: Roma, Musei Capitolini

mkpọ: Foto e setara site n’ikike British Museum